ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Septemba 2013
Ụlọ Nche a kwuru otú anyị ga-esi na-eme mkpebi ziri ezi, mee ka anyị na Jehova Chineke dịkwuo ná mma, na otú ihe Jehova na-echetara anyị ga-esi baara anyị uru.
Otú Ihe Abụọ Dị Iche Nwere Ike Isi Baara Gị Uru
Jizọs na-eji ihe abụọ dị iche akụzi ihe. Mụta otú i nwere ike isi jiri ihe abụọ dị iche kụziere ndị mmadụ Baịbụl.
Anyị Kwesịrị Ịtụkwasị Ihe Jehova Na-echetara Anyị Obi
Kemgbe ụwa, otú Jehova si eduzi ndị ya bụ ichetara ha ihe. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na ihe Chineke na-echetara anyị ga-abara anyị uru?
Mee Ka Ihe Jehova Na-echetara Anyị Na-eme Gị Obi Ụtọ
Obi ọ̀ na-adị gị ụtọ irubere Jehova isi, ka ị̀ na-eche mgbe ụfọdụ na ị gaghị edebeli iwu Chineke? Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-eme ihe Jehova na-echetara anyị?
Ị̀ Gbanweela?
Gịnị mere Ndị Kraịst niile ji kwesị ‘ịgbanwe’? Olee ihe anyị kwesịrị ịgbanwe, oleekwa otú anyị nwere ike isi gbanwee?
Na-eme Mkpebi Ziri Ezi
Olee otú anyị ga-esi na-eme mkpebi otú Chineke chọrọ? Gịnị ga-enyere anyị aka ime ihe anyị kpebiri?
Ịsụ Ụzọ Na-eme Ka Anyị na Chineke Dịkwuo ná Mma
Tụlee ụzọ asatọ ịsụ ụzọ nwere ike isi mee ka gị na Jehova dịkwuo ná mma. Gịnị ga-enyere gị aka ịnọsi ike n’ozi gị?
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Jọn 11:35 kwuru na anya mmiri gbara Jizọs tupu ya akpọlite Lazarọs n’ọnwụ. Gịnị mere anya mmiri ji gbaa ya?