Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ihe Osise A Mara Ezigbo Mma!”

“Ihe Osise A Mara Ezigbo Mma!”

Mgbe ị sapere Ụlọ Nche ọhụrụ, ugboro ole ka i kwutụrụla ụdị ihe a, ma ị̀ gwara ya onwe gị ma ị̀ gwara ya ndị ọzọ? E nwere ihe mere e ji etinye ọmarịcha foto na ihe osise ndị ahụ e sere nke ọma. E ji ha akụzi ihe, ha na-emekwa ka anyị chee echiche. Ha nwere ike ịbara anyị uru karịchaa mgbe anyị na-akwado isiokwu a ga-amụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nakwa mgbe anyị na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe.

Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere ihe mere e ji etinye ihe osise ná mmalite isiokwu a na-amụ. Gịnị ka e ji ya akọwa? Olee otú o si gbasa isiokwu ahụ ma ọ bụ amaokwu Baịbụl e si nweta isiokwu ahụ? Chee otú ya na ihe ndị ọzọ e sere n’isiokwu ahụ si gbasa ihe a na-amụ nakwa uru o nwere ike ịbara gị.

Onye na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche kwesịrị ịgwa ụmụnna ka ha kọwaa ihe osise ọ bụla dị n’isiokwu ahụ. Ha nwere ike ikwu otú ihe osise ahụ si gbasa ihe a na-amụ nakwa ihe ha mụtara na ya. Mgbe ụfọdụ, a na-ede nọmba paragraf n’akụkụ ihe osise. Ọ ga-enyere onye na-eduzi ya aka ịmata mgbe e kwesịrị ịkọwa ya. N’ihe osise ndị a na-edeghị nọmba paragraf n’akụkụ ha, ọ bụ onye na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ga-ekpebi mgbe a ga-akọwa ihe osise nke ọ bụla. E mee otú ahụ, ọ ga-abara mmadụ niile uru, nyekwara anyị aka ichebara ihe e ji Okwu Chineke akụziri anyị echiche.

Otu nwanna nwoke kwuru, sị, “M gụchaa isiokwu tọrọ m ezigbo ụtọ, ihe osise ndị dị na ya na-adị m nnọọ ka mmanụ e ji eri ji.”