Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Na-akwanyerenụ Ndị Dị Otú Ahụ Ùgwù”

“Na-akwanyerenụ Ndị Dị Otú Ahụ Ùgwù”

KEMGBE afọ 1992, Òtù Na-achị Isi na-ahọpụta ndị okenye ruru eru, ndị ferela Jehova ọtụtụ afọ, ka ha na-enyere kọmitii ha dị́ iche iche aka n’ọrụ ha. * Ụmụnna ndị a só ‘n’atụrụ ọzọ’ na-enyere Òtù Na-achị Isi ezigbo aka. (Jọn 10:16) Ha na-eso kọmitii e kenyere ha aga nnọkọ kwa izu. Ha na-ekwu ihe ha ma banyere ihe a na-atụle, na-atụkwa aro. Ọ bụ Òtù Na-achị Isi na-ekpebi ihe a ga-eme. Ma, ụmụnna ndị na-enyere ha aka na-ahụ na e mere ihe ahụ ha kpebiri. Ha na-arụkwa ọrụ ọ bụla e nyere ha. Ha na-eso ndị só n’Òtù Na-achị Isi aga mgbakọ mba niile na mgbakọ ndị pụrụ iche ná mba ndị ọzọ. E nwekwara ike iziga ha alaka ụlọ ọrụ dị́ iche iche ka ha nọchite anya isi ụlọ ọrụ anyị.

Otu nwanna só na-enyere Òtù Na-achị Isi aka kemgbe afọ 1992 sịrị: “Ịrụ ọrụ e nyere m na-eme ka Òtù Na-achị Isi nwee ike ilekwasịkwu anya n’ọrụ ha.” Nwanna ọzọ rụrụla ọrụ ahụ iri afọ abụọ sịrị: “Ọ bụ ihe ùgwù karịrị ihe ọ bụla m tụrụla anya ya.”

Òtù Na-achị Isi enyela ndị na-enyere ha aka ọtụtụ ọrụ. Obi dịkwa ha ụtọ na ụmụnna ndị a ji obi ha niile na-arụ ọrụ. Ka anyị niile ‘na-akwanyere ndị dị otú ahụ ùgwù.’—Fil. 2:29.

^ para. 2 Gụọ peeji nke 131 n’akwụkwọ bụ́ Alaeze Chineke Amalitela Ịchị! ka ị hụ ebe e depụtara ọrụ niile kọmitii isii nke Òtù Na-achị Isi na-arụ.