Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ ‘Ghọtara Ihe Ọ Pụtara’?

Ị̀ ‘Ghọtara Ihe Ọ Pụtara’?

“O mepere obi ha nke ọma ka ha ghọta ihe Akwụkwọ Nsọ pụtara.”LUK 24:45.

1, 2. Olee otú Jizọs si mee ka obi sie ndị na-eso ụzọ ya ike n’ụbọchị a kpọlitere ya n’ọnwụ?

N’ỤBỌCHỊ a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya si Jeruselem na-aga otu obodo dị ihe dị ka kilomita iri na otu. Ha ka nọ na-eru uju n’ihi na ha amaghị na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ. Na mberede, Jizọs pụtara ma soro ha na-aga. Ọ kasiri ha obi. Olee otú o si mee ya? “Ọ kọwaara ha ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ dum banyere onwe ya, malite n’ihe Mozis dere ruo n’Akwụkwọ Ndị Amụma niile.” (Luk 24:13-15, 27) Obi kpooro ha ọkụ n’ihi na ‘ọ nọ na-akọwara ha Akwụkwọ Nsọ nke ọma.’Luk 24:32.

2 Ná mgbede ahụ, mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya laghachiri Jeruselem. Mgbe ha hụrụ ndịozi Jizọs, ha kọọrọ ha ihe merenụ. Ka ha nọ na-akọrọ ha ya, Jizọs pụtara n’ihu ha niile. Ma, ezigbo ụjọ bịara ndịozi ya, ha amalite iche ma onye ahụ ọ̀ bụkwa Jizọs. Olee otú Jizọs si mee ka obi sie ha ike? Baịbụl gwara anyị, sị: “O mepere obi ha nke ọma ka ha ghọta ihe Akwụkwọ Nsọ pụtara.”Luk 24:45.

3. Gịnị nwere ike ime ka obi jọọ anyị njọ n’ozi anyị na-ejere Jehova? Olee ihe ga-enyere anyị aka iji obi ụtọ na-eje ozi anyị?

3 Mgbe ụfọdụ, obi nwere ike ịdị anyị otú ahụ ọ dị ndị na-eso ụzọ Jizọs. N’agbanyeghị na anyị na-arụsi ọrụ Onyenwe anyị ike, obi nwere ike ịjọ anyị njọ ma ọ bụrụ na ndị mmadụ anaghị abata n’ọgbakọ. (1 Kọr. 15:58) Ma eleghị anya, ndị anyị na-amụrụ ihe anaghị enwe ezigbo ọganihu. Ụfọdụ ndị anyị na-enyere aka nwedịrị ike ịgbakụta Jehova azụ. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike iji obi ụtọ na-eje ozi anyị? Otu ihe ga-enyere anyị aka bụ ịghọta nke ọma ihe ihe atụ ndị Jizọs mere pụtara. Ka anyị leba anya n’atọ n’ime ha ma hụ ihe anyị nwere ike ịmụta na ha.

ỌGHA MKPỤRỤ NKE HIRI ỤRA

4. Gịnị ka ihe atụ Jizọs mere gbasara ọgha mkpụrụ nke hiri ụra pụtara?

4 Gụọ Mak 4:26-29. Gịnị ka ihe atụ a Jizọs mere gbasara ọgha mkpụrụ nke hiri ụra pụtara? Ọgha mkpụrụ ahụ nọchiri anya onye ọ bụla na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Mkpụrụ ahụ nọchiri anya ozi ọma a na-ezi ndị ji obi ha na-achọ eziokwu. Ọgha mkpụrụ ahụ mere ihe mmadụ niile na-eme, ya bụ, ‘o hiri ụra n’abalị ma bilie mgbe chi bọrọ.’ Mkpụrụ ahụ etoghị n’otu ntabi anya. O wetụrụ oge, malite n’ụbọchị a kụrụ ya ruo n’oge owuwe ihe ubi. N’oge ahụ, ‘mkpụrụ ndị ahụ pulitere ma too ogologo.’ Mkpụrụ ahụ pulitere “n’onwe ya,” jiri nwayọọ nwayọọ too. Ya wepụtachaa otu ihe, ọzọ esochie. Otú ahụkwa ka mmadụ si eji nwayọọ nwayọọ eme ka ya na Jehova dị ná mma. Ọ bụrụ na onye ahụ enwee ọganihu ma kpebie ijere Chineke ozi, ọ na-enyefe Jehova onwe ya, e mee ya baptizim. Ya esi otú ahụ gosi na ọ na-amị mkpụrụ.

5. Gịnị mere Jizọs ji mee ihe atụ gbasara ọgha mkpụrụ nke hiri ụra?

5 Gịnị mere Jizọs ji mee ihe atụ a? Jizọs chọrọ ka anyị ghọta na ọ bụ Jehova na-eme ka eziokwu Baịbụl too n’obi ‘ndị nwere ezi obi.’ (Ọrụ 13:48; 1 Kọr. 3:7) Anyị na-akụ mkpụrụ, na-agbakwa ya mmiri. Ma, uto ya adịghị anyị n’aka. Anyị agaghị amanyeli ya ito ma ọ bụ mee ka o too ngwa ngwa. Otú ahụ ọ dị nwoke ahụ Jizọs ji mee ihe atụ ka ọ dịkwa anyị. Anyị amaghị otú eziokwu Baịbụl si eto n’obi ndị mmadụ. Ọtụtụ mgbe, anyị anaghị ama na ọ na-eto n’obi onye ahụ, anyị ana-eme ihe ndị dịịrị anyị n’ụbọchị. Ma, ka oge na-aga, mkpụrụ a kụrụ n’obi onye ahụ na-amị mkpụrụ, onye ahụ aghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs ma soro anyị na-ewe ihe ubi.Jọn 4:36-38.

6. Gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta gbasara onye anyị na-amụrụ ihe?

6 Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe atụ a? Nke mbụ bụ na anyị kwesịrị ịghọta na ọganihu onye anyị na-amụrụ Baịbụl ga-enwe adịghị anyị n’aka. Ọ bụ eziokwu na anyị kwesịrị ịgba mbọ nyere ya aka, anyị ekwesịghị ịmanye ya ma ọ bụ nyewe ya nsogbu ka o mee baptizim. N’agbanyeghị na anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị nyere onye ahụ aka ma na-akwado ya, anyị ghọtara na ọ bụ onye ahụ ga-eji aka ya kpebie ma ọ̀ ga-enyefe Chineke onwe ya. Ụdị mkpebi ahụ ga-esi onye ahụ n’obi ma ọ bụrụ na ọ hụrụ Chineke n’anya. Ma ọ́ bụghị otú ahụ, Jehova agaghị anabata ya.Ọma 51:12; 54:6; 110:3.

7, 8. (a) Olee ihe ndị ọzọ anyị mụtara n’ihe atụ Jizọs mere gbasara ọgha mkpụrụ nke hiri ụra? Nye ihe atụ. (b) Gịnị ka ọ na-akụziri anyị gbasara Jehova na Jizọs?

7 Nke abụọ bụ na ọ bụrụ na anyị aghọta ihe mere Jizọs ji mee ihe atụ a, ọ ga-eme ka anyị ghara ịda mbà ma ọ bụrụ na ọ dị anyị ná mmalite ka o nweghị ihe anyị na-arụpụta n’ozi ọma anyị na-ekwusa. Anyị kwesịrị inwe ndidi. (Jems 5:7, 8) Ọ bụrụ na anyị emee ihe niile anyị nwere ike ime iji nyere onye anyị na-amụrụ Baịbụl aka, ma ya abụrụ na mkpụrụ anyị kụrụ n’obi ya amịghị mkpụrụ, ọ pụtaghị na anyị anaghị akụzi ihe nke ọma. Ndị Jehova na-ekwe ka mkpụrụ nke eziokwu too n’obi ha bụ naanị ndị dị umeala n’obi, ndị dịkwa njikere ịgbanwe àgwà ha. (Mat. 13:23) N’ihi ya, anyị ekwesịghị iche na ihe na-egosi na anyị na-eme nke ọma n’ozi anyị bụ mmadụ ole anyị nyeere aka ha emee baptizim. N’anya Jehova, ọ bụghị otú ndị mmadụ si nabata ihe anyị kụziiri ha na-egosi na anyị na-eme nke ọma. Kama, ọ bụ mbọ anyị na-agbasi ike n’ozi ya. Ọ naghị eji ya egwu egwu.Gụọ Luk 10:17-20; 1 Ndị Kọrịnt 3:8.

8 Ihe nke atọ bụ na ọ bụghị mgbe niile ka anyị na-ama otú ihe anyị na-akụzi si akpa ike n’obi mmadụ. Dị ka ihe atụ, e nwere di na nwunye onye ozi ala ọzọ na-amụrụ ihe. Ha bịara otu ụbọchị gwa ya na ha chọrọ ịbụ ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim. Onye ozi ala ọzọ ahụ gwara ha na ọ bụrụ na ha chọrọ ịbụ ndị nkwusa, ha ga-akwụsịgodị ịṅụ sịga. O juru ya anya mgbe ha gwara ya na ha akwụsịla ịṅụ sịga kemgbe ọtụtụ ọnwa. Gịnị mere ha ji kwụsị ịṅụ sịga? Ọ bụ n’ihi na ha ghọtara na ọ bụrụgodị na ha na-aṅụ sịga na nzuzo, Jehova ga-ahụ ha. Ọ kpọrọ ndị ihu abụọ asị. N’ihi ya, ha kpebiri na ọ bụrụ na ha agaghị aṅụli ya n’ihu onye ozi ala ọzọ ahụ, ọ ka mma ka ha kwụsị ya kpamkpam. Ihe mere ha ji kpebie ime ihe dị mma bụ na ha hụrụ Jehova n’anya n’agbanyeghị na onye ozi ala ọzọ ahụ amaghị na ha agbanweela.

ỤGBỤ

9. Gịnị ka ihe atụ Jizọs mere gbasara ụgbụ pụtara?

9 Gụọ Matiu 13:47-50. Gịnị ka ihe atụ a Jizọs mere gbasara ụgbụ pụtara? Jizọs ji ozi ọma Alaeze Chineke a na-ezi ndị mmadụ tụnyere nnukwu ụgbụ a wụnyere n’oké osimiri. Otú ahụ ụgbụ a wụnyere n’oké osimiri si ekpokọta “ụdị azụ̀ dị iche iche” ka ozi ọma anyị na-ekwusa si adọta ọtụtụ nde mmadụ, ya bụ, ụdị ndị dị iche iche. (Aịza. 60:5) Ihe gosiri na ọ bụ eziokwu bụ na ọtụtụ nde mmadụ na-abịa mgbakọ anyị na Ncheta Ọnwụ Jizọs kwa afọ. Ụfọdụ n’ime ha yiri azụ̀ “ndị dị mma.” Ha na-abata n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ma, e nwere ndị nke yiri azụ̀ “ndị na-adịghị mma.” Jehova anabataghị ha.

Ị gụchaa Matiu 13:47-50 . . .

10. Gịnị mere Jizọs ji mee ihe atụ gbasara ụgbụ?

10 Gịnị mere Jizọs ji mee ihe atụ a? Jizọs kwuru na a chịkọtara azụ̀ ndị dị mma iche, chịkọta ndị nke na-adịghị mma iche. Ihe ọ na-ekwu abụghị gbasara ikpe ikpeazụ a ga-ekpe ndị mmadụ n’oge oké mkpagbu. Kama, ọ na-ekwu gbasara ihe ndị ga-eme n’oge ikpeazụ nke ụwa ochie a. Ihe ahụ o kwuru gosiri na ọ bụghị ndị niile nwere mmasị n’eziokwu Baịbụl ga-ekpebi ife Jehova. Ọtụtụ ndị na-abịa ọmụmụ ihe anyị. E nwekwara ndị kwetara ka anyị na ha mụwa Baịbụl, ma ha achọghị inyefe Jehova onwe ha. (1 Eze 18:21) Ụfọdụ akwụsịdịla ịbịa ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. E nwere ndị na-eto eto ndị mụrụ ha bụ Ndịàmà Jehova. Ma, ha ahụghị Jehova n’anya n’eziokwu. Ihe Jizọs kwuru gosiri na mee elu mee ala, onye ọ bụla ga-eji aka ya kpebie ihe ọ ga-eme. Ọ bụrụ na anyị emee ihe dị Jehova mma, ọ ga-ewere anyị ka “ihe a na-achọsi ike nke mba niile.”Hag. 2:7.

. . . tụlee otú o si gbasa oge anyị a

11, 12. (a) Gịnị ka anyị mụtara n’ihe atụ Jizọs mere gbasara ụgbụ? (b) Gịnị ka ọ na-akụziri anyị gbasara Jehova na Jizọs?

11 Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe atụ a Jizọs mere gbasara ụgbụ? Ọ bụrụ na anyị aghọta ihe mere Jizọs ji mee ihe atụ a, ọ ga-eme ka anyị ghara inwebiga mwute ókè ma ọ bụrụ na onye anyị na-amụrụ ihe ma ọ bụ nwa anyị achọghị ife Jehova. Ụdị ihe a nwere ike ime n’agbanyeghị mbọ niile anyị gbara. Mmadụ nwere ike ikwe ka a mụwara ya Baịbụl ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ndị mụrụ ya bụ Ndịàmà Jehova. Ma, ọ pụtaghị na onye ahụ aghọọla enyi Jehova. Ọ bụrụ na onye ahụ ekweghị erubere Jehova isi, o nweghị otú ọ ga-esi soro ná ndị Chineke.

Ụfọdụ ndị nwere mmasị n’eziokwu ga-ekpebi ife Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 ruo nke 12)

12 Ọ̀ pụtara na mmadụ hapụ ọgbakọ, a gaghị ekwe ya bata ọzọ? Ka ọ̀ pụtara na ọ bụrụ na mmadụ enyefebeghị Jehova onwe ya, a ga-ewere onye ahụ ka azụ̀ “na-adịghị mma” ruo mgbe ebighị ebi? Mba. Onye ahụ ka nwere ike ịghọ enyi Jehova tupu oké mkpagbu amalite. Jehova gwara ụdị ndị ahụ, sị: “Lọghachikwutenụ m, m ga-alọghachikwutekwa unu.” (Mal. 3:7) Jizọs mere ka ihe a doo anya n’ihe atụ ọzọ o mere, ya bụ, ihe atụ gbasara nwa mmefu.Gụọ Luk 15:11-32.

NWA MMEFU

13. Gịnị ka ihe atụ Jizọs mere gbasara nwa mmefu pụtara?

13 Gịnị ka ihe atụ Jizọs mere gbasara nwa mmefu pụtara? Nna ahụ nwere obiọma Jizọs kwuru okwu ya nọchiri anya Jehova, bụ́ Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya. Nwa ya nke kwuru ka e nye ya ihe nketa nke ya ma mechaa gaa mefusịa ya nọchiri anya ndị si n’ọgbakọ pụọ. Ọ dị ka à ga-asị na ha gara “mba ọzọ nke dị anya,” ya bụ, ụwa Setan nke gbakụtara Jehova azụ. (Efe. 4:18; Kọl. 1:21) Anya na-emecha doo ụfọdụ n’ime ha, ha alọghachi n’ọgbakọ n’agbanyeghị na ọ dịghị mfe. Jehova na-anabata ndị a dị umeala n’obi chegharịrịnụ ma gbaghara ha.Aịza. 44:22; 1 Pita 2:25.

14. Gịnị mere Jizọs ji mee ihe atụ gbasara nwa mmefu?

14 Gịnị mere Jizọs ji mee ihe atụ a? Jizọs ji ya gosi na Jehova chọrọ ka ndị hapụrụ ya lọghachikwute ya. O nweghị mgbe nwoke ahụ Jizọs kwuru okwu ya kwụsịrị ịtụ anya na nwa ya ga-alọta. Ọ hụrụ nwa ya “mgbe ọ ka nọ n’ebe dị anya” ma gbara ọsọ gaa nabata ya. Ihe atụ a kwesịrị ime ka ndị si n’ọgbakọ pụọ gbalịa lọghachi ozugbo. O nwere ike ịbụ na ha na Jehova adịtụdịghị ná mma. Ihere nwere ike ịna-eme ha. O nwekwara ike isiri ha ike ịlọghachi. Ma, mbọ ọ bụla ha ga-agba ka ha lọghachi agaghị efu ọhịa. Ọ ga-eme ka obi dị Jehova, Jizọs, na ndị mmụọ ozi ụtọ.Luk 15:7.

15, 16. (a) Olee ihe ndị anyị mụtara n’ihe atụ Jizọs mere gbasara nwa mmefu? Nye ihe atụ. (b) Gịnị ka ọ na-akụziri anyị gbasara Jehova na Jizọs?

15 Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe atụ Jizọs mere gbasara nwa mmefu? Anyị kwesịrị inwe ịhụnanya otú ahụ Jehova nwere. Ọ bụrụ na mmadụ alọghachite n’ọgbakọ, anyị ekwesịghị ‘ịbụ ndị ezi omume gabiga ókè’ ma jụ ịnabata ya. Anyị mee otú ahụ, ọ ga-eme ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. (Ekli. 7:16) Ihe ọzọ anyị ga-amụta n’ihe a bụ na anyị kwesịrị iwere onye pụrụ n’ọgbakọ ka “atụrụ furu efu.” Anyị ekwesịghị iche na nke ya agwụla. (Ọma 119:176) Ọ bụrụ na anyị ahụ onye hapụrụ ọgbakọ, ànyị ga-eji obiọma nyere ya aka ka o nwee ike ịlọghachi? Ànyị ga-agwa ndị okenye ozugbo ka ha nyere ya aka? Anyị ga-eme otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị ghọtara ihe atụ ahụ Jizọs mere gbasara nwa mmefu ma na-eme ihe anyị mụtara na ya.

16 Taa, e nwere ndị yiri nwa mmefu. Ụfọdụ n’ime ha kwuru ihe gosiri na obi dị ha ụtọ maka otú Jehova si meere ha ebere nakwa otú ọgbakọ si hụ ha n’anya ma nyere ha aka. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna nwoke a chụrụ n’ọgbakọ, ya anọọ iri afọ abụọ na ise tupu ya alọghachi. O kwuru, sị: “M na-enwekwu obi ụtọ kemgbe a nabatara m n’ọgbakọ n’ihi na Jehova emeela ka m ‘nweta ume.’ (Ọrụ 3:19) Ụmụnna niile hụrụ m n’anya, na-enyekwara m aka. Eweere m ndị mụ na ha nọ n’ọgbakọ ka ndị ezinụlọ m ugbu a.” Mgbe otu nwanna nwaanyị ka na-eto eto pụrụ n’ọgbakọ, o were ya afọ ise tupu ya alọghachi. O kwuru, sị: “E gosiri m ụdị ịhụnanya ahụ Jizọs kwuru okwu ya. Otú o mere ka obi dị m abụghị ihe e ji ọnụ akọ. O nweghị ihe karịrị ịnọ ná nzukọ Jehova.”

17, 18. (a) Olee ihe ndị anyị mụtara n’ihe atụ atọ ndị anyị tụlere? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

17 Olee ihe ndị anyị mụtara n’ihe atụ atọ a Jizọs mere? Nke mbụ bụ na anyị aghọtala na ọganihu onye anyị na-amụrụ Baịbụl ga-enwe adịghị anyị n’aka. Ọ bụ Jehova ka ọ dị n’aka. Nke abụọ bụ na anyị ekwesịghị ịtụ anya na ndị niile na-abịa ọmụmụ ihe na ndị niile anyị na-amụrụ ihe ga-emecha kpebie ife Jehova. Nke ikpeazụ bụ na ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị nwere ike isi n’ọgbakọ pụọ ma gbakụta Jehova azụ, ka anyị ghara iche na ha agaghị alọghachi. Ọ bụrụ na ha alọghachi, ka anyị nabata ha ma gosi na anyị nwere ụdị ịhụnanya ahụ Jehova nwere.

18 Ka onye ọ bụla n’ime anyị na-achọ ihe ọmụma, nghọta, na amamihe. Mgbe anyị na-agụ gbasara ihe atụ ndị ahụ Jizọs mere, ka anyị jụọ onwe anyị, sị: ‘Gịnị ka ihe atụ a pụtara? Gịnị mere e ji dee ya na Baịbụl? Olee otú m ga-esi mee ihe m mụtara na ya? Gịnị ka ọ na-akụziri m gbasara Jehova na Jizọs? Anyị mee otú ahụ, ọ ga-egosi na anyị ghọtara ihe okwu Jizọs pụtara n’eziokwu.