ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Mee 2014

Ụlọ Nche a kwuru ụzọ atọ anyị ga-esi zaa onye jụrụ anyị ajụjụ siri ike n’ozi ọma ihe ga-eru ya n’obi. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-eme ihe nzukọ Jehova na-agwa anyị?

‘Ihe Oriri M Bụ Ka M Mee Uche Chineke’

Ime uche Chineke tọrọ Devid, Pọl, na Jizọs Kraịst ụtọ. Olee otú anyị ga-esi jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ma ọ bụrụ na ndị mmadụ anaghị ege anyị ntị?

Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi “Azaghachi Onye Ọ Bụla”?

Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ anyị ajụjụ siri ike, olee otú anyị ga-esi mee ka ọ tụgharịa uche n’ihe Baịbụl kwuru? Tụlee ụzọ atọ anyị nwere ike isi zaa onye ahụ ihe ga-eru ya n’obi.

Na-akpa Àgwà Ọma n’Ozi Ọma

Olee otú anyị kwesịrị isi emeso ndị mmadụ n’ozi ọma? Olee otú ihe Jizọs kwuru na Matiu 7:12 si gbasa ozi ọma anyị?

AKỤKỌ NDỤ

Jehova Enyerela M Aka

Kenneth Little kwuru otú Jehova Chineke si mee ka ọ kwụsị ime ihere na ịtụ ụjọ. Chọpụta otú Chineke sirila gọzie obi ike o ji na-ejere ya ozi.

Jehova Na-ahazi Ihe Ya Ahazi

Olee otú ihe Baịbụl kọrọ gbasara ụmụ Izrel na Ndị Kraịst oge mbụ si gosi na Jehova ga-ahazi ndị ohu ya n’ụwa taa ahazi?

Ì So Nzukọ Jehova Na-aga Ụkwụ na Ụkwụ?

N’oge na-adịghị anya, a ga-ebibi ụwa Setan. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-eme ihe nzukọ Chineke gwara anyị taa?

IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

“A Ga-arụ Nnukwu Ọrụ Ka E Nwee Ike Ịkụziri Ndị Mmadụ Eziokwu Baịbụl”

Ihe karịrị narị puku Ndịàmà Jehova asaa na iri puku isii na-ezi ozi ọma na Brazil. Olee otú Ndị Mmụta Baịbụl si bido izi ozi ọma na Brazil na mba ndị gbara ya gburugburu?