Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Kwadoro Ofufe Dị Ọcha

Ọ Kwadoro Ofufe Dị Ọcha

Ṅomie Okwukwe Ha

Ọ Kwadoro Ofufe Dị Ọcha

ỊLAỊJA lepụrụ anya hụ ka ìgwè mmadụ na-agbagote Ugwu Kamel. Ọ bụ ezie na mgbe ahụ ka bụ isi ụtụtụ, i lee ha anya ị ga-ahụ na ịda ogbenye na ụkọ nri akpaala ha aka ọjọọ. Mmiri na-ezobeghị n’ala ha kemgbe afọ atọ na ọkara emesiela ha ike.

Narị ndị amụma anọ na iri ise, ndị onwe ha na-ebu isi, so na-agbagote, nganga juru ha isi, ha kpọkwara Ịlaịja onye amụma Jehova asị. Jezibel bụ́ nwunye eze egbuola ọtụtụ ndị ohu Jehova, ma nwoke a ka nọ na-alụsosi Bel ọgụ ike. Ọ̀ ga-alụrukwanụ ya mgbe ole? Ikekwe, ndị nchụàjà ahụ chere na o nweghị otú otu onye ga-esi merie ha niile. (1 Ndị Eze 18:3, 19, 20) Eze Ehab gbaara ụgbọ ịnyịnya ya bịa. Ya onwe ya kwa ahụghị Ịlaịja n’anya.

Taa ga-abụrụ onye amụma ahụ naanị ya kwụ ụbọchị pụrụ iche. Ka Ịlaịja na-ekiri ihe na-emenụ, a na-aga inwe ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ n’etiti ihe ọma na ihe ọjọọ nke ụwa na-ahụtụbeghị ụdị ya. Olee otú ahụ́ dị Ịlaịja n’ụbọchị ahụ? A gaghị asị na egwu ejighị ya n’ihi na ọ “bụ nwoke nwere ụdị mmetụta anyị na-enwe.” (Jems 5:17) Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, otu ihe a doro anyị anya: O doro nnọọ Ịlaịja anya na ya kwụ naanị ya mgbe ahụ ndị ahụ na-enweghị okwukwe na eze ha nke si n’ezi ofufe dapụ na ndị nchụàjà ahụ ndị na-egbu ọchụ gbara ya gburugburu.—1 Ndị Eze 18:22.

Ma, gịnị dubara Izrel ná nsogbu a? Olee otú akụkọ a si gbasa gị taa? Baịbụl gbara anyị ume ka anyị lekwasị ndị ohu Chineke bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi anya, ‘ṅomiekwa okwukwe ha.’ (Ndị Hibru 13:7) Leba anya n’ihe nlereanya Ịlaịja setịpụrụ.

Ọgụ Dị Kemgbe Akpụrụ Ọkụ n’Ọnụ

Kemgbe ọtụtụ afọ ná ndụ Ịlaịja, ọ nọ na-ekiri n’anya n’anya ka a nọ na-eleghara ihe kacha mma n’obodo ya na ihe kacha baara ndị obodo ya uru anya, jirikwa ya mere ihe efu. Ọ dịla anya ọgụ a malitere n’Izrel, ọgụ nke dị n’etiti okpukpe dị ọcha na okpukpe ụgha, ya bụ, n’etiti ofufe Jehova bụ́ Chineke na ikpere arụsị nke mba ndị gbara ha gburugburu. N’oge Ịlaịja, otú ọgụ ahụ si na-aga adịghị mma.

Eze Ehab lụrụ Jezibel, bụ́ ada eze Saịdọn. Jezibel kpebisiri ike na ya ga-eme ka ofufe Bel gbasaa n’ala Izrel dum, nakwa na ya ga-ekpochapụ ofufe Jehova. N’oge na-adịghị anya, Ehab gewere nwaanyị ahụ ntị. O wuuru Bel ụlọ nsọ na ebe ịchụàjà, burukwa ofufe chi ụgha a n’isi. Ọ kpasuru Jehova iwe nke ukwuu.—1 Ndị Eze 16:30-33. *

Gịnị mere ofufe Bel ji jọgbuo onwe ya? O duhiere Izrel, mee ka ha kwụsị ife ezi Chineke. Ọ bụ okpukpe rụrụ arụ, obi takwara ndị na-ekpe ya mmiri. N’okpukpe a, ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-agba akwụna n’ụlọ arụsị, a na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ, a na-achụkwa ụmụaka n’àjà. Jehova wee ziga Ịlaịja ka ọ gakwuru Ehab gwa ya na mmiri agaghị ezokwa ruo mgbe onye amụma Chineke kwuru ka o zoo. (1 Ndị Eze 17:1) Ọtụtụ afọ gafere tupu Ịlaịja agaa ịhụ Ehab ọzọ wee gwa ya ka ọ kpọkọọ ụmụ Izrel na ndị amụma Bel n’Ugwu Kamel.

Olee otú ọgụ a si gbasa anyị taa? Ụfọdụ nwere ike iche na akụkọ banyere ofufe Bel adịghị anyị mkpa n’oge a, ebe ọ bụ na anyị anaghị ahụ ụlọ nsọ Bel na ebe ịchụàjà ya. Ma, ihe a abụghị akụkọ efu na-abaghị uru nke ihe mere n’oge ochie. (Ndị Rom 15:4) Okwu ahụ bụ́ “Bel” pụtara “onyenwe” ma ọ bụ “nna ukwu.” Jehova gwara ndị ya ka ha họrọ ya ka ọ bụrụ “bel” ha ma ọ bụ di nwe ha. (Aịzaya 54:5) Ọ̀ bụ na i kwetaghị na ndị mmadụ ka na-efe nna ukwu dị iche iche ndị na-abụghị Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile? N’ezie, mgbe ndị mmadụ ji ndụ ha na-achụ ego, na-emikpu onwe ha n’ọrụ, ná ntụrụndụ, n’inwe mmekọahụ ma ọ bụ n’ife chi ọzọ dị iche iche ndị mmadụ na-efe kama ife Jehova, ha ji ihe ndị ahụ mere nna ha ukwu. (Matiu 6:24; Ndị Rom 6:16) Ya mere, ihe ndị ahụ e ji mara ofufe Bel ka juru ebe niile taa. Ọgụ ahụ Jehova na Bel lụrụ n’oge ochie nwere ike inyere anyị aka mee ka anyị jiri amamihe họrọ onye anyị ga-efe.

Olee Otú Ha Si “Na-enwe Echiche Abụọ”?

Ọ bụrụ na mmadụ anọrọ n’elu elu Ugwu Kamel, ọ ga-ahụ Izrel nke ọma, malite n’iyi ndagwurugwu Kaịshọn nke dị ná mgbada ruo n’Osimiri Ukwu (ya bụ, Osimiri Mediterenian) nke dị nso, ruokwa n’ugwu Lebanọn nke dị anya, n’ebe ugwu. * N’agbanyeghị na ihu eluigwe dị mma n’ụbọchị ahụ, o nweghị ebe dị mma n’ala ahụ. Ahịhịa niile akpọnwụọla n’ala a na-emebu nri nke Jehova nyere ụmụ Ebreham. Anwụ achakpọọla ala ahụ n’ihi nzuzu ndị Chineke zuzuru! Mgbe ndị ahụ gbakọtawara, Ịlaịja gakwuuru ha wee sị ha: “Ruo ole mgbe ka unu ga na-enwe echiche abụọ dị iche? Ọ bụrụ na ọ bụ Jehova bụ ezi Chineke, sowenụ ya; ma ọ bụrụ na ọ bụ Bel, sowenụ ya.”—1 Ndị Eze 18:21.

Gịnị ka Ịlaịja bu n’obi mgbe o kwuru na ha “na-enwe echiche abụọ dị iche”? Ndị ahụ aghọtaghị na ha kwesịrị ịhọrọ ife Jehova ma ọ bụkwanụ ife Bel. Ha chere na ha ga-achịrị aka abụọ fanye n’ọnụ otu mgbe, ya bụ, na ha ga na-eji ememme nnupụisi ha na-eme Bel obi ụtọ, n’otu mgbe ahụkwa na-arịọ Jehova bụ́ Chineke ka o meere ha amara. Ikekwe, ha chere na Bel ga na-agọzi ihe ha kụrụ n’ubi na anụmanụ ha, “Jehova nke ụsụụ ndị agha” ana-echebe ha n’agha. (1 Samuel 17:45) Ma, ha chefuru otu ihe dị mkpa, bụ́ nke ọtụtụ ndị na-aghọtaghị taa, ya bụ, na Jehova na onye ọzọ anaghị eke ofufe ya. Ihe ọ chọrọ bụ ofufe a na-ekewaghị ekewa, o kwesịkwara ya. Iwere ụdị ofufe ọzọ gwakọta n’ofufe ya adịghị ya mma, ọ bụkwa ịkparị ya akparị!—Ọpụpụ 20:5.

Ya mere, ndị Izrel ahụ nọ “na-enwe echiche abụọ” dị ka nwoke nke na-anwa iso ụzọ abụọ otu mgbe. Ọtụtụ ndị na-eme ụdị ihe ahụ taa, ha na-enwe “bel” ọzọ dị iche iche ná ndụ ha, wee leghara ofufe Chineke anya. Arịrịọ ahụ dị mkpa Ịlaịja rịọrọ ha ka ha kwụsị inwe echiche abụọ nwere ike inyere anyị aka ilebakwu anya n’ihe ndị anyị na-ebute ụzọ ná ndụ na ofufe anyị.

Ule Dị Oké Mkpa

Ihe ọzọ Ịlaịja mere bụ ịgwa ha ka e nwee ule. Ọ bụ ule na-esighị ike. Ndị nchụàjà Bel ga-ewu ebe ịchụàjà ma dokwasị anụ ha ga-eji chụọ àjà n’elu ya; mgbe ahụ, ha ga-ekpeku chi ha ekpere ka o mee ka o nwuru ọkụ. Ịlaịja ga-emekwa otu ihe ahụ. Ọ sịrị: “Ezi Chi nke ji ọkụ za, ọ bụ ya bụ ezi Chineke.” Ịlaịja maara nke ọma onye bụ́ ezi Chineke. Okwukwe ya siri ike nke ukwuu nke na ọ gwara ndị amụma Bel ka ha buru ya ụzọ malite. O mere ka ihe niile dịrị ndị iro ya mfe wee gwa ha ka ha họrọ ehi ha ga-eji chụọ àjà ma buru ụzọ kpọkuo Bel. *1 Ndị Eze 18:24, 25.

Oge anyị a abụghị oge ọrụ ebube. Otú o sina dị, Jehova agbanwebeghị. Anyị pụrụ inwe obi ike n’ebe ọ nọ dị nnọọ ka Ịlaịja nwere. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị ọzọ na-ekwetaghị ihe Baịbụl kwuru, anyị ekwesịghị ịtụwa ụjọ ịhapụ ha ka ha kwuo echiche ha. Dị ka Ịlaịja mere, anyị ga-elekwasị ezi Chineke anya na ọ ga-edozi okwu ahụ. Otú anyị ga-esi mee nke ahụ abụghị ịdabere n’onwe anyị, kama nke ahụ, anyị ga-adabere n’Okwu ya si n’ike mmụọ nsọ, bụ́ nke e dere iji “mee ka ihe guzozie.”—2 Timoti 3:16.

Ndị amụma Bel wee kwadebe anụ ha ga-eji chụọ àjà ma malite ịkpọku chi ha. Ha tiri mkpu ugboro ugboro, sị, “Bel, za anyị!” Ha nọ na-eti mkpu a ruo mgbe ọtụtụ awa gafere. Baịbụl sịrị: “Ma a nụghị olu ọ bụla, ọ dịghịkwa onye na-azaghachi.” N’ehihie, Ịlaịja malitere ịkwa ha emo, na-asị na ọ ga-abụ na ọ dị ihe Bel na-eme nke mere na ọ zabeghị ha, na ọ ga-abụ na ọ gara mposi, ma ọ bụ na ọ na-ehi ụra, na e kwesịrị ịkpọte ya. Ịlaịja gbara ndị aghụghọ ahụ ume ka ha ‘kpọkusie ya ike.’ O doro anya na ọ maara na ofufe Bel bụ ofufe aghụghọ, ọ chọkwara ka ndị Chineke ghọta na ọ bụ ofufe aghụghọ.—1 Ndị Eze 18:26, 27.

Mgbe ahụ, ndị nchụàjà Bel tinyekwuru mgbalị, “malite ịkpọkusi ya ike, jirikwa daga na ube na-amakasị onwe ha dị ka omenala ha si dị, ruo mgbe ha mere ka ọbara na-agba ha n’ahụ́.” Ma nke a enyeghịrị ha aka! “A nụghị olu ọ bụla, ọ dịghịkwa onye na-azaghachi, ọ dịghịkwa onye na-aṅa ntị.” (1 Ndị Eze 18:28, 29) N’eziokwu, ọ dịghị ihe bụ́ Bel. Ọ bụ ihe e chepụtara echepụta nke Setan ji eme ka ndị mmadụ hapụ ife Jehova. Ma ugbu a ma n’oge ochie, mmadụ ịhọrọ nna ukwu ọzọ nke na-abụghị Jehova na-eweta ihere.—Abụ Ọma 25:3; 115:4-8.

Ihe Si n’Ule ahụ Pụta

Mgbe o ruwere uhuruchi, Ịlaịja gbagotere. Ọ rụziri ebe ịchụàjà Jehova nke ndị iro ofufe dị ọcha kụturu. O ji nkume iri na abụọ rụzie ya. Ikekwe, nke ahụ ga-echetara ọtụtụ ndị nọ n’ebo iri nke mba Izrel na ha ka kwesịrị irube isi n’Iwu ahụ e nyere ebo iri na abụọ niile nke Izrel. O wee debe anụ ọ ga-eji chụọ àjà n’elu ya, wụọkwa ebe niile ahụ mmiri nke ọma. Ọ ga-abụ na e kutere mmiri ahụ n’Oké Osimiri Mediterenian nke dị nso n’ebe ahụ. O gwukwara olulu gburugburu ebe ịchụàjà ahụ, gbajuokwa ya mmiri. Ọ bụ ezie na o mere ka ihe niile dịrị ndị amụma Bel mfe, o mere ka ihe niile taara Jehova akpụ n’ihi obi ike o nwere n’ebe Chineke nọ.—1 Ndị Eze 18:30-35.

Mgbe Ịlaịja mechara ihe niile ahụ, o kpere ekpere. Ekpere ahụ na-adịghị ogologo nke Ịlaịja kpere nke ọma gosiri ihe ndị ka ya mkpa. Ihe mbụ kacha ya mkpa bụ na ọ chọrọ ime ka a mara na Jehova “bụ Chineke n’Izrel,” ọ bụghị Bel. Nke abụọ bụ na ọ chọrọ ka mmadụ niile mara na o nweghị ihe ọzọ ọ bụ ma ọ́ bụghị naanị ohu Jehova; na ọ bụ Chineke ka otuto na nsọpụrụ niile kwesịrị ịgara. Nke ikpeazụ bụ na ọ ka nwere mmasị n’ebe ndị ya nọ n’ihi na ọ na-agụsi ya agụụ ike ịhụ ka Jehova mere ka “obi ha chigharịa.” (1 Ndị Eze 18:36, 37) N’agbanyeghị nsogbu niile ekwesịghị ntụkwasị obi ha kpatara, Ịlaịja ka hụrụ ha n’anya. Mgbe anyị na-ekpeku Chineke ekpere, ọ́ gaghị adị mma ka anyị gosi na aha Chineke dị anyị mkpa, na anyị dị umeala n’obi, nakwa na anyị na-emetere ndị nọ ná mkpa ebere?

Tupu Ịlaịja amalite ekpere ya, ìgwè mmadụ ahụ nwere ike ichewe ma Jehova ọ̀ ga-emekwu otú ahụ Bel mere. Ma mgbe o kpechara ekpere ahụ, ọ baraghị ha uru ichewe otú ahụ. Baịbụl sịrị: “Ọkụ nke Jehova wee daa repịa àjà nsure ọkụ ahụ na nkụ ahụ na nkume ndị ahụ na ájá, ọ mịkọkwaara mmiri dị n’olulu ahụ.” (1 Ndị Eze 18:38) A zara ekpere ahụ nke ọma. Gịnị ka ndị ahụ mere?

Ha niile tiri mkpu, sị: “Ọ bụ Jehova bụ ezi Chineke! Ọ bụ Jehova bụ ezi Chineke!” (1 Ndị Eze 18:39) Ha emechaala hụ nke bụ́ eziokwu. Otú ọ dị, ha egosibeghị na ha nwere okwukwe. N’eziokwu, naanị ikweta na Jehova bụ ezi Chineke mgbe ha hụrụ ka ọkụ si n’eluigwe daa n’ihi ekpere Ịlaịja kpere ezughị iji gosi na ha nwere okwukwe. Ya mere, Ịlaịja gwara ha ka ha gosi okwukwe ha n’ụzọ ọzọ. Ọ gwara ha ka ha mee ihe ha kwesịrịla ime kemgbe ọtụtụ afọ gara aga, ya bụ, irubere Iwu Jehova isi. Iwu Chineke sịrị na e kwesịrị igbu ndị amụma ụgha na ndị na-ekpere arụsị. (Diuterọnọmi 13:5-9) Ndị a bụ́ ndị amụma Bel bụ ndị iro Jehova bụ́ Chineke, ndị ma ụma na-agba nzube ya mgba okpuru. È kwesịrị imere ha ebere? Hà meere ụmụaka niile ahụ aka ha dị ọcha ebere, bụ́ ndị ha surere n’ọkụ ná ndụ iji chụọrọ Bel àjà? (Ilu 21:13; Jeremaya 19:5) Ee e, e kwesịghị imere ha ebere. Ya mere, Ịlaịja nyere iwu ka e gbuo ha, e wee gbuo ha.—1 Ndị Eze 18:40.

Ụfọdụ ndị na-akatọ Baịbụl taa na-akatọ ihe a mechara mee n’Ugwu Kamel. Ụfọdụ na-ekwu na ndị na-anụrụ okpukpe ha ọkụ n’obi gabiga ókè nwere ike ịkụgide ya aka na-emeso ndị na-abụghị ndị okpukpe ha ihe ike. N’ezie, ọ dị mwute na e nwere ọtụtụ arụrụala ndị okpukpe ha na-agba ara na-arụ taa. Ma, Ịlaịja abụghị onye okpukpe ya na-agba ara. Ọ bụ Jehova ka ọ rụụrụ ọrụ mgbe o gburu ndị ahụ kwesịrị ọnwụ. Ezigbo Ndị Kraịst maara na ha agaghị egbu ndị ajọ omume otú ahụ Ịlaịja gburu. Mgbe Mesaya bịara n’ụwa, o kwuru ihe ọ chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya na-eme mgbe ọ gwara Pita, sị: “Mịghachi mma agha gị n’ọbọ ya, n’ihi na ndị niile na-eji mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:52) Jehova ga-esi n’aka Ọkpara ya kpee ndị mmadụ ikpe ziri ezi n’ọdịnihu.

Ọrụ ezigbo Ndị Kraịst nwere ịrụ bụ ibi ndụ nke gosiri na ha nwere okwukwe. (Jọn 3:16) Otu n’ime ụzọ anyị ga-esi mee nke ahụ bụ iṅomi ndị nwere okwukwe dị ka Ịlaịja nwere. O fere naanị Jehova, gbaakwa ndị ọzọ ume ka ha mee otú ahụ. O ji obi ike kpughee okpukpe aghụghọ ahụ Setan ji eme ka ndị mmadụ ghara ife Jehova. O nwere ntụkwasị obi na Jehova ga-edozi ihe niile kama ịdabere n’ikike nakwa n’uche nke onwe ya. N’ezie, Ịlaịja kwadoro ofufe dị ọcha. Ka onye ọ bụla n’ime anyị ṅomie okwukwe ya!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe meburu n’etiti Ịlaịja na Ehab, gụọ isiokwu bụ́ “Ì Nwere Okwukwe Yiri nke Elaịja?” nke dị n’Ụlọ Nche nke April 1, 1992.

^ par. 13 Ahịhịa ndụ na-ejupụta n’Ugwu Kamel, n’ihi na ikuku nke si n’oké osimiri na-eme ka mmiri na igirigi na-ede mkpọda ugwu ahụ mgbe niile. Ebe ọ bụ na ha na-ekwu na ọ bụ Bel na-eme ka mmiri zoo, o yiri ka ugwu a ọ̀ bụ ebe dị mkpa maka ofufe Bel. Ebe ọ bụ na Ugwu Kamel akpọọla nkụ, ọ bụ ebe mara mma ịnọ gosi na ofufe Bel enweghị isi.

^ par. 17 Ọ dị mkpa ịmata na Ịlaịja gwara ha, sị: ‘Unu agaghị etinye anụ ahụ unu ga-eji chụọ àjà ọkụ.’ Ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuru na mgbe ụfọdụ ndị ahụ na-ekpere arụsị na-achụ àjà n’ebe ịchụàjà nke a rụnyere oghere zoro ezo n’okpuru ya. N’ihi ya, ọ bụrụ na ha tinye ya ọkụ ya eyie ka ọ bụghị mmadụ tinyere ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 20]

Ịhọrọ nna ukwu ọzọ nke na-abụghị Jehova na-eweta ihere

[Foto dị na peeji nke 21]

“Ọ bụ Jehova bụ ezi Chineke!”