Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kwadebe Ugbu A Maka Ibi n’Ụwa Ọhụrụ

Kwadebe Ugbu A Maka Ibi n’Ụwa Ọhụrụ

“[Gwa ha] ka ha na-arụ ọrụ ọma, . . . ka ha wee jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.”1 TIM. 6:18, 19.

ABỤ: 125, 40

1, 2. (a) Olee ihe ị na-atụ anya ya mgbe ụwa ga-aghọ Paradaịs? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee ihe ga-akacha eme anyị obi ụtọ n’ụwa ọhụrụ?

ANYỊ na-atụ anya “ndụ ebighị ebi.” Pọl onyeozi kpọrọ ya “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” (Gụọ 1 Timoti 6:12, 19.) Ọ pụtara na ọtụtụ n’ime anyị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ Paradaịs. O siri ike ịmatacha otú obi ga-adị anyị mgbe anyị ga na-eteta ụra kwa ụbọchị, ahụ́ esie anyị ike, obi adị anyị ụtọ, uche akpakọọkwa anyị ọnụ. (Aịza. 35:5, 6) Chegodị ụdị obi ụtọ ị ga-enwe mgbe gị na ndị ezinụlọ unu na ndị enyi gị ga na-anọrị, ma ndị a kpọlitere n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) Ị ga-enwe ohere ịmụta ihe ọhụrụ, mụtakwuokwa ndị nke ị ma ama. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịmụtakwu ihe banyere sayensị, ịkụ egwú ma ọ bụ ịtụ ụkpụrụ ụlọ.

2 N’agbanyeghị ihe ọma ahụ niile anyị na-atụ anya ha, ọ bụ ife Jehova ga-akacha eme ka anyị nwee obi ụtọ n’ụwa ọhụrụ. Chegodị otú ndụ ga-adị mgbe mmadụ niile ga na-edo aha Jehova nsọ ma ghọta na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị. (Mat. 6:9, 10) Obi ga-adị anyị ụtọ ịhụ na ọ bụzi naanị ndị zuru okè bi n’ụwa otú ahụ Chineke chọrọ. Cheekwa otú ọ ga-esi dịkwuo mfe anyị na Jehova ịna-adịkwu ná mma, anyị ejiri nwayọọ nwayọọ zuo okè.Ọma 73:28; Jems 4:8.

3. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-akwadebe maka ya ugbu a?

3 Obi siri anyị ike na Jehova ga-emere anyị ihe ọma ndị a n’ihi na Jizọs sịrị na “n’ebe Chineke nọ, ihe niile kwere omume.” (Mat. 19:25, 26) Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ibi n’ụwa ọhụrụ ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụ ugbu a ka anyị kwesịrị ‘ijidesi’ ndụ ebighị ebi ike. Anyị ma na ọgwụgwụ ụwa ochie a dị ezigbo nso. N’ihi ya, otú anyị si ebi ndụ kwesịrị igosi na anyị na-atụ anya na ọ ga-abịa mgbe ọ bụla. Anyị kwesịrị ime ike anyị niile ugbu a iji kwadebe maka ibi n’ụwa ọhụrụ. Ka anyị chọpụta otú anyị ga-esi eme ya.

OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-AKWADEBE

4. Olee otú anyị ga-esi na-akwadebe ugbu a maka ibi n’ụwa ọhụrụ? Nye ihe atụ.

4 Olee otú anyị ga-esi na-akwadebe ugbu a maka ibi n’ụwa ọhụrụ Chineke? Ka e were ya na anyị chọrọ ịkwaga mba ọzọ. Olee otú anyị ga-esi akwadebe? Ihe mbụ anyị nwere ike ime bụ ịmụwa asụsụ ndị ebe ahụ. Ịmụ ihe gbasara omenala ha ga-abakwara anyị uru. Anyị nwere ike ịmata ụdị nri ha na-eri. Anyị mee otú ahụ, ọ ga-adịwa anyị ka ànyị ebirila ebe ahụ. A sị ka e kwuwe, ọ bụ otú ahụ ka anyị ga-esizi na-ebi ndụ ozugbo anyị ruru ebe ahụ. Anyị kwesịrị ime ụdị ihe ahụ n’ihe gbasara ụwa ọhụrụ anyị na-atụ anya ya. Otú anyị ga-esi gosi na anyị na-akwadebe maka ya bụ ịgbalịsi ike na-ebi ndụ ugbu a ka à ga-asị na anyị abaala na ya. Ka anyị leba anya n’ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi eme ya.

5, 6. Olee otú ime ihe nzukọ Jehova na-agwa anyị ugbu a ga-esi nyere anyị aka ịkwadebe maka ụwa ọhụrụ?

5 N’ụwa taa, Setan chọrọ ka ndị mmadụ chee na ha nwere ike ịna-eme ihe sọrọ ha. Ọtụtụ ndị chere na onye ọ bụla kwesịrị iji aka ya na-ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ nakwa na ọ baghị uru irubere Chineke isi. Olee ihe ụdị echiche a kpatarala? Ọ kpatala ahụhụ, enweghị obi ụtọ, na nsogbu ndị ọzọ. (Jere. 10:23) Ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị ihe niile. Anyị na-atụsi anya ike mgbe mmadụ niile ga na-erubere ya isi n’ụwa ọhụrụ.

6 N’ụwa ọhụrụ, obi ga-adị anyị ụtọ ịna-eme ihe nzukọ Jehova ga-agwa anyị iji mee ka ụwa ghọọ paradaịs, kụziekwara ndị a kpọlitere n’ọnwụ ihe. A ga-enwe ọtụtụ ọrụ Jehova ga-achọ ka a rụọ mgbe ahụ. Ma, gịnị ka anyị ga-eme ma a gwa anyị rụọ ụdị ọrụ anyị na-anaghị achọ ịrụ? Ànyị ga-erube isi? Ànyị ga-agbalịsi ike ime ihe a gwara anyị mee? Ọtụtụ n’ime anyị ga-asị, ‘Eenụ.’ N’ihi ya, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ànyị na-eme ihe nzukọ Jehova na-agwa anyị ugbu a?’ Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, ọ pụtara na anyị na-akwadebe maka ịdị ndụ ebighị ebi mgbe Jehova ga na-achị ihe niile.

7, 8. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-akwado ndị Jehova ji eduzi nzukọ ya? (b) Olee ihe ndị a gbanweere ụmụnna ụfọdụ? (ch) Olee obi ike anyị kwesịrị inwe banyere ụwa ọhụrụ?

7 Otú anyị ga-esi na-akwadebe maka ibi n’ụwa ọhụrụ abụghị naanị ịna-erubere nzukọ Jehova isi ugbu a. Anyị kwesịkwara ịgba mbọ ka ihe anyị nwere na-eju anyị afọ, mụtakwa iji otu obi soro ụmụnna anyị na-arụ ọrụ. Dị ka ihe atụ, e nye anyị ọrụ anyị na-arụtụbeghị, anyị kwesịrị iji obi anyị niile rụọ ya ma gbalịsie ike ịna-enwe obi ụtọ. Ọ bụrụ na anyị amụta ịna-akwado ndị Jehova ji na-eduzi ọgbakọ ya ugbu a, ọ ga-adịrị anyị mfe ime otú ahụ n’ụwa ọhụrụ. (Gụọ Ndị Hibru 13:17.) Mgbe ndị Izrel banyere n’Ala Nkwa, e ji ife nza kenye ndị ọ bụla ala nke ha. (Ọnụ Ọgụ. 26:52-56; Jọsh. 14:1, 2) Taa, anyị amaghị ebe a ga-asị onye ọ bụla n’ime anyị biri n’ụwa ọhụrụ. Ma, ọ bụrụ na anyị amụta ime ihe a gwara anyị ugbu a, obi ga-adị anyị ụtọ ime uche Jehova n’agbanyeghị ebe anyị ga-ebi mgbe ahụ.

8 Chegodị ihe ùgwù ọ ga-abụ ibi n’ụwa ọhụrụ Chineke mgbe Alaeze ya ga na-achị. Ọ bụ ya mere obi ji adị anyị ụtọ ịna-akwado nzukọ Jehova ugbu a ma na-eme ihe ọ bụla a gwara anyị mee. Ma, mgbe ụfọdụ, e nwere ike ịgbanwere anyị ọrụ. Dị ka ihe atụ, e zipụla ụfọdụ ndị so n’ezinụlọ Betel dị́ n’Amerịka ka ha gaa kwusawa ozi ọma. Nká ma ọ bụ ihe ndị ọzọ emeela ka ụfọdụ ndị nlekọta sekit bụrụzie ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Obi dị ha ụtọ n’ebe ọhụrụ ha na-eje ozi. Jehova na-agọzikwa ha. Ọ bụrụ na anyị na-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka, na-eme ike anyị niile n’ozi ya ma jiri obi anyị niile nabata ọrụ ọ bụla e nyere anyị, obi ga na-adị anyị ụtọ. Jehova ga-agọzikwa anyị. (Gụọ Ilu 10:22.) Olee otú ihe a si gbasa ụwa ọhụrụ anyị na-atụ anya ya? O nwere ike ịbụ na e nwere ebe anyị ga-achọ ibi mgbe ahụ. Ma, e nwere ike ịgwa anyị kwaga ebe ọzọ. N’agbanyeghị ebe anyị ga na-eje ozi mgbe ahụ na ihe anyị ga na-arụ, obi ga na-adị anyị ezigbo ụtọ na anyị bi n’ụwa ọhụrụ.Nehe. 8:10.

9, 10. (a) Gịnị mere o nwere ike iji dị mkpa ka anyị nwee ndidi n’ụwa ọhụrụ? (b) Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị nwere ndidi?

9 N’ụwa ọhụrụ, o nwere ike ịdị mkpa mgbe ụfọdụ ka anyị nwee ndidi. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịnụ na obi dị ụfọdụ ndị ụtọ n’ihi na a kpọlitela ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha n’ọnwụ. Ma, o nwere ike ịbụ na anyị ga-echere ka a kpọlite ndị nwụnahụrụ anyị. Ụdị ihe a mee, ànyị ga-eso ndị ọzọ ṅụrịa ọṅụ ma nwee ndidi? (Rom 12:15) Ọ bụrụ na anyị amụta iji ndidi chere ka Jehova mezuo nkwa ya ugbu a, anyị ga na-enwekwa ndidi mgbe ahụ.Ekli. 7:8.

10 Ụzọ ọzọ anyị ga-esi gosi na anyị na-ejikere maka ibi n’ụwa ọhụrụ bụ inwe ndidi n’ihe banyere eziokwu a na-akụziri anyị. Ànyị na-amụsi ihe ike ma nwee ndidi ka e ji nwayọọ nwayọọ na-eme ka eziokwu Baịbụl dokwuo anya taa? Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, o nwere ike ime ka ọ ghara isiri anyị ike inwe ndidi n’ụwa ọhụrụ mgbe Jehova ga-eme ka a mata ihe ọ chọrọ ka ụmụ mmadụ mee.Ilu 4:18; Jọn 16:12.

11. Gịnị ka Jehova na-akụziri anyị ugbu a banyere adịm ná mma anyị na ndị ọzọ? Olee uru ọ ga-abara anyị n’ụwa ọhụrụ?

11 Àgwà ọzọ anyị kwesịrị ịmụta iji gosi na anyị adịla njikere ibi n’ụwa ọhụrụ bụ ịgbaghara ndị ọzọ. N’otu puku afọ ahụ Kraịst ga-achị, o nwere ike iwetụ oge tupu mmadụ niile, ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume, ezuo okè. (Ọrụ 24:15) Ànyị ga-ahụ ibe anyị n’anya ma na-agbaghara ibe anyị mgbe ahụ? Ọ bụrụ na anyị amụta ịna-agbaghara ndị ọzọ kpamkpam, na-agbakwa mbọ ka anyị na ha na-adị ná mma ugbu a, ọ ga-adịrị anyị mfe ime otú ahụ n’ụwa ọhụrụ.Gụọ Ndị Kọlọsi 3:12-14.

12. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-akwadebe ugbu a maka ụwa ọhụrụ?

12 N’ụwa ọhụrụ, o nwere ike ọ bụghị mgbe niile ka anyị ga-enweta ihe anyị chọrọ mgbe anyị chọrọ ya. Anyị ga na-ekele Jehova ma nwee obi ụtọ n’ọnọdụ ọ bụla anyị nọ. N’eziokwu, ọ ga-abara anyị uru ma anyị mụta àgwà ndị a Jehova na-akụziri anyị ugbu a. Ime otú ahụ ga-egosi na anyị kwetara na ụwa ọhụrụ ga-abịa n’eziokwu nakwa na anyị na-akwadebe maka ndụ ebighị ebi. (Hib. 2:5; 11:1) Anyị ga-egosikwa na anyị chọrọ ka ụwa ọhụrụ bịa, bụ́ ebe mmadụ niile ga na-erubere Jehova isi.

LEKWASỊ ANYA N’OZI JEHOVA

Jiri ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe

13. Olee ihe ga-akacha anyị mkpa n’ụwa ọhụrụ?

13 Ka anyị tụlee ụzọ ọzọ anyị ga-esi na-akwadebe maka ụwa ọhụrụ. N’agbanyeghị na Chineke kwere nkwa na nri ga-abụ atụrụ tawa, nakwa na ọ ga-egboro anyị mkpa anyị ndị ọzọ n’ụwa ọhụrụ, ihe ga-akacha mee anyị obi ụtọ bụ adịm ná mma anyị na Jehova. (Mat. 5:3) Ijere ya ozi ga-abụ ihe kacha anyị mkpa. Anyị ga-egosikwa na ọ na-atọ anyị ụtọ. (Ọma 37:4) Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe gbasara ife Jehova kpọrọ ihe, anyị na-akwadebe maka ụwa ọhụrụ.Gụọ Matiu 6:19-21.

14. Olee ihe ndị na-eto eto ga-ekpebi ime n’ozi Jehova, nke ga-eme ka obi ha dịrị n’ụwa ọhụrụ?

14 Olee otú anyị ga-esi mee ka ijere Jehova ozi na-atọkwu anyị ụtọ? Ọ bụ ikpebi ihe ndị anyị ga-eme n’ozi Jehova. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, chee otú ị ga-esi jiri ndụ gị jeere Jehova ozi. Ọ ga-adị mma ka i mee nchọnchọ n’akwụkwọ anyị ka ị mata ụdị ozi oge niile ndị e nwere. I nwere ike ikpebi nke ị ga-abanye. * Gị na ndị jerela ozi oge niile ọtụtụ afọ nwekwara ike ikwurịta ya. Ọ bụrụ na i jiri ndụ gị jeere Jehova ozi, ị ga-amụta ihe ga-abara gị uru. Ị ga-eji ihe ị mụtara jeere Jehova ozi n’ụwa ọhụrụ.

Soro na-arụ ihe ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova

15. Olee ihe dị iche iche ndị ohu Jehova nwere ike ikpebi ịna-eme?

15 Gịnị na gịnị ka anyị nwere ike ikpebi ime n’ozi Jehova? Anyị nwere ike ikpebi ịmụta otú anyị ga-esi na-emekwu nke ọma n’ikwusa ozi ọma. Anyị nwekwara ike ịgbalịsi ike ka anyị ghọtakwuo ihe Baịbụl kwuru na otú anyị ga-esi na-eme ya. Ihe ọzọ anyị nwere ike ikpebi ime bụ ịmụtakwu ịgụ ihe na ikwu okwu n’ihu ọha ma ọ bụ ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. O doro anya na i nwere ike icheta ihe ndị ọzọ i nwere ike ime. Ma, ihe ị ga-eburu n’obi bụ na i kpebie ihe ị ga-eme n’ozi Jehova, ọ ga-enyere gị aka ịna-anụkwu ọkụ n’obi ma na-akwadebe maka ụwa ọhụrụ.

JEHOVA NA-AGỌZI ANYỊ UGBU A

Gosi na obi dị gị ụtọ maka ihe a na-akụziri anyị

16. Gịnị mere ijere Jehova ozi ji bụrụ ụzọ kacha mma anyị ga-esi bie ndụ?

16 Iwepụta oge na-akwadebe maka ụwa ọhụrụ Chineke ọ̀ pụtara na anyị agaghị na-ebi ndụ bara uru ugbu a? Mbanụ. Ife Jehova bụ ụzọ kacha mma mmadụ ga-esi bie ndụ. Anyị anaghị efe Jehova n’ihi na a manyere anyị amanye ma ọ bụ naanị ka anyị lafere oké mkpagbu na-abịanụ. Ọ bụrụ na anyị na Jehova dị ná mma, ndụ anyị ga-aka mma, obi adịkwuo anyị ụtọ. Ọ bụ otú ahụ ka Chineke kere anyị ka anyị si na-ebi ndụ. Jehova ịhụ anyị n’anya ma na-eduzi anyị ka ụdị ndụ ọ bụla ọzọ mmadụ nwere ike ibi mma. (Gụọ Abụ Ọma 63:1-3.) Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị agaghị echere ka ụwa ọhụrụ bịa tupu Jehova agọzie anyị maka ozi anyị ji obi anyị niile na-ejere ya. Ọ na-agọzi anyị ugbu a. Ụfọdụ n’ime anyị ahụla otú o si na-agọzi ha kemgbe ọtụtụ afọ. Ihe ndị anyị hụrụla emeela ka anyị mata na ife Jehova bụ ụzọ kacha mma anyị ga-esi bie ndụ.Ọma 1:1-3; Aịza. 58:13, 14.

Na-achọ ntụziaka si n’Akwụkwọ Nsọ

17. Olee otú ntụrụndụ na ihe ndị na-amasị anyị ga-adịru ná mkpa na Paradaịs?

17 N’ụwa ọhụrụ, anyị ga-enwe ohere ime ihe ndị na-amasị anyị nakwa ịtụrụ ndụ. A sị ka e kwuwe, ọ bụrụ na Jehova achọghị ka anyị na-enwe obi ụtọ ma nweta ezigbo ihe ndị na-agụ anyị, gịnịkwanụ mere o ji kee anyị ka ihe ndị ahụ na-agụ anyị? (Ekli. 2:24) Jehova si otú a egosi na ya ‘ga-ewere ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.’ (Ọma 145:16) Ntụrụndụ na izu ike abụghị ihe ọjọọ. Ma, ha ga-akacha tọọ anyị ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ewere adịm ná mma anyị na Jehova ka ihe kacha mkpa. Otú ahụ ka ọ ga-adịkwa n’ụwa ọhụrụ. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwe ka ịchụ ihe nke aka anyị megharịa anyị anya. Kama, anyị kwesịrị ‘ibu ụzọ na-achọ alaeze Chineke’ ma lekwasị anya ná ngọzi ndị anyị na-enweta n’ozi anyị na-ejere Jehova.Mat. 6:33.

18. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-akwadebe maka ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ Paradaịs?

18 N’ụwa ọhụrụ, anyị ga-enwe ụdị obi ụtọ anyị na-enwetụbeghị. Ka anyị gosi na anyị chọsiri ike inweta ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-akwadebe maka ya ugbu a. Ka anyị mụta àgwà ndị ahụ Jehova na-akụziri anyị, jirikwa ezigbo obi ụtọ na ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, bụ́ ọrụ Chineke nyere anyị. Ka anyị mee ka ijere Jehova ozi na-atọ anyị ụtọ. Ka anyị tụkwasị nkwa niile Jehova kwere obi ma na-ebi ndụ ugbu a otú ga-egosi na anyị na-atụ anya ibi n’ụwa ọhụrụ.