Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Kwụrụ Nwaanyị Zarefat Di Ya Nwụrụ Ụgwọ n’Ihi Okwukwe Ya

Jehova Kwụrụ Nwaanyị Zarefat Di Ya Nwụrụ Ụgwọ n’Ihi Okwukwe Ya

WEREGODỊ ya na ị na-ahụ otu nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye ka ọ makụrụ nwa ya nwoke. Nwa ya ahụ bụ naanị otu nwa o nwere. Ihe merenụ dị ya ka ọ̀ bụ ná nrọ. O tebeghị aka o ku ozu nwa ya. Ma ugbu a, a kpọlitela ya n’ọnwụ, obi atọọ ya ụtọ mgbe ọ hụrụ na nwa ya na-amụmụrụ ya ọnụ ọchị. Onye bịara na nke ha sịrị ya, “Lee, nwa gị adịla ndụ.”

A kpọlitere nwa ahụ n’ọnwụ ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ atọ gara aga. Akụkọ ahụ na-emetụ n’obi. I nwere ike ịgụ gbasara ya ná Ndị Eze nke Mbụ isi iri na asaa. Onye ọbịa ha bụ Ịlaịja onye amụma Chineke. Ònye bụ nwaanyị ahụ? Ọ bụ otu nwaanyị di ya nwụrụ bi n’obodo Zarefat. Ma, Baịbụl akpọghị aha ya. Otu n’ime ihe ndị mere ka okwukwe ya sie ike bụ na a kpọlitere nwa ya n’ọnwụ. Ka anyị na-eleba anya n’ihe Baịbụl kọrọ gbasara nwaanyị ahụ, anyị ga-amụta ọtụtụ ihe bara uru.

ỊLAỊJA HỤRỤ NWAANYỊ DI YA NWỤRỤ NKE NWERE OKWUKWE

N’oge ajọ eze Izrel aha ya bụ Ehab na-achị, Jehova kpebiri na ya ga-eme ka mmiri ghara izo n’Izrel ruo afọ ole na ole. Mgbe Ịlaịja kwuchara na mmiri agaghị ezo, Chineke zoro ya ka aka Ehab ghara ịkpara ya. Ọ rụrụ ọrụ ebube mee ka ugoloọma na-ewetara Ịlaịja achịcha na anụ. Jehova gwaziri Ịlaịja, sị: “Bilie gaa Zarefat nke Saịdọn, birikwa n’ebe ahụ. Lee! M ga-enye otu nwaanyị di ya nwụrụ iwu n’ebe ahụ ka ọ na-enye gị ihe oriri.”—1 Eze 17:1-9.

Mgbe Ịlaịja rutere Zarefat, ọ hụrụ otu nwaanyị na-akpa nkụ. Ọ bụ ogbenye, di ya anwụọkwala. Ọ̀ bụ ya bụ nwaanyị ahụ ga na-enye ya nri? Olee otú ọ ga-esi na-enye ya nri ebe ọ dara ogbenye? N’agbanyeghị na o nwere ike ịna-eme Ịlaịja obi abụọ, o bidoro ịgwa nwaanyị ahụ okwu. Ọ sịrị ya, “Biko, were ihe kutetụrụ m mmiri ka m ṅụọ.” Mgbe ọ gawara ikutere ya  mmiri, Ịlaịja gwara ya, sị: “Biko, wetatụrụ m achịcha.” (1 Eze 17:10, 11) Inye Ịlaịja mmiri abụrụghị nwaanyị ahụ nsogbu. Ma, ihe bụ́ nsogbu bụ iwetara ya achịcha.

Nwaanyị ahụ gwara Ịlaịja, sị: “Dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke gị dị ndụ, enweghị m achịcha ọ bụla, ma e wezụga ntụ ọka nke juru ọbụ aka dị n’ime nnukwu ite nakwa obere mmanụ dị n’ime obere ite; lee, m na-akpata obere nkụ, m ga-abanyekwa n’ụlọ sie ihe mụ na nwa m ga-eri, anyị ga-eri ya wee nwụọ.” (1 Eze 17:12) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ụka a Ịlaịja na nwaanyị a kparịtara?

Nwaanyị ahụ di ya nwụrụ matara na Ịlaịja bụ nwoke Izrel na-ejere Chineke ozi. Otú anyị si mata bụ na o kwuru, sị: “Dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke gị dị ndụ.” Ihe o kwuru gosiri na n’agbanyeghị na ọ ma ihe ụfọdụ banyere Chineke Izrel, ọ naghị efe Jehova. Ọ sịghị, “Jehova bụ́ Chineke m.” Nwaanyị a bi na Zarefat. Ọ bụ ndị Saịdọn, bụ́ obodo dị na Finishia, nwe Zarefat. O nwere ike ịbụ na ọtụtụ ndị bi na Zarefat na-efe Bel. Ma, Jehova hụrụ ihe pụrụ iche n’obi nwaanyị a di ya nwụrụ.

N’agbanyeghị na nwaanyị a bi n’ebe ọtụtụ ndị na-efe arụsị, o nwere okwukwe na Jehova. Jehova gwara Ịlaịja ka ọ gaa na nke nwaanyị a n’ihi na ọ ma na ọ ga-abara ma Ịlaịja ma nwaanyị a uru. E nwere ihe dị ezigbo mkpa anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ Jehova gwara Ịlaịja.

Ọ bụghị mmadụ niile bi na Zarefat ka omume ha retọrọ eretọ. Ebe ọ bụ na Jehova gwara Ịlaịja ka ọ gaa na nke nwaanyị a, ọ pụtara na ọ na-ahụ ndị na-anaghị efe ya, ma ya abụrụ na ha ebughị ihe ọjọọ n’obi. N’eziokwu, “ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”—Ọrụ 10:35.

Mmadụ ole bi n’ókèala unu dị ka nwaanyị Zarefat ahụ? Ha nwere ike ịna-achọ otú ka mma ha ga-esi na-efe Jehova n’agbanyeghị na ndị agbata obi ha na-ekpe okpukpe ụgha. O nwere ike ha amachaghị banyere Jehova ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha amatụdịghị banyere ya. E kwesịrị inyere ụdị ndị a aka ka ha fewe Jehova. Ị̀ na-aga chọọ ha ma nyere ha aka?

‘BURU ỤZỌ MEERE M OBERE ACHỊCHA’

Chebara ihe Ịlaịja gwara nwaanyị ahụ mee echiche. Ọ ka gwachara Ịlaịja na ya na nwa ya richaa nri ikpeazụ ọ ga-esi, ha echere ọnwụ ha. Ma, olee ihe Ịlaịja gwara ya? Ọ gwara ya, sị: “Atụla egwu. Banye, mee dị ka i kwuru. Kama buru ụzọ si n’ihe dị n’ebe ahụ meere m obere achịcha, ị ga-ewepụtakwara m ya, e mesịakwa, ị ga-eme nke gị na nwa gị. N’ihi na nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, ‘Nnukwu ite ntụ ọka ahụ agaghị agwụ, obere ite mmanụ ahụ agaghịkwa agwụ ruo ụbọchị Jehova ga-eme ka oké mmiri zoo n’elu ala.’”—1 Eze 17:11-14.

O nwere ndị ọ ga-abụ, ha asị: ‘Olee otú m ga-esi nye gị nri ikpeazụ anyị nwere? Ị na-egwu egwu.’ Ma, nwaanyị ahụ ekwughị otú ahụ. N’agbanyeghị na ọ machaghị Jehova, o kweere ihe Ịlaịja gwara ya ma mee ihe o kwuru. Ihe nwaanyị a mere ga-egosi ma ò nwere okwukwe. Ma, o mere ihe ziri ezi.

Okwukwe nwaanyị a di ya nwụrụ nwere na Jehova, bụ́ Chineke Ịlaịja, mere ka ya na nwa ya ghara ịnwụ

Chineke ahapụghị nwaanyị ahụ di ya nwụrụ. Jehova mere ihe ahụ Ịlaịja kwuru. Ịlaịja na nwaanyị ahụ na nwa ya rigidere nri ruo mgbe Jehova mere ka oké ọkọchị ahụ kwụsị. N’eziokwu, “nnukwu ite ntụ ọka ahụ agwụghị agwụ, obere ite mmanụ ahụ agwụghịkwa, dị ka Jehova kwuru site n’ọnụ Ịlaịja.”  (1 Eze 17:16; 18:1) A sị na nwaanyị ahụ emeghị otú ahụ o mere, achịcha o ji obere ntụ ọka ahụ na mmanụ ahụ mee gaara abụ nri ikpeazụ ya. Ma, o mere ihe gosiri na o nwere okwukwe, tụkwasị Jehova obi ma buru ụzọ nye Ịlaịja nri.

Ihe anyị ga-amụta n’ihe a bụ na Chineke na-agọzi ndị nwere okwukwe na ya. Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara gị, Jehova ga-enyere gị aka ma ị tụkwasị ya obi. Ọ ga-egboro gị mkpa gị, chebe gị ma bụrụ Enyi gị ka i nwee ike idi ihe ndị bịaara gị.—Ọpụ. 3:13-15.

N’afọ 1898, otu isiokwu gbara n’Ụlọ Nche nke Bekee kwuru ihe anyị ga-amụta n’akụkọ nwaanyị a di ya nwụrụ. O kwuru na ọ bụrụ na nwaanyị ahụ enwee okwukwe ma mee ihe Ịlaịja gwara ya, Jehova ga-enyere ya aka. Ma, ọ bụrụ na o nweghị okwukwe na Jehova, Jehova nwere ike isi n’aka nwaanyị ọzọ di ya nwụrụ mee ihe ahụ. Ụlọ Nche ahụ kwukwara na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị anyị. Mgbe ụfọdụ, Jehova nwere ike ikwe ka ọnwụnwa bịara anyị. Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe, ‘ọ ga-agọzi anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị enweghị okwukwe, ọ gaghị agọzi anyị.’

Mgbe ọ bụla ọnwụnwa bịaara anyị, anyị kwesịrị ịgụ Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ka anyị mara ihe Jehova chọrọ ka anyị mee. Anyị mata ihe Jehova chọrọ ka anyị mee, anyị kwesịrị ime ya, ọ bụrụgodị na ọ gaghị adịrị anyị mfe. Jehova ga-agọzi anyị ma ọ bụrụ na anyị emee ihe a e kwuru n’akwụkwọ Ilu, ya bụ: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.”—Ilu 3:5, 6.

‘Ị̀ BỊARA IGBU NWA M?’

E nwere ihe ọzọ ga-egosi ma nwaanyị ahụ di ya nwụrụ ò nwere okwukwe. Baịbụl kwuru, sị: “O wee ruo mgbe ihe ndị a gasịrị na nwa nwoke nke nwaanyị ahụ, bụ́ nwaanyị nwe ụlọ ahụ, dara ọrịa, ọrịa ya wee sie ike nke na ume afọdụghị n’ime ya.” Mgbe nwaanyị a na-achọ ihe mere nwa ya ji nwụọ, ọ sịrị Ịlaịja: “Gịnị jikọrọ mụ na gị, onye nke ezi Chineke? Ị bịakwutewo m ichetara m njehie m nakwa igbu nwa m.” (1 Eze 17:17, 18) Obi gbawara nwaanyị a. Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

Ọ̀ ga-abụ na nwaanyị a chetara mmehie o mere nke na-enye akọnuche ya nsogbu? Ò chere na ọnwụ nwa ya bụ otú Chineke chọrọ isi kwụọ ya ụgwọ ihe o metara nakwa na Chineke zitere Ịlaịja ka o gbuo nwa ya? Baịbụl agwaghị anyị. Ma ihe anyị ma bụ na nwaanyị a ekwughị na Chineke mere ihe ọjọọ.

Ọ ga-abụrịrị na o juru Ịlaịja anya mgbe ọ nụrụ na nwa nwaanyị ahụ anwụọla, nakwa na ọ bụ ya kpatara ya. Ịlaịja kuuru ozu nwa ahụ gbagoo n’ọnụ ụlọ dị n’elu ma kpọkuo Jehova, sị: “Jehova bụ́ Chineke m, ọ̀ bụkwa nwaanyị a di ya nwụrụ nke m bi n’ụlọ ya dị ka ọbịa ka ị ga-eme ihe ọjọọ site n’ime ka nwa ya nwụọ?” O wutere Ịlaịja na ọ bụrụ na Jehova ekwe ka ihe a mee nwaanyị a nwere obiọma, o nwere ike ime ka a kọchaa aha Jehova. N’ihi ya, ọ rịọrọ Jehova, sị: “Jehova bụ́ Chineke m, biko, mee ka mkpụrụ obi nwatakịrị a bịaghachi n’ime ya.”—1 Eze 17:20, 21.

“LEE, NWA GỊ ADỊLA NDỤ”

Jehova zara ekpere Ịlaịja. Nwaanyị ahụ di ya nwụrụ gosiri na ya nwere okwukwe na Jehova, gbokwaara Ịlaịja mkpa ya. E nwere ike ihe mere Jehova ji kwe ka nwa ahụ nwụọ bụ na ọ ma na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ. Ọ makwa na a kpọlite ya n’ọnwụ, ọ ga-emecha mee ka ọtụtụ nde mmadụ nwee okwukwe. Ọ bụ nwa a bụ onye mbụ Baịbụl kwuru na a kpọlitere n’ọnwụ. Jehova zara ekpere Ịlaịja ma mee ka nwa ahụ dị ndụ. Chegodị ụdị obi ụtọ nwaanyị ahụ nwere mgbe Ịlaịja gwara ya, sị: “Lee, nwa gị adịla ndụ.” Nwaanyị ahụ gwara Ịlaịja, sị: “Ugbu a ka m maara na ị bụ onye nke Chineke nakwa na okwu Jehova nke dị n’ọnụ gị bụ eziokwu.”—1 Eze 17:22-24.

Ndị Eze nke Mbụ isi iri na asaa ekwuzighị ihe ọ bụla ọzọ banyere nwaanyị ahụ. Ma, ebe ọ bụ na Jizọs mechara kwuo okwu ọma gbasara nwaanyị ahụ, ọ ga-abụ na o feweziri Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ. (Luk 4:25, 26) Akụkọ nwaanyị a na-akụziri anyị na Chineke na-agọzi ndị na-emere ndị na-efe ya ihe ọma. (Mat. 25:34-40) O gosikwara na Chineke na-egboro ndị na-efe ya mkpa ha, a sịgodị na ihe siri ike. (Mat. 6:25-34) Ihe ọzọ anyị mụtara bụ na ọ na-agụ Jehova agụụ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ nakwa na ọ ga-akpọliteli ha n’ọnwụ. (Ọrụ 24:15) N’eziokwu, ihe a niile bụ ihe mere anyị kwesịrị iji na-echeta nwaanyị Zarefat.