ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Mee 2013

Ụlọ Nche a ga-akọwa otú anyị ga-esi na-ezisa ozi ọma ya eruo mmadụ n’obi, kọwaakwa àgwà ndị ga-enyere ezinụlọ aka ịna-ekwurịta okwu nke ọma ma na-enwe obi ụtọ.

Na-ezisa Ozi Ọma nke Ọma

Olee ihe mere o ji dị oké mkpa ka ndị mmadụ nụ ozi ọma taa? Oleekwa otú anyị nwere ike isi zie ozi ọma ya eruo mmadụ n’obi?

Ị̀ “Na-anụ Ọkụ n’Obi Ịrụ Ezi Ọrụ”?

Isiokwu a kwuru otú ozi ọma anyị na-ekwusa na àgwà ọma anyị na-akpa si eme ka ndị mmadụ fewe Chineke.

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’oge ochie, otú ọtụtụ mba si egbu ndị omekome bụ ịkwụgbu ha n’osisi. Ndị Izrel oge ochie hà na-eme ụdị ihe ahụ?

Ndị Di na Nwunye, Na-ekwurịtanụ Okwu Nke Ọma Ka Unu Dịkwuo ná Mma

Ikwurịta okwu nke ọma na-eme ka di na nwunye na-enwe obi ụtọ. Isiokwu a ga-eme ka anyị ghọta àgwà ndị nwere ike inyere anyị aka ịna-ekwurịta okwu nke ọma.

Ndị Nne na Nna na Ndị Bụ́ Ụmụ, Jirinụ Ịhụnanya Na-ekwurịta Okwu

Olee ihe ụfọdụ nwere ike ime ka o sie ike ịna-ekwurịta okwu nke ọma? Olee otú e nwere ike isi merie nsogbu ndị ahụ?

AKỤKỌ NDỤ

Ihe Mere Ndụ Anyị Ji Nwee Isi

Patricia mụrụ ụmụ abụọ na-arịa ụdị ọrịa ọtụtụ ndi na-amaghị banyere ya. Mụta ihe mere ndụ ha ji nwee isi n’agbanyeghị nsogbu ha nwere.

Na-ekpebi Ime Ihe Ziri Ezi Ka I Nwee Ike Ijidesi Ihe Nketa Gị Ike

Olee ihe nketa Chineke kwere nkwa inye Ndị Kraịst, gịnịkwa ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Isọ mere?

IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

Ha Kwụsiri Ike “n’Oge Awa nke Ule”

Gụọ otú Agha Ụwa nke Mbụ a lụrụ n’afọ 1914 si mee ka ndị mmadụ mara na Ndị Mmụta Baịbụl anaghị alụ agha.