Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì wetuola obi gụọ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:

Olee mgbe Jizọs kwusaara “ndị mmụọ nọ n’ụlọ mkpọrọ” okwu? (1 Pita 3:19)

Ọ dị ka ọ̀ bụ obere oge Jizọs bilitechara n’ọnwụ ka ọ gwara ndị mmụọ ọjọọ banyere ahụhụ a ga-ata ha.—6/15, peeji nke 23.

Olee ihe atọ nwere ike ime ka gị na onye ị lụgharịrị ghara ibi n’udo?

Ha bụ: ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike iwepụ obi n’onye mbụ ị lụrụ; ọ bụrụ na ị maghị otú gị na ndị enyi gị ga-esi na-akpa n’akpasughị onye ị lụrụ ọhụrụ iwe; ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịtụkwasị di gị ma ọ bụ nwunye gị obi n’ihi na onye mbụ ị lụrụ kwara iko.—7/1, peeji nke 9-10.

Olee mgbe Jizọs ga-ekpe ndị bụ́ atụrụ na ndị bụ́ ewu ikpe? (Mat. 25:32)

Ọ ga-abụ mgbe Jizọs bịara ikpe ndị mmadụ ikpe n’oké mkpagbu ahụ, mgbe e bibichara okpukpe ụgha.—7/15, peeji nke 6.

Olee mgbe ndị ahụ na-emebi iwu Jizọs kwuru okwu ha n’ihe atụ ahụ o nyere banyere ọka wit na ata ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé? (Mat. 13:36, 41, 42)

Ọ ga-abụ n’oké mkpagbu ahụ, mgbe ha ga-aghọta na o nweghị ihe ga-eme ka a ghara ibibi ha.—7/15, peeji nke 13.

Olee mgbe ihe ahụ Jizọs kwuru gbasara ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche mezuru? (Mat. 24:45-47)

Ha malitere imezu n’oge ikpeazụ a mgbe afọ 1914 gachara, ọ bụghị na Pentikọst afọ 33. N’afọ 1919, Jizọs họpụtara ohu ahụ ka ọ na-elekọta ezinụlọ ya, ya bụ, ndị niile a na-akụziri Okwu Chineke n’ọgbakọ Ndị Kraịst.—7/15, peeji nke 21-23.

Olee mgbe Jizọs ga-eme ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi onye na-elekọta ihe niile o nwere?

Ọ ga-abụ n’oké mkpagbu ahụ, bụ́ mgbe a ga-enye ha ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe.—7/15, peeji nke 25.

Ihe mere na Baịbụl akpọghị ụfọdụ ndị ọ kọrọ akụkọ ha aha ọ̀ bụ maka na ha bụ ndị ọjọọ ma ọ bụ na o nweghị ihe e ji ha kpọrọ?

Mba. E nwere ụfọdụ ndị ọjọọ a na-akpọghị aha ha na Baịbụl, nweekwa ụfọdụ ndị ọma a na-akpọghị aha ha. (Rut 4:1-3; Mat. 26:18) Ọ bụ naanị ndị mmụọ ozi abụọ na-erubere Chineke isi ka Baịbụl kpọrọ aha ha.—8/1, peeji nke 10.

Ewezụga ike Chineke nyere narị Ndịàmà Jehova abụọ na iri atọ, olee ihe ọzọ nyeere ha aka isi n’ogige ịta ahụhụ dị na Saksenhaụsen jiri ụkwụ gaa ọtụtụ kilomita ma ghara ịnwụ?

N’agbanyeghị na ike gwụrụ ha n’ihi agụụ na ọrịa, ha na-agba ibe ha ume ka onye ọ bụla jisie ike na-aga.—8/15, peeji nke 18.

Olee otú ihe Baịbụl kọrọ banyere otú ndị Izrel si gafee Osimiri Jọdan ma banye n’Ala Nkwa ahụ si agba anyị ume?

N’agbanyeghị na mmiri ahụ na-asọsi ike, Jehova mere ka ọ kwụsị ịsọ asọ ka ndị ya nwee ike ịgafe. Ọ ga-abụrịrị na ihe a merenụ mere ka okwukwe ha sikwuo ike, meekwa ka ha tụkwasịkwuo Chineke obi. O kwesịkwara ịgba anyị ume.—9/15, peeji nke 16.

Gịnị ka ihe Baịbụl kwuru ugboro ugboro banyere otú ihe dị iche iche na-acha na-egosi?

O gosiri na Chineke ghọtara na ịhụ otú ihe na-acha baara anyị uru. Ọ na-eme ka ihe anyị hụrụ ruo anyị n’obi, na-emekwa ka anyị ghara ichefu ihe ndị dị mkpa.—10/1, peeji nke 14-15.

Olee otú amụma ahụ e buru na Maịka 5:5 banyere ndị ọzụzụ atụrụ asaa na ndị isi asatọ si na-emezu n’oge anyị a?

Anyị ghọtara na ‘ndị ọzụzụ atụrụ asaa na ndị isi asatọ’ e kwuru okwu ha na Maịka 5:5 bụ ndị okenye ọgbakọ. Ha na-enyere ndị Chineke aka ijikere nke ọma maka ọgụ onye iro ga-alụso ha n’ọdịnihu.—11/15, peeji nke 20.

Olee ihe ụfọdụ gosiri na Chineke baara anyị uru?

Anyị chọrọ onye ga na-eduzi anyị, na onye ga-aza anyị ajụjụ ndị na-agbagwoju anyị anya. Ọ bụ Chineke na-emere anyị ihe abụọ a. Ọ chọrọ ka ihe dịrị anyị ná mma, nakwa ka anyị na-enwe obi ụtọ. Ọ ga-emezukwa nkwa o kwere n’Okwu ya ka ihe ndị a nwee ike nwee isi.—12/1, peeji nke 4-6.