ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Eprel 2014
Ụlọ Nche a kwuru otú anyị ga-esi nwee okwukwe ka Mozis. Olee otú Jehova chọrọ ka anyị si na-elekọta ndị ezinụlọ anyị? Olee otú o si enyere anyị aka ịna-elekọta ha?
Ṅomie Okwukwe Mozis
Olee otú okwukwe Mozis si mee ka ọ ghara ime ihe anụ ahụ́ ya chọrọ, mee ka o jiri ozi ya kpọrọ ihe? Gịnị mere Mozis ji ‘legide anya n’ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ya’?
Ị̀ Na-ahụ “Onye A Na-apụghị Ịhụ Anya”?
Olee otú okwukwe si mee ka Mozis ghara ịtụ egwu mmadụ, meekwa ka o nwee okwukwe ná nkwa Chineke? Mee ka okwukwe gị sie ike ka ị ghọta na Jehova dị njikere inyere gị aka.
AKỤKỌ NDỤ
Ebe Ozi Oge Niile Mere Ka M Ruo
Chọpụta ihe mere Robert ji sị na ya cheta ozi oge niile ya jerela afọ iri isii na ise, ya aghọta na o meela ka ndụ ya baa ezigbo uru, Chineke agọziekwa ya.
E Nweghị Onye Ga-abụli Ohu Nna Ukwu Abụọ
Ụfọdụ agaala mba ọzọ ka ha kpatakwuo ego. Olee otú obi ga-adị Jehova ma mmadụ hapụ ezinụlọ ya gaa biri ná mba ọzọ? Olee nsogbu ọ ga-akpata n’ezinụlọ?
Nwee Obi Ike, Jehova Bụ Onye Na-enyere Gị Aka
Olee otú otu nna si nwee okwukwe na Chineke ma bido ime ka ezinụlọ ya dị n’otu mgbe o si ná mba ọzọ ọ gara na-arụ ọrụ lọta? Olee otú Jehova si nyere ya aka ịna-akpa afọ ezinụlọ ya n’agbanyeghị na ihe siri ike?
Obi Ọ̀ Dị Gị Ụtọ na Jehova Na-eleru Gị Anya?
Tụlee ụzọ ise Chineke si eleru anyị anya n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya na otú ọ ga-esi baara anyị uru.
Ị̀ Maara?
N’oge Baịbụl, ọ bụrụ na mmadụ akpachara anya dọwaa uwe ya, gịnị ka ọ pụtara?