Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Ga-alụsoli Setan Ọgụ ma Merie

Ị Ga-alụsoli Setan Ọgụ ma Merie

“Guzogidenụ [Setan], sienụ ike n’okwukwe.”—1 PITA 5:9.

1. (a) Gịnị mere ọgụ anyị na-alụso Setan ji dị ezigbo mkpa ugbu a? (b) Olee otú anyị si mara na anyị ga-emerili n’ọgụ anyị na Setan na-alụ?

SETAN na-alụso ndị e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ” ọgụ. (Jọn 10:16) Ekwensu chọrọ iji obere oge fọọrọ ya ripịa ọtụtụ ndị ohu Jehova. (Gụọ Mkpughe 12:9, 12.) Ànyị ga-emerili n’ọgụ a anyị na Setan na-alụ? Eenụ. Baịbụl sịrị: “Na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.”—Jems 4:7.

2, 3. (a) Gịnị mere Setan ji chọọ ka ndị mmadụ kwere na ọ dịghị adị? (b) Olee otú i si mara na Setan dị adị?

2 Ọtụtụ ndị na-achị ọchị ma ha nụ na Setan dị. Ha chere na Setan na ndị mmụọ ọjọọ adịghị adị, na a na-anụ banyere ha naanị n’akwụkwọ, na fim na-emenye ụjọ, nakwa n’egwuregwu vidio. Ụdị ndị ahụ chere na onye ma ihe agaghị ekweta na ndị mmụọ ọjọọ dị. Ì chere na ọ na-ewute Setan na ọtụtụ ndị chere na ihe gbasara ya na ndị mmụọ ọjọọ ya bụ akụkọ ifo? Mbanụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịịrị Setan mfe iduhie ndị na-ekweghị na ọ dị adị. (2 Kọr. 4:4) Ụdị echiche ahụ so n’ọtụtụ ụzọ o si eduhie ndị mmadụ.

3 Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, anyị esoghị ná ndị o duhiere. Anyị ma na Ekwensu dị n’ihi na ọ bụ ya ji agwọ gwa Iv okwu. (Jen. 3:1-5) Setan kwara Jehova emo n’ihe banyere Job. (Job 1:9-12) Ọ bụ Setan nwara Jizọs ọnwụnwa. (Mat. 4:1-10) Mgbe e hiwere Alaeze Chineke n’eluigwe n’afọ 1914, ọ bụ Setan malitere ibuso ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ agha. (Mkpu. 12:17) Agha ahụ ebibeghị n’ihi na Setan chọrọ ime ka okwukwe ndị fọdụrụ ná ndị ahụ e tere mmanụ nakwa atụrụ ọzọ nyụọ ka ọkụ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ imeri n’agha ahụ, anyị kwesịrị iguzogide Setan ma sie ike n’okwukwe. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụzọ atọ anyị ga-esi eme ya.

ZERE NGANGA

4. Olee otú Setan si gosi na nganga juru ya isi?

4 Setan adịghị umeala n’obi. Ọ kara anya kwuo na ọ bụghị Jehova kwesịrị ịchị, gbalịsiwekwa ike ka ndị ọzọ fewe ya kama ife Jehova. O si otú ahụ gosi na nganga na mpako juru ya isi. N’ihi ya, otu ụzọ anyị nwere ike isi guzogide Setan bụ izere nganga ma dị umeala n’obi. (Gụọ 1 Pita 5:5.) Gịnịdị bụ nganga? Ọ̀ bụ nganga niile dị njọ?

5, 6. (a) Ọ̀ bụ ụdị nganga niile dị njọ? Kọwaa. (b) Olee ụdị nganga na-akpata nsogbu? Olee ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl kpara ụdị nganga ahụ?

5 Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na nganga bụ “obi ụtọ mmadụ na-enwe maka ihe ọma yanwa ma ọ bụ ndị ya na ha dị ná mma mere ma ọ bụkwanụ maka ezigbo ihe ha nwere.” Ụdị nganga ahụ abụghị ihe ọjọọ. Pọl onyeozi gwara ndị Tesalonaịka, sị: “Anyị onwe anyị ji unu akpa nganga n’ọgbakọ dị iche iche nke Chineke n’ihi ntachi obi unu na okwukwe unu n’ime mkpagbu na ahụhụ niile unu na-edi.” (2 Tesa. 1:4) N’ihi ya, inwe obi ụtọ maka ihe anyịnwa ma ọ bụ ndị ọzọ mere abụghị ihe ọjọọ. Ezinụlọ anyị, obodo anyị, ma ọ bụ ebe anyị toro ekwesịghị ịna-eme anyị ihere.—Ọrụ 21:39.

6 Ma, e nwere ụdị nganga nwere ike ime ka anyị na ndị ọzọ ghara ịdị ná mma, meekwa ka anyị ghara ịbụ enyi Jehova. Ụdị nganga a nwere ike ime ka anyị wewe iwe ma e nye anyị ndụmọdụ. O nwekwara ike ime ka anyị jụ ya, kama iji obi umeala nabata ya. (Ọma 141:5) Mmadụ nwee ụdị nganga a, ọ pụtara na “onwe ya na-ebu ya isi.” O gosikwara na “ọ dị mpako ma chee na ya ka ndị ọzọ mma.” Jehova kpọrọ mpako asị. (Ezik. 33:28; Emọs 6:8) Ma, obi na-adị Setan ụtọ ma ọ hụ ndị dị mpako, n’ihi na ha na-etu ọnụ ka ya. Chegodị ụdị obi ụtọ Setan nwere mgbe Nimrọd, Fero, na Absalọm turu ọnụ ma gosi na ha dị mpako. (Jen. 10:8, 9; Ọpụ. 5:1, 2; 2 Sam. 15:4-6) Mpako sokwa mee ka Ken na Chineke ghara ịdị ná mma. Chineke dụrụ ya ọdụ, ma mpako ekweghị ya nabata ndụmọdụ ahụ. O mere isi ike, leghara ndụmọdụ ahụ anya, jiri isi gaa koro nsogbu.—Jen. 4:6-8.

7, 8. (a) Gịnị bụ ịkpa ókè agbụrụ? Olee otú o si gbasa mpako? (b) Kọwaa otú mpako nwere ike isi tisaa ọgbakọ.

7 Taa, e nwere ọtụtụ ụzọ ndị mmadụ si egosi na ha dị mpako. Ndị dị mpako na-akpa ókè agbụrụ. Otu akwụkwọ kwuru na ịkpa ókè agbụrụ pụtara “mmadụ ịkpọ ndị si n’agbụrụ ọzọ asị” ma ọ bụ mmadụ iche na ọ bụ agbụrụ mmadụ si na-eme ka ọ bụrụ onye ma ihe nakwa na e nwere agbụrụ ka ibe ya. Ịkpa ókè agbụrụ na-akpata ọgba aghara, agha, nakwa igbukpọ ndị mmadụ.

8 N’eziokwu, ụdị ihe ahụ ekwesịghị ime n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ma, mpako nwere ike ịkpata esemokwu n’etiti ụmụnna, ghọzie ọkụ na-agba ọzara. Ọ bụ ihe mere n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge ochie, nke mere Jems ji jụọ ha, sị: “Olee ebe agha si bịa, oleekwa ebe ọgụ a na-alụ n’etiti unu si bịa?” (Jems 4:1) Ọ bụrụ na anyị kpọrọ ndị ọzọ asị, werekwa na anyị ka ha mma, anyị nwere ike ịna-eme ma ọ bụ na-ekwu ihe ga-akpasu ndị ọzọ iwe. (Ilu 12:18) N’eziokwu, mpako nwere ike itisa ọgbakọ.

9. Olee otú Baịbụl si enyere anyị aka imeri ịkpa ókè agbụrụ na ụdị mpako ndị ọzọ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

9 Ọ bụrụ na ọ na-adị anyị ka ànyị ka ndị ọzọ, anyị kwesịrị icheta na “onye ọ bụla nke dị nganga n’obi bụ ihe arụ n’anya Jehova.” (Ilu 16:5) Anyị kwesịrị iche echiche, jụọ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-eche na m ka ndị agbụrụ ọzọ ma ọ bụ ndị obodo ọzọ mma?’ Ọ bụrụ na anyị na-eche otú ahụ, ọ pụtara na anyị na-echefu na Chineke ‘si n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ.’ (Ọrụ 17:26) E nwere ike ikwu na mmadụ niile bụ otu agbụrụ ebe ọ bụ na anyị niile bụ ụmụ Adam. N’ihi ya, anyị ekwesịghị iche na e nwere agbụrụ ka ibe ya. Iche otú ahụ ga-eme ka Ekwensu nwee ike ime ka ịhụnanya na ịdị n’otu ghara ịdị n’ọgbakọ. (Jọn 13:35) Ọ bụrụ na anyị chọrọ imeri n’ọgụ anyị na Setan na-alụ, anyị kwesịrị izere ụdị mpako niile.—Ilu 16:18.

ZERE ỊCHỤ AKỤNỤBA ỌNWỤ ỌNWỤ NA ỊHỤ ỤWA N’ANYA

10, 11. (a) Gịnị mere ịhụ ụwa n’anya nwere ike iji dị mfe? (b) Gịnị ka Dimas mere n’ihi na ọ hụrụ ụwa n’anya?

10 Ọ bụ Setan “na-achị ụwa a.” Ụwa dịkwa n’aka ya. (Jọn 12:31; 1 Jọn 5:19) N’ihi ya, ọtụtụ ihe a na-eme n’ụwa na-emegide iwu ndị Jehova nyere na Baịbụl. N’eziokwu, ọ bụghị ihe niile dị n’ụwa bụ ihe ọjọọ. Ma, anyị ma na Setan ga-eji ụwa ya mee ka ihe ọjọọ gụwa anyị ma mee ka anyị mehie. O nwekwara ike ịgba mbọ ka anyị hụwa ụwa n’anya ma leghara ofufe Jehova anya.—Gụọ 1 Jọn 2:15, 16.

11 Ụfọdụ Ndị Kraịst oge mbụ hụrụ ụwa n’anya. Dị ka ihe atụ, Pọl dere, sị: “Dimas agbahapụwo m n’ihi na ọ hụrụ usoro ihe dị ugbu a n’anya.” (2 Tim. 4:10) Baịbụl agwaghị anyị kpọmkwem ihe dị n’ụwa Dimas hụrụ n’anya, nke mere ka ọ hapụ Pọl. O nwere ike ịbụ na ọ malitere ịhụ akụnụba n’anya karịa ijere Chineke ozi. Ọ bụrụ otú ahụ, ihe ùgwù ijere Chineke ozi kwara Dimas. Gịnịdị ka ọ gara ịchụ? Ò nwere ihe ọ ga-enweta n’ụwa nke karịrị ngọzi Jehova ga-enye ya ma ọ nọsie ike n’ozi ya na Pọl na-eje?—Ilu 10:22.

12. Olee otú Setan nwere ike isi jiri “ike dị aghụghọ nke akụnụba” nweta anyị?

12 Ụdị ihe ahụ nwere ike ime anyị. Ọ bụghị ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na anyị bụ́ Ndị Kraịst na-agba mbọ igbo mkpa anyị na ndị ezinụlọ anyị. (1 Tim. 5:8) Jehova achọghị ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ. Ọ bụ ya mere o ji nye Adam na Iv ebe mara mma ha ga-ebi. (Jen. 2:9) Ma, Setan nwere ike iji “ike dị aghụghọ nke akụnụba” nweta anyị. (Mat. 13:22) Ọtụtụ ndị chere na ọ bụ ego ga-eme ka ha nwee obi ụtọ ma ọ bụ na ọ bụ akụnụba na-egosi na ihe na-agara mmadụ nke ọma. Ekwensu aghọgbuola onye chere otú ahụ. O nwere ike ime ka anyị na Jehova gharazie ịbụ enyi. Ma anyị ma na adịm ná mma anyị na ya bụ akụ̀ kacha baa uru anyị nwere. Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ; n’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.” (Mat. 6:24) Ọ bụrụ na anyị na-agbara Akụnụba ohu, anyị akwụsịla ijere Jehova ozi. Ọ bụ ihe Setan chọrọ. Ka anyị ghara ikwe ka ego ma ọ bụ akụnụba dị anyị mkpa karịa adịm ná mma anyị na Jehova. Ọ bụrụ na anyị chọrọ imeri n’ọgụ anyị na Setan na-alụ, anyị ekwesịghị ịna-achụ akụnụba ọnwụ ọnwụ.—Gụọ 1 Timoti 6:6-10.

ZERE OMUME RỤRỤ ARỤ

13. Olee otú ụwa Setan si eme ka ndị mmadụ na-ele alụmdi na nwunye na mmekọahụ anya otú na-ekwesịghị ekwesị?

13 Ọnyà ọzọ dị n’ụwa Setan bụ omume rụrụ arụ. Taa, ọtụtụ ndị chere na alụmdi na nwunye anaghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́ nakwa na ọ bụ ihe oge ya gaferela. Ọ bụkwa otú ahụ ka ha si ewere di na nwunye na-anaghị agba n’èzí. Dị ka ihe atụ, otu nwaanyị a ma ama nke na-eme ihe nkiri kwuru na o nweghị otú ọ ga-esi bụrụ naanị onye mmadụ lụrụ ka ya na ya ga na-enwe mmekọahụ. Ọ sịrị: “Echeghị m na e nwere onye na-eme otú ahụ ma ọ bụ onye chọrọ ịna-eme ya.” Onye ọzọ kwuru, sị: “Echeghị m na mmadụ na otu onye ibigide ruo ọnwụ dị anyị n’ọbara.” Ọ ga-abụrịrị na obi na-adị Setan ụtọ mgbe ndị a ma ama na-akatọ alụmdi na nwunye, bụ́ onyinye Chineke nyere anyị. Ekwensu achọghị ịkwado alụmdi na nwunye. Ọ chọghịkwa ka ọ na-aga nke ọma. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ imeri n’ọgụ anyị na Setan na-alụ, anyị kwesịrị ịna-ele alụmdi na nwunye anya otú Chineke si ele ya.

14, 15. Gịnị ka ị ga-eme ma a nwaa gị ka i mee omume rụrụ arụ?

14 Ma ànyị alụọla di ma ọ bụ nwunye ma ọ̀ bụ na anyị alụbeghị, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike na-ezere ụdị omume niile rụrụ arụ. Ọ̀ dị mfe? Mba. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, i nwere ike ịnụ ka ụmụ akwụkwọ ibe gị ji ihe ọjọọ na-etu ọnụ, ma mmekọahụ ha nwere ma ozi rụrụ arụ ha zigaara ndị ọzọ. N’obodo ụfọdụ, iji ekwentị ezigara mmadụ ozi rụrụ arụ na izigara mmadụ vidio ebe a na-edina ụmụaka bụ otu ihe. Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-akwa iko na-emehie megide ahụ́ nke ya.” (1 Kọr. 6:18) Ọrịa ndị a na-ebute ná mmekọahụ egbuola ọtụtụ ndị, meekwa ka ọtụtụ ndị na-ata ahụhụ. Ọtụtụ ndị na-eto eto, bụ́ ndị nwere mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye, na-akwa mmakwaara. Ndị na-eme fim na ndị na-akụ egwú chọrọ ka anyị chee na imebi iwu Chineke anaghị akpata nsogbu. Ọ bụrụ na anyị ekweta ụdị ụgha ahụ, e nwere ike iji “ike dị aghụghọ nke mmehie” ghọgbuo anyị.—Hib. 3:13.

15 Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na a nwaa gị ka i mee omume rụrụ arụ? Mata ihe bụ́ adịghị ike gị. (Rom 7:22, 23) Kpee ekpere ka Chineke nye gị ike. (Fil. 4:6, 7, 13) Zere ihe ọ bụla nwere ike ime ka i mee omume rụrụ arụ. (Ilu 22:3) Ọnwụnwa bịara gị, jụ ya ozugbo.—Jen. 39:12.

16. Gịnị ka Jizọs kwuru mgbe Setan nwara ya ọnwụnwa? Olee ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe o mere?

16 Jizọs gosiri anyị otú e si emeri ọnwụnwa. O kweghị ka Setan jiri nkwa ya ghọgbuo ya. Ọ gwaghịdị Setan ka ya chee ya echee. Kama ime otú ahụ, ọ sịrị Setan ozugbo: “E dere, sị.” (Gụọ Matiu 4:4-10.) Jizọs ma Okwu Chineke. O nyeere ya aka izere ihe ọjọọ ozugbo ma kwuo ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ mgbe ọnwụnwa bịaara ya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ imeri n’ọgụ anyị na Setan na-alụ, anyị ekwesịghị ikwe ka e jiri omume rụrụ arụ rata anyị.—1 Kọr. 6:9, 10.

NTACHI OBI GA-ENYERE GỊ AKA IMERI N’ỌGỤ A

17, 18. (a) Olee ihe ndị ọzọ Setan ji alụso anyị ọgụ? Gịnị mere na o kwesịghị iju anyị anya? (b) Gịnị ka a ga-eme Setan? Gịnị mere o kwesịrị iji mee ka obi sie gị ike ịtachi obi?

17 Mpako, ịchụ akụnụba ọnwụ ọnwụ, na omume rụrụ arụ bụ naanị atọ n’ọnyà ndị Setan na-esi. E nwere ọtụtụ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, e nwere Ndị Kraịst ndị ezinụlọ ha na-emegide, nweekwa ndị ụmụ akwụkwọ ibe ha na-achị ọchị, na ndị gọọmenti obodo ha na-agbalịsi ike ka ha ghara ikwusa ozi ọma. Anyị ma na ụdị nsogbu ndị a ga-abịara Ndị Kraịst n’ihi na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mmadụ niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m; ma onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.”—Mat. 10:22.

A ga-ebibi Setan kpamkpam (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)

18 Olee otú anyị ga-esi merie n’ọgụ anyị na Setan na-alụ? Jizọs sịrị ndị na-eso ụzọ ya: “Unu ga-esite n’ịtachi obi nweta mkpụrụ obi unu.” (Luk 21:19) O nweghị ihe mmadụ ọ bụla ga-eme anyị nke ga-adịru mgbe ebighị ebi. O nweghịkwa onye ga-anapụli anyị adịm ná mma anyị na Chineke, ọ gwụla ma ànyị kwere ka o mee. (Rom 8:38, 39) Ọ bụrụgodị na ndị ohu Jehova anwụọ, ọ pụtaghị na Setan emeriela, n’ihi na Jehova ga-akpọlite ha n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29) Ma, ọ bụ mbibi na-eche Setan. E bibichaa ụwa ọjọọ a, a ga-atụba Setan n’abis ruo otu puku afọ. (Mkpu. 20:1-3) Jizọs chịchaa otu puku afọ, ‘a ga-atọpụ Setan ruo nwa oge’ ka o lee ụmụ mmadụ ule ikpeazụ. Nke ahụ gachaa, e bibie Ekwensu. (Mkpu. 20:7-10) Ihe na-eche Setan jọgburu onwe ya. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị gị. Guzogide Ekwensu ma nọsie ike n’okwukwe gị. Ị ga-emerili n’ọgụ anyị na Setan na-alụ.