Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Na-ahụ Ịdị Mma Jehova”

“Na-ahụ Ịdị Mma Jehova”

Nsogbu nwere ike ịkpa anyị aka ọjọọ. O nwere ike ime ka anyị na-eche oké echiche, mee ka ike ụwa gwụ anyị, obi ana-ajọkwa anyị njọ. Eze Devid, bụ́ onye chịrị Izrel n’oge ochie, nwere ọtụtụ nsogbu. Olee otú o si merie ha? N’otu abụ na-emetụ n’obi Devid bụrụ, o kwuru, sị: “Eji m olu m kpọkuo Jehova ka o nyere m aka; eji m olu m malite itiku Jehova ka o meere m amara. M nọ na-awụpụ nchegbu m n’ihu ya dị ka mmiri. M nọ na-akọ nhụjuanya m n’ihu ya, mgbe ike gwụrụ mmụọ m n’ime m. Mgbe ahụ, gị onwe gị maara okporo ụzọ m.” N’eziokwu, Devid ji obi umeala kpegara Chineke ekpere ka o nyere ya aka.—Ọma 142:1-3.

Mgbe ihe siiri Devid ike, o ji obi umeala kpegara Chineke ekpere ka o nyere ya aka

N’abụ ọma ọzọ Devid bụrụ, ọ sịrị: “Otu ihe ka m rịọrọ Jehova—ọ bụ ihe m ga-achọ, ka m biri n’ụlọ Jehova ụbọchị niile nke ndụ m, ka m wee na-ahụ ịdị mma Jehova, ka m wee jirikwa obi ekele na-ele ụlọ nsọ ya anya.” (Ọma 27:4) Devid abụghị onye Livaị. Ma, were ya na ị na-ahụ ebe o guzo n’èzí, n’ebe dị nso n’ogige ụlọ nsọ ahụ a na-anọ efe Jehova. Obi dị Devid ezigbo ụtọ. Ọ bụ ya mere o ji chọọ ibi n’ebe ahụ ụbọchị ndụ ya niile ka o wee “na-ahụ ịdị mma Jehova.”

Okwu Hibru e si sụgharịta “ịdị mma” e kwuru okwu ya n’Abụ Ọma 27:4 pụtara ihe obi mmadụ nabatara na ihe na-eme ya obi ụtọ. Devid anaghị eji ndokwa Jehova mere ka a na-efe ya egwu egwu. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘Ọ̀ dị m otú ahụ ọ dị Devid?’

JIRI OBI ỤTỌ NA-ELE NDOKWA CHINEKE MERE ANYA

Taa, Jehova emeghị ndokwa ka anyị na-aga n’ụdị ụlọ nsọ ahụ ụmụ Izrel gara ka anyị na ya nwee ike ịdị ná mma. O mere ndokwa ka e nwee ụlọ nsọ ihe atụ, ya bụ, ndokwa o mere ka anyị na-efe ya ezi ofufe. * Ọ bụrụ na anyị ejiri obi ụtọ na-ele ndokwa a anya, anyị ga ‘na-ahụkwa ịdị mma Jehova.’

Chegodị banyere ebe ịchụàjà nsure ọkụ e ji ọla kọpa mee, nke dị ná mbata ụlọikwuu. (Ọpụ. 38:1, 2; 40:6) Ebe ịchụàjà ahụ nọchiri anya nnabata Chineke nabatara àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ. (Hib. 10:5-10) Chegodị uru àjà ahụ baara anyị. Pọl onyeozi dere, sị: “Mgbe anyị bụ ndị iro, e mere ka anyị na Chineke dị ná mma site n’ọnwụ Ọkpara ya.” (Rom 5:10) Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe n’àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ, anyị na Chineke ga-adị ná mma, ya emezie ka ọ na-ele anyị anya ọma ma tụkwasị anyị obi. Ọ ga-emekwa ka anyị na ya bụrụ ezigbo enyi.—Ọma 25:14.

Ebe ọ bụ na ‘e hichapụla mmehie anyị,’ Jehova emeela ka obi ruo anyị ala. (Ọrụ 3:19) Anyị dị ka onye mkpọrọ a mara ikpe ọnwụ n’ihi ihe ọjọọ o mere. Ka ọ na-eche ụbọchị a ga-egbu ya, ihe ahụ o mere wutere ya, ya agbanwee. Mgbe otu ọkàikpe nwere obiọma hụrụ na ọ gbanweela, ọ gbaghaara ya ihe niile o mere, ma kagbuo ikpe ọnwụ ahụ a mara ya. Obi ga-atọgbu onye mkpọrọ ahụ atọgbu. Jehova na-eme ka ọkàikpe ahụ. Ọ bụrụ na onye mmehie echegharịa, ọ ga-ele ya anya ọma ma kagbuo ikpe ọnwụ a mara ya.

KA IFE JEHOVA NA-ATỌ GỊ ỤTỌ

E nwere ihe ụfọdụ a na-eme n’ofufe Jehova Devid na-ahụ ma ọ gaa n’ụlọ Jehova. Dị ka ihe atụ, ọ na-ahụ ọtụtụ ndị Izrel ibe ya gbakọrọnụ, ebe a na-agụpụta Iwu Mozis n’ihu ọha ma na-akọwa ya, ebe a na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, na  ebe ndị nchụàjà na ndị Livaị na-eje ozi dị nsọ. (Ọpụ. 30:34-38; Ọnụ Ọgụ. 3:5-8; Diut. 31:9-12) Taa, e nwere ihe yiri ihe ndị ahụ ndị Izrel na-eme mgbe ha na-efe Chineke.

Otú ahụ ọ dị n’oge ochie bụ otú ọ dị taa. Ọ “dị mma, bụrụkwa ihe na-enye obi ụtọ mgbe ụmụnne bikọtara ọnụ n’ịdị n’otu!” (Ọma 133:1) Ụmụnna anyị ebukwuola ibu n’ụwa niile. (1 Pita 2:17) N’ọmụmụ ihe, a na-agụ Baịbụl ma kọwaa ya. Jehova ejirila nzukọ ya kụziere anyị ọtụtụ ihe. E bipụtakwala ọtụtụ akwụkwọ anyị ga-eji na-amụ ihe ma naanị anyị chọọ ịmụ ihe na ndị nke anyị na ezinụlọ anyị ga-eji na-amụ ihe. Otu onye so n’Òtù Na-achị Isi kwuru, sị: ‘M na-agụ Okwu Jehova, chebara ya echiche, mee nchọnchọ ka m nwee ike ịghọta ihe m gụrụ. Ihe ndị a emeela ka m mụta ọtụtụ ihe gbasara Jehova, meekwa ka obi na-adị m mma.’ N’eziokwu, ‘ihe ọmụma nwere ike ịna-atọ mkpụrụ obi gị ụtọ.’—Ilu 2:10.

Taa, ndị ohu Chineke na-ekpegara ya ekpere kwa ụbọchị. Ọ na-anụkwa ekpere ha. Ọ na-ewere ya ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. (Ọma 141:2) Obi na-atọ anyị ụtọ ma anyị cheta na ihe anyị na-adị Jehova Chineke mma mgbe ọ bụla anyị ji obi umeala kpegara ya ekpere.

Mozis kpere ekpere, sị: “Ka ịdị mma Jehova bụ́ Chineke anyị dịkwasị anyị, meekwa ka ọrụ aka anyị guzosiere anyị ike.” (Ọma 90:17) Jehova ga na-agọzi ozi anyị ma anyị jiri obi anyị niile na-eje ya. (Ilu 10:22) O nwere ike ịbụ na anyị enyerela ụfọdụ ndị aka, ha amụta eziokwu. O nwekwara ike ịbụ na anyị ejeela ozi ọtụtụ afọ n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị anaghị enwe mmasị n’ozi anyị, ma ọ bụkwanụ na anyị na-arịa ọrịa, a na-akpagbu anyị, e nweekwa ihe ndị na-enye anyị nsogbu n’obi. (1 Tesa. 2:2) Ma, ànyị ga-asị na anyị ahụbeghị “ịdị mma Jehova” ma ghọta na obi dị Nna anyị nke eluigwe ụtọ n’ihi mbọ anyị na-agba?

Devid bụrụ abụ, sị, “Jehova bụ òkè e kenyere m nakwa iko e nyere m. Ị na-ejidesiri m òkè m ike. Ihe ị tụrụ atụ̀ inye m ka ọ bụrụ ihe nketa m dị mma.” (Ọma 16:5, 6) Obi dị Devid ụtọ maka “òkè” e kenyere ya, nke pụtara na obi dị ya ụtọ na ya na Jehova dị ná mma, ya enweekwa ihe ùgwù ịna-ejere ya ozi. Ihe nwere ike isiri anyị ike otú ahụ o siiri Devid. Ma, e nwere ọtụtụ ụzọ Jehova sirila gọzie anyị. N’ihi ya, ka ife Jehova na-atọ anyị ụtọ. Ka anyị jiri obi ụtọ na-ele ụlọ nsọ ihe atụ ya anya.

^ para. 6 Gụọ Ụlọ Nche July 1, 1996, peeji nke 14-24.