Olee Mgbe Alaeze Chineke Ga-abịa?
Olee Mgbe Alaeze Chineke Ga-abịa?
“ONYENWE ANYỊ, ị̀ na-eweghachiri Izrel alaeze ahụ n’oge a?” (Ọrụ 1:6) Ọ gụsiri ndịozi Jizọs agụụ ike ịmata mgbe Jizọs ga-eweta Alaeze ya. Taa, mgbe ihe dị ka puku afọ abụọ gaferela, ọ ka na-agụsi ndị mmadụ agụụ ike ka a zaa ajụjụ bụ́: Olee mgbe Alaeze Chineke ga-abịa?
Ebe ọ bụ na ihe Jizọs ji mere isiokwu ya mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma bụ Alaeze Chineke, ọ ga-abụ na ọ zara ajụjụ ahụ. N’ezie, ọ zara ya! O kwuru okwu ọtụtụ ugboro banyere oge pụrụ iche nke ọ kpọrọ oge “ọnụnọ” ya. (Matiu 24:37) Oge ọnụnọ ya ahụ na mgbe Alaeze Mesaya ga-amalite ịchị ga-abụ otu mgbe. Gịnị ka ọnụnọ ya a pụtara? Ka anyị tụlee ihe anọ dị oké mkpa Baịbụl kwuru banyere ọnụnọ Kraịst.
1. Ọnụnọ Kraịst ga-amalite ma ogologo oge gafechaa mgbe ọ nwụrụ. N’otu ihe atụ Jizọs mere, o ji onwe ya tụnyere otu nwoke nke “jere n’ala dị anya ka ọ gaa nweta ike ọchịchị ma lọta.” (Luk 19:12) Olee otú amụma a yiri ihe atụ si mezuo? Jizọs nwụrụ e wee kpọlite ya n’ọnwụ. O wee gaa “n’ala dị anya,” ya bụ, eluigwe. Dị ka Jizọs buru n’amụma n’ihe atụ yiri nke ahụ, mgbe ọ ga-alọta wee malite ịchị ga-abụ “mgbe ogologo oge gasịrị.”—Matiu 25:19.
Afọ ole na ole mgbe Jizọs rịgochara eluigwe, Ndị Hibru 10:12, 13) Ya mere, mgbe Jizọs ruru n’eluigwe, o cheere ruo ogologo oge. Oge ahụ zuru mgbe Jehova bụ́ Chineke mere Ọkpara ya Eze Alaeze Mesaya bụ́ Alaeze e kwere nkwa ya kemgbe. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọnụnọ Kraịst malitere. Ndị mmadụ nọ n’ụwa hà ga-ahụ ihe a pụrụ iche mgbe ọ na-eme?
Pọl onyeozi dere, sị: “Nwoke a [ya bụ, Jizọs] chụrụ otu àjà maka mmehie ruo mgbe niile wee nọdụ ala n’aka nri Chineke, malite mgbe ahụ gaa n’ihu, ọ nọ na-echere ruo mgbe a ga-edebe ndị iro ya ka ha bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ ya.” (2. Ndị mmadụ agaghị eji anya nkịtị hụ ọnụnọ ya. Cheta na Jizọs kwuru banyere ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya. (Matiu 24:3) Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ ga-eji anya nkịtị hụ ọnụnọ ya, ihe ịrịba ama ọ̀ ga-adị mkpa? Ka e were ya na ị na-aga ịhụ oké osimiri. I nwere ike ịhụ ihe e dere ede ga-egosi gị ụzọ e si aga ebe ahụ, ma ozugbo i rutere n’ikpere oké osimiri ahụ wee guzoro hụ ka ebe niile bụ mmiri mmiri, ị̀ ka ga-atụ anya ka ị hụ nnukwute bọọdụ e dere ihe nke sịrị: “Ihe a bụ Oké Osimiri”? Mbanụ! Ọ̀ bara uru idere gị ihe ga-egosi gị ihe i ji anya gị abụọ na-ahụ?
Ihe mere Jizọs ji kwuo ihe ga-abụ ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya abụghị iji gosi ndị mmadụ ihe ha nwere ike iji anya ha hụ, kama ọ bụ iji nyere ha aka ịghọta ihe ga-eme n’eluigwe. Ọ bụ ya mere Jizọs ji sị: “Alaeze Chineke agaghị abịa n’ụzọ pụtara oké ìhè.” (Luk 17:20) Oleezi otú ihe ịrịba ama ahụ ga-esi gosi ndị nọ n’ụwa na ọnụnọ Kraịst amalitela?
3. Ihe a ga-eji amata ọnụnọ Jizọs ga-abụ oké nsogbu ga-adị n’ụwa a. Jizọs kwuru na ihe a ga-eji amata oge ọnụnọ ya, mgbe ọ ga-abụ Eze n’eluigwe, ga-abụ agha, ụnwụ, ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe, na mmebi iwu. Ihe ndị a ga-ejupụta n’ụwa. (Matiu 24:7-12; Luk 21:10, 11) Gịnị ga-akpata nsogbu a niile? Baịbụl kwuru na iwe ji Setan, bụ́ “onye na-achị ụwa a,” maka na ọ maara na ugbu a Kraịst ghọrọ Eze, ọnụnọ Jizọs amalitekwa, oge ya fọdụrụ nnọọ ntakịrị. (Jọn 12:31; Mkpughe 12:9, 12) N’oge anyị a, e nwere ọtụtụ ihe a na-ahụ anya ndị na-egosi na iwe ji Setan nakwa na ọnụnọ Kraịst amalitela. Ihe àmà ndị a juru ebe niile n’ụwa karịchaa kemgbe 1914, bụ́ afọ ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme kwetara na ọ bụ mgbe ihe gbanwere n’ụwa.
Ihe a niile nwere ike ịdị ka akụkọ ọjọọ, ma, ọ bụghị akụkọ ọjọọ. Ihe ọ pụtara bụ na Alaeze Mesaya ahụ na-achị achị ugbu a n’eluigwe. N’oge na-adịghị anya, ọchịchị ahụ ga-amalite ịchị ụwa. Ma, olee otú ndị mmadụ ga-esi mara banyere Alaeze ahụ ka ha wee nabata ya ma ghọọ ndị ọ na-achị?
4. Ihe a ga-eji mata ọnụnọ Jizọs bụ ozi ọma a na-ekwusa n’ụwa niile. Jizọs kwuru na oge ọnụnọ ya ga-adị ka “ụbọchị Noa.” * (Matiu ) Ọ bụghị naanị ụgbọ ka Noa wuru; ọ bụkwa “onye na-ekwusa ezi omume.” ( 24:37-392 Pita 2:5) Noa dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị na Chineke na-aga ikpe ụwa ikpe. Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga na-arụ ọrụ yiri nke ahụ n’oge ọnụnọ ya. O buru amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Matiu 24:14.
Dị ka anyị hụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ, Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị niile dị n’ụwa a. Ọrụ ikwusa ozi ọma na-eme ka ndị mmadụ mara na ọchịchị eluigwe a ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya, na-emekwa ka mmadụ niile nwee ohere ịlanahụ mbibi na-abịa nakwa ịghọ ndị Alaeze ahụ na-achị. Ajụjụ dị mkpa bụ, Ị̀ ga-ege ntị?
Alaeze Chineke Ọ̀ Ga-abụrụ Gị Ozi Ọma?
Ozi Jizọs zisara mere ka ndị mmadụ nwee olileanya na-enweghị atụ. Mgbe ụmụ mmadụ nupụchara isi n’Iden n’ọtụtụ puku afọ gara aga, Jehova bụ́ Chineke zubere ihiwe ọchịchị nke ga-eme ka ihe dị mma. Ọchịchị ahụ ga-emekwa ka ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi malite ibi ụdị ndụ Chineke buuru ha n’obi ná mmalite, ya bụ, ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs n’ụwa a. Ò nwere ihe na-enye obi ụtọ karịa ịmara na ọchịchị a e kwere ná nkwa kemgbe na-achị achị ugbu a n’eluigwe? Nke a abụghị akụkọ ifo, kama ọ bụ ihe na-eme eme ugbu a!
Eze ahụ Chineke họpụtara na-achị ugbu a n’etiti ndị iro ya. (Abụ Ọma 110:2) N’ụwa a rụrụ arụ nke ya na Chineke na-adịghị ná mma, Mesaya ahụ na-eme ihe Nna ya chọrọ, ya bụ, ọ na-achọ ndị niile chọrọ ịmara onye Chineke bụ n’ezie, bụ́ ndị chọrọ ife ya ofufe “n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:24) Ndị si n’agbụrụ niile, ma nwata ma okenye, ma onye ukwu ma onye nta, nwere ike inwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi ma Alaeze Chineke chịwa. (Ọrụ 10:34, 35) Anyị na-agba gị ume ka ị ghara ikwe ka ohere a magburu onwe ya kwaa gị. Mụta banyere Alaeze Chineke ugbu a, ka i wee soro ná ndị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ma ọchịchị ezi omume a chịwa!—1 Jọn 2:17.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 10 Ihe Jizọs kwuru na-eme ka anyị ghara inwe echiche na-ezighị ezi ụfọdụ nsụgharị Baịbụl nyere bụ́ ndị na-asụgharịtaghị okwu ahụ bụ́ “ọnụnọ.” Ụfọdụ nsụgharị sụgharịrị ya “ọbịbịa,” ma ọ bụ “nlọghachi,” bụ́ nke na-egosi na ihe niile a agaghị ewe oge. Ma, cheta na Jizọs ejighị ọnụnọ ya tụnyere Iju Mmiri ụbọchị Noa, bụ́ nke na-eweghị oge ọ bụla, kama o ji ya tụnyere “ụbọchị Noa,” ya bụ, oge pụrụ iche. Ọnụnọ Kraịst ga-adị ka oge Noa n’ihi na ọ bụ mgbe ndị mmadụ ga-eji obi ha niile na-achụ ihe nke ụwa nke ga-eme ka ha leghara ịdọ aka ná ntị a na-adọ ha anya.
[Foto ndị dị na peeji nke 8 na 9]
Akụkọ ọjọọ ndị anyị na-anụ kwa ụbọchị na-egosi na ihe ọma ga-abịa n’oge na-adịghị anya
[Ebe E Si Nweta Foto]
Égbè e ji agbatu ụgbọelu: foto Ndị Agha U.S.