ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Febụwarị 2014

Ụlọ Nche a kwuru otú ihe dị n’Abụ Ọma nke 45 si gbasa anyị. Ọ ga-enyere anyị aka igosi Jehova na obi dị anyị ụtọ na ọ na-egboro anyị mkpa, na-echebe anyị, bụrụkwa ezigbo Enyi anyị.

Na-eto Kraịst, Bụ́ Eze Dị Ebube

Olee otú ihe ndị dị mkpa e kwuru n’Abụ Ọma nke 45 si gbasa anyị taa?

Ṅụrịa Ọṅụ n’Ihi Ọlụlụ Nwunye nke Nwa Atụrụ Ahụ

Ònye bụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ? Olee otú Kraịst si na-akwadebe ya maka agbamakwụkwọ ha? Olee ndị ga-eso ha ṅụrịa ọṅụ?

Jehova Kwụrụ Nwaanyị Zarefat Di Ya Nwụrụ Ụgwọ n’Ihi Okwukwe Ya

Otu n’ime ihe ndị mere ka okwukwe nwaanyị a di ya nwụrụ sie ike bụ na a kpọlitere nwa ya n’ọnwụ. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ ya?

Jehova Na-egboro Anyị Mkpa ma Na-echebe Anyị

Ghọta na Jehova Chineke bụ Nna anyị nke eluigwe. Mụọ otú gị na Chineke ga-esi dịkwuo ná mma n’ihi na ọ bụ Onye Ukwu na-egbo mkpa na Onye na-echebe anyị.

Jehova Bụ Ezigbo Enyi Anyị

Tụlee gbasara Ebreham na Gidiọn, ndị ha na Jehova Chineke dị n’ezigbo mma. Gịnị ka anyị ga-emerịrị ka Jehova bụrụ Enyi anyị?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere ndị Juu ji “na-atụ anya” Mesaya na narị afọ mbụ?

“Na-ahụ Ịdị Mma Jehova”

N’Izrel oge ochie, obi dị Eze Devid ụtọ maka ndokwa Chineke mere ka a na-efe ya ezi ofufe. Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ezi ofufe?

IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

Ihe E Mere Otu Narị Afọ Gara Aga, nke Mere Ka E Nwee Okwukwe

Ihe a bụ otu narị afọ kemgbe e mepụtara fim bụ́ “Photo-Drama of Creation.” Ihe e kwo mepụta ya bụ ka o mee ka ndị mmadụ kweta na Baịbụl bụ Okwu Chineke.