Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì wetuola obi gụọ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:

Olee mgbe ndị Izrel na-egbu ebule e ji eme Ememme Ngabiga n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan?

Baịbụl kwuru na ọ bụ “ná mgbede.” Otú e si sụgharịa ya n’ụfọdụ Baịbụl bụ “n’anyasị.” N’ihi ya, a ga-egbu ebule ahụ mgbe abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan malitere, ya bụ, mgbe anyanwụ dachara, ma tupu chi ejie. (Ọpụ. 12:6)12/15, peeji nke 18-19.

Olee ihe ndị Baịbụl kwuru nwere ike inyere ndị na-eto eto aka ime mkpebi ga-akacha baara ha uru?

Atọ n’ime ha bụ (1) Buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume ya. (Mat. 6:19-34) (2) Na-ejere ndị ọzọ ozi ka i nwee ike na-enwe obi ụtọ. (Ọrụ 20:35) (3) Ka ijere Jehova ozi n’oge ị na-eto eto na-eme gị obi ụtọ. (Ekli. 12:1)1/15, peeji nke 19-20.

Olee ndị na-agba ịnyịnya anọ na-awụ ọsọ kemgbe afọ 1914?

Ọ bụ Jizọs Kraịst bụ Eze na-agba ịnyịnya ọcha. Ọ chụpụrụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe. Onye na-agba ịnyịnya na-acha uhie uhie nọchiri anya agha tarala isi ọtụtụ nde mmadụ. Onye na-agba ịnyịnya ojii nọchiri anya ụkọ nri. Onye na-agba ịnyịnya ahụ́ ya chanwụrụ achanwụ ji ọrịa ọjọọ na ọnwụ na-egbu ọtụtụ nde mmadụ. (Mkpu. 6:2-8)2/1, peeji nke 6-7.

Olee mgbe Nwa Atụrụ ahụ ga-agba akwụkwọ? (Mkpu. 19:7)

Ọ bụ mgbe Eze bụ́ Jizọs Kraịst nwezuru mmeri ya, ya bụ, mgbe e bibichara Babịlọn Ukwu ahụ, a lụọkwa agha Amagedọn.2/15, peeji nke 10.

Gịnị mere ndị Juu ji “na-atụ anya” Mesaya n’oge Jizọs? (Luk 3:15)

Anyị ejighị n’aka na ndị dịrị ndụ n’oge Jizọs ghọtara amụma Daniel buru banyere Mesaya otú anyị si ghọta ya taa. (Dan. 9:24-27) Ma, o nwere ike ịbụ na ha nụrụ gbasara ihe mmụọ ozi gwara ụfọdụ ndị na-azụ atụrụ ma ọ bụkwanụ ihe onye amụma nwaanyị aha ya bụ Ana kwuru mgbe e ku Jizọs bịa n’ụlọ nsọ. Ndị na-agụ kpakpando bịara na-achọ “onye ahụ a mụrụ ịbụ eze ndị Juu.” (Mat. 2:1, 2) Ihe Jọn Onye Na-eme Baptizim mechara kwuo gosiri na ọ gaghị adị anya Kraịst abịa.2/15, peeji nke 26-27.

Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Ee anyị ghara ịbụ Ee e? (2 Kọr. 1:18)

O doro anya na ihe bịaara anyị nke ọ na-enweghị ihe ọzọ anyị ma anyị ga-eme nwere ike ime mgbe ụfọdụ ka anyị ghara ime ihe anyị kwuru. Ma, ọ bụrụ na anyị ekwe nkwa, anyị kwesịrị ime ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị mezuo ya.3/15, peeji nke 32.

Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ka anyị ghara ile ndị gba ọtọ?

Ihe atọ nwere ike inyere anyị aka bụ (1) Iwepụ anya anyị ozugbo ma ọ bụrụ na anyị ahụpere ihe ga-eme ka ịkwa iko gụwa anyị agụụ. (2) Ime ka uche anyị ghara ịna-aga n’ihe ọjọọ. Otú anyị ga-esi mee ya bụ ịna-ekpegara Chineke ekpere na ịgbalị ka ihe anyị na-eche n’echiche bụrụ ezigbo ihe. (3) Ịkpachara anya ka anyị ghara itinye onwe anyị ná nsogbu. Anyị agaghị na-ele fim a na-egosi ndị gba ọtọ ma ọ bụ ndị na-enwe mmekọahụ ma ọ bụkwanụ na-aga ele ya n’Ịntanet.4/1, peeji nke 10-12.

Ọ bụrụ na Onye Kraịst ahapụ ezinụlọ ya gaa ịkpata ego ná mba ọzọ, olee nsogbu ndị o nwere ike ịkpata?

Ọ bụrụ na nne na nna na ụmụ ha ebighị, obi nwere ike ịna-ajọ ụmụ ha njọ. Obi ha agaghị abụ otu n’ihe bụ́ ihe ọma na ihe bụ́ ihe ọjọọ. Iwe nwere ike ịna-ewe ha ma ha hụ papa ha na mama ha. Ọ bụrụkwa na mmadụ ahapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya gaa biri ebe ọzọ, ndị mmadụ nwere ike ịna-enye ya nsogbu ka ha nwee mmekọahụ.4/15, peeji nke 19-20.

Gịnị mere e ji akụjisị ndị omekome ụkwụ ma a kpọgide ha n’osisi?

Ndị Rom na-akpọgbu ụfọdụ ndị omekome n’osisi. Ndị Juu kwuru ka a kụjie ụkwụ ndị omekome abụọ a kpọgidere ha na Jizọs n’osisi. Ọ ga-eme ka o siere ha ike iku ume, meekwa ka ha nwụọ ngwa ngwa. Ọ ga-emekwa ka a ghara ịhapụ ozu ha n’elu osisi abalị dum. (Diut. 21:22, 23)5/1, peeji nke 11.

Olee ajụjụ anọ anyị kwesịrị iburu n’obi ma anyị gaa izi mmadụ ozi ọma?

Ha bụ: Olee onye m bịara izi ozi ọma? Olee ebe m bịara izi ya ozi ọma? Olee mgbe kacha mma ịbịa na nke ya? Olee otú m ga-esi agwa ya okwu?5/15, peeji nke 12-15.

Gịnị gosiri na sịga na-egbu ndị mmadụ?

Sịga gburu otu narị nde mmadụ n’ime otu narị afọ gara aga. Ọ na-egbu ihe dị ka nde mmadụ isii kwa afọ.—6/1, peeji nke 3.