Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

Anyị Nwetara Ọrụ Ka Mma

Anyị Nwetara Ọrụ Ka Mma

MỤ NA Gwen malitere ịmụ otú e si agba egwú mgbe anyị dị afọ ise. N’oge ahụ, mụ na ya amatabeghị. Ma, anyị kpebiri mgbe anyị na-eto eto na ọrụ anyị ga-abụ ịgba egwú. Mgbe ọ fọrọ obere ka anyị ruo n’ọkwá kacha elu n’ọrụ ahụ, anyị hapụrụ ya. Gịnị mere anyị ji hapụ ya?

David: A mụrụ m n’afọ 1945 n’obodo Shrọpshee dị n’Ịngland. Papa m nwere ugbo n’ime obodo. Ọ bụ n’ebe ahụ ka anyị bi. M lọta akwụkwọ, obi na-adị m ụtọ inye ụmụ ọkụkọ anyị nri ma chịkọta àkwá ha. M na-elekọtakwa atụrụ anyị na ehi anyị. Anyị mechie akwụkwọ, m na-eji traktọ arụ ọrụ n’ubi anyị.

Ma, e nwere ihe ọzọ m malitere inwe mmasị na ya. Papa m chọpụtara na mgbe m dị ezigbo obere, m na-agbakarị egwú mgbe ọ bụla m nụrụ ụda egwú. N’ihi ya, mgbe m dị afọ ise, ọ gwara mama m ka ọ kpọga m n’ụlọ akwụkwọ ebe m ga-amụta otú e si agba egwú. N’ebe ahụ, onye nkụzi anyị kwuru na m ga-agbali ụdị egwú ọzọ a na-akpọ balee, ọ kụzikwaara m ya. Mgbe m dị afọ iri na ise, enwetara m ohere agụmakwụkwọ n’efu n’otu ụlọ akwụkwọ a ma ama dị na Lọndọn, bụ́ ebe a na-akụzi ụdị egwú ahụ. Ọ bụ n’ebe ahụ ka mụ na Gwen matara. E kenyere anyị abụọ ịna-agbakọ egwú.

Gwen: A mụrụ m n’afọ 1944, na Lọndọn, bụ́ obodo na-ekwo ekwo. Mgbe m na-eto eto, m nwere ezigbo okwukwe na Chineke. Agbalịrị m ịgụ Baịbụl, ma o siiri m ike nghọta. Tupu mgbe ahụ, mgbe m dị afọ ise, agara m ebe a na-akụzi ịgba egwú. Mgbe afọ isii gara, m gbara onye mbụ n’asọmpi a haziri maka ndị niile na-agba egwú balee na Briten. A na-enye onye meririnụ ohere ịgụ akwụkwọ n’otu ụlọ akwụkwọ a ma ama, bụ́ ebe a na-akụzi ịgba egwú balee. Ọ dị n’ebe a na-akpọ Waịt Lọj, n’otu ọmarịcha ụlọ dị n’Ogige Richmọnd, n’ebe mpụga Lọndọn. Ọ bụ n’ebe ahụ ka m gụrụ akwụkwọ, ndị nkụzi a ma ama akụziekwara m otú e si agba egwú balee. Mgbe m dị afọ iri na isii, m gafere na klas ka elu n’ụlọ akwụkwọ ahụ, nke dị n’ime Lọndọn. Ọ bụ ebe ahụ ka mụ na David matara. N’ime ọnwa ole na ole, mụ na ya gbakọrọ egwú balee n’otu nnukwu ụlọ dị na Lọndọn, bụ́ ebe ọtụtụ ndị na-abịa ekiri ndị na-agba egwú. A na-akpọ ya Royal Opera House.

Egwú balee anyị na-agba mere ka anyị gaa ebe dị iche iche n’ụwa

David: Dị ka Gwen kwuru, egwú anyị na-agba mere ka anyị gaa gbaa egwú n’otu nnukwu ụlọ a ma ama, sorokwa òtù a ma ama na Lọndọn na-agba egwú. Otu onye nkụzi anyị malitere òtù nke ya n’ebe a na-akpọ Vupatal, dị na Jamanị. Ha na-aga mba dị iche iche agba egwú. Ọ kpọkwa anyị abụọ ka anyị soro ha na-agba egwú. Ka anyị na-arụ ọrụ ahụ, anyị gara gbaa egwú n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ndị anyị so gbaa egwú bụ ndị a ma ama, dị ka Margot Fonteyn na Rudolf Nureyev. Otú e si amarịta aka n’ụdị ọrụ a na-eme ka mmadụ dị mpako. Anyị jikwa oge anyị niile na-arụ ya.

Gwen: N’oge ahụ, uche m niile dị n’ịgba egwú. Mụ na David chọrọ iru n’ọkwá kacha elu n’ọrụ a. Ndị mmadụ na-ewetara m ihe dị iche iche ka m dee aha m na ha. Ha na-enye m okooko osisi, na-akụkwara m aka. Ihe ndị ahụ na-atọ m ụtọ. Dịkwa ka ọtụtụ ndị ọzọ na-eme ihe nkiri, atụkwasịrị m obi n’ọtụmọkpọ m. Ọtụtụ ndị mụ na ha na-akpa na-eme omume rụrụ arụ, na-aṅụ sịga, na-aṅụbigakwa mmanya ókè.

NDỤ ANYỊ GBANWERE KPAMKPAM

Ụbọchị anyị gbara akwụkwọ

David: Mgbe m rụrụ ọrụ ịgba egwú ọtụtụ afọ, ike ịga ebe dị iche iche mgbe niile gwụrụ m. Ebe ọ bụ na m toro n’ebe a na-akọ ugbo, ụdị ndụ a na-ebi n’ime obodo bidoro ịgụsi m agụụ ike. N’ihi ya, n’afọ 1967, ahapụrụ m ọrụ ahụ, gaa rụwa n’otu ugbo dị nso n’ebe papa m na mama m bi. Onye nwe ugbo ahụ nyere m obere ụlọ m ga-ebi na-akwụ ya ụgwọ. Akpọrọ m Gwen na fon mgbe ọ nọ n’ebe ọ na-agba egwú ma gwa ya na m chọrọ ịlụ ya. N’oge ahụ, e bugoola ya n’ọkwá ka ọ na-agbazi egwú naanị ya. Ọ na-emekwa nke ọma. N’ihi ya, o siiri ya ike ikpebi ihe ọ ga-eme. Ma, o kwetara ka mụ na ya lụọ. Ọ bịara soro m biri n’ime obodo, bụ́ ụdị ebe ọ na-ebitụbeghị.

Gwen: N’eziokwu, o siiri m ike ibi n’ụdị ebe a. Ịpịpụta mmiri ara ehi na inye ézì na ọkụkọ nri ma mgbe anwụ na-acha ma mgbe mmiri na-ezo dị nnọọ iche n’ụdị ndụ m na-ebibu. David malitere ịga ụlọ akwụkwọ ga-ewe ya ọnwa itoolu ka a kụziere ya ụzọ ọgbara ọhụrụ e si azụ ụmụ anụmanụ. N’ihi ya, m na-anọ naanị m n’ụlọ ruo mgbe ọ lọtara n’abalị. Mgbe ahụ, anyị amụọla ada anyị bụ́ Gilly. David gwara m ka m gaa mụọ otú e si anya ụgbọala, mụ agaa mụọ ya. Otu ụbọchị, m bu ụgbọala m gaa otu obodo dị anyị nso. N’ebe ahụ, m hụrụ otu nwaanyị aha ya bụ Gael. Amatara m ya mgbe ọ na-ere ihe n’otu ụlọ ahịa.

Mgbe anyị nọ n’ebe anyị na-azụ anụmanụ, mgbe anyị lụrụ ọhụrụ

Gael gwara m ka m bịa n’ụlọ ya ṅụọ tii. O gosiri m foto agbamakwụkwọ ya. M hụrụ nke ya na ndị mmadụ sere n’ihu ebe a kpọrọ Ụlọ Nzukọ Alaeze. M jụrụ ya ụdị ụlọ chọọchị dị ihe ahụ. Obi tọrọ m ụtọ mgbe ọ gwara m na ya na di ya bụ Ndịàmà Jehova. M chetara na e nwere nwanne papa m bụ́ Onyeàmà Jehova, chetakwa otú papa m si kpọọ ya asị ma kpofuo akwụkwọ ya niile. Papa m na ndị mmadụ na-adị ná mma, nwanne ya nwaanyị ahụ dịkwa obiọma. N’ihi ya, m nọ na-eche ihe mere papa m ji na-emesi ụdị onye ahụ ike.

Ọ bụzi mgbe ahụ m gara n’ụlọ Gael ka m matara otú ihe nwanne papa m ahụ kweere si dị iche n’ihe a na-akụzi na chọọchị. Gael gosiri m ihe Baịbụl na-akụzi n’eziokwu. O juru m anya mgbe m matara na ọtụtụ ihe a na-akụzi na chọọchị abụghị ihe Baịbụl na-akụzi, ma Atọ n’Ime Otu ma na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. (Ekli. 9:5, 10; Jọn 14:28; 17:3) Ọ bụkwa mgbe ahụ bụ mgbe mbụ m hụrụ aha Chineke bụ́ Jehova na Baịbụl.—Ọpụ. 6:3.

David: Gwen gwara m ihe ọ na-amụta na Baịbụl. Echetara m na mgbe m bụ nwata, papa m gwara m na m kwesịrị ịgụ Akwụkwọ Nsọ. N’ihi ya, mụ na Gwen kwetara ka Gael na di ya bụ́ Derrick mụwara anyị Baịbụl. Mgbe ọnwa isii gara, anyị kwagara ebe a na-akpọ Ọswestri. Ọ dị nso na Shrọpshee. Ihe mere anyị ji kwaga ebe ahụ bụ na anyị nwetara obere ebe anyị ga na-azụ ụmụ anụmanụ. N’Ọswestri, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Deirdre weturu obi mụọrọ anyị ihe. Ná mmalite, anyị emechaghị nke ọma. Ilekọta ụmụ anụmanụ anyị mere ka anyị ghara ịna-enwe efe. Ma, eziokwu anyị na-amụta ji nwayọọ nwayọọ ruo anyị n’obi.

Gwen: Otu nnukwu nsogbu m nwere bụ na m kweere n’ihe ụfọdụ na-abụghị eziokwu. Aịzaya 65:11 nyeere m aka ịhụ otú Jehova si ele “ndị na-edozi tebụl maka chi Ihu Ọma” anya. O were oge tupu m tụfuo ọtụmọkpọ m niile. Ekpere nyekwaara m aka. M mụtara na “onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala,” nakwa na “onye ọ bụla nke na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.” (Mat. 23:12) O mere ka m mata ụdị ndị Jehova chọrọ ka ha bịa fewe ya. Amụtara m na Chineke hụrụ anyị n’anya nke na o ji Ọkpara ya chụọ àjà iji gbapụta anyị. Achọrọ m ife ụdị Chineke ahụ. N’oge ahụ, anyị amụọla nwa nwaanyị ọzọ. Obi dị anyị ụtọ mgbe anyị mụtara na ezinụlọ anyị nwere ike ịdị ndụ ebighị ebi mgbe ụwa ga-abụ paradaịs.

David: Mgbe m hụrụ otú amụma ndị dị na Baịbụl si emezu, dị ka ndị dị na Matiu isi 24 nakwa na Daniel, o doro m anya na achọtala m eziokwu. M ghọtara na e nweghị ihe dị n’ụwa ochie a a ga-eji tụnyere mmadụ na Jehova ịdị ná mma. N’ihi ya, ka oge na-aga, m selatara aka n’ịchụ akụnụba. Aghọtara m na m kwesịrị ịna-elekọta nwunye m na ụmụ m otú m si elekọta onwe m. Ndị Filipaị 2:4 mere ka o doo m anya na ekwesịghị m ịna-eche naanị banyere onwe m na otú m ga-esi mee ka ebe anyị na-azụ anụmanụ bukwuo ibu. Kama, m kwesịrị iwere ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa ná ndụ m. M kwụsịrị ịṅụ sịga. Ma, ọ dịrịghị anyị mfe ịhazi ihe ndị anyị na-eme ka anyị nwee ike ịga ọmụmụ ihe a na-enwe ná mgbede Satọdee. Ebe anyị na-aga ya dị kilomita iri. Ihe mere o ji siere anyị ike bụ na ọ bụ oge ọmụmụ ihe ahụ ka e kwesịrị ịpịpụta mmiri ara ehi anyị. Ma, otú Gwen si na-enyere m aka mere ka ọmụmụ ihe ghara ịkwa anyị. Anyị na-akpọkwa ụmụ anyị aga ozi ọma n’ụtụtụ Sọnde ọ bụla, ma anyị pịpụtachaa mmiri ara ehi anyị.

Mgbanwe ndị a anyị mere adịghị ndị ezinụlọ anyị mma n’obi. Papa Gwen ekweghị atụpụrụ ya ọnụ ruo afọ isii. Mama m na papa m gbakwara mbọ ka anyị kwụsị ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova.

Gwen: Jehova nyeere anyị aka idi nsogbu a niile. Ka oge na-aga, ụmụnna ndị nọ n’Ọgbakọ Ọswestri ghọrọ ezinụlọ ọhụrụ anyị. Ha ji obiọma nyere anyị aka imeri ọnwụnwa ndị ahụ niile. (Luk 18:29, 30) Anyị raara onwe anyị nye Jehova, meekwa baptizim n’afọ 1972. Achọrọ m ịgbasi mbọ ike ka m nyere ọtụtụ ndị aka ịmụta eziokwu. N’ihi ya, m malitere ịsụ ụzọ.

ỌRỤ KA MMA

David: Afọ ndị ahụ anyị ji na-azụ ụmụ anụmanụ adịghị mfe. Ma, anyị gbalịrị igosi ụmụ anyị otú ha ga-esi na-efe Jehova. Anyị mechara ree ebe ahụ anyị na-azụ ụmụ anụmanụ n’ihi na ndị ọchịchị selatara aka n’ịkwado ndị ọrụ ugbo. Anyị rịọrọ Jehova ka o nyere anyị aka, duziekwa anyị n’ihi na anyị enweghịzi ma ụlọ ma ọrụ, nwa anyị nke atọ dịkwa naanị otu afọ. Anyị kpebiri imeghe ebe anyị ga na-akụziri ndị mmadụ ịgba egwú iji na-akpata ihe anyị ga-eri. Otú anyị si kpebisie ike iwere ofufe Chineke ka ihe kacha mkpa baara anyị ezigbo uru. Obi tọrọ anyị ụtọ mgbe ụmụ nwaanyị atọ anyị mụtara malitere ịsụ ụzọ ozugbo ha gụchara akwụkwọ. Gwen bụkwa ọsụ ụzọ. N’ihi ya, ọ nọ na-akwado ụmụ anyị kwa ụbọchị.

Mgbe ụmụ anyị abụọ, bụ́ Gilly and Denise, lụrụ di, anyị mechiri ebe ahụ a na-akụzi ịgba egwú. Anyị degaara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ ka anyị mata ọgbakọ anyị nwere ike ịga nyere aka. Ha gwara anyị banyere obodo ndị dị n’agbata ebe ugwu na ebe ọwụwa anyanwụ Ịngland. Ebe ọ bụ naanị nwa anyị nke ikpeazụ bụ́ Debbie nọzi n’ụlọ, mụnwa malitekwara ịsụ ụzọ. Mgbe afọ ise gara, a gwara anyị ka anyị gaa nyere ọgbakọ ndị dị n’ebe ugwu aka. Mgbe Debbie lụrụ di, anyị ji afọ iri gaa mba dị iche iche soro rụọ ebe ndị a na-anọ efe Jehova na Zimbabwe, Mọldova, Họngarị, na Kot Devụa. Anyị mechara laghachi Ịngland ma soro rụọ Betel dị na Lọndọn. Ebe m ma otú e si azụ ụmụ anụmanụ, a gwara m ka m gaa rụwa ọrụ n’ebe a na-azụ anụ na Betel n’oge ahụ. Ka ọ dị ugbu a, anyị na-asụ ụzọ n’agbata ebe ugwu na ebe ọdịda anyanwụ Ịngland.

Obi dị anyị ezigbo ụtọ iso rụọ ebe a na-anọ efe Jehova ná mba ndị iche iche

Gwen: Ihe anyị ji oge anyị niile na-arụ n’oge mbụ bụ ịgba egwú balee. O mere anyị obi ụtọ mgbe ahụ. Ma obi ụtọ ahụ adịteghị aka. Ihe anyị ji oge anyị niile na-arụ ugbu a bụ ihe kacha mkpa, ya bụ, ozi Jehova. O meela ka anyị nwee ezigbo ọṅụ. Anyị ga-arụkwa ya ruo mgbe ebighị ebi. Anyị abụọ ka na-arụkọ ọrụ. Ma, kama iji ụkwụ anyị na-agba egwú, anyị jizi ya na-aga ekwusara ndị mmadụ ozi ọma. Anyị enyerela ọtụtụ ndị aka ịmụta eziokwu ndị dị na Baịbụl, nke ga-eme ka ha nweta ndụ ebighị ebi. Obi dịkwa anyị ezigbo ụtọ n’ihi na ha dị ka “akwụkwọ ozi nkọwa” nke karịrị ịbụ onye a ma ama n’ụwa. (2 Kọr. 3:1, 2) A sị na anyị achọtaghị eziokwu, naanị ihe anyị ga na-eme ugbu a bụ icheta ihe ndị mere n’oge anyị na-agba egwú. Naanị ihe anyị ga-enwekwa bụ foto ndị anyị sere mgbe ahụ na ihe nkiri ndị anyị mere.

David: Ije ozi Jehova abaarala anyị ezigbo uru. Ama m na o nyeere m aka ịbụ ezigbo di na ezigbo nna. Baịbụl gwara anyị na Miriam, Eze Devid, na ndị ọzọ gbara egwú iji gosi na obi dị ha mma. Anyị na ọtụtụ ndị ọzọ na-elekwa anya mgbe anyị niile ga-agba egwú ọṅụ n’ụwa ọhụrụ Jehova ga-eweta.—Ọpụ. 15:20; 2 Sam. 6:14.