Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Osisi E Gbuturu Egbutu Ò Nwere Ike Ipulite Ọzọ?

Osisi E Gbuturu Egbutu Ò Nwere Ike Ipulite Ọzọ?

Ị HỤ osisi oliv kara nká ma hịgọọ ahịgọọ, o nwere ike ịdị gị ka o nweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere oké osisi sida dị na Lebanọn. Ma osisi oliv na-akpa ike dị egwu. O nwere ike ịnọ ọtụtụ afọ, ọ bụrụgodị n’ebe mmiri na-adịghị ma ọ bụ n’ebe bụ́ okwute okwute. E nwere osisi oliv ndị dị ihe dị ka otu puku afọ. Otú mgbọrọgwụ osisi oliv si abami n’ime ala na-eme ka o nwee ike ipute nke ọhụrụ, é gbutugodị úkwù ya. Ọ bụrụhaala na mgbọrọgwụ ya ka dị ndụ, ọ ga-epute nke ọhụrụ.

Obi siri Job ike na ọ bụrụgodị na ya anwụọ, na ya ga-adị ndụ ọzọ. (Job 14:13-15) O ji osisi mee ihe atụ iji gosi na obi siri ya ike na Chineke ga-akpọliteli ya n’ọnwụ. O nwere ike ịbụ osisi oliv ka o bu n’obi. Job sịrị: “Osisi nwere olileanya. Ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epulite ọzọ.” Ọ bụrụ na mmiri ezoo mgbe oké ọkọchị kọchara, úkwù osisi oliv kpọrọ nkụ nwere ike isi na mgbọrọgwụ ya pute nke ọhụrụ ga-emecha ‘waa alaka dị ka osisi pulitere ọhụrụ.’—Job 14:7-9.

Otú ahụ onye ọrụ ugbo na-atụsi anya ike ka osisi oliv e gbuturu egbutu pulite ọzọ ka ọ na-agụsi Jehova Chineke agụụ ike ịkpọlite ndị ohu ya na ọtụtụ ndị ọzọ n’ọnwụ. (Mat. 22:31, 32; Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) Chegodị ụdị aṅụrị ga-eju anyị obi mgbe anyị ga-amakụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ, hụkwa ka obi dị ha ụtọ na ha adịla ndụ.