ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Mach 2015

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite na Mee 4 ruo 31, 2015.

AKỤKỌ NDỤ

Anyị Nwetara Ọrụ Ka Mma

David Cartwright na Gwen nwunye ya na-agbakọbu egwú balee, ma ha jizi ụkwụ ha arụkọ ọrụ ka mma.

“Otú Ahụ Bụ Ụzọ Ị Kwadoro”

Gịnị mere otú akwụkwọ anyị sizi akọwa akụkọ Baịbụl ji dị mfe nghọta ma doo anya?

Ị̀ Ga ‘Na-eche Nche’?

Gụọ otú e si mee ka ilu Jizọs tụrụ banyere ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke dokwuo anya. A kọwara ihe dị mkpa anyị kwesịrị ịmụta na ya.

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’oge gara aga, akwụkwọ anyị na-ekwukarị gbasara akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl na ihe ha nọchiri anya ya. Ma, ha anaghịzi ekwukarị otú ahụ. N’ihi gịnị?

Mụta Ihe n’Ilu Jizọs Tụrụ Banyere Talent

Isiokwu a mere ka anyị ghọtakwuo ilu Jizọs tụrụ banyere talent.

Jiri Obi Gị Niile Na-akwado Ụmụnna Kraịst

Olee otú ndị ahụ Kraịst ga-akpọ atụrụ si na-akwado ụmụnna ya?

Ọ̀ Ka Na-ekwe Omume Ịlụ “Naanị n’Ime Onyenwe Anyị”?

Ndị kpebiri ime ihe Chineke kwuru na-eme ya obi ụtọ, ọ na-agọzikwa ha.