Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

“Oge Pụrụ Iche”

“Oge Pụrụ Iche”

N’AFỌ 1870, mmadụ ole na ole malitere inyocha Akwụkwọ Nsọ na Pitsbọg (n’ebe a na-akpọbu Alegeni) dị na Pensụlvenịa, n’Amerịka. Onye na-eduzi ha mgbe ahụ bụ Nwanna Charles Taze Russell. Ha mụrụ ihe gbasara àjà ahụ Kraịst chụrụ, ghọta na o so n’ihe dị mkpa ga-eme ka nzube Jehova mezuo. Obi dị ha ezigbo ụtọ ịmụta na àjà ahụ Jizọs chụrụ mepeere ndị mmadụ ụzọ a ga-esi zọpụta ha, ma ndị na-anụbeghị gbasara Jizọs. Ụdị obi ụtọ ha nwere mere ka ha malite ịna-echeta ọnwụ Jizọs otu ugboro n’afọ.—1 Kọr. 11:23-26.

Nwanna Russell malitere ibipụta Ụlọ Nche, nke mere ka ndị mmadụ mara na àjà Jizọs chụrụ bụ ụzọ kachanụ Chineke si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya. N’oge ahụ, Ụlọ Nche kpọrọ oge e ji echeta ọnwụ Jizọs “oge pụrụ iche,” gwakwa ndị na-agụ ya ka ha bịa Pitsbọg cheta ọnwụ Jizọs ma ọ bụ ha ezukọọ n’ebe ọzọ cheta ya. O kwukwara na ọ bụrụgodị naanị mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ zukọrọ maka icheta ọnwụ Jizọs, Onyenwe anyị ga-anọnyere ha.

N’oge ahụ, ọtụtụ ndị na-abịa Pitsbọg echeta ọnwụ Jizọs kwa afọ. Ihe e dere n’akwụkwọ ịkpọ òkù ha na-enye ndị mmadụ bụ “Anyị ga-eji obi ụtọ nabata gị.” Ndị Mmụta Baịbụl ndị bi na Pitsbọg na-eji obi ha niile enye ụmụnna ha nri na ebe ha ga-arahụ. N’afọ 1886, ha nwere nnọkọ were ọtụtụ ụbọchị n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ụlọ Nche gbara ndị mmadụ ume, sị, “Bịa ka i gosi na ị hụrụ ma Nna anyị ukwu ma ụmụnna ya ma eziokwu ya n’anya.”

Chaatị gosiri otú e si ebugharị achịcha na mmanya n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs na Lọndọn Tabanakụl

Ruo afọ ole na ole, Ndị Mmụta Baịbụl bi na Pitsbọg lere ndị kweere n’àjà ahụ Jizọs chụrụ ọbịa ná nnọkọ ndị a na-enwe kwa afọ ma e mechaa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ka oge na-aga, Ndị Mmụta Baịbụl ji nwayọọ nwayọọ na-ehi nne, ebe a na-anọ eme Ncheta Ọnwụ Jizọs na ndị na-abịa ya adịkwa ọtụtụ. Otu nwanna nwoke aha ya bụ Ray Bopp nke nọ n’ọgbakọ dị na Chikago kwuru na malite n’afọ 1910, ibunye ọtụtụ narị ndị bịaranụ achịcha na mmanya na-ewe awa ole na ole n’ihi na ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ha niile na-ata achịcha.

Gịnị ka ha ji mee Ncheta Ọnwụ Jizọs? N’oge ahụ, ọ bụ eziokwu na Ụlọ Nche kwuru na Jizọs ji mmanya mee Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, ruo afọ ole na ole, Ụlọ Nche kwuru ka e jiri mkpụrụ vaịn a pịchapụtara ọhụrụ na-eme ya, ka a ghara ịnwa ndị na-adịghị ike ọnwụnwa. Ma, a na-eweta mmanya maka ndị kwetasiri ike na ọ bụ mmanya na-aba n’anya ka e kwesịrị iji mee ya. Ndị Mmụta Baịbụl mechara ghọta na ihe kwesịrị ịnọchi anya ọbara Jizọs bụ mmanya na-acha ọbara ọbara nke a na-agwaghị ihe ọ bụla.

E ji mpempe akwụkwọ a na pensụl a dee mmadụ ole bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ụlọ mkpọrọ dị na Nikaragụa

Oge ahụ e ji echeta ọnwụ Jizọs bụ oge e ji atụgharị uche nke ọma. Ma, n’ọgbakọ ụfọdụ, ndị mmadụ na-anọ ka ndị na-eru uju. A gbasaa, mmadụ niile alawa n’atụpụrụghị onye ọ bụla ọnụ. Ma, n’afọ 1934, akwụkwọ a kpọrọ Jehovah kwuru na oge e ji echeta ọnwụ Jizọs ekwesịghị ịbụ oge a ga-eji ‘na-eru uju’ maka ahụhụ Jizọs tara ma nwụọ, kama, ọ bụ oge a ga-eji ‘na-enwe ọṅụ’ na Jizọs bụ Eze n’eluigwe kemgbe afọ 1914.

Ụmụnna ndị zukọrọ n’ụlọ mkpọrọ dị n’obodo Mọdvinia dị na Rọshịa ime Ncheta Ọnwụ Jizọs n’afọ 1957

Ihe mere n’afọ 1935 mere ka a gbanwee ihe gbasara Ncheta Ọnwụ Jizọs. N’afọ ahụ ka a ghọtara ndị bụ́ “oké ìgwè mmadụ” ahụ e kwuru okwu ha ná Mkpughe 7:9. Tupu mgbe ahụ, ndị ohu Jehova chere na “oké ìgwè mmadụ” ahụ bụ Ndị Kraịst raara onwe ha nye, ma ha anaghị anụcha ọkụ n’obi. Ma, n’afọ 1935, a ghọtara na ha bụ ndị ji obi ha niile na-efe Jehova, ma ha nwere olileanya ibi na paradaịs ga-adị n’ụwa. Mgbe e mechara ka ihe a doo anya, Nwanna Russell Poggensee nyochara onwe ya nke ọma ma kwuo na Jehova ejighị mmụọ nsọ ya gwa ya na ọ ga-aga eluigwe. Nwanna Poggensee na ọtụtụ ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi kwụsịrị ịta achịcha na ịṅụ mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs, ma ha akwụsịghị ịga ya.

‘N’oge a pụrụ iche,’ a na-ahazi mkpọsa pụrụ iche. Ụmụnna niile na-eji oge ahụ egosi na obi dị ha ụtọ maka àjà ahụ Jizọs chụrụ. Ozi Alaeze Anyị nke Mee afọ 1932 gbara Ndị Kraịst ume ka ha ghara ịbụ naanị ndị “ọta achịcha,” kama, ka ha sorokwa na-ekwusa ozi ọma. N’afọ 1934, Ozi Alaeze Anyị gbara ụmụnna ume ka ha bụrụ “ndị ọsụ ụzọ nwa oge.” Ọ jụrụ, sị: “À ga-enweli otu puku ndị ọsụ ụzọ nwa oge n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs?” O kwuru na ndị e tere mmanụ ga-enwe ọṅụ zuru ezu ma ọ bụrụ na ha na-ekwusa ozi ọma. Ka oge na-aga, ọṅụ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ga-ezukwa ezu ma ha na-ekwusa ozi ọma. *

Mgbe Nwanna Harold King nọ n’ụlọ mkpọrọ, o dere ụfọdụ abụ banyere Ncheta Ọnwụ Jizọs

Ndị Jehova niile ghọtara na abalị ahụ a na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ abalị kacha nsọ n’afọ. Ha na-eme ya ọ bụrụgodị na ihe siri ezigbo ike. N’afọ 1930, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Pearl English na nwanne ya nwaanyị aha ya bụ Ora ji ụkwụ gaa ihe dị ka iri kilomita asatọ tupu ha eruo ebe a ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs. E nwere otu onye ozi ala ọzọ aha ya bụ Harold King. Mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ na Chaịna, o dere ụfọdụ abụ banyere Ncheta Ọnwụ Jizọs, jiri ihe yiri mkpụrụ vaịn mee mmanya, jirikwa osikapa mee achịcha. N’ebe dị iche iche n’ụwa, Ndị Kraịst ji obi ike mee Ncheta Ọnwụ Jizọs ma mgbe a na-alụ agha ma mgbe a machibidoro ha iwu. N’agbanyeghị ebe anyị nọ ma ọ bụ otú ihe si dịrị anyị, anyị na-ezukọ n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs ka anyị sọpụrụ Jehova Chineke na Jizọs Kraịst.

^ para. 10 Ná mbido, a na-akpọ Ozi Alaeze Anyị Bulletin, mechaa kpọwa ya Informant.