Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Ị Ga-esi Nyere Ụmụnna Gbara Alụkwaghịm Aka?

Olee Otú Ị Ga-esi Nyere Ụmụnna Gbara Alụkwaghịm Aka?

Ọtụtụ ndị na-agba alụkwaghịm taa. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na ị ma onye gbara alụkwaghịm. Dị ka ihe atụ, ihe a chọpụtara na Poland gosiri na ọtụtụ ndị dị afọ iri atọ ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha birila afọ atọ ruo afọ isii nwere ike ịgba alụkwaghịm. Ma, ọ bụghị naanị ndị dị afọ ole ahụ na-agba alụkwaghịm.

Ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihe gbasara ezinụlọ na Spen kwuru na e kee ndị na-agba akwụkwọ na Yurop ụzọ abụọ, otu ụzọ ga-agba alụkwaghịm. Otu ihe ahụ na-emekwa n’obodo ndị ọzọ mepere emepe.

O NWEGHỊ ỤDỊ IHE NA-AGAGHỊ ABATA ONYE AHỤ N’OBI

Gịnị ka ịgba alụkwaghịm na-akpatakarị? Otu nwaanyị bụ́ aka ochie n’ịdụ ndị lụrụ di na nwunye ọdụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Yurop kwuru, sị: “Ịgba alụkwaghịm na-eme ka ọhaneze mata na di na nwunye enweela nsogbu, ya bụ na ha etisaala ma biri iche iche. Ọ bụ ihe na-agbawa obi.” O kwukwara na ịgba alụkwaghịm na-akpatakarị iwe, mwute, ịkwa mmakwaara, na ihere. Ọ na-emekwa ka ọsụkọsụ na-asụ ndị ahụ gbara alụkwaghịm. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eme ka otu n’ime ha chọwa igbu onwe ya. Nwaanyị ahụ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ụlọikpe emechaa kweta ka di na nwunye gbaa alụkwaghịm, nsogbu ọzọ na-amalite. Ọ ga na-adị onye ahụ ka ò nwere ihe pụrụ ya n’ahụ́ nakwa ka ọ̀ bụ onye a jụrụ ajụ. O nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ugbu a m gbara alụkwaghịm, ọ̀ ka nwere uru m bara? Olee isi ndụ m dị?’”

Otu nwaanyị aha ya bụ Ewa kwuru otú obi dị ya mgbe ya na di ya gbara alụkwaghịm afọ ole na ole gara aga. Ọ sịrị: “Mgbe anyị gbachara alụkwaghịm, ihere megburu m emegbu n’ihi na ndị agbata obi m na ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ na-akpọzi m ‘onye a gbara alụkwaghịm.’ Iwe juru m obi. Ọ bụ naanị mụ na ụmụ m abụọ bi mgbe ahụ, mụ abụrụ ma papa ha ma mama ha.” * E nwere otu nwanna aha ya bụ Adam. Ọ bụ okenye ruo afọ iri na abụọ. Ndị mmadụ na-akwanyere ya ùgwù. O kwuru, sị: “O nweghịzi ihe ndị mmadụ ji m kpọrọ. N’ihi ya, iwe na-eju m obi mgbe ụfọdụ. O nwekwara mgbe ọ na-adị m ka m nọọrọ onwe m.”

IHE MERE O JI ESIRI ỤFỌDỤ NDỊ IKE INWETA ONWE HA

Ụfọdụ ndị gbara alụkwaghịm na-achị obi n’aka n’ihi na ha amaghị otú ihe ga-adịrị ha n’ọdịnihu. Ọ na-esikwara ha ike inweta onwe ha ọ bụrụgodị na ọtụtụ afọ agaala kemgbe ha gbara alụkwaghịm. Ha nwere ike iche na o nweghị onye chọrọ ịma ma hà dị ndụ ma hà nwụrụ anwụ. Otu onye na-ede gbasara ịgba alụkwaghịm n’akwụkwọ akụkọ kwuru na mmadụ gbaa alụkwaghịm, ‘onye ahụ ga-agbanwe àgwà ya, mụwakwa otú naanị ya ga-esi na-edi nsogbu ndị bịaara ya.’

Otu nwanna aha ya bụ Stanisław kwuru, sị: “Mgbe anyị gbachara alụkwaghịm, nwunye m ekweghị ka m na-ahụ ụmụ nwaanyị abụọ anyị mụtara. N’ihi ya, amalitere m iche na o nweghịzi onye hụrụ m n’anya nakwa na Jehova ahapụla m. Ndụ gbụrụ m. Ma, emechara m ghọta na ihe ahụ m na-eche abụghị eziokwu.” E nwere otu nwaanyị aha ya bụ Wanda. Ya na di ya gbara alụkwaghịm, ya achịrị obi n’aka n’ihi na ọ maghị otú ihe ga-adịrị ya n’ọdịnihu. O kwuru, sị: “Obi m gwara m na obere oge, ụmụnna na ndị ọzọ agaghị achọ ịma ihe ọ bụla gbasara mụ na ụmụ m. Ma ugbu a, ahụla m otú ụmụnna si na-akpa anyị nso ma na-enyere m aka ná mbọ m na-agba ịzụ ụmụ m ka ha nwee ike ịna-efe Jehova ma ha too.”

Ihe ụmụnna ndị a kwuru gosiri na obi anaghị adị ụfọdụ ndị mma ma ha gbachaa alụkwaghịm. Ha nwere ike ịna-ele onwe ha anya otú na-ekwesịghị ekwesị, na-eche na ha abachaghị uru nakwa na o nweghị onye kwesịrị ịna-ajụ ase ha. Ha nwekwara ike ịna-akatọ ihe ọ bụla mmadụ mere. O nwere ike ime ka ha chewe na ọgbakọ ahụghịzi ha n’anya nakwa na ihe banyere ha anaghị emetụ ụmụnna n’obi. Ma, ihe ahụ a kọrọ gbasara Stanisław na Wanda gosiri na ndị gbara alụkwaghịm nwere ike imecha ghọta na ihe banyere ha na-emetụ ụmụnna n’obi. Nke bụ́ eziokwu bụ na ụmụnna na-enyere ha aka, ọ bụrụgodị na ha amataghị ná mmalite na a na-enyere ha aka.

Ọ GA NA-ADỊ ONYE AHỤ KA À JỤRỤ YA AJỤ

Ihe anyị kwesịrị iburu n’obi bụ na n’agbanyeghị otú anyị si agbalị inyere ụmụnna gbara alụkwaghịm aka, o nwere ike ịdị ha mgbe ụfọdụ ka à hapụrụ naanị ha. Ụmụnna nwaanyị gbara alụkwaghịm nwere ike ịna-eche na ọtụtụ ndị achọghị ịma ma hà dị ndụ ma hà nwụrụ anwụ. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Alicja kwuru, sị: “Afọ asatọ agaala kemgbe anyị gbara alụkwaghịm. Ma, ọ ka na-adị m mgbe ụfọdụ ka abachaghị m uru. Mgbe ọ bụla ọ dị m otú ahụ, m na-anọrọ onwe m, bee ezigbo ákwá ma na-akwa ụwa m.”

Ọ bụ eziokwu na obi nwere ike ịna-ajọ onye gbara alụkwaghịm njọ, Baịbụl kwuru na mmadụ ekwesịghị ịna-akpa iche. Ọ bụrụ na mmadụ akpawa iche, o nwere ike ime ka ọ jụ “ezi amamihe.” (Ilu 18:1) Ma, ọ bụrụ na ọ na-adị mmadụ ka o nweghị onye ihe gbasara ya na-emetụ n’obi, onye ahụ kwesịrị ịghọta na ya ekwesịghị ịna-aga ugboro ugboro ka onye na-abụghị nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị ibe ya dụọ ya ọdụ ma ọ bụ kasie ya obi. Ọ bụ otú ahụ ka ọ ga-esi gosi na ya nwere ezi amamihe n’ihi na ọ ga-eme ka onye ahụ ghara iri ya obi.

Nwanna gbaa alụkwaghịm, o nweghị ụdị ihe na-agaghị abata ya n’obi. O nwere ike ịna-achị obi n’aka n’ihi na ọ maghị ihe ga-eme echi. O nwekwara ike ịna-adị ya ka ọ̀ bụ onye a jụrụ ajụ. Ebe anyị ghọtara na ọ bụ otú obi na-adị ụdị onye ahụ, ghọtakwa na ọ naghị adị mfe, anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-akwado ya, si otú ahụ gosi na anyị na-eme ka Jehova. (Ọma 55:22; 1 Pita 5:6, 7) Ka obi sie anyị ike na obi ga-adị onye ahụ ụtọ ma ọ bụrụ na anyị esi n’ụzọ ọ bụla nyere ya aka. Ọ ga-eme ka ọ ghọta na e nwere ezigbo ndị enyi na-enyere ya aka n’ọgbakọ.—Ilu 17:17; 18:24.

^ para. 6 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.