Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye A Họpụtara Ọhụrụ Ka O Soro n’Òtù Na-achị Isi

Onye A Họpụtara Ọhụrụ Ka O Soro n’Òtù Na-achị Isi

N’ụtụtụ Wenezdee, abalị ise n’ọnwa itoolu, n’afọ 2012, a maara ezinụlọ Betel dị n’Amerịka nakwa na Kanada ọkwa na a họpụtala onye ọhụrụ ga-eso n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Aha ya bụ Mark Sanderson. Ọ malitere ịrụ ọrụ a n’abalị mbụ n’ọnwa itoolu, n’afọ 2012.

Nwanna Sanderson toro n’obodo San Diego, Kalịfọnịa, dị n’Amerịka. Nne ya na nna ya bụ Ndịàmà Jehova. E mere ya baptizim n’abalị itoolu n’ọnwa abụọ, n’afọ 1975. O bidoro ịsụ ụzọ n’abalị mbụ n’ọnwa itoolu, n’afọ 1983 n’obodo Saskachewan dị na Kanada. N’ọnwa iri na abụọ n’afọ 1990, ọ gụchara akwụkwọ na klas nke asaa n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi n’Amerịka. (A na-akpọzi ya Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị). Nwanna Sanderson ghọrọ ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ọnwa anọ n’afọ 1991. E zigara ya n’otu agwaetiti a na-akpọ Niufaụndland, dị na Kanada. O mechara ghọọ onye na-arụchitere onye nlekọta sekit ọrụ. N’ọnwa abụọ n’afọ 1997, a kpọrọ ya ka ọ gaa jewe ozi na Betel dị na Kanada. N’ọnwa iri na otu n’afọ 2000, e zigara ya n’alaka ụlọ ọrụ dị n’Amerịka. Ọ rụrụ ọrụ na Ngalaba Na-enyere Ndị Dọkịta Aka Ịgwọ Ndịàmà Jehova n’Ejighị Ọbara. Ka oge na-aga, ọ rụrụ ọrụ na Ngalaba Ije Ozi.

N’ọnwa itoolu n’afọ 2008, Nwanna Sanderson gara Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Kọmitii Alaka. E mechara họpụta ya ka o soro na Kọmitii Alaka n’obodo Filipinz. N’ọnwa itoolu n’afọ 2010, a kpọrọ ya ka ọ laghachite Amerịka, ya amalite inyere Kọmitii Ije Ozi nke Òtù Na-achị Isi aka.