Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Kwesịrị Ịgbanwe Obi Gị?

Ì Kwesịrị Ịgbanwe Obi Gị?

KA E were ya na ụfọdụ ndị na-eto eto bụ́ Ndịàmà Jehova kpebiri ịga lee otu fim. Ha nụrụ na ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ibe ha agaala lee ya nakwa na ọ tọrọ ha ụtọ. Mgbe ha ruru ebe ha ga-ele ya, ha lere anya na foto ndị e ji kọwaa otú fim ahụ ga-adị. Ihe ha hụrụ bụ ụdị ngwá ọgụ dị iche iche na ụmụ nwaanyị ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ha gba ọtọ. Gịnị ka ha ga-eme? Hà ga-aba lewe fim ahụ?

Ihe atụ a gosiri na kwa ụbọchị, anyị na-eme mkpebi ndị nwere ike ime ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma ma ọ bụkwanụ mee ka anyị na ya ghara ịdị ná mma. Mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịchọ ime ihe, ma mgbe i chebaara ya echiche, gị agbanwee obi, mee ihe dị iche. Ọ̀ pụtara na ị maghị ihe ị ga-eme eme? Ka ime otú ahụ ọ̀ dị mma?

Mgbe Ị Na-ekwesịghị Ịgbanwe Obi Gị

Anyị hụrụ Jehova n’anya. Ọ bụ ya mere anyị ji nyefee ya onwe anyị, e meekwa anyị baptizim. Anyị kwere ya nkwa na anyị ga-eji obi anyị niile na-ejere ya ozi, chọọkwa imezu nkwa a anyị kwere ya. Ma, onye iro anyị bụ́ Setan bụ́ Ekwensu ga-eme ike ya niile ka anyị kwụsị ijere Chineke ozi. (Mkpu. 12:17) Anyị kpebiri ijere Jehova ozi na irubere ya isi. Ọ ga-ajọgbu onwe ya ma ọ bụrụ na anyị agbanwee obi anyị, ghara imezu nkwa anyị kwere Jehova mgbe anyị na-enyefe ya onwe anyị. O nwere ike ịta isi anyị.

Ihe karịrị puku afọ abụọ na narị afọ isii gara aga, Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn rụrụ nnukwu ihe oyiyi ọlaedo ma nye iwu ka onye ọ bụla kpọọrọ ya isiala. O kwuru na a ga-atụba onye ọ bụla na-emeghị otú ahụ n’ime oké ọkụ. Ma, ụmụ okorobịa atọ bụ́ Shedrak, Mishak, na Abednego na-efe Jehova, na-atụkwa egwu ya. Ha jụrụ ime ihe a eze kwuru. N’ihi ya, a tụbara ha n’oké ọkụ ahụ. Ma, Jehova rụrụ ọrụ ebube chebe ha. Ha dịdị njikere ịnwụ kama inupụrụ Chineke isi.Dan. 3:1-27.

Mgbe e mechara, Daniel onye amụma akwụsịghị ikpesi ekpere ike n’agbanyeghị na ọ ma na a ga-atụba ya n’olulu ọdụm ma ọ bụrụ na ndị ọzọ ahụ ya. Ọ kwụsịghị ikpegara Jehova ekpere ugboro atọ n’ụbọchị otú ọ na-emebu. Daniel onye amụma ka kpebisiri ike ịna-efe ezi Chineke. N’ihi ya, Chineke napụtara ya “n’aka ọdụm.”Dan. 6:1-27.

Taa, ndị ohu Chineke na-emezukwa nkwa ha kwere Jehova mgbe ha nyefere ya onwe ha. N’otu ụlọ akwụkwọ dị n’Afrịka, ụmụ akwụkwọ bụ́ Ndịàmà Jehova jụrụ ikele ọkọlọtọ. E yiri ha egwu na a ga-achụ ha n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụrụ na ha esoghị ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ mee otú ahụ. N’oge na-adịghị anya, minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ bịara n’ebe ahụ ma gwa ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ndị ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova okwu. Ha weturu obi ma jiri obi ike gwa ya ebe ha kwụ. Kemgbe ahụ, e kwutebeghị okwu ya ọzọ. Ha gaa ụlọ akwụkwọ, o nweghịzi onye na-enye ha nsogbu ka ha nupụrụ Jehova isi.

Onye ọzọ bụ otu nwanna nwoke aha ya bụ Joseph. Nwunye ya rịara ọrịa kansa ma nwụọ na mberede. Ndị ezinụlọ Joseph enyeghị ya nsogbu n’ihi na ha ghọtara otú Ndịàmà Jehova si eli ozu. Ma, ndị ezinụlọ nwunye ya abụghị Ndịàmà Jehova. Ha chọrọ ka e mee ihe ụfọdụ Jehova kpọrọ asị. Joseph kwuru, sị: “Mgbe ha chọpụtara na ekweghị m eme ihe ndị ahụ, ha gbara mbọ ka ha nweta ụmụ m. Ma, ụmụ m niile jụrụ ime ihe ha kwuru. Ha chọkwara ka anyị mụọrọ ya anya abalị n’ụlọ m. Ma, m gwara ha na ọ bụrụ na ha kpebiri na ha ga-amụrịrị anya abalị, ọ gaghị abụ n’ụlọ m. Ha ma na mụ na nwunye m kweere na ịmụ anya abalị adịghị mma. Mụ na ha kwutere ya aka. Mgbe anyị kwuchara, ha gara nọrọ ebe ọzọ mee ya.

“N’oge ahụ ihe siri ezigbo ike, m rịọrọ Jehova ka o nyere mụ na ezinụlọ m aka ka anyị ghara imebi iwu ya. Ọ zara ekpere m ma nyere anyị aka ka okwukwe anyị sie ike n’agbanyeghị nsogbu niile e nyere anyị.” O nweghị mgbe Joseph na ụmụ ya chetụrụ n’echiche ịgbanwe obi ha ma mee ihe na-ekwesịghị ekwesị.

Mgbe I Nwere Ike Ịgbanwe Obi Gị

Obere oge e mechara Ememme Ngabiga n’afọ 32, otu nwaanyị si n’obodo Finishia nke dị na Siria bịakwutere Jizọs Kraịst mgbe ọ nọ na Saịdọn. Ọ rịọrọ Jizọs ugboro ugboro ka ọ chụpụ mmụọ ọjọọ na-enye nwa ya nwaanyị nsogbu. Ná mmalite, Jizọs azaghị ya ihe ọ bụla. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “E ziteghị m ijekwuru ndị ọ bụla ma ọ́ bụghị atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel.” Ma, ọ kwụsịghị ịrịọ Jizọs ihe ọ na-arịọ ya. N’ihi ya, Jizọs gwara ya, sị: “O zighị ezi iwere nri ụmụaka tụpụrụ ụmụ nkịta.” Nwaanyị ahụ mere ihe gosiri na okwukwe ya siri ezigbo ike. Ọ zara Jizọs, sị: “Ee, Onyenwe anyị; ma n’ezie, ụmụ nkịta na-eri irighiri ihe na-esi na tebụl nna ha ukwu na-adapụsị.” Jizọs gbanwere obi ya ma chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ na-enye nwa nwaanyị ahụ nsogbu.Mat. 15:21-28.

Otú ahụ Jizọs si gbanwee obi ya gosiri na ọ na-eme ka Jehova. Dị ka ihe atụ, Chineke chọrọ ikpochapụ mba Izrel mgbe ha kpụrụ nwa ehi ọlaedo. Ma, mgbe Mozis rịọrọ ya ka ọ ghara igbu ha, ọ gbanwere obi ya.Ọpụ. 32:7-14.

Pọl onyeozi mere ka Jehova na Jizọs. Mgbe ọ gara ozi ala ọzọ mbụ ya, Mak hapụrụ ya na Banabas lawa. N’ihi ya, Pọl achọghị ịkpọ Mak aga ebe ọzọ. Ma mgbe e mechara, ọ ga-abụ na Pọl chọpụtara na Mak agbanweela nakwa na ọ ga-arụrụ ya ọrụ bara uru. N’ihi ya, Pọl gwara Timoti, sị: “Kpọrọ Mak ka gị na ya bịa, n’ihi na ọ baara m uru maka ije ozi.”2 Tim. 4:11.

Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe a niile? N’agbanyeghị na Jehova zuru okè, ọ na-agbanwe obi ya mgbe ụfọdụ n’ihi na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, na-eme ebere, na-enwekwa ndidi. Ma anyịnwa ezughị okè. Ọ bụghịkwa mgbe niile ka anyị na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. N’ihi ya, o kwesịrị imekwu ka anyị na-agbanwe obi anyị mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịgbanwe otú anyị si ele ndị ọzọ anya ma ọ bụrụ na anyị aghọtakwuo otú ihe si dịrị ha.

O nwere ike ịdị mkpa ka anyị gbanwee obi anyị mgbe anyị na-eche ihe anyị ga-eme gbasara ofufe Jehova. Ụfọdụ ndị anyị na ha na-amụ Baịbụl na ndị na-abịa ọmụmụ ihe nwere ike ha achọbeghị ka e mee ha baptizim. E nwekwara ụfọdụ ụmụnna na-egbu oge ịbụ ndị ọsụ ụzọ n’agbanyeghị na ha ga-emeli ya. O nwekwara ike ịbụ na nwanna nwoke achọghị iru eru ka a họpụta ya ka ọ bụrụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi n’ọgbakọ. (1 Tim. 3:1) Ò nwetụla mgbe ọ dị gị otú a? Ì chere na ị ga-agbanweli obi gị? Jehova ji obiọma na-agwa gị ka ị rụọ ihe ndị a ma jiri obi ụtọ na-ejere ya na ndị ọzọ ozi.

Ịgbanwe obi gị nwere ike ịbara gị uru

E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Ella. Ọ na-eje ozi n’otu alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Afrịka. O kwuru, sị: “Mgbe m bịara Betel ọhụrụ, amaghị m ma m̀ ga-anọte aka. Achọrọ m iji obi m niile jeere Jehova ozi. Ma, ndị ezinụlọ anyị anaghị apụ m apụ n’obi. Ná mmalite, ọ dị m ka ọ̀ bụ m lakwuru ndị ezinụlọ anyị. Ma, onye mụ na ya bi n’ụlọ gbara m ume, mụ ekpebizie ịnọwa. Anọọla m afọ iri na Betel. Ma, m ka chọrọ ịnọ na Betel na-ejere ụmụnna m ozi ruo mgbe ọ bụla ike kwere m.”

Mgbe I Kwesịrị Ịgbanwe Obi Gị

Ì chetara ihe mere Ken mgbe ọ malitere inwere nwanne ya nwoke anyaụfụ ma wee iwe dị ọkụ? Chineke gwara nwoke a ọnụma juru obi na ya ga-ebuli ya elu ma ọ bụrụ na ọ gbanwee mewe ezi ihe. Chineke gwara ya ka ọ gbalịa merie mmehie nke “makpu n’ọnụ ụzọ.” Ken kwesịrị ịgbanwe àgwà ya na obi ya. Kama ime otú ahụ, o leghaara ihe Chineke gwara ya anya. Ọ dị mwute na Ken gburu nwanne ya ma ghọọ onye mbụ gburu ọchụ.Jen. 4:2-8.

Gịnị gaara eme ma a sị na Ken gbanwere obi ya?

Anyị nwekwara ike ịmụta ihe n’ihe Baịbụl kọrọ gbasara Eze Ọzaya. Ná mmalite, o rubeere Jehova isi, ya na ya dịkwa n’ezigbo mma. Ma, ọ dị mwute na Ọzaya mechara ghọọ onye mpako. N’agbanyeghị na ọ bụghị onye nchụàjà, ọ bara n’ụlọ nsọ ka ọ chụọ àjà. Mgbe ndị nchụàjà gwara ya ka ọ ghara ịchụ àjà ahụ, ọ̀ gbanwere obi ya? Mba. “Ọzaya were oké iwe.” O geghịkwa ha ntị. N’ihi ya, Jehova tiri ya ekpenta.2 Ihe 26:3-5, 16-20.

Taa, e nwere mgbe ụfọdụ anyị kwesịrị ịgbanwe obi anyị. Were Joachim dị ka ihe atụ. E mere ya baptizim n’afọ 1955. Ma, n’afọ 1978, a chụrụ ya n’ọgbakọ. Mgbe ihe karịrị iri afọ abụọ gara, ọ gbanwere àgwà ọjọọ ọ na-akpa, chegharịa, a nabatakwa ya n’ọgbakọ. N’oge na-adịbeghị anya, otu okenye jụrụ ya ihe mere o ji chere ruo ogologo oge tupu ya arịọ ka a nabata ya. Joachim zara, sị: “N’oge ahụ, iwe ji m, m dịkwa mpako. Ọ na-ewute m na m nọrọ ọdụ tupu mụ alọghachi. Mgbe ahụ a chụrụ m n’ọgbakọ, m ma na ọ bụ Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu.” Ọ matara na ya kwesịrị ịgbanwe àgwà ya ma chegharịa.

Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị gbanweekwa obi anyị na àgwà anyị. Ka anyị gbaa mbọ mee otú ahụ. Anyị mee ya, obi ga-adị Jehova ụtọ.Ọma 34:8.