ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Disemba 2013

Ụlọ Nche a ga-akọwa ihe anyị ga-eme ka okwukwe anyị sie ike. Ọ ga-akọwakwa mgbe e kwesịrị ịna-eri Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị na uru ọ baara anyị.

Jehova Chebere Ha n’Ugwu

Olee otú e si webatara Ndịàmà Jehova nọ na Jamanị akwụkwọ e ji amụ Baịbụl n’oge ndị Nazi na-achị? Olee nsogbu Ndịàmà Jehova nwere n’oge ahụ?

‘Ekwela Ka E Mee Ka Ị Maa Jijiji Ọsọ Ọsọ Wee Bụrụ Onye Na-enweghị Uche’

Olee ndụmọdụ dị n’akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara ndị Tesalonaịka? Gịnị ga-eme ka a ghara iduhie anyị?

Ị̀ Ga-eji Ihe Ndị I Nwere Na-ejekwuru Chineke Ozi?

Mụta otú anyị nwere ike isi jiri oge anyị, ego anyị, ike anyị, na nkà anyị na-akwado Alaeze Chineke.

Ì Chetara?

Ì wetuola obi gụọ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara n’afọ 2013? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a.

“Ụbọchị A Ga-abụrụ Unu Ihe Ncheta”

Olee ihe Ndị Kraịst kwesịrị ịma gbasara Ememme Ngabiga? Gịnị ka anyị niile nwere ike ịmụta ná Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?

“Na-emenụ nke A Ka Unu Wee Na-echeta M”

Olee otú anyị si amata ụbọchị a ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs? Gịnị ka achịcha na mmanya ahụ pụtara?

Otú Ị Ga-esi Die Ọnwụ Di Gị ma Ọ Bụ Ọnwụ Nwunye Gị

Ọ bụrụ na di mmadụ ma ọ bụ nwunye ya anwụọ, ọ na-agbawa obi. Tụlee otú olileanya mbilite n’ọnwụ Baịbụl kwuru okwu ya si akasi mmadụ obi.

Isiokwu Ndị E Bipụtara n’Ụlọ Nche n’Afọ 2013

Gaa n’ebe e depụtara isiokwu niile gbara n’Ụlọ Nche n’Afọ 2013 ka ha dịrị n’isiokwu n’isiokwu.