Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ “Maara Ụzọ”

Ọ “Maara Ụzọ”

GUY HOLLIS PIERCE, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, jechara ozi ya n’ụwa na Tuzdee, abalị iri na asatọ n’ọnwa atọ n’afọ 2014. O nwere olileanya na ya ga-eso n’ụmụnna Kraịst a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha gaa eluigwe. Ọ dị iri afọ asaa na itoolu mgbe olileanya ahụ mezuru.Hib. 2:10-12; 1 Pita 3:18.

A mụrụ Guy Pierce n’abalị isii n’ọnwa itoolu n’afọ 1934 n’obodo Ọbọn dị na Kalịfọnịa, n’Amerịka. E mere ya baptizim n’afọ 1955, ya alụọ Penny bụ́ ezigbo nwunye ya n’afọ 1977. Ha mụkwara ụmụ. Ezinụlọ o nwere mere ka ọ na-akpa àgwà ka nna. Ya na nwunye ya malitere ịsụ ụzọ n’afọ 1982. N’afọ 1986, ọ ghọrọ onye nlekọta sekit n’Amerịka. Ọ rụrụ ọrụ a afọ iri na otu.

N’afọ 1997, ya na nwunye ya bidoro ije ozi na Betel dị n’Amerịka. Nwanna Pierce rụrụ ọrụ na Ngalaba Ije Ozi. N’afọ 1998, a họpụtara ya ka o soro ná ndị na-enyere Kọmitii Na-ahụ Maka Ndị Na-arụ Ọrụ na Betel aka. N’abalị abụọ n’ọnwa iri n’afọ 1999, a mara ọkwa ná nnọkọ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania na-enwe kwa afọ na a họpụtala ya ka o soro n’Òtù Na-achị Isi. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, o jere ozi na Kọmitii Na-ahụ Maka Ndị Na-arụ Ọrụ na Betel, Kọmitii Ide Ihe, Kọmitii Mbipụta nakwa na Kọmitii Na-ahaziri Òtù Na-achị Isi Ọrụ.

Ụdị ndị dị iche iche na ndị si n’ebe dị iche iche na-akpa ya nso n’ihi na ihu na-abụ ya ọchị ọchị. Ọ bụkwa onye egwuregwu. Ma, ihe ndị kacha mee ka ihe ya masị ndị mmadụ bụ na ọ hụrụ ha n’anya, dịrị umeala n’obi, na-akwanyere iwu Jehova ùgwù, nweekwa okwukwe siri ike na Jehova. Obi siri Nwanna Pierce ike na o nweghị ihe ga-eme ka nkwa Jehova ghara imezu. Ọ chọkwara ịkọrọ ya ụwa niile.

Ike anaghị agwụ Nwanna Pierce n’ọrụ ọ na-arụrụ Jehova. Ọ na-ebido n’isi ụtụtụ rụgide ọrụ ruo n’abalị. Ọ gara ebe dị iche iche n’ụwa gbaa ụmụnna ume. N’agbanyeghị ọrụ niile ọ na-arụ, ọ na-ewepụta oge ka ya na ndị na-eje ozi na Betel na ndị ọzọ nọrịa. Ọ na-enye ha ndụmọdụ, na-enyekwara ha aka. Ụmụnna ndị ma ya kemgbe ọtụtụ afọ ka na-echeta otú ha na ya si dị n’ezigbo mma, otú o si ele ndị mmadụ ọbịa, na otú o si eji Baịbụl agba ha ume.

Ndị na-eru uju ọnwụ ya bụ nwunye ya, ụmụ isii ha nwere, ụmụ ụmụ ya, na ụmụ ụmụ ụmụ ya. E nwekwara ọtụtụ ndị ọ mụụrụ Baịbụl na ndị weere ya ka nna ha. E kwuru okwu olili ozu Nwanna Pierce na Satọdee, abalị iri abụọ na abụọ n’ọnwa atọ n’afọ 2014 na Betel dị na Bruklin. Ọ bụ Nwanna Mark Sanderson, onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru ya. O kwuru ọtụtụ ihe gbasara Nwanna Pierce, kwuokwa na o nwere olileanya ịga eluigwe. Ọ gụkwara Jọn 14:2-4, bụ́ ebe Jizọs kwuru, sị: “N’ụlọ Nna m, ọtụtụ ebe obibi dị. . . . Ọ bụrụkwa na mụ agaa kwadebere unu ebe, m ga-abịa ọzọ, mụ onwe m ga-anabatakwa unu n’ebe obibi m, ka unu wee nọrọkwa n’ebe m nọ. Unu maara ụzọ ebe m na-aga.”

Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị na-ahụ Nwanna Pierce, obi dị anyị ụtọ na ọ “maara ụzọ” “ebe obibi” ya na-adịru mgbe ebighị ebi.