Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obi Eruola M Ala Ọ Bụ Ezie na Obi Kooro M n’Elu Mgbe M Bụ Okorobịa

Obi Eruola M Ala Ọ Bụ Ezie na Obi Kooro M n’Elu Mgbe M Bụ Okorobịa

Obi Eruola M Ala Ọ Bụ Ezie na Obi Kooro M n’Elu Mgbe M Bụ Okorobịa

Dị ka Eusebio Morcillo si kọọ

Na September 1993, agara m n’otu ụlọ mkpọrọ a gbachisiri ogige ike. Agara m ime nwanne m nwaanyị nke nta a tụrụ mkpọrọ, bụ́ Mariví, baptizim. Ụfọdụ ndị mkpọrọ na ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ mkpọrọ ahụ kwanyeere anyị ùgwù wee kirie mgbe m mere ya baptizim. Tupu mụ ekwuo otú mụ na ya si gaa ebe ahụ, ka m kọọ ihe mere mgbe anyị dị obere.

A MỤRỤ m na Spain na May 5, 1954. Anyị dị ụmụ asatọ, abụ m nwa nke mbụ. Mariví bụ nwa nke atọ. Nne nne anyị zụrụ anyị, anyị abụrụ ezigbo ndị Katọlik. M na-echeta na mgbe m bụ nwata obi m na-agwa m na mụ na Chineke dị ná mma mgbe ahụ mụ na nne nne m bi. Ma, a naghị asọpụrụ Chineke n’ụlọ nne na nna m. Papa m na-akụkarị mama m na anyị bụ́ ụmụ ya ihe. Ụjọ na-atụ anyị mgbe niile, ọ na-ewutekwa m ịhụ ka mama m na-ata ahụhụ.

N’ụlọ akwụkwọ, e nwekwara ihe ọzọ na-akụda m obi. Otu n’ime ndị nkụzi anyị, bụ́ ụkọchukwu, na-ebi anyị isi n’ahụ́ ájá ma ọ bụrụ na anyị azataghị ajụjụ. Ụkọchukwu ọzọ na-emetọ ụmụ akwụkwọ ma ha wegara ya ihe omume o nyere ha ka ha mee n’ụlọ. Ozizi ndị Katọlik na-ezi, dị ka ọkụ ala mmụọ, na-esiri m ike nghọta, na-emenyekwa m ụjọ. N’oge na-adịghị anya, m kwụsịrị inwe mmasị n’ebe Chineke nọ.

Amalitere M Ibi Ndụ Na-enweghị Isi

Ebe ọ bụ na mụ anaghị ebi ndụ na-atọ Chineke ụtọ, mụ na ndị na-ebi ndụ rụrụ arụ na ndị na-eme ihe ike bụ́ ndị na-aga egwú disko malitere ịkpa. Ọtụtụ mgbe a na-eji mma, ígwè, karama, na oche alụ ọgụ n’ebe ahụ. Ọ bụ ezie na anaghị m eso alụ ọgụ, otu ụbọchị a kụturu m n’ala mụ atụbọọ.

Mgbe e mechara, ike ebe ahụ gwụrụ m, mụ achọwa ebe ndị ọzọ dịtụ jụụ a na-agba egwú disko. A na-aṅụkwa ọgwụ ike n’ebe ndị ahụ. Kama ọgwụ ike ndị ahụ iwetara m obi ụtọ na obi iru ala, ha na-akpaghasị m uche, na-akpatakwara m nchegbu.

Ọ bụ ezie na ụdị ndụ m na-ebi anaghị enye m obi ụtọ, m mere ka nwanne m nwoke nke nta, bụ́ José Luis, na ezigbo enyi m, bụ́ Miguel, malite ibi ụdị ndụ ahụ. Anyị na ọtụtụ ndị na-eto eto bi na Spain n’oge ahụ biwere ndụ rụrụ arụ. O nweghị ụdị ihe m na-adịghị eme iji nweta ego m ga-eji zụrụ ọgwụ ike. Onwe m gbụrụ m.

Jehova Napụtara M

N’oge a, mụ na ndị enyi m kwuru ọtụtụ ugboro banyere Chineke, na ọ dị adị, kwuokwa ihe mere mmadụ ji dị ndụ. M malitere ịchọ Chineke nke mere m ji chọwa onye m ga-akọrọ ihe dị m n’obi. Amaara m na Francisco, bụ́ otu n’ime ndị mụ na ha na-arụ ọrụ, adịghị ka ndị ọzọ. O yiri ka ò nwere obi ụtọ, na-akwụwa aka ọtọ, dịkwa obiọma, m wee kpebie ịkọrọ ya ihe dị m n’obi. Francisco bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. O nyere m otu Ụlọ Nche nke kwuru banyere ọgwụ ike.

Mgbe m gụchara Ụlọ Nche ahụ, ekpekuru m Chineke ekpere ka o nyere m aka. M sịrị, “Onyenwe anyị, ama m na ị dị adị, achọrọ m ịmara gị, chọọkwa ime uche gị. Biko, nyere m aka!” Francisco na Ndịàmà ndị ọzọ ji Baịbụl gbaa m ume, nyekwa m akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ka m gụọ. M mechara ghọta na ha na-enyere m aka ahụ m rịọrọ Chineke ka o nyere m. N’oge na-adịghị anya, m malitere ịkọrọ ndị enyi m na José Luis banyere ihe m na-amụta.

Otu ụbọchị mụ na ndị enyi m ụfọdụ si n’ebe a na-agba egwú disko pụta, ahapụrụ m ha gaa nọrọ ebe ọzọ. M nọ ebe ahụ na-ele ha, ya edoo m anya na ndụ anyị na-ebi ruru unyi n’ihi ọgwụ ike. Ọ bụ mgbe ahụ ka m kpebiri ịhapụ ibi ụdị ndụ ahụ, kpebiekwa ịghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova.

Arịrịọ m Francisco ka o nye m Baịbụl, o nyere m ya, nyekwa m akwụkwọ bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi. * Mgbe m gụrụ banyere nkwa Chineke kwere na ọ ga-ehichapụ anya mmiri, wepụkwa ọnwụ, o doro m anya na achọtala m eziokwu nke ga-eme ka ụmụ mmadụ nwere onwe ha. (Jọn 8:32; Mkpughe 21:4) E mechaa, m gara ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova. Obi ụtọ na ịhụnanya dị ebe ahụ masịrị m nke ukwuu.

Ebe ọ bụ na ọ gụsiri m agụụ ike ịkọrọ ndị ọzọ ihe mere n’Ụlọ Nzukọ ahụ, akpọkọrọ m José Luis na ndị enyi m ozugbo wee kọọrọ ha ihe niile merenụ. Ụbọchị ole na ole mgbe e mechara, anyị niile gara ọmụmụ ihe. Otu nwatakịrị nwaanyị nọ anyị n’ihu lere anyị anya. O doro anya na o juru ya anya na anyị bu ogologo ntutu bịa, ọ gbalịkwara hụ na ọ tụgharịghị lee anyị anya ọzọ. Ọ ga-abụrịrị na o juru ya anya mgbe anyị bịara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’izu ya nke ọzọ, n’ihi na anyị kpọchiri akpọchi bịa n’ụbọchị a.

N’oge na-adịghị anya, mụ na Miguel gara mgbakọ sekit nke Ndịàmà Jehova. Anyị ahụtụbeghị ihe yiri ya, ya bụ, ụmụnna dị n’otu n’eziokwu, ma ndị okenye ma ụmụaka. Ọ tụrụ anyị n’anya na ebe e nwere mgbakọ ahụ bụ otu ebe ahụ anyị gara egwú disko n’oge na-adịbeghị anya. Ma ná nke ugbu a, otú ebe ahụ dị na egwú anyị nụrụ mere anyị obi ụtọ.

Mụ na ndị enyi m ahụ niile malitere ịmụ Baịbụl. Mgbe ihe dị ka ọnwa asatọ gachara, na July 26, 1974, e mere mụ na Miguel baptizim. Anyị abụọ dị afọ iri abụọ mgbe ahụ. E mere mmadụ anọ n’ime ndị enyi m ahụ baptizim mgbe ọnwa ole na ole gachara. Ihe m mụtara na Baịbụl mere ka m malite inyere mama m, bụ́ onye na-ata ahụhụ kemgbe, aka ịrụ ọrụ dị n’ụlọ, nakwa ịkọrọ ya banyere okpukpe ọhụrụ m. Mụ na ya wee dị ná mma. Ewepụtara m oge dị ukwuu nyere ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwaanyị m tọrọ aka.

Ka oge na-aga, mama m na ụmụnne m niile, ma e wezụga otu, mụtara eziokwu Baịbụl, e wee mee ha baptizim, ha aghọọ Ndịàmà Jehova. Na 1977, alụrụ m Soledad. Ọ bụ ya bụ nwatakịrị nwaanyị ahụ otú anyị dị n’ụbọchị mbụ anyị bịara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze tụrụ n’anya. N’ime ọnwa ole na ole, anyị abụọ ghọrọ ndị ọsụ ụzọ, bụ́ ihe Ndịàmà Jehova na-akpọ ndị na-ekwusa ozi ọma oge niile.

A Napụtara Onye M Hụrụ n’Anya

E metọrọ nwanne m nwaanyị nke nta, bụ́ Mariví, mgbe ọ bụ nwata. Mmeso ọjọọ ahụ kpara ya aka ọjọọ nke ukwuu. Mgbe ọ na-erubeghị afọ iri abụọ, ọ malitere ibi ndụ rụrụ arụ, ya bụ, ịṅụ ọgwụ ike, izu ohi, na ịgba akwụna. A tụrụ ya mkpọrọ mgbe ọ dị afọ iri abụọ na atọ. Ọ nọkwa n’ụlọ mkpọrọ na-ebi ndụ ọjọọ.

N’oge ahụ abụ m onye nlekọta sekit, ya bụ, onye ozi na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova. Na 1989, e zigara mụ na Soledad gburugburu ebe ahụ a tụrụ Mariví mkpọrọ. Obi adịghị ya mma, ndụ gbụkwara ya, n’ihi na ndị ọchịchị napụrụ ya nwa ya nwoke n’oge na-adịbeghị anya. M gara leta ya otu ụbọchị, gwa ya ka mụ na ya mụwa Baịbụl, ya ekweta. Mgbe anyị mụrụ Baịbụl ruo otu ọnwa, ọ kwụsịrị ịṅụ ọgwụ ike, kwụsịkwa ise ụtaba. Obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu ịhụ na Jehova nyere ya ike ime mgbanwe ndị a ná ndụ ya.—Ndị Hibru 4:12.

Obere oge Mariví malitere ịmụ Baịbụl, o bidoro ịkọrọ ndị mkpọrọ ibe ya na ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ mkpọrọ eziokwu dị na Baịbụl. N’agbanyeghị na a na-esi n’otu ụlọ mkpọrọ kpọga ya n’ụlọ mkpọrọ ọzọ, ọ nọgidere na-ekwusa ozi ọma. N’otu ụlọ mkpọrọ, o kwusara ozi ọma site n’otu ọnụ ụlọ mkpọrọ ruo n’ọnụ ụlọ mkpọrọ ọzọ. Kemgbe ọtụtụ afọ, Mariví anọwo na-akụziri ọtụtụ ndị mkpọrọ Baịbụl n’ụlọ mkpọrọ dị iche iche.

Otu ụbọchị, Mariví gwara m na ya chọrọ inyefe Jehova ndụ ya, chọọkwa ka e mee ya baptizim. Ma, e kweghị ka o si n’ụlọ mkpọrọ ahụ pụta, e kweghịkwa ka onye ọ bụla bata mee ya baptizim. Ọ nọkwuru afọ anọ ọzọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ omume ọjọọ jupụtara. Gịnị mere okwukwe ya ka ji sie ike? N’oge ọgbakọ nke dị nso ebe ahụ ji amụ ihe, ọ na-anọ n’ụlọ mkpọrọ mụọ otu ihe ahụ ha na-amụ. Ọ na-amụchi Baịbụl anya, na-ekpechikwa ekpere anya.

E mechaa, a kpọgara Mariví n’ụlọ mkpọrọ a gbachisiri ogige ike nke nwere ebe a na-egwu mmiri. O chere na ebe a a kpọtara ya ga-eme ka ọ dị mfe ime ya baptizim. Ọ bụ otú ahụ ka o mere. E mechara gwa Mariví na e nwere ike ime ya baptizim n’ebe ahụ. Ọ bụ otú ahụ ka m si gawa ikwu okwu si na Baịbụl nke ọ ga-abụ m kwuchaa e mee ya baptizim. Mụ na ya nọ n’oge a kacha mkpa ná ndụ ya.

Ndụ na-adịghị mma Mariví biri na mbụ mere ka o bute ọrịa AIDS. N’agbanyeghị nke ahụ, àgwà ọma ọ na-akpa mere ka a kpọpụta ya n’ụlọ mkpọrọ na March 1994, tupu oge e kwesịrị ịkpọpụta ya eruo. Ya na mama anyị biri afọ abụọ. Tupu ya anwụọ, o biri ndụ otú ezigbo Onye Kraịst kwesịrị ibi.

Imeri Echiche Ọjọọ Na-abata M n’Obi

Otú ndụ m si gaa na mbụ ghọọrọ m nsogbu. Ọnụ papa m mekpọrọ m nakwa otú m si bie ndụ mgbe m na-etolite apụghị m apụ n’ahụ́. Ugbu a m bụ dimkpa, ọtụtụ mgbe obi m na-ama m ikpe, ọ na-adịkwa ka ọ̀ bụ na mụ abaghị uru. Mgbe ụfọdụ, obi na-ada m mbà. Ma, Okwu Chineke enyeworo m aka nke ukwuu ịgbaso echiche ọjọọ a mgba. Ịtụgharị uche mgbe mgbe n’amaokwu ndị dị ka Aịzaya 1:18 na Abụ Ọma 103:8-13 enyerela m aka kemgbe ọtụtụ afọ ịkwụsịlata ikpe obi m na-ama m mgbe niile.

Ekpere bụ ihe ọzọ na-enyere m aka ịkwụsị iche na o nweghị uru m bara. Ọtụtụ mgbe anya mmiri na-eju m anya ma m na-ekpeku Jehova ekpere. Ka o sina dị, ihe dị na 1 Jọn 3:19, 20 na-agba m ume. Ebe ahụ sịrị: “Anyị ga-eji ihe a mara na anyị sitere n’eziokwu ahụ, anyị ga-emekwa ka obi sie anyị ike n’ihu ya banyere ihe ọ bụla obi anyị nwere ike ịma anyị ikpe na ya, n’ihi na Chineke karịrị obi anyị, marakwa ihe niile.”

Ebe ọ bụ na m ji ezi obi “tiwara etiwa, nke nọ ná mwute” agakwuru Chineke, aghọtara m na adịghị m njọ otú ahụ m chere na mbụ. Baịbụl mesiri ndị niile na-achọ Jehova obi ike na ọ naghị eleghara ndị ji obi ha niile chegharịa anya, bụ́ ndị hapụrụ ihe ọjọọ ha na-emebu mewe uche ya.—Abụ Ọma 51:17.

Mgbe ọ bụla ihe na-adịghị mma batara m n’obi, m na-agbalị iche ihe ndị dị mma, ya bụ, ụdị ihe ndị metụtara ofufe Chineke ndị e kwuru ná Ndị Filipaị 4:8. Ebu m Abụ Ọma nke iri abụọ na atọ n’isi, tinyere Ozizi Elu Ugwu. M na-agụ ebe ndị a dị n’Akwụkwọ Nsọ n’obi m mgbe ọ bụla ihe na-adịghị mma batawara m n’obi. Otú a m si ewepụ echiche ọjọọ n’obi m na-abara m uru karịchaa mgbe ụra na-ekweghị atụ m n’abalị.

Ihe ọzọ na-enyere m aka bụ na nwunye m na Ndị Kraịst ndị ọzọ tozuru okè na-aja m mma. Ọ bụ ezie na ọ na-esiri m ike na mbụ ịnabata ume ha na-agba m, ma Baịbụl enyerela m aka ịghọta na ịhụnanya “na-ekwere ihe niile.” (1 Ndị Kọrịnt 13:7) Ejirila m nke nta nke nta mụta iji umeala n’obi were onwe m otú m hụrụ ya, n’agbanyeghị adịghị ike m.

Otu uru echiche na-adịghị mma mụ na ya na-agba mgba baara m bụ na o nyerela m aka ịbụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke nwere obiọma. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ma mụ ma nwunye m ekwusaala ozi ọma oge niile afọ iri atọ afọ iri atọ. Ọṅụ m na-enweta n’ijere ndị ọzọ ozi na-enyere m aka ichefutụ ihe ọjọọ ndị mere m ná ndụ bụ́ ndị m na-echeta.

Ugbu a, m cheta ngọzi niile Jehova gọziri m, ọ na-emetụ m n’obi ikwu ihe otu ọbụ abụ kwuru, sị: “Gọzie Jehova, . . . onye na-agbaghara gị njehie gị dum, onye na-agwọ gị ọrịa gị niile, onye napụtara ndụ gị n’olulu, onye kpuwere gị obiọma na ebere dị ka okpueze.”—Abụ Ọma 103:1-4.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya, ma a naghịzi ebipụta ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 30]

Ọtụtụ mgbe, obi m na-ama m ikpe, ọ na-adịkwa ka ọ̀ bụ na mụ abaghị uru. Ma, Okwu Chineke enyeworo m aka nke ukwuu ịgbaso echiche ọjọọ a mgba

[Foto ndị dị na peeji nke 27]

Nwanne m nwoke bụ́ José Luis na enyi m bụ́ Miguel, bụ́ ndị sooro ihe nlereanya m setịpụrụ

[Foto dị na peeji nke 28, 29]

Ezinụlọ Morcillo na 1973

[Foto dị na peeji nke 29]

Mgbe Mariví nọ n’ụlọ mkpọrọ

[Foto dị na peeji nke 30]

Mụ na nwunye m bụ́ Soledad