Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ndị Bi Nwa Oge” Ji Otu Obi Na-efe Chineke

“Ndị Bi Nwa Oge” Ji Otu Obi Na-efe Chineke

“Ndị Bi Nwa Oge” Ji Otu Obi Na-efe Chineke

“Ndị mba ọzọ ga-abụ ndị ọrụ ubi unu na ndị ọrụ ubi vaịn unu. Ma a ga-akpọ unu ndị nchụàjà Jehova.” —AỊZA. 61:5, 6.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

Olee otú ụfọdụ ndị si ele ndị mba ọzọ anya? Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ya?

Olee òkù a na-akpọ ndị si ná mba niile taa?

Olee otú o si bụrụ na e nweghị ndị mba ọzọ n’etiti Ndịàmà Jehova?

1. Olee otú ụfọdụ ndị si ele ndị si mba ọzọ anya? Gịnị mere na e kwesịghị ile ha anya otú ahụ?

IHE e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ gosiri na ndị mmadụ na-akpọ ndị ọzọ “ndị mba ọzọ” iji kparịa ha ma ọ bụ gosi na ha kpọrọ ha asị ma ọ bụ leda ha anya. Ọ bụrụ na anyị echee na ndị obodo anyị ka ndị si mba ọzọ mma, ọ pụtara na anyị anaghị akwanyere ha ùgwù. Anyị ekwesịghịkwa iche otú ahụ. Otu akwụkwọ nke kwuru banyere agbụrụ dị iche iche sịrị: “Ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Ụmụ mmadụ niile bụ ụmụnne n’agbanyeghị agbụrụ ha si.” Ndị otu nne ji nwere ike ha agaghị eyi ibe ha, ma ha bụ ụmụnne.

2, 3. Olee otú Jehova si ele ndị mba ọzọ anya?

2 N’eziokwu, e nwere ndị mba ọzọ n’ụwa niile. Otú ahụ ka ọ dị n’oge ụmụ Izrel, bụ́ ndị ha na Jehova Chineke gbara ndụ, ha abụrụ ndị pụrụ iche ọ họọrọ. Ọ bụghị ihe niile ndị Izrel mere ka ndị ahụ na-abụghị ndị Izrel nwere ike ime. Ma Chineke nyere ndị Izrel iwu ka ha na-akwanyere ha ùgwù, gharakwa ịna-emegbu ha. Anyị kwesịrị ime otú ahụ taa! Ezi Ndị Kraịst ekwesịghị ịna-ele mmadụ anya n’ihu ma ọ bụ na-akpa ókè. N’ihi gịnị? Pita onyeozi kwuru, sị: “N’ezie, ana m aghọta na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.

3 N’oge ochie, e nwere ndị mba ọzọ bi n’etiti ndị Izrel. Ha ritere uru n’otú ha na ndị Izrel si emekọ ihe. Otú ndị Izrel si na-emeso ndị mba ọzọ omume gosiri ihe Jehova mechara si n’ọnụ Pọl onyeozi kwuo mgbe ọtụtụ afọ gachara. Pọl jụrụ banyere Jehova, sị: “Ọ̀ bụ Chineke nke naanị ndị Juu? Ọ́ bụghịkwa nke ndị mba ọzọ? Ee, ọ bụkwa nke ndị mba ọzọ.”—Rom 3:29; Joel 2:32.

4. Gịnị mere a ga-eji kwuo na e nweghị onye mba ọzọ ‘n’Izrel nke Chineke’?

4 Mba Izrel bụbu ndị pụrụ iche n’anya Chineke. Ma o mechara jiri ọgbụgba ndụ ọhụrụ mee ka ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ nọchie mba Izrel. N’ihi ya, a kpọrọ ha “Izrel nke Chineke.” (Gal. 6:16) Pọl kọwara na ná mba ọhụrụ a, e nweghị “onye Grik ma ọ bụ onye Juu, ibi úgwù ma ọ bụ ebighị úgwù, onye mba ọzọ, onye Sitia, ohu ma ọ bụ onye nweere onwe ya, kama Kraịst bụ ihe niile, nọrọkwa n’ime mmadụ niile.” (Kọl. 3:11) N’ihi ya, n’ọgbakọ Ndị Kraịst, o nweghị onye e kwesịrị ịkpọ onye mba ọzọ.

5, 6. (a) Olee ajụjụ ụfọdụ ndị nwere ike ịjụ banyere Aịzaya 61:5, 6? (b) Ole ndị bụ “ndị nchụàjà Jehova” na “ndị mba ọzọ” Aịzaya kwuru okwu ha? (ch) Olee ọrụ ha abụọ na-arụkọ ọnụ?

5 Ma ụfọdụ nwere ike ịna-eche banyere amụma e buru n’Aịzaya isi iri isii na otu, nke na-emezu n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Amaokwu nke isii kwuru banyere ndị ga-abụ “ndị nchụàjà Jehova.” Ma, amaokwu nke ise kwuru banyere “ndị mba ọzọ,” bụ́ ndị ga na-enyere “ndị nchụàjà” aka, ha na ha ana-arụkọkwa ọrụ. Gịnị mere ebe ahụ ji kwuo banyere “ndị mba ọzọ”?

6 Anyị ghọtara na “ndị nchụàjà Jehova” ndị ahụ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị mbụ a ga-akpọlite n’ọnwụ. Ha ga-abụ ‘ndị nchụàjà nke Chineke na nke Kraịst, sorokwa ya chịa dị ka ndị eze ruo otu puku afọ.’ (Mkpu. 20:6) E nwekwara ọtụtụ Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa. E nwere ike ịkpọ ha “ndị mba ọzọ” n’agbanyeghị na ha na ndị nwere olileanya ịga eluigwe na-arụkọ ọrụ. Ha ji obi ụtọ na-akwado “ndị nchụàjà Jehova,” bụrụ ‘ndị ọrụ ubi na ndị ọrụ ubi vaịn.’ Ha na-enyere ndị e tere mmanụ aka n’ikwusa ozi ọma nakwa n’ịkụziri ndị ọzọ eziokwu, nke na-ewetara Chineke otuto. N’eziokwu, ma ndị e tere mmanụ ma ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ na-achọta ndị nwere ezi obi, bụ́ ndị chọrọ ijere Chineke ozi ruo mgbe ebighị ebi, jirikwa obiọma na-azụ ha dị ka atụrụ.—Jọn 10:16.

“NDỊ BI NWA OGE” DỊ KA EBREHAM

7. Olee otú Ndị Kraịst taa si dị ka Ebreham na ndị ọzọ ji obi ha niile fee Jehova n’oge ochie?

7 Di ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, ezi Ndị Kraịst dị ka ndị mba ọzọ ma ọ bụ ndị bi nwa oge n’ụwa ochie a Setan na-achị. Ha dị ka Ebreham na ndị ọzọ ji obi ha niile fee Jehova n’oge ochie, bụ́ ndị e kwuru na ha bụ “ndị bịara abịa na ndị bi nwa oge n’ala ahụ.” (Hib. 11:13) Dị ka Ebreham, anyị na Jehova nwere ike ịdị ná mma, ma olileanya anyị ọ̀ bụ ịga eluigwe ma ọ bụ ibi n’ụwa. Jems kwuru na “‘Ebreham nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ, e wee gụọrọ ya nke ahụ dị ka ezi omume,’ e wee kpọọ ya ‘enyi Jehova.’”—Jems 2:23.

8. Olee nkwa Jehova kwere Ebreham, oleekwa otú Ebreham si lee mmezu nkwa ahụ anya?

8 Chineke kwere nkwa na a ga-esi n’aka Ebreham na ụmụ ya gọzie mba niile nke ụwa, ọ bụghị naanị otu mba. (Gụọ Jenesis 22:15-18.) Obi siri Ebreham ike na nkwa ahụ Chineke kwere ga-emezu n’agbanyeghị na ọ ga-abụ ọtụtụ puku afọ n’ọdịnihu. Ruo otu narị afọ, ya na ndị ezinụlọ ya nọ na-akwagharị si n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ. Ma n’oge ahụ niile, Ebreham akwụsịghị ịbụ enyi Jehova.

9, 10. (a) Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Ebreham? (b) Olee òkù anyị nwere ike iso na-akpọ ndị mmadụ taa?

9 N’agbanyeghị na Ebreham amaghị mgbe nkwa ahụ Jehova kwere ya ga-emezu, ọ hụrụ Jehova n’anya mgbe niile, jirikwa obi ya niile na-efe ya. O chetara mgbe niile na ya bụ onye bi nwa oge. N’ihi ya, o bighị ndụ otú ndị ọzọ chere ụmụ amaala kwesịrị isi na-ebi ndụ. (Hib. 11:14, 15) Anyị kwesịrị iṅomi Ebreham ma ghara ịna-ebi ndụ okomoko. Anyị ekwesịghị iche na ihe kacha mkpa ná ndụ bụ inwe ọtụtụ ihe, ịbụ onye a ma ama n’obodo, ma ọ bụ inwe ezigbo ọrụ! Gịnị mere anyị ga-eji na-agba mbọ ibi ndụ otú ndị ọzọ si ebi n’ụwa ochie a a ga-ebibi n’oge na-adịghị anya? Olee uru ọ ga-abara anyị ịhụ ụwa n’anya ebe ọ bụ na ọ ga-adị naanị nwa oge? Dị ka Ebreham, anyị na-atụ anya inweta ihe ka ụwa ochie a mma. Anyị chọrọ iji ndidi chere mgbe Chineke ga-emezu nkwa ndị o kwere anyị.—Gụọ Ndị Rom 8:25.

10 Jehova ka na-akpọ ndị mba niile òkù ka ha bịa soro ná ndị a ga-esi ná mkpụrụ Ebreham gọzie. “Ndị nchụàjà Jehova,” bụ́ ndị e tere mmanụ, na “ndị mba ọzọ,” bụ́ ndị so n’atụrụ ọzọ, na-eji ihe karịrị narị asụsụ isii akpọ ndị mmadụ òkù a n’ụwa niile.

HỤ NDỊ MMADỤ N’ANYA N’AGBANYEGHỊ MBA HA SI

11. Gịnị ka Sọlọmọn kwuru, nke gbasara ndị na-abụghị ndị Izrel?

11 Mgbe Sọlọmọn na-enyefe Chineke ụlọ nsọ ya n’afọ 1026 Tupu Oge Ndị Kraịst, o kpere ekpere nke mere ka anyị ghọta otú Jehova si ele ndị si mba niile anya. Ọ rịọrọ Jehova ka o gee ntị n’ekpere ndị si ná mba niile, nke ga-eme ka ha rite uru ná nkwa Jehova kwere Ebreham. O ji obi ya niile kpee ekpere, sị: “Tinyere onye mba ọzọ, onye na-esoghị ná ndị gị Izrel, onye sikwa n’ala dị anya bịa n’ihi aha gị (n’ihi na ha ga-anụ banyere aha ukwu gị na banyere aka gị dị ike nakwa banyere ogwe aka gị ị gbatịrị agbatị), o wee bịa chee ihu n’ụlọ a kpee ekpere, gị onwe gị, nọrọ n’eluigwe, bụ́ ebe obibi gị guzosiri ike, nụrụ, meekwa ihe niile mere onye mba ọzọ ahụ ji na-akpọku gị; ka ndị niile nke ụwa wee mara aha gị wee tụọ egwu gị dị ka ndị gị Izrel na-eme.”—1 Eze 8:41-43.

12. Gịnị mere ụfọdụ nwere ike iji na-ele Ndịàmà Jehova anya ka “ndị mba ọzọ”?

12 Onye mba ọzọ bụ onye bịara abịa ma ọ bụ onye bi n’obodo na-abụghị nke ya. Ndịàmà Jehova dị ka ndị mba ọzọ. Ha na-akwado naanị Alaeze Chineke dị n’eluigwe na Eze ya, bụ́ Jizọs Kraịst. N’ihi ya, ha anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ bụrụgodị na ndị ọzọ na-ele ha anya ka ndị iberiibe.

13. (a) Olee otú anyị nwere ike isi kwụsị ile ndị ọzọ anya ka ndị mba ọzọ? (b) Olee otú Jehova chọrọ ka anyị si na-ele ndị ọzọ anya?

13 E nwere ihe ụfọdụ e ji ama na mmadụ bụ onye mba ọzọ. O nwere ike ịbụ asụsụ onye ahụ na-asụ, omenala ha, otú onye ahụ dị, ma ọ bụ ejiji ya. N’agbanyeghị ihe ndị ahụ, e nwere ihe ụfọdụ mere ka ndị si mba dị iche iche yie. Ọ bụ ihe ndị ahụ ka mkpa. Ihe mere e ji akpọ mmadụ onye mba ọzọ bụ otú e si ele ụfọdụ ihe ọ na-eme anya. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị amụta iche banyere otú anyị na onye si ebe ọzọ si yie, o nwere ike ime ka anyị ghara ịna-ele ya anya ka onye mba ọzọ. A sị na ọ bụ otu ọchịchị na-achị ụwa niile, o nweghị onye a ga-asị na ọ bụ onye mba ọzọ. N’eziokwu, nzube Jehova bụ ka mmadụ niile bụrụ otu ezinụlọ, otu ọchịchị ana-achịkwa ha, nke bụ́ ọchịchị ya. Ndị niile bi n’ụwa hà nwere ike ịkwụsị ile ndị ọzọ anya ka ndị mba ọzọ ugbu a?

14, 15. Gịnị ka Ndịàmà Jehova ghọtara?

14 Ọtụtụ ndị taa na-eche naanị banyere onwe ha, na-echekwa na ọ bụ mba ha kacha mma. Ma, obi dị anyị ụtọ na e nwere ndị hụrụ ndị si mba niile n’anya. N’eziokwu, ọ naghị adị mfe ịkwụsị ịkpa ókè. E nwere otu onyeisi ụlọ ọrụ mgbasa ozi a ma ama nke ya na ọtụtụ ndị si mba dị iche iche rụkọrọ ọrụ. Ndị ahụ niile bụ ndị ụbụrụ ha na-aghọ nkọ. O kwuru banyere ha, sị: “Ịmata ndị ahụ mere ka m mụta ihe bara ezigbo uru. O mere ka m na-ele ndị si obodo ọzọ anya ka ndị mụ na ha bi n’ụwa a, kama ịna-ele ha anya ka ‘ndị mba ọzọ.’ Amalitere m ile okwu ahụ bụ́ ‘onye mba ọzọ’ anya ka ihe e ji akparị mmadụ. Enyere m ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ iwu ka ha ghara ịkpọ onye ọ bụla ‘onye mba ọzọ’ ma mgbe a na-agbasa ozi ma mgbe a na-akparịta ụka n’ụlọ ọrụ anyị.”

15 Ná mba dị iche iche gburugburu ụwa, ọ bụ naanị Ndịàmà Jehova na-ele ndị si mba dị iche iche anya otú Chineke si ele ha. Ebe ọ bụ na ha amụtala ile ndị mmadụ anya otú Jehova si ele ha, ha agbanweela ihe ha na-eche banyere ndị ọzọ nakwa otú ha si ele ha anya. Ha anaghị akpọ ndị si mba ọzọ asị, na-enyo ha enyo ma ọ bụ chee na e nweghị ike ịtụkwasị ha obi. Obi na-adị Ndịàmà Jehova ụtọ na n’etiti ha, e nwere ụdị ndị dị iche iche, bụ́ ndị nwere ụdị nkà dị iche iche. Ì cheela echiche banyere ihe a na-enweghị atụ nakwa otú o si abara gị uru mgbe gị na ndị ọzọ na-emekọ ihe?

MGBE A NA-AGAGHỊ ENWE ONYE MBA ỌZỌ N’ỤWA

16, 17. Olee uru ị ga-erite ma amụma e buru ná Mkpughe 16:16 nakwa na Daniel 2:44 mezuo?

16 N’oge na-adịghị anya, mba niile ga-alụso ọchịchị Chineke ọgụ. Mgbe ahụ, Jizọs Kraịst na ndị mmụọ ozi ya ga-alụ agha ikpeazụ a kpọrọ “Ha-Magedọn n’asụsụ Hibru.” (Mkpu. 16:14, 16; 19:11-16) Ihe karịrị puku afọ abụọ na narị ise gara aga, Daniel onye amụma si n’ike mmụọ nsọ kwuo ihe a ga-eme ọchịchị ụmụ mmadụ niile, bụ́ ndị na-emegide nzube Chineke. O dere, sị: “N’ụbọchị ndị eze ahụ, Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”—Dan. 2:44.

17 Chegodị uru ị ga-erite mgbe amụma ahụ ga-emezu. N’ụwa taa, onye ọ bụla gara obodo ọzọ bụ onye mba ọzọ, ebe ọ bụ na e nwere mba dị iche iche n’ụwa. A lụchaa agha Amagedọn, ụwa niile ga-abụzi otu. N’agbanyeghị na ndị mmadụ ka ga-adịkwa iche iche, ọ ga-egosi na Chineke kere ndị mmadụ ka ha dị iche iche iji chọọ ha mma. Ebe anyị na-atụ anya oge ihe ọma ndị a ga-emezu, anyị niile kwesịrị ịgbalịsi ike ịna-eto Jehova Chineke, bụ́ onye kere anyị, ma na-asọpụrụ ya.

18. Gịnị ka Ndịàmà Jehova mere nke gosiri na ha anaghị ele ụmụnna ha anya ka “ndị mba ọzọ”?

18 Ànyị kwesịrị ikweta na ụdị ihe ahụ ga-eme eme n’ụwa niile? Eheenụ. Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-eme. Taa, Ndịàmà Jehova anaghị ele ụmụnna ha si mba dị iche iche anya ka ndị mba ọzọ. Dị ka ihe atụ, n’oge na-adịbeghị anya, ha jikọrọ obere alaka ụlọ ọrụ ndị ha nwere ná mba ụfọdụ ka otu alaka ụlọ ọrụ na-elekọtazi ha. Ihe mere ha ji mee otú ahụ bụ ka ha nwee ike ịna-elekọta ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke ná mba ndị ahụ nke ọma, meekwa ka ọrụ dịkwuo mfe. (Mat. 24:14) Ihe mere e ji mee ya abụghị na e nwere mba ndị ka ibe ha mma. Ma, e mere ya otú ọ na-agaghị emegide iwu mba ọ bụla. Ihe ahụ ha mere gosiri na Jizọs Kraịst, bụ́ Eze Alaeze Chineke, na-enyere Ndịàmà Jehova aka ka ha niile dị n’otu n’agbanyeghị na ha si mba dị iche iche. Mgbe ọ ‘ga-enwezu mmeri ya’ n’oge na-adịghị anya, ọ ga-ewepụ ihe niile e ji kewaa mba dị iche iche.—Mkpu. 6:2.

19. Gịnị ka Ndịàmà Jehova merela n’ihi eziokwu Baịbụl ha mụtara?

19 Ndịàmà Jehova si ná mba dị iche iche, na-asụkwa asụsụ dị iche iche. Ma, ha na-agbalịsi ike ịsụ asụsụ dị ọcha, nke bụ́ eziokwu Baịbụl. Ọ bụ ya mere ha ji dị n’otu. O nweghị ihe ga-ekewa ha. (Gụọ Zefanaya 3:9.) Ha bụ otu ezinụlọ zuru ụwa ọnụ. N’agbanyeghị na ha bi n’ụwa ọjọọ a, ha dị iche. Otú ha si dị n’otu ugbu a na-egosi na n’ụwa ọhụrụ, o nweghị onye ga-abụ onye mba ọzọ. Onye ọ bụla nọ n’ụwa mgbe ahụ ga-aghọta na ihe ahụ otu akwụkwọ kwuru banyere agbụrụ dị iche iche bụ eziokwu. O kwuru, sị: “Ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Ụmụ mmadụ niile bụ ụmụnne n’agbanyeghị agbụrụ ha si.”—Akwụkwọ bụ́ The Races of Mankind.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 28]

Ị̀ na-atụ anya ịhụ mgbe a na-agaghịzi enwe ihe kewara mba dị iche iche, mgbe a na-agaghịkwa enwe onye a ga-akpọ “onye mba ọzọ”?

[Foto dị na peeji nke 25]

Dị ka Ebreham, obi ò siri gị ike na Chineke ga-emezu nkwa ya?

[Foto dị na peeji nke 27]

O nweghị onye Jehova na-ele anya ka onye mba ọzọ