Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Nyekwuo Anyị Okwukwe”

“Nyekwuo Anyị Okwukwe”

“Nyere m aka n’ebe okwukwe dị m mkpa!”—MAK 9:24.

ABỤ: 81, 135

1. Olee otú okwukwe dịruru ná mkpa? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

Ị̀ JỤTỤLA onwe gị, sị, ‘Àbụ m ụdị onye Jehova ga-achọ ichebe n’oké mkpagbu ma mee ka ọ banye n’ụwa ọhụrụ?’ N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe anyị ga-eme ka Jehova chebe anyị. Ma, Pọl onyeozi kwuru otu ihe dị́ ezigbo mkpa. Ọ sịrị: ‘Ọ bụrụ na okwukwe adịghị, ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị Chineke ezi mma.’ (Hib. 11:6) O nwere ike iyi ihe dị́ mfe, ma nke bụ́ eziokwu bụ na “ọ bụghị mmadụ niile nwere okwukwe.” (2 Tesa. 3:2) Amaokwu Baịbụl abụọ a na-enyere anyị aka ịghọta na inwe okwukwe siri ike dị ezigbo mkpa.

2, 3. (a) Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe Pita kwuru banyere otú okwukwe si dị́ mkpa? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Ihe Pita onyeozi kwuru gosiri na okwukwe dị mkpa. O kwuru banyere okwukwe “a nwalere anwale,” nke ga-abụ “ihe na-eweta otuto na ebube na nsọpụrụ mgbe a ga-ekpughe Jizọs Kraịst.” (Gụọ 1 Pita 1:7.) Ebe oké mkpagbu na-abịa n’ike n’ike, anyị kwesịrị ịchọpụta ma ànyị nwere ụdị okwukwe ga-eme ka anyị soro ná ndị Eze anyị dị́ ebube ga-echebe mgbe ọ ga-abịa ibibi ụwa ochie a. O doro anya na anyị chọrọ ịbụ “ndị nwere okwukwe ka e wee chebe mkpụrụ obi ha ndụ.” (Hib. 10:39) N’ihi ya, ka anyị rịọ Chineke ihe otu nwoke rịọrọ Jizọs, ya bụ, “Nyere m aka n’ebe okwukwe dị m mkpa!” (Mak 9:24) Ma ọ bụkwanụ, anyị arịọ ihe ndịozi Jizọs rịọrọ. Ha sịrị: “Nyekwuo anyị okwukwe.”—Luk 17:5.

3 N’ihi otú inwekwu okwukwe si dị́ mkpa, ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a bụ: Olee otú anyị ga-esi nwekwuo okwukwe? Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị nwere okwukwe? Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Chineke ga-aza ekpere anyị na-ekpe ka o nyekwuo anyị okwukwe?

OTÚ ANYỊ GA-ESI NWEE ỤDỊ OKWUKWE GA-EME CHINEKE OBI ỤTỌ

4. Olee ndị akụkọ banyere ha nwere ike ime ka anyị mee ka okwukwe anyị sie ike?

4 Baịbụl kwuru, sị: “Ihe niile e dere n’oge gara aga, e dere ha iji nye anyị ntụziaka.” N’ihi ya, anyị ga-amụta ezigbo ihe n’ihe Baịbụl kọrọ banyere ọtụtụ ndị nwere okwukwe n’oge ochie. (Rom 15:4) Anyị gụọ banyere Ebreham, Sera, Aịzik, Jekọb, Mozis, Rehab, Gidiọn, Berak, na ọtụtụ ndị ọzọ, o nwere ike ime ka anyị chebara okwukwe anyị echiche. (Hib. 11:32-35) Anyị gụọkwa banyere ụmụnna ndị nwere okwukwe pụrụ iche n’oge anyị a, o nwere ike ime ka anyị na-agba mbọ ka okwukwe anyị sie ike. *

5. Olee otú Ịlaịja si gosi na o nwere okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ? Gịnị ka ihe o mere kwesịrị ime ka anyị chebara echiche?

5 Otu n’ime ndị Baịbụl kọrọ akụkọ ha bụ Ịlaịja onye amụma. Ka ị na-atụgharị uche n’akụkọ a, cheta ihe ise o mere iji gosi na ọ tụkwasịrị Jehova obi. Nke mbụ bụ na mgbe ọ gwara Eze Ehab na Jehova ga-eme ka ọkọchị kọọ, o ji obi ike sị ya: “Dị nnọọ ka Jehova . . . dị ndụ, . . . igirigi agaghị ada, mmiri agaghịkwa ezo . . . ọ gwụla ma m̀ kwuru ka o mee!” (1 Eze 17:1) Nke abụọ bụ na Ịlaịja kwetara na Jehova ga na-egboro ya na ndị ọzọ mkpa ha n’oge ahụ mmiri na-agaghị ezo. (1 Eze 17:4, 5, 13, 14) Nke atọ bụ na obi siri ya ike na Jehova ga-akpọlite nwa otu nwaanyị di ya nwụrụ n’ọnwụ. (1 Eze 17:21) Nke anọ bụ na o meghị ya obi abụọ na Jehova ga-eme ka ọkụ si n’eluigwe repịa àjà ya n’Ugwu Kamel. (1 Eze 18:24, 37) Nke ise bụ na tupu mmiri ezoo, Ịlaịja ji obi ike sị Ehab: “Lawa, rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ; n’ihi na ụda nke mkpọtụ oké mmiri ozuzo na-ada.” (1 Eze 18:41) Ụdị akụkọ ahụ ọ́ naghị eme ka anyị chebara onwe anyị echiche iji mata ma okwukwe anyị ò sikwara ike?

GỊNỊ KA ANYỊ GA-EME KA OKWUKWE ANYỊ SIE IKE?

6. Gịnị ka Jehova ga-enye anyị iji mee ka okwukwe anyị sie ike?

6 Ebe ọ bụ na anyị agaghị enweli okwukwe n’ike nke aka anyị, anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka o nye anyị mmụọ nsọ ya. N’ihi gịnị? N’ihi na okwukwe so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ ya. (Gal. 5:22) Anyị kwesịrị ịna-arịọ ka Chineke nyekwuo anyị mmụọ nsọ otú ahụ Jizọs sịrị ka anyị na-eme. O kwere anyị nkwa na Jehova ‘ga-enye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ.’—Luk 11:13.

7. Nye ihe atụ gosiri otú anyị ga-esi mee ka okwukwe anyị na-esikwu ike.

7 Anyị nwehaala okwukwe, anyị kwesịrị ịna-eme ka ọ na-esikwu ike. E nwere ike iji okwukwe tụnyere ọkụ. É jiri nkụ kwanye ọkụ, o nwere ike inwusiwe ike. Ma, á kwụsị itinyekwu ya nkụ, ọ ga-emecha nyụọ kpamkpam. Ma, á na-etinyekwu ya nkụ, ọ ga na-enwu n’anyụghị anyụ. Ọ bụ otú ahụ ka okwukwe anyị dị. Ọ bụrụ na anyị ana-agụ ma na-amụ Okwu Chineke kwa ụbọchị, anyị ga-ahụkwu Jehova n’anya, jirikwa Baịbụl kpọrọ ihe. Okwukwe anyị agaghị anyụ ka ọkụ, kama ọ ga na-esikwu ike.

8. Olee ihe ga-enyere anyị aka ka okwukwe anyị sikwuo ike?

8 Olee ihe ọzọ ị ga-eme ka okwukwe gị sikwuo ike? Echela na naanị ihe ndị ahụ ị mụtara tupu e mee gị baptizim ezuola. (Hib. 6:1, 2) Dị ka ihe atụ, ịmụ banyere amụma Baịbụl ndị mezurula ga-eme ka okwukwe gị na-esikwu ike. I nwekwara ike iji ihe Baịbụl kwuru chọpụta ma okwukwe gị ọ̀ dị ka nke ndị ahụ Baịbụl kwuru na okwukwe ha siri ike.—Gụọ Jems 1:25; 2:24, 26.

9, 10. Olee otú ihe ndị a si eme ka okwukwe anyị sie ike: (a) ezigbo ndị enyi? (b) ọmụmụ ihe? (ch) ozi ọma?

9 Pọl onyeozi gwara ụmụnna ya ka ha ‘na-agbarịta ibe ha ume, onye ọ bụla site n’okwukwe nke ibe ya.’ (Rom 1:12) Ka anyị na ụmụnna anyị na-akpakọrịta, anyị ga na-eme ka okwukwe ibe anyị na-esi ike, karịchaa ma ọ bụrụ na ndị anyị na ha na-anọrị bụ ndị ‘a nwalerela’ okwukwe ha. (Jems 1:3) Mkpakọrịta ọjọọ na-eme ka okwukwe ghara isi ike, ma ezigbo ndị enyi na-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike. (1 Kọr. 15:33) Ọ bụ ya mere e ji dụọ anyị ọdụ ka anyị ghara ‘ịna-ahapụ nzukọ anyị,’ kama ka anyị “na-agbarịta ibe anyị ume.” (Gụọ Ndị Hibru 10:24, 25.) Ihe ọzọ bụ na ihe ndị anyị na-amụ n’ọmụmụ ihe na-emekwa ka okwukwe anyị sie ike. Ọ dabara adaba n’ihi na Pọl onyeozi kwuru, sị: “A na-esi n’ihe a nụrụ enwe okwukwe.” (Rom 10:17) N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-agbalịsi ike ka m na-agachi ọmụmụ ihe anya?’

10 Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị na-emekwa ka okwukwe anyị na nke ndị ọzọ sie ike. Dị ka Ndị Kraịst oge ochie, anyị na-amụta inwe okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ, jirikwa obi ike na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla.—Ọrụ 4:17-20; 13:46.

11. Gịnị mere Keleb na Jọshụa ji nwee okwukwe siri ike? Olee otú anyị ga-esi mee ka ha?

11 Okwukwe anyị ga na-esikwu ike ma anyị hụ otú Jehova si na-enyere anyị aka nakwa otú o si na-aza ekpere anyị. Ụdị ihe a mere ka okwukwe Keleb na Jọshụa sie ike. Ha gosiri na ha nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ mgbe ha gara ledo Ala Nkwa ahụ. Ka oge na-aga, okwukwe ha sikwuru ike ka ha na-ahụ otú Jehova si na-enyere ha aka. Ka a sịkwa ihe mere obi ji sie Jọshụa ike, ya asị ndị Izrel: “Ọ dịghị otu ihe n’ime ihe ọma niile Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu nke na-emezughị.” O mechara kwuokwa, sị: “Tụọnụ egwu Jehova, feekwanụ ya n’ụzọ na-enweghị ntụpọ nakwa n’eziokwu . . . Ma mụ onwe m na ezinụlọ m, anyị ga-efe Jehova.” (Jọsh. 23:14; 24:14, 15) Ọ bụrụ na anyị ahụ ihe gosiri na Jehova dị mma, obi ga-esikwa anyị ike otú ahụ.—Ọma 34:8.

OTÚ ANYỊ GA-ESI GOSI NA ANYỊ NWERE OKWUKWE

12 Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị nwere okwukwe siri ike? Jems, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, zara ajụjụ a. Ọ sịrị: “M ga-egosikwa gị okwukwe m site n’ọrụ m.” (Jems 2:18) Omume anyị ga-egosi na okwukwe anyị bụ nke ezigbo ya. Ka anyị leba anya n’ihe atụ ụfọdụ.

Ndị na-eme ihe niile ha nwere ike ime iji na-ekwusa ozi ọma na-egosi na ha nwere okwukwe siri ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13. Gịnị mere ikwusa ozi ọma ji egosi na anyị nwere okwukwe?

13 Ikwusa ozi ọma bụ ụzọ magburu onwe ya anyị ga-esi gosi na anyị nwere okwukwe. N’ihi gịnị? N’ihi na ikwusa ozi ọma na-egosi na anyị kwetara na Chineke ga-ebibi ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya nakwa na “ọ gaghị anọ ọdụ.” (Hab. 2:3) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịma ma okwukwe anyị ò sikwara ike, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ikwusa ozi ọma ọ̀ dị m ezigbo mkpa? M̀ na-agbalịsi ike ịgwa ndị ọzọ banyere Chineke? M̀ na-achọ ụzọ dị́ iche iche m ga-esi jekwuoro Jehova ozi?’ (2 Kọr. 13:5) N’eziokwu, otú anyị ga-esi egosi na okwukwe anyị siri ike bụ ‘ịna-eme nkwupụta ihu ọha maka nzọpụta,’ ya bụ, ịna-ekwusa ozi ọma.—Gụọ Ndị Rom 10:10.

14 Anyị nwekwara ike igosi na anyị nwere okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ ka anyị na-edi nsogbu ndị na-abịara anyị kwa ụbọchị. Ma ànyị na-arịa ọrịa, ma ànyị dara ogbenye, ma ànyị dara mbà ma ọ bụ na nsogbu ọzọ bịaara anyị, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova na Jizọs ga-enyere anyị aka “n’oge kwesịrị ekwesị.” (Hib. 4:16) Otú anyị ga-esi egosi na anyị nwere ụdị obi ike ahụ bụ ịna-ekpe ekpere ka Jehova nyere anyị aka. Jizọs gwara anyị ka anyị na-arịọ Jehova ka o “nye anyị nri anyị ga-eri taa dị ka ihe ga-ezuru anyị taa si dị.” (Luk 11:3) Ihe ndị a kọrọ na Baịbụl na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga na-egboro anyị mkpa anyị. Dị ka ihe atụ, mgbe e nwere oké ọkọchị n’Izrel, Jehova nọ na-enye Ịlaịja nri na mmiri. Baịbụl kwuru, sị: “Ugoloọma na-ewetakwara ya achịcha na anụ n’ụtụtụ nakwa achịcha na anụ n’anyasị, ọ nọkwa na-aṅụ mmiri si n’iyi ndagwurugwu ahụ.” (1 Eze 17:3-6) Anyị nwere okwukwe na Jehova ga na-egbokwara anyị mkpa anyị.

Idi nsogbu ndị na-abịara anyị na-egosi na anyị nwere okwukwe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14, 15. (a) Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị nwere okwukwe? (b) Kọọ akụkọ mere eme nke gosiri na mmadụ nwere okwukwe siri ike.

15 Obi siri anyị ike na anyị mee ihe Baịbụl kwuru, anyị ga-enwe ike ịna-egboro ndị ezinụlọ anyị mkpa ha. Otu nwanna nwaanyị bí n’Eshia kọwara otú ya na di ya na ụmụ ya si mee ihe e kwuru na Matiu 6:33 na Ilu 10:4, ya bụ, ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke nakwa ịna-arụsi ọrụ ike. O kwuru na di ya chọpụtara na ọrụ ya nwere ike ime ka ya na Jehova ghara ịdị ná mma. N’ihi ya, ọ gbara arụkwaghịm. Ma, ha nwere ụmụ anọ ha na-elekọta. Ọ bụ ya mere ha ji malite ire nri. Otú ha si na-arụsi ọrụ ike mere ka ha na-akpata ego ha ji na-egbo mkpa ezinụlọ ha. Nwanna nwaanyị ahụ sịrị: “Anyị ghọtara na Jehova ahapụghị anyị. O nweghị mgbe anyị na-ahụghị ihe anyị ga-eri.” È nwetụla mgbe i mere ihe gosiri na obi siri gị ike na ime ihe Baịbụl kwuru na-abara ndị mmadụ ezigbo uru n’oge anyị a?

16. Gịnị ga-eme ma anyị tụkwasị Chineke obi?

16 O kwesịghị ịna-eme anyị obi abụọ ma Chineke ọ̀ ga-enyere anyị aka ma anyị mee ihe o kwuru. Mgbe Pọl onyeozi na-ekwughachi ihe Habakọk onye amụma kwuru, ọ sịrị: “Onye ezi omume ga-adị ndụ n’ihi okwukwe ya.” (Gal. 3:11; Hab. 2:4) N’ihi ya, anyị kwesịrị inwe okwukwe siri ezigbo ike n’ebe Chineke nọ n’ihi na ọ bụ ya ga-enyere anyị aka n’eziokwu. Pọl chetaara anyị na Chineke bụ “onye ahụ nke pụrụ ime ihe nke ukwuu karịa ihe niile anyị na-arịọ ma ọ bụ na-eche n’echiche dị ka ike ya nke na-arụ ọrụ n’ime anyị si dị.” (Efe. 3:20) Ndị ohu Jehova na-agbalịsi ike ime ihe dị́ Chineke mma, ma ha makwa na e nwere ihe ndị ha na-agaghị emeli. N’ihi ya, ha na-atụkwasị Jehova obi na ọ ga-agọzi mbọ ha na-agba. Obi ọ́ naghị atọ anyị ụtọ na Chineke nọnyeere anyị?

E MEERE HA IHE HA RỊỌRỌ

17. (a) Olee otú e si meere ndịozi Jizọs ihe ha rịọrọ? (b) Gịnị mere anyị ga-eji na-atụ anya na Jehova ga-aza ekpere anyị na-ekpe ka o nyekwuo anyị okwukwe?

17 Ugbu a anyị tụlechara ihe ndị a, o nwere ike ịdị anyị otú ahụ ọ dị ndịozi Jizọs mgbe ha rịọrọ ya, sị: “Nyekwuo anyị okwukwe.” (Luk 17:5) Mgbe e meere ha ihe a ha rịọrọ bụ na Pentikọst nke afọ 33 mgbe e nyere ha mmụọ nsọ, ha aghọtakwuo nzube Chineke. O mere ka okwukwe ha sikwuo ike. N’ihi ya, ha malitere ikwusa ozi ọma otú a na-ekwusatụbeghị ya n’oge ahụ. (Kọl. 1:23) Ànyị kwesịrị ịna-atụ anya na a ga-aza ekpere anyị na-ekpe ka e nyekwuo anyị okwukwe? Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na Chineke ga-emere anyị “ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị.”—1 Jọn 5:14.

18. Olee otú Jehova si agọzi ndị na-agba mbọ ka okwukwe ha sie ike?

18 O doro anya na obi na-atọ Jehova ụtọ ma anyị tụkwasị ya obi anyị niile. Ọ ga-enyekwu anyị okwukwe otú anyị na-arịọ ya. Okwukwe anyị ga-esikwu ike, nke ga-eme ka ‘a gụọ anyị ná ndị ruru eru inweta alaeze Chineke.’—2 Tesa. 1:3, 5.

^ para. 4 Ị chọọ ịgụ banyere ụfọdụ n’ime ha, gụọ akụkọ ndụ Lillian Gobitas Klose (na Teta! Bekee, July 22, 1993), Feliks Borys (Teta!, June 8, 1994), nakwa nke Josephine Elias (Teta! Bekee, September 2009).