Ì Chetara?
Ì wetuola obi gụọ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:
È Kwesịrị Ịkpọ Ozu Ndị Kraịst Ọkụ?
Ọ bụ mmadụ ga-ekpebi ma à ga-akpọ ozu ya ọkụ ma ọ bụ na a gaghị akpọ ya. Ọ bụ eziokwu na Baịbụl ekwughị ma ịkpọ ozu ọkụ ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ, anyị kwesịrị icheta na a kpọrọ ozu Eze Sọl na ozu Jọnatan nwa ya ọkụ ma lie ha. (1 Sam. 31:
Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na ọ bụghị Chineke na-akpata ihe ọjọọ ndị na-emenụ?
Chineke bụ onye ezi omume n’ụzọ ya niile. Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi, kwesị ntụkwasị obi, bụrụkwa onye ziri ezi. Jehova nwere obi ọmịiko, na-emekwa ebere. (Diut. 32:4; Ọma 145:17; Jems 5:11)
Olee nsogbu ndị chọrọ ịga jee ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa nwere ike inwe?
Atọ n’ime ha bụ (1) otú ihe dị n’ebe ahụ nwere ike ịdị iche n’otú ọ dị n’ebe ha si, (2) ịhụ ndị ezinụlọ ha ga na-agụ ha agụụ, (3) imete ụmụnna ndị ebe ahụ enyi nwere ike ịna-esiri ha ike. Jehova agọziela ọtụtụ ndị na-ekweghị ka nsogbu ndị a mee ka ha daa mbà.
Gịnị mere ụmụnne Josef ji kpọọ ya asị?
Otu ihe kpatara ya bụ na Jekọb meere Josef ihe pụrụ iche. Ọ kwaara ya uwe pụrụ iche. N’ihi ya, ụmụnne Josef malitere inwere ya anyaụfụ ma ree ya ka ọ gaa gbawa ohu.
Gịnị mere traktị ndị ahụ e bipụtara ọhụrụ ji aba ezigbo uru, dịkwa mfe iji ha akụzi ihe?
Otú e si hazie ha niile bụ otu. Na traktị nke ọ bụla, e dere amaokwu Baịbụl anyị nwere ike ịgụrụ mmadụ na ajụjụ anyị nwere ike ịjụ ya. Ihe ọ bụla ọ zara, anyị nwere ike imepe traktị ahụ ma gosi ya ihe Baịbụl kwuru. Anyị nwekwara ike igosi ya ajụjụ anyị na ya ga-atụle ma anyị bịa nletaghachi.
Gịnị bụ Peshitta Siriak?
Siriak bụ otu n’ime olumba ndị si n’asụsụ Arameik. A malitere ịsụ ya na ide ya n’ebe dị iche iche n’agbata afọ 100 na afọ 300. Ọ dị ka ọ̀ bụ Siriak bụ asụsụ mbụ a sụgharịrị ụfọdụ akwụkwọ dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik. Ọ bụ Baịbụl a e dere n’asụsụ Siriak ka e mechara kpọwa Peshitta.
Gịnị ka ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ga-eme ka ha nwee ike ịzụ ụmụ ha?
Ha kwesịrị ịna-ege ha ntị ka ha nwee ike ịmara ha nke ọma. Ha kwesịrị ịgba mbọ na-akụziri ha Okwu Chineke, jirikwa obiọma na-eduzi ha, dị ka ihe atụ, ma ọ bụrụ na ha na-enwe obi abụọ ma ihe nzukọ Jehova na-akụzi ọ̀ bụ eziokwu.
Olee ihe ndị na-agaghịzi adị mgbe Alaeze Chineke ga-abịa?
Ọrịa, ọnwụ, enweghị ọrụ, agha, ụkọ nri, na ịda ogbenye agaghịzi adị.
Olee ọgbụgba ndụ Baịbụl kwuru gbasara ya, nke ga-eme ka ndị ọzọ soro Kraịst chịa?
Mgbe Jizọs malitechara Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, ya na ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi gbara ndụ. A na-akpọ ya ọgbụgba ndụ Alaeze. (Luk 22:
Olee ihe abụọ a kọrọ na Baịbụl gosiri na Setan bụ onye dị adị?
Akwụkwọ Nsọ kwuru na Setan gwara Jizọs okwu iji nwaa ya. N’oge Job, Setan na Chineke kwurịtara okwu. Ihe ndị a Baịbụl kọrọ gosiri na Setan bụ onye dị adị.
Ole ndị bụ ndị ahụ Jems kwuru na ‘Chineke wepụtaara aha ya’ n’Ọrụ Ndịozi 15:14?
Ha bụ Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu na ndị mba ọzọ, bụ́ ndị Chineke mere ka ha bụrụ agbụrụ a họọrọ, ‘ka ha wee kwusaa n’ebe niile ịdị mma’ nke onye ahụ kpọrọ ha. (1 Pita 2:
Olee ebe bụ́ Timgad? Olee ụdị echiche ụfọdụ ndị ebe ahụ nwere?
Timgad bụ nnukwu obodo ndị Rom rụrụ n’Ebe Ugwu Afrịka n’oge ochie, n’ebe bụ́ Ọljirịa ugbu a. Ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie gwutere otu ihe gosiri ụdị echiche ụfọdụ ndị ebe ahụ nwere. Ihe e dere na ya bụ: “Ịchụ nta, ịsa ahụ́, igwuri egwu, ịchị ọchị, ọ bụ ihe ndị a bụ na mmadụ dị ndụ.” Ụdị echiche ahụ yiri ihe e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 15:32.