Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-enweta ‘Nri n’Oge Kwesịrị Ekwesị’?

Ị̀ Na-enweta ‘Nri n’Oge Kwesịrị Ekwesị’?

O NWETỤBEGHỊ oge tara akpụ ka oge anyị a. (2 Tim. 3:1-5) Kwa ụbọchị, ọnwụnwa ndị na-abịara anyị na-eme ka a mata ma ànyị hụrụ Jehova n’anya, na-erubekwara iwu ya isi. Jizọs ma na oge anyị a ga-ata akpụ. Ọ bụ ya mere o ji gwa ndị na-eso ụzọ ya na ya ga na-agba ha ume ka ha nwee ike ịtachi obi ruo ọgwụgwụ. (Mat. 24:3, 13; 28:20) N’ihi ya, ọ họpụtara ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ka ọ na-enye ha “nri ha n’oge kwesịrị ekwesị.”—Mat. 24:45, 46.

Kemgbe afọ 1919 a họpụtara ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, o nyerela ọtụtụ nde ndị na-asụ asụsụ dị iche iche aka ka ha bata n’ọgbakọ Chineke ma soro ‘n’ezinụlọ’ ya. A na-akụzikwara ha Okwu Chineke. (Mat. 24:14; Mkpu. 22:17) Ma, ọ bụghị akwụkwọ niile e bipụtara ka e nwere n’asụsụ niile. Ọ bụghịkwa mmadụ niile na-enwetali akwụkwọ anyị ndị dị n’Ịntanet. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị enweghị vidio na akwụkwọ anyị ndị e tinyere naanị na jw.org. Ọ̀ pụtara na ụfọdụ Ndị Kraịst anaghị enwetacha ihe ga-eme ka okwukwe ha sie ike? Ihe ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a bụ ịza ajụjụ anọ dị mkpa.

1. Olee ihe bụ́ isi sekpụ ntị Jehova ji akụziri anyị ihe?

Mgbe Setan gwara Jizọs ka o mee ka nkume ghọọ achịcha, Jizọs gwara ya, sị: “Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.” (Mat. 4:3, 4) Ọ bụ na Baịbụl ka e dere okwu Jehova. (2 Pita 1:20, 21) N’ihi ya, Baịbụl bụ isi sekpụ ntị Jehova ji na-akụziri anyị ihe.—2 Tim. 3:16, 17.

Nzukọ Jehova ebipụtala Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ n’ihe karịrị otu narị asụsụ na iri abụọ. E nwere ma nke bụ́ naanị Akwụkwọ Nsọ Grik ma nke bụ́ Akwụkwọ Nsọ Hibru na Akwụkwọ Nsọ Grik. Kwa afọ, a na-ebipụtakwu ya n’asụsụ ndị ọzọ. E nwekwara ọtụtụ Baịbụl ndị ọzọ. E bipụtakwala ha ọtụtụ ijeri n’ọtụtụ puku asụsụ. Otú a e si nwee Baịbụl n’asụsụ dị iche iche dabara adaba n’ihi na Jehova chọrọ ka “a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:3, 4) Ebe ọ bụ na ‘ọ dịghị ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’anya Jehova,’ obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-akpọbata “ndị maara mkpa ime mmụọ ha” n’ọgbakọ ya, na-akụzikwara ha Okwu ya.—Hib. 4:13; Mat. 5:3, 6; Jọn 6:44; 10:14.

2. Gịnị mere o ji bụrụ na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl so ná nri ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-enye anyị?

Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ka okwukwe ya sie ike, ihe ọ ga-eme abụghị naanị ịna-agụ Baịbụl. O kwesịrị ịghọta ihe ọ gụrụ, na-emekwa ya eme. (Jems 1:22-25) N’oge ndịozi Jizọs, otu nwoke bụ́ onye Itiopia ghọtara na ya kwesịrị ime otú ahụ. Ọ nọ na-agụ Okwu Chineke mgbe Filip bụ́ onye na-ekwusa ozi ọma hụrụ ya ma jụọ ya, sị: “Ị̀ maara n’ezie ihe ị na-agụ?” Nwoke ahụ zara ya, sị: “N’ezie, olee otú m ga-esi mara, ma ọ bụrụ na mmadụ eduzighị m?” (Ọrụ 8:26-31) Filip nyeere ya aka ka ọ ghọta ihe ọ na-agụ. Ihe nwoke ahụ mụtara ruru ya n’obi, ya ekpebie ka e mee ya baptizim. (Ọrụ 8:32-38) Ọ bụ otú ahụ ka akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl si enyere anyị aka ka anyị ghọta eziokwu dị n’Okwu Chineke. Ihe anyị na-agụ na-eru anyị n’obi, na-emekwa ka anyị mee ihe anyị mụtara.—Kọl. 1:9, 10.

Akwụkwọ ndị a na-ebipụtara anyị so n’otú Jehova si enyeju anyị afọ. (Aịza. 65:13) Dị ka ihe atụ, a na-ebipụta Ụlọ Nche n’ihe karịrị narị asụsụ abụọ na iri. Ọ na-akọwa amụma ndị e buru na Baịbụl, na-enyere anyị aka ka anyị ghọta eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na Baịbụl, na-emekwa ka anyị na-eme ihe Chineke kwuru. A na-ebipụtakwa Teta! n’ihe dị ka otu narị asụsụ. Ọ na-eme ka anyị mụtakwuo gbasara ihe ndị mara mma Jehova kere, na-akụzikwara anyị otú anyị nwere ike isi mee ihe e kwuru na Baịbụl. (Ilu 3:21-23; Rom 1:20) Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-ebipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ihe karịrị narị asụsụ isii na iri asatọ. Ị̀ na-ewepụta oge agụ Baịbụl kwa ụbọchị? Ị̀ na-agụ Ụlọ Nche na Teta! ọ bụla e bipụtara? Ị̀ na-agụkwa akwụkwọ ọhụrụ niile e nwere n’asụsụ unu?

Nzukọ Jehova na-ebipụtakwara anyị ihe ndepụta ndị e ji ekwu okwu n’ọmụmụ ihe nakwa ná mgbakọ dị iche iche. Ị̀ na-anọ mgbe a na-ekwu okwu, mgbe a na-eme ihe nkiri na ihe ngosi nakwa mgbe a na-agba ndị mmadụ ajụjụ ọnụ? N’eziokwu, Jehova na-enyeju anyị afọ.—Aịza. 25:6.

3. Ọ bụrụ na e nweghị akwụkwọ anyị niile n’asụsụ unu, ọ̀ pụtara na Jehova anaghị enyeju gị afọ?

Azịza ya bụ mba. O kwesịghị iju anyị anya ma ọ bụrụ na e nwere ihe a kụziiri ụfọdụ ndị ohu Jehova a na-akụzighịrị ndị ọzọ. Ọ̀ bụ maka gịnị? Were ndịozi Jizọs dị ka ihe atụ. E nwere ihe ụfọdụ Jizọs kụziiri ha ọ na-akụzighịrị ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ. (Mak 4:10; 9:35-37) Ma, ọ pụtaghị na Jehova enyejughị ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ afọ. Jizọs kụziiri ha ihe ga-eme ka okwukwe ha sie ike.—Efe. 4:20-24; 1 Pita 1:8.

Anyị kwesịkwara icheta na mgbe Jizọs nọ n’ụwa, e nwere ọtụtụ ihe o kwuru na ọtụtụ ihe o mere a na-edeghị na Baịbụl. Jọn onyeozi dere, sị: “N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jizọs mere, bụ́ ndị, ọ bụrụ na e dee ha edee n’ụzọ zuru ezu, m chere na ụwa apụghị ịba akwụkwọ mpịakọta ndị e dere ha.” (Jọn 21:25) E nwere ọtụtụ ihe Ndị Kraịst mbụ ma gbasara Jizọs anyị na-amaghị. Ma, ọ pụtaghị na anyị amaghị ihe anyị kwesịrị ịma gbasara Jizọs. Jehova emeela ka anyị mata ihe niile anyị kwesịrị ịma gbasara Jizọs ka anyị nwee ike ịna-eso ụzọ ya.—1 Pita 2:21.

Ihe atụ ọzọ bụ akwụkwọ ozi ndị ahụ ndịozi degaara ọgbakọ Ndị Kraịst mbụ. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, e nwere otu akwụkwọ ozi Pọl dere a na-edeghị na Baịbụl. (Kọl. 4:16) Ebe ọ bụ na e deghị akwụkwọ ozi ahụ na Baịbụl, ọ̀ pụtara na Okwu Chineke a na-akụziri anyị ezughị ezu? Mba. Jehova ma ihe dị anyị mkpa. Ọ na-enyekwa anyị ihe niile ga-eme ka okwukwe anyị sie ike.—Mat. 6:8.

Jehova ma ihe dị anyị mkpa. Ọ na-enyekwa anyị ihe niile ga-eme ka okwukwe anyị sie ike

Taa, ụfọdụ ndị na-efe Jehova na-enweta ihe ndị e ji akụziri anyị Okwu Chineke karịa ndị ọzọ. Ọ̀ bụ naanị akwụkwọ anyị ole na ole ka e nwere n’asụsụ unu? Ya bụrụ otú ahụ, cheta na ihe gbasara gị na-emetụ Jehova n’obi. Na-amụ akwụkwọ anyị ndị e nwere n’asụsụ unu. Gbalịakwa na-aga ọmụmụ ihe n’asụsụ ị na-aghọta nke ọma. I mee otú ahụ, Jehova ga-eme ka okwukwe gị bụrụ a kwaa a kwụrụ.—Ọma 1:2; Hib. 10:24, 25.

4. Ọ bụrụ na ị naghị enweta ihe ndị anyị tinyere na jw.org, ọ̀ ga-eme ka okwukwe gị ghara isi ike?

E nwere Ụlọ Nche, Teta! na akwụkwọ anyị ndị ọzọ dị n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, nweekwa ihe ndị e tinyere maka ndị di na nwunye, ndị nne na nna, ndị na-eto eto, na ụmụaka. Ihe ndị a ga-abara mmadụ niile nọ n’ezinụlọ uru ma ọ bụrụ na ha ejiri ha na-enwe Ofufe Ezinụlọ. E nwekwara ihe ndị pụrụ iche a na-etinye n’ebe ahụ, dị ka Ememme Ngụcha Akwụkwọ Gilied na nnọkọ a na-enwe kwa afọ. Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka a na-akọ gbasara ụmụnna anyị ndị ọdachi dakwasịrị na ikpe ndị gbasara ụmụnna anyị. (1 Pita 5:8, 9) Ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet na-abakwa uru n’ozi ọma anyị na-ekwusa. O meela ka ozi ọma ruo ná mba dị iche iche ndị ọchịchị machibidoro Ndịàmà Jehova iwu.

Ma, ị ka nwere ike ime ka okwukwe gị sie ike ma ị̀ na-enwetali ihe ndị anyị na-edebe n’Ịntanet ma ọ bụ na ị naghị enweta ha. Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ebipụtala ọtụtụ akwụkwọ n’ihi na ha chọrọ ka Onye Kraịst ọ bụla na-amụta ihe ga-eme ka okwukwe ya sie ike. N’ihi ya, i kwesịghị iche na ị ga-azụrịrị ihe ị ga-eji na-aga n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet. Ụfọdụ ụmụnna nwere ike ịgwa ndị ọzọ ka ha gaa n’ebe ahụ ma bipụta ihe ụfọdụ a ga-enye ndị na-agaghị agali. Ma, e nyeghị ọgbakọ iwu ka ha na-eme otú ahụ.

Obi dị anyị ụtọ na Jizọs na-emezu nkwa ahụ o kwere na ya ga na-enye anyị ihe ndị ga-eme ka okwukwe anyị sie ike. Ka oge ikpeazụ a tara akpụ na-eru ọgwụgwụ ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga na-enye anyị ‘nri n’oge kwesịrị ekwesị.’