Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ntachi Obi Dị Unu Mkpa”

“Ntachi Obi Dị Unu Mkpa”

E NWERE otu nwaanyị aha ya bụ Amaka. * Mgbe e mechara ya baptizim, ya abụrụ Onyeàmà Jehova, di ya malitere imegide ya. Amaka kwuru, sị: “Ọ naghị ekwe m gaa ọmụmụ ihe. O nyekwara m iwu ka m ghara ịna-akpọ aha Chineke. M kpọhaala Jehova, ezigbo iwe abịa ya.”

Nsogbu ọzọ Amaka nwere bụ otú ọ ga-esi akụziri ụmụ ha banyere Jehova. O kwuru, sị: “Di m ekweghị ka e fee Jehova n’ụlọ anyị. Enweghị m ike ịnọ ebe ọ ga-ahụ m mụọrọ ụmụ m Baịbụl, ma ya fọdụzie ịkpọ ha gaa ọmụmụ ihe.”

Nsogbu a Amaka nwere gosiri na onye ezinụlọ mmadụ nwere ike ịna-emegide ya, mee ka o siere ya ike irubere Chineke isi. Nsogbu ndị ọzọ nwere ike ịbụ na mmadụ na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala, na nwa ya, di ya ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ ma ọ bụkwanụ na onye ezinụlọ ya kwụsịrị ife Jehova. N’ihi ya, olee ihe nwere ike inyere Onye Kraịst aka iji obi ya niile na-ejere Jehova ozi?

Mgbe ụdị nsogbu ahụ bịaara gị, gịnị ka ị ga-eme? Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ntachi obi dị unu mkpa.” (Hib. 10:36) Ma, gịnị nwere ike inyere gị aka ịtachi obi?

NA-ARỊỌ JEHOVA N’EKPERE KA O NYERE GỊ AKA

Otu ụzọ dị mkpa anyị ga-esi merie ọnwụnwa bịaara anyị bụ ịna-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka. Dị ka ihe atụ, chegodị ihe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Ana mere mgbe di ya nwụrụ na mberede. Ya na di ya ebiela afọ iri atọ. Ana sịrị: “Ọ lọtaghị ọrụ n’ụbọchị ahụ. Ọ dị naanị iri afọ ise na abụọ.”

Gịnị nyeere Ana aka idi ya? Ọrụ ọ malitere ịrụ nyeere ya aka n’ihi na ọ bụ ụdị ọrụ ọ ga-eji uche ya niile na-arụ. Ma, o meghị ka o chefuo ihe mere ya. O kwuru, sị: “M gwara Jehova otú ọ dị m n’obi, rịọkwa ya ka o nyere m aka idi ọnwụ di m.” Jehova ọ̀ zara ekpere ya? Obi siri Ana ike na ọ zara ya. Ọ sịrị: “Udo nke Chineke mere ka obi ruo m ala, meekwa ka isi ghara ikopụ m. Ọ naghị eme m obi abụọ na Jehova ga-akpọlite di m n’ọnwụ.”—Fil. 4:6, 7.

Jehova kwere ndị ya nkwa na ọ ga-anụ ekpere ha nakwa na ọ ga-enye ha ihe niile ga-enyere ha aka ịna-efe ya. (Ọma 65:2) Ọ̀ bụ na i kwetaghị na nkwa a o kwere na-eme ka okwukwe anyị sie ike? Ọ́ naghị eme ka ị hụ ihe mere ị ga-eji na-atachi obi?

ỌMỤMỤ IHE ỌGBAKỌ NA-ENYERE ANYỊ AKA

Jehova ji ọgbakọ Ndị Kraịst enyere ndị ya aka. Dị ka ihe atụ, mgbe a na-akpagbu ụmụnna nọ n’ọgbakọ Tesalonaịka, Pọl gbara ha ume, sị: “Na-akasirịtanụ ibe unu obi ma na-ewulirịtanụ ibe unu elu, dị nnọọ ka unu na-eme.” (1 Tesa. 2:14; 5:11) Ihe nyeere ụmụnna ndị ahụ aka imeri ọnwụnwa bịaara ha bụ na ha hụrụ ibe ha n’anya. Ọ bụ ya mere ha ji na-anọkọ, na-enyekwara ibe ha aka. Otú ha si tachie obi na-akụziri anyị ihe anyị kwesịrị ime, meekwa ka anyị mata ihe ga-enyere anyị aka ịtachi obi.

Anyị na ndị nọ n’ọgbakọ kwesịrị ịna-akpachi anya, ka anyị nwee ike ịna-agbarịta ibe anyị ume, karịchaa n’oge nsogbu. (Rom 14:19) Pọl onyeozi hụsiri anya n’ihi na a kpagburu ya. Ma Jehova nyeere ya aka ịtachi obi. Mgbe ụfọdụ, Chineke si n’aka ụmụnna gbaa ya ume. Dị ka ihe atụ, mgbe Pọl na-ezigara ndị nọ n’ọgbakọ dị na Kọlọsi ozi ekele, o kwuru na ha ‘na-enyere ya aka, na-emekwa ka ọ dị ike.’ (Kọl. 4:10, 11) Ha hụrụ Pọl n’anya. N’ihi ya, mgbe ihe siiri ya ike, ha kasiri ya obi, gbaakwa ya ume. O nwere ike ịbụ na o nweela mgbe ndị nọ n’ọgbakọ unu gbara gị ume otú ahụ ma nyere gị aka.

GWA NDỊ OKENYE KA HA NYERE GỊ AKA

Ndị ọzọ Chineke nwere ike iji nyere anyị aka n’ọgbakọ bụ ndị okenye. Ha nwere ike ịgba gị ume ma nye gị ezigbo ndụmọdụ si na Baịbụl. Ha dị ka “ebe izere ifufe na ebe mgbaba iji zere oké mmiri ozuzo, dị ka mmiri iyi ndị dị n’ala mmiri na-adịghị, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala kpọrọ nkụ.” (Aịza. 32:2) Ihe a Baịbụl kwuru na-eme ka obi sie anyị ike. Ị̀ na-agwa ndị okenye ka ha nyere gị aka? Otú ha ga-esi gbaa gị ume ma nyere gị aka nwere ike ime ka ị na-atachi obi.

N’eziokwu, ndị okenye anaghị arụ ọrụ ebube. Ha bụ mmadụ na-ezughị okè, nweekwa “ụdị adịghị ike ndị [anyị] nwere.” (Ọrụ 14:15) Ma, ekpere ha ga-ekpere gị nwere ike ịbara gị ezigbo uru. (Jems 5:14, 15) Dị ka ihe atụ, ndị okenye gbara otu nwanna nwoke bi n’Ịtali ume. Nwanna a arịaala ajọ ọrịa kemgbe ọtụtụ afọ. Ọ sịrị: “Otú ụmụnna ndị a si hụ m n’anya ma na-abịa eleta m mgbe mgbe nyeere m aka ịtachi obi.” Ọ bụrụ na e nwere nsogbu gị na ya na-alụ, Jehova chọrọ ka ị gwa ndị okenye ka ha nyere gị aka.

NA-AGBASI MBỌ IKE N’OZI JEHOVA

E nwere ihe ndị ọzọ ga-enyere anyị aka ịtachi obi. Otu n’ime ha bụ ịna-agbasi mbọ ike n’ozi Jehova. Ọ bụ ihe otu nwanna aha ya bụ John mere. Mgbe ọ dị afọ iri atọ na itoolu, a chọpụtara na ọ na-arịa ụdị ọrịa kansa ọtụtụ ndị na-anaghị arịa. O kwuru, sị: “O wutere m nke ukwuu n’ihi na akatabeghị m ahụ́.” N’oge ahụ, ọkpara ya dị naanị afọ atọ. John sịrị: “Ọ bụghị naanị nwa anyị ka nwunye m na-elekọta, ọ na-elekọta m, na-enyekwara m aka mgbe ọ bụla m kwesịrị ịga ụlọ ọgwụ.” Ụdị ọgwụ a na-enye John na-akụrisị ya ahụ́, na-enukwa ya agbọ. Ma, ọ bụghị ebe okwu biri. Nna John malitere ịrịa ọrịa ga-egbu ya, e kwesịkwara inwe onye ga na-elekọta ya.

Gịnị nyeere John na ezinụlọ ya aka n’oge ahụ nsogbu zuru ha ahụ́? Ọ sịrị: “N’agbanyeghị na ike na-agwụkarị m, anyị ejighị ofufe Jehova egwu egwu. Anyị na-aga ọmụmụ ihe niile, na-aga ozi ọma kwa izu, na-enwechikwa ofufe ezinụlọ anyị anya, ma mgbe ọ na-adịrịghị anyị mfe.” John mụtara na ọ dị mkpa ka o mee ka adịm ná mma ya na Jehova sie ezigbo ike. N’agbanyeghị na ụjọ ji ya ná mmalite, ya ana-echegbukwa onwe ya, obi mechara ruo ya ala. Ọ ma na Jehova hụrụ ya n’anya nakwa na o nyere ya ike ịtachi obi. Jehova ga-enyekwara gị aka otú ahụ mgbe ọ bụla ị na-echegbu onwe gị ma ọ bụ mgbe ụjọ ji gị. John sịrị: “Jehova ga-eme ka i sie ike otú ahụ o mere ka m sie.”

O doro anya na Chineke ga-enyere anyị aka idi nsogbu ọ bụla anyị nwere ma ugbu a ma n’ọdịnihu. Na-arịọ Jehova n’ekpere ka o nyere gị aka. Gị na ụmụnna kpachiwe anya. Gwa ndị okenye ka ha nyere gị aka, na-agbasikwa mbọ ike n’ozi Jehova. I mee ihe ndị a, ọ ga-egosi na ị na-echeta ihe Pọl onyeozi kwuru, ya bụ, “Ntachi obi dị unu mkpa.”

^ para. 2 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.