Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Jizọs gwara ndị Sadusii na ndị a kpọlitere n’ọnwụ “adịghị alụ nwunye, a dịghịkwa eke ha di.” (Luk 20:34-36) Ndị Jizọs na-ekwu banyere ha ọ̀ bụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha biri n’ụwa?
Ajụjụ a dị mkpa. Ndị ọ kacha gbasa bụ ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ. O nwere ike ịna-agụsi ha agụụ ike ka a kpọlite di ha ma ọ bụ nwunye ha n’ọnwụ n’ụwa ọhụrụ, ha na ya ebirikwa. Otu nwanna nwoke nwunye ya nwụrụ kwuru, sị: “Mụ na nwunye m ekpebighị na anyị agaghịzi ebi. Anyị chọsiri ike iji otu obi na-efe Jehova ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ otú a ka ọ ka dị m.” È nwere ihe kwesịrị ime ka mmadụ tụwa anya na ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha biri n’ụwa ga-alụ di ma ọ bụ nwunye? Anyị agaghị akọwali.
Ruo ọtụtụ afọ, e nweela ebe dị iche iche akwụkwọ anyị kwuru na o nwere ike ịbụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha biri n’ụwa ka Jizọs bu n’obi kwuo ihe ahụ o kwuru gbasara ịlụ di na nwunye na mbilite n’ọnwụ. Akwụkwọ anyị ekwuokwala na n’ụwa ọhụrụ, o yiri ka ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye. * (Mat. 22:29, 30; Mak 12:24, 25; Luk 20:34-36) Ọ bụ eziokwu na anyị ekwesịghị isi ọnwụ n’okwu a, ò nwere ike ịbụ na Jizọs na-ekwu banyere ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha gaa eluigwe? Ka anyị leba anya n’ihe ahụ Jizọs kwuru.
Ole ndị ka Jizọs na-agwa okwu mgbe o kwuru ihe ahụ? (Gụọ Luk 20:27-33.) Ọ bụ ndị Sadusii bụ́ ndị na-ekweghị ná mbilite n’ọnwụ. Ha chọrọ ịnwa Jizọs ọnwụnwa. Ọ bụ ya mere ha ji jụọ ya ajụjụ banyere mbilite n’ọnwụ na mmadụ ịlụ nwunye nwanne ya. * Jizọs sịrị ha: “Ụmụ nke usoro ihe a na-alụ nwunye, a na-ekekwa ha di, ma ndị a gụrụ ná ndị ruru eru inweta usoro ihe na-abịanụ na inweta mbilite n’ọnwụ adịghị alụ nwunye, a dịghịkwa eke ha di. N’eziokwu, ha apụghịkwa ịnwụ anwụ ọzọ, n’ihi na ha dị ka ndị mmụọ ozi, ha bụkwa ụmụ Chineke site n’ịbụ ụmụ nke mbilite n’ọnwụ.”—Luk 20:34-36.
Gịnị mere akwụkwọ anyị ji kwuo na o nwere ike ịbụ na Jizọs na-ekwu gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha biri n’ụwa? E nwere ihe abụọ mere o ji kwuo ya. Nke mbụ bụ na mgbe ahụ ndị Sadusii na-agwa Jizọs okwu, o nwere ike ịbụ na ha na-ekwu gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha biri n’ụwa. N’ihi ya, o yiri ka ọ̀ dabara adaba na otú Jizọs ga-esi zaa ha ajụjụ ahụ bụ ịgwa ha banyere ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha biri n’ụwa. Nke abụọ bụ na ihe ikpeazụ Jizọs gwara ha bụ gbasara Ebreham, Aịzik, na Jekọb. A ga-akpọlitekwa ha n’ọnwụ ka ha biri n’ụwa n’ihi na ha ji obi ha niile jeere Jehova ozi.—Luk 20:37, 38.
Ma, o nwere ike ịbụ na ndị Jizọs bu n’obi kwuo ihe ahụ bụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha gaa eluigwe. Gịnị mere anyị ji kwuo ya? Ka anyị leba anya n’ihe abụọ Jizọs kwuru.
“Ndị a gụrụ ná ndị ruru eru . . . inweta mbilite n’ọnwụ.” A gụrụ ndị e tere mmanụ ji obi ha niile na-efe Chineke “ná ndị ruru eru inweta alaeze Chineke.” (2 Tesa. 1:5, 11) Chineke kpọrọ ha ndị ezi omume n’ihi àjà Jizọs chụrụ. Ha nwụọ, ha anaghị abụ ndị mmehie Chineke mara ikpe. (Rom 5:1, 18; 8:1) A kpọrọ ndị e tere mmanụ ndị ‘obi ụtọ na ndị dị nsọ.’ Ha ruru eru ka Chineke kpọlite ha n’ọnwụ ka ha gaa eluigwe. (Mkpu. 20:5, 6) Ma, “ndị ajọ omume” so ná ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha biri n’ụwa. (Ọrụ 24:15) È nwere ike ikwu na ha “ruru eru” ka a kpọlite ha n’ọnwụ?
“Ha apụghịkwa ịnwụ anwụ ọzọ.” Jizọs asịghị: “Ha agaghị anwụ ọzọ.” Ihe o kwuru bụ: “Ha apụghịkwa ịnwụ anwụ ọzọ.” Ọ bụrụ na ndị e tere mmanụ ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, a na-akpọlite ha, ha agaa eluigwe. N’ebe ahụ, ha ga-abụ ndị na-anaghị anwụ anwụ. Ihe ọ pụtara bụ na ha ga-enwe ụdị ndụ a na-enweghị ike ibibi ebibi. (1 Kọr. 15:53, 54) O nweghị ihe ọnwụ ga-emeli ndị a kpọlitere ka ha gaa eluigwe. *
N’ihi ihe niile anyị tụlerela, gịnị ka e nwere ike ikwu? O nwere ike ịbụ na ọ bụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha gaa eluigwe ka Jizọs bu n’obi kwuo ihe ahụ o kwuru. Ọ bụrụ na ọ bụ ha ka o bu n’obi, e nwere ihe atọ anyị ga-aghọta gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha gaa eluigwe. Nke mbụ bụ na ha agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye. Nke abụọ abụrụ na ha enweghị ike ịnwụ anwụ. Nke atọ abụrụ na e nwere ike ikwu na ha dị ka ndị mmụọ ozi. Ma, ọ bụrụ na Jizọs na-ekwu gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha gaa eluigwe, e nwere ajụjụ ụfọdụ e kwesịrị ịza.
Nke mbụ, gịnị mere Jizọs ga-eji gwawa ndị Sadusii gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha gaa eluigwe ebe ọ bụ na o yiri ka ndị ha bu n’obi jụọ ya ajụjụ ahụ ọ̀ bụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha biri n’ụwa? Ọ bụghị mgbe niile ka Jizọs na-aza ndị iro ya ihe ha bu n’obi jụọ ya ajụjụ. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị Juu gwara Jizọs ka o gosi ha ihe ịrịba ama, Jizọs gwara ha, sị: “Kụtuonụ ụlọ nsọ a, n’ime ụbọchị atọ, m ga-ewu ya.” Ọ ga-abụ na Jizọs ma na ndị Juu ahụ chere na ya na-ekwu gbasara ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ma, ‘ụlọ nsọ Jizọs kwuru banyere ya bụ ahụ́ ya.’ (Jọn 2:18-21) O nwere ike ịbụ na Jizọs chere na ọ baghị uru ịza ndị Sadusii ahụ bụ́ ndị ihu abụọ ihe ahụ ha jụrụ ya ebe ọ bụ na ha ekweghị na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ nakwa na e nwere ndị mmụọ ozi. (Ilu 23:9; Mat. 7:6; Ọrụ 23:8) Kama, o yiri ka ọ̀ chọrọ ịgwa ndị na-eso ụzọ ya ihe ụfọdụ banyere ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha gaa eluigwe n’ihi na ha ga-emecha nwee olileanya ịga eluigwe.
Nke abụọ, gịnị mere ihe ikpeazụ Jizọs kwuru ji bụrụ gbasara Ebreham, Aịzik, na Jekọb ebe ọ bụkwanụ na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha biri n’ụwa? (Gụọ Matiu 22:31, 32.) Cheta na tupu Jizọs agwawa ha gbasara Ebreham, Aịzik, na Jekọb, o bu ụzọ kwuo, sị: “Banyere mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.” Ihe a o kwuru nwere ike igosi na o kwuchaala gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha gaa eluigwe, kwuwezie gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha biri n’ụwa. Jizọs ma na ndị Sadusii kweere n’ihe Mozis dere. Ọ bụ ya mere o ji kwuo ihe ahụ Chineke gwara Mozis n’ebe ahụ osisi ogwu na-ere ọkụ. Jizọs chọrọ ime ka ndị Sadusii ahụ mata na ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ ka ha biri n’ụwa so ná nzube Chineke.—Ọpụ. 3:1-6.
Nke atọ, ọ bụrụ na Jizọs na-ekwu gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha gaa eluigwe, ọ̀ pụtara na ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha biri n’ụwa ga-alụ di ma ọ bụ nwunye? Baịbụl azaghị ajụjụ a hoo haa. Ọ bụrụ na Jizọs na-ekwu gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha gaa eluigwe, ọ pụtara na ihe o kwuru egosighị ma ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha biri n’ụwa hà ga-alụ di ma ọ bụ nwunye n’ụwa ọhụrụ ma ọ bụ na ha agaghị alụ.
Ma, anyị ma na Baịbụl kwuru hoo haa na ọ bụ ọnwụ na-ekewa di na nwunye. N’ihi ya, ọ bụrụ na di mmadụ ma ọ bụ nwunye ya anwụọla, obi ekweghị ịna-ama ya ikpe ma ọ bụrụ na o kpebie ịlụ onye ọzọ. Ọ bụ ya ga-ekpebi ma ọ̀ ga-alụ onye ọzọ ma ọ bụ na ọ gaghị alụ. Ọ bụrụ na onye ahụ ekpebie ịlụ onye ọzọ, e kwesịghị ịkatọ ya.—Rom 7:2, 3; 1 Kọr. 7:39.
Anyị nwere ike inwe ọtụtụ ajụjụ gbasara otú ihe ga-adị n’ụwa ọhụrụ. Kama ikwuwe ihe na-edoghị anyị anya, ka anyị chere ruo mgbe ahụ. Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ bụrụ na anyị erubere Chineke isi, obi ga-adị anyị ụtọ n’ihi na ọ ga-egboro anyị mkpa anyị niile, meekwara anyị ihe niile anyị chọrọ.—Ọma 145:16.
^ para. 4 Gụọ Ụlọ Nche Bekee, June 1, 1987, peeji nke 30-31.
^ para. 5 N’oge ochie, ọ bụrụ na nwoke amụtaghị nwa nwoke tupu ya anwụọ, nwanne ya nwoke na-alụrụ nwunye ya ka o nwee ike ịmụta nwa nwoke ga na-aza aha nwanne ya ahụ nwụrụ anwụ.—Jen. 38:8; Diut. 25:5, 6.
^ para. 9 Ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha biri n’ụwa ga-enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ma, ọ pụtaghị na ha ga-enwe ụdị ndụ a na-enweghị ike ibibi ebibi. Ị chọọ ịmatakwu ihe dị iche n’anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi, gụọ Ụlọ Nche October 1, 1984, peeji nke 30-31.