Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ozizi Evolushọn Ò Kwekọrọ na Baịbụl?

Ozizi Evolushọn Ò Kwekọrọ na Baịbụl?

Ozizi Evolushọn Ò Kwekọrọ na Baịbụl?

Ọ̀ BỤ eziokwu na otú Chineke si kee ụmụ mmadụ bụ ime ka ha si n’ụmụ anụmanụ pụta? Chineke ò mere ka ụmụ irighiri ihe dị ndụ ghọọ azụ̀, azụ̀ aghọọ anụ na-akpụ akpụ, anụ na-akpụ akpụ aghọọ anụ nwere ụkwụ anụ, anụ nwere ụkwụ anọ aghọzie adaka, adaka aghọọ mmadụ? Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na ndị ndú okpukpe na-ekwu na ha kweere ma n’ozizi evolushọn ma na Baịbụl. Ha sịrị na ihe Baịbụl kwuru na Jenesis bụ ilu. Ikekwe o nweela mgbe ị jụrụ, sị, ‘Ozizi ahụ a na-ezi na mmadụ si n’ụmụ anụmanụ pụta ò kwekọrọ na Baịbụl?’

Ịghọta otú anyị si malite ịdị ndụ dị anyị mkpa iji mara ndị anyị bụ, ebe anyị na-aga, nakwa otú anyị kwesịrị isi na-ebi ndụ. Ọ bụ naanị mgbe anyị matara otú mmadụ si malite ịdị ndụ ka anyị ga-amata ihe Chineke ji kwe ka ahụhụ dịrị, matakwa ihe bụ́ nzube ya maka ọdịnihu ụmụ mmadụ. Anyị na Chineke agaghị adị ná mma ma ọ bụrụ na o doghị anyị anya na ọ bụ ya kere anyị. Ya mere, ka anyị tụlee ihe Baịbụl kwuru banyere otú ụmụ mmadụ si malite ịdị ndụ, ndụ ha na-adị ugbu a na ọdịnihu ha. Anyị ga-ahụkwa ma ozizi evolushọn ò kwekọrọ na Baịbụl.

Mgbe Ọ Bụ Naanị Otu Onye Nọ n’Ụwa

Ndị kweere n’ozizi evolushọn na-ekwu na ìgwè ụmụ anụmanụ ji nke nta nke nta ghọọ ìgwè ụmụ mmadụ. Ha ekwetaghị na ọ dị mgbe naanị otu onye nọ n’ụwa. Ma, Baịbụl kwuru ihe dị iche na nke ahụ. Ọ sịrị na ọ bụ otu onye aha ya bụ́ Adam mụrụ anyị. Baịbụl kwuru na Adam bụ nwoke dịrị ndụ n’ezie. Ọ gwara anyị aha nwunye ya, gwakwa anyị aha ụmụ ya ụfọdụ. Ọ kọọrọ anyị ọtụtụ ihe Adam mere, ihe o kwuru, mgbe o biri ndụ, na mgbe ọ nwụrụ. Jizọs eleghị akụkọ ahụ anya dị ka akụkọ ifo a na-akọrọ ndị na-agụghị akwụkwọ. Mgbe ọ na-agwa ndị ndú okpukpe gụrụ akwụkwọ okwu, ọ sịrị: “Ọ̀ bụ na unu agụghị na onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwaanyị?” (Matiu 19:3-5) Mgbe ahụ, Jizọs kwuru ihe e dere na Jenesis 2:24 banyere Adam na Iv.

Luk, bụ́ onye so dee Baịbụl, bụrụkwa ọkọ akụkọ nke leziri anya n’ihe ọ kọrọ, kọrọ na Adam bụ mmadụ dịrị ndụ n’ezie dị ka Jizọs dịrị. Luk deere usoro ọmụmụ Jizọs ruo na nwoke mbụ ahụ. (Luk 3:23-38) Pọl onyeozi gwara ìgwè mmadụ okwu, sị: “Chineke nke kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya . . . sitekwara n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ, ka ha biri n’elu ala dum.” (Ọrụ 17:24-26) Ndị ọkà ihe ọmụma, bụ́ ndị gụrụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ndị Grik a ma ama, so ná ndị ọ gwara okwu ahụ. O doro anya na Baịbụl na-akụzi na anyị sitere “n’otu mmadụ.” Ihe Baịbụl kwuru banyere otú ndụ mmadụ dị ná mmalite ò kwekọrọ n’ozizi evolushọn?

Otú Mmadụ Si Ghọọ Onye Na-ezukwaghị Okè

Baịbụl kwuru na mmadụ mbụ Jehova kere zuru okè. Chineke agaghị eke ihe na-ezughị okè. Baịbụl kwuru banyere ihe e kere eke, sị: “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo ya . . . E mesịa, Chineke hụrụ ihe niile o mere, ma, lee! ha dị nnọọ mma.” (Jenesis 1:27, 31) Olee otú mmadụ zuru okè na-adị?

Mmadụ zuru okè nweere onwe ya ịhọrọ ihe ọ bụla ọ chọrọ ime, nweekwa ikike iṅomi àgwà Chineke ruo n’isi. Baịbụl sịrị: “Ụmụ mmadụ ziri ezi mgbe ezi Chineke kere ha, ma ha onwe ha echepụtawo ọtụtụ atụmatụ.” (Ekliziastis 7:29) Adam họọrọ inupụrụ Chineke isi. Isi Adam nupụrụ mere ka ọ ghọọ onye na-ezukwaghị okè, meekwa ka ụmụ ya bụrụ ndị na-ezughị okè. Ihe mere anyị ji eme ihe na-adịghị mma, ọbụna mgbe anyị chọrọ ime ihe dị mma, bụ na anyị ezughị okè. Pọl onyeozi dere, sị: “Ihe m na-achọ ime ka m na-adịghị eme; ma ihe m kpọrọ asị ka m na-eme.”—Ndị Rom 7:15.

Baịbụl kwuru na mmadụ zuru okè ga-adị ndụ ebighị ebi, nweekwa ahụ́ ike zuru okè. N’ihi ihe Chineke gwara Adam, o doro anya na nwoke mbụ ahụ agaraghị anwụ anwụ ma à sị na o nupụghị isi. (Jenesis 2:16, 17; 3:22, 23) Jehova agaraghị asị na mmadụ o kere “dị nnọọ mma” ma à sị na mmadụ ahụ ga na-arịa ọrịa ma ọ bụ na-enupụ isi. Ihe mere mmadụ ji enwe nkwarụ, na-arịakwa ọrịa, ọ bụ ezie na otú Chineke si kee ahụ́ mmadụ magburu onwe ya, bụ n’ihi ezughị okè. Ya mere, ozizi evolushọn ekwekọghị na Baịbụl. Ozizi evolushọn na-akọ na ụmụ mmadụ adịla mma ugbu a karịa ụmụ anụmanụ ha bụbu ná mmalite. Baịbụl na-akụzi na ụmụ mmadụ ndị nọ ugbu a adịrukwaghị mma otú onye mụrụ ha, bụ́ nwoke zuru okè, dịbu.

Echiche ahụ bụ́ na Chineke mere ka mmadụ si n’ụmụ anụmanụ pụta ekwekọghịkwa n’ụdị onye Baịbụl kwuru na Chineke bụ. Ọ bụrụ na Chineke mere ka mmadụ si n’ụmụ anụmanụ pụta, ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ ya mere ka ụmụ mmadụ na-arịa ọrịa ma na-ata ahụhụ n’oge a. Ma, Baịbụl kwuru banyere Chineke, sị: “Oké Nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ, n’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi. Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, onye ikpe na-ezighị ezi na-adịghị n’ebe ọ nọ; onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ. Ha onwe ha emewo omume na-eweta mbibi; ha abụghị ụmụ ya, ọ bụ ha nwere ntụpọ.” (Diuterọnọmi 32:4, 5) Ya mere, ahụhụ ndị mmadụ na-ata ugbu a abụghị maka na Chineke mere ka ha si n’ụmụ anụmanụ pụta. Ihe kpatara ya bụ na otu nwoke nupụụrụ Chineke isi wee ghọọ onye na-ezukwaghị okè, ụmụ ya abụrụkwa ndị na-ezughị okè. Ugbu a anyị tụlechara banyere Adam, ka anyị tụlezie banyere Jizọs. Ozizi evolushọn ò kwekọrọ n’ihe Baịbụl kwuru banyere Jizọs?

Ì Nwere Ike Ikwere n’Ozizi Evolushọn Kwerekwa n’Ozizi Ndị Kraịst?

“Kraịst nwụrụ maka mmehie anyị.” Ma eleghị anya, ị maara na nke a bụ otu n’ime ihe dị mkpa Ndị Kraịst na-akụzi. (1 Ndị Kọrịnt 15:3; 1 Pita 3:18) Iji ghọta ihe mere o ji bụrụ na ozizi evolushọn ekwekọghị n’ihe Ndị Kraịst na-akụzi, anyị kwesịrị ibu ụzọ ghọta ihe mere Baịbụl ji akpọ anyị ndị mmehie, ghọtakwa ihe mmehie buteere anyị.

Otú o si bụrụ na anyị niile bụ ndị mmehie bụ na anyị enweghị ike iṅomi àgwà Chineke n’ụzọ zuru okè, ya bụ, àgwà ya magburu onwe ha, ndị dị ka ịhụnanya na ikpe ziri ezi. N’ihi ya, Baịbụl sịrị: “Mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke.” (Ndị Rom 3:23) Baịbụl na-akụziri anyị na ọ bụ mmehie kpatara ọnwụ. Ndị Kọrịnt nke mbụ 15:56 sịrị: “Ihe ọgbụgba nke na-akpata ọnwụ bụ mmehie.” Ọ bụkwa mmehie anyị ketara eketa kpatara anyị ji arịa ọrịa. Jizọs gosiri na e nwere ihe jikọrọ ịrịa ọrịa na mmehie anyị ketara eketa. Ọ gwara otu onye ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị, “A gbagharawo gị mmehie gị,” ahụ́ wee dị ya mma.—Matiu 9:2-7.

Olee otú ọnwụ Jizọs si enyere anyị aka? Baịbụl kwuru ihe dị iche n’Adam na Jizọs Kraịst, sị: “Dị nnọọ ka mmadụ niile na-anwụ n’ime Adam, otú ahụkwa ka a ga-eme ka mmadụ niile dị ndụ n’ime Kraịst.” (1 Ndị Kọrịnt 15:22) Jizọs kwụrụ ụgwọ mmehie anyị ketara n’aka Adam mgbe o ji ndụ ya chụọ àjà. Ya mere, ndị niile nwere okwukwe na Jizọs ma na-erubere ya isi ga-enweta ihe Adam tụfuru, ya bụ, olileanya ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16; Ndị Rom 6:23.

Ị̀ hụla ugbu a na ozizi evolushọn ekwekọghị n’ozizi Ndị Kraịst? Ọ bụrụ na anyị ekwetaghị na “mmadụ niile na-anwụ n’ime Adam,” olee otú anyị ga-esi nwee olileanya na “a ga-eme ka mmadụ niile dị ndụ n’ime Kraịst”?

Ihe Mere Ozizi Evolushọn Ji Amasị Ndị Mmadụ

Baịbụl kwuru ihe mere ozizi ndị dị ka ozizi evolushọn ji amasị ọtụtụ mmadụ. Ọ sịrị: “A ga-enwe oge mgbe ha na-agaghị anabata ozizi ahụ na-enye ezi ndụ, kama, dị ka ha si chọọ, ha ga-akpọkọtara onwe ha ndị ozizi ka ha wee na-anụ ihe na-atọ ha ụtọ ná ntị; ha ga-ewepụkwa ntị ha ka ha ghara ịnụ eziokwu ahụ, ebe a ga-eme ka ha chigharịa gewe akụkọ ụgha.” (2 Timoti 4:3, 4) Ọ bụ ezie na a na-akụzi ozizi evolushọn dị ka nkụzi sayensị, ma n’eziokwu, ọ bụ nkụzi okpukpe. Ozizi ahụ na-akụzi otú a ga-esi na-ele ndụ anya na otú a ga-esi na-ele Chineke anya. Ozizi ya na-amasị ụmụ mmadụ n’ihi na ha na-achọ naanị ọdịmma onwe ha, ha na-achọkwa ka ha na-eduzi onwe ha. Ọtụtụ ndị kweere n’ozizi evolushọn na-ekwu na ha kwekwaara na Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, ha na-ekweta na ọ bụghị Chineke kere ihe dị iche iche, na ihe ụmụ mmadụ na-eme agbasaghị ya, nakwa na ọ gaghị ekpe ndị mmadụ ikpe. Ọ bụ ozizi na-atọ ndị mmadụ ụtọ ná ntị.

Ihe na-akpalikarị ndị na-akụzi ozizi evolushọn ịkụzi ya abụghị eziokwu ndị ha ji n’aka, kama ọ bụ “dị ka ha si chọọ.” Ikekwe, ya abụrụ na ha chọrọ ka ha soro ná ndị ọkà mmụta sayensị a na-anụ aha ha bụ́ ndị ozizi evolushọn na-amasị. Ọkachamara n’ihe banyere otú ihe dị ndụ si arụ ọrụ bụ́ Michael Behe, bụ́ onye nọworo na-amụ banyere otú mkpụrụ ndụ dị mgbagwoju si arụ ọrụ kemgbe ọtụtụ afọ ná ndụ ya, kọwara na ndị na-akụzi na e keghị mkpụrụ ndụ eke enweghị ihe ọ bụla mere ha ga-eji na-akụzi ya. Mkpụrụ ndụ dị nta ò nwere ike ịgbanwe ghọọ ihe ọzọ? O dere, sị: “Ikwu na ihe ndị dị nta dị ka mkpụrụ ndụ na-agbanwe ghọọ ihe ọzọ ekwekọghị na nkà mmụta sayensị. Ọ dịghị akwụkwọ sayensị ọ bụla, ma ọ bụ magazin ndị a ma ama ma ọ bụ akwụkwọ ndị ọzọ, nke kọwara otú ihe ndị dị nta dị ka mkpụrụ ndụ si gbanwee ghọọ ihe ọzọ, ọ dịghịkwa nke kwuru otú o nwere ike isi mee otú ahụ. . . . Darwin ikwu na ihe ndị dị nta dị ka mkpụrụ ndụ na-agbanwe ghọọ ihe ọzọ bụ ikwu ihe ọ na-amaghị.”

Ọ bụrụ na ndị na-akụzi evolushọn enweghị ike ịkọwa ihe ha na-akụzi, gịnị mere ha ji akụzi ya n’eleghị anya n’azụ? Behe kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị, tinyere ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị a ma ama bụ́ ndị a na-akwanyere ùgwù, achọghị ịma na e nwere onye kere ihe bụ́ onye karịrị ụmụ mmadụ.”

Ozizi evolushọn na-amasị ọtụtụ ndị ndú okpukpe bụ́ ndị chọrọ ka a sị na ha ma ihe. Ha yiri ndị ahụ Pọl onyeozi kwuru banyere ha n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst nọ na Rom. Pọl dere, sị: “Ihe a pụrụ ịmara banyere Chineke pụtara ìhè n’etiti ha . . . Àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya ka a na-ahụ nke ọma malite mgbe e kere ụwa gaa n’ihu, n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke, ya bụ, ike ebighị ebi ya na ịbụ Chineke ya, nke mere na ha enweghị ihe ngọpụ; n’ihi na, ọ bụ ezie na ha maara Chineke, ha enyeghị ya otuto dị ka Chineke, ha ekeleghịkwa ya, kama ha ghọrọ ndị na-enweghị nghọta, obi ha nke na-amaghị ihe gbakwara ọchịchịrị. Ọ bụ ezie na ha na-ekwusi ike na ha maara ihe, ha ghọrọ ndị nzuzu.” (Ndị Rom 1:19-22) Olee ihe ị ga-eme ka ndị ozizi ụgha ghara iduhie gị?

Inwe Okwukwe n’Onye Okike n’Ihi Ihe Àmà

Baịbụl kwuru otú ihe àmà si dị mkpa mgbe ọ na-akọwa ihe okwukwe bụ. Ọ sịrị: “Okwukwe bụ atụmanya e ji n’aka na ihe ndị a na-ele anya ha ga-emezu, ihe àmà doro anya na ihe ndị a na-adịghị ahụ anya dị adị n’ezie.” (Ndị Hibru 11:1) Ezi okwukwe mmadụ nwere na Chineke kwesịrị ịdabere n’ihe àmà nke na-egosi na Onye Okike dị adị n’ezie. Baịbụl kwuru ebe i nwere ike ịhụ ihe àmà ahụ.

Otu n’ime ndị si n’ike mmụọ nsọ dee Baịbụl, bụ́ Devid, dere, sị: “M ga-eto gị n’ihi na i kere m n’ụzọ dị egwu, dịkwa ebube.” (Abụ Ọma 139:14) Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge chebara otú ihe ndị dị anyị n’ahụ́ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ dị ndụ si dị ịtụnanya, anyị ga-ahụ na Onye kere anyị nwere amamihe dị ukwuu. Ọtụtụ puku ihe ndị na-arụkọ ọrụ ọnụ n’ahụ́ anyị, bụ́ ndị na-eme ka anyị dịrị ndụ, magburu onwe ha n’ihi otú e si kezie ha ekezi. Eluigwe na ụwa na-egosi na e kere ha n’usoro, ihe niile dị na ha dịkwa kpọmkwem ebe ha kwesịrị ịdị. Devid dere, sị: “Eluigwe na-akọsa ebube Chineke; mbara igwe na-akọkwa ọrụ aka ya.”—Abụ Ọma 19:1.

N’ime Baịbụl, e nwere ọtụtụ ihe ndị na-egosi na ọ bụ Chineke kere ihe dị iche iche. Ọ bụrụ na i wepụta oge tụlee otú akwụkwọ iri isii na isii dị na Baịbụl si nwee otu olu, otú àgwà o kwuru ka anyị na-akpa si ka mma, na otú amụma ndị dị na ya si emezu, ị ga-ahụ na ihe a niile bụ ihe àmà na ọ bụ Onye Okike chepụtara ya. Ịghọta ihe Baịbụl na-akụzi ga-emekwa ka i nwee obi ike na Baịbụl bụ Okwu Onye Okike. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị ghọta ihe Baịbụl na-akụzi banyere ihe kpatara ahụhụ, Alaeze Chineke, ọdịnihu ụmụ mmadụ, na otú e si enweta obi ụtọ, ị ga-ahụ ihe àmà na-egosi na Chineke nwere amamihe. Obi nwere ike ịdị gị otú obi dị Pọl mgbe o dere, sị: “Lee otú ngọzi na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke si dị omimi! Lee otú a na-apụghị ịchọpụtacha ikpe ya, na otú a na-apụghị ịchọpụtacha ụzọ ya!”—Ndị Rom 11:33.

Mgbe ị na-atụle ihe àmà ndị a, okwukwe gị ga-esikwu ike. Obi ga-esikwa gị ike mgbe ọ bụla ị na-agụ Baịbụl na ọ bụ Chineke na-agwa gị okwu. Chineke sịrị: “Ọ bụ m kere ụwa, keekwa ọbụna mmadụ n’elu ya. Ọ bụ aka m setịrị eluigwe, enyewokwa m ìgwè ihe niile dị n’ime ya iwu.” (Aịzaya 45:12) O doro anya na o nweghị ihe ga-eme ka ị kwaa ụta ma ị gbalịa mụta ihe ndị ga-egosi gị na ọ bụ Jehova kere ihe niile.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]

Pọl onyeozi gwara ndị Grik gụrụ akwụkwọ, sị: “Chineke . . . sitekwara n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 15]

Ozizi evolushọn na-akọ na ụmụ mmadụ adịla mma ugbu a karịa ụmụ anụmanụ ha bụbu ná mmalite. Baịbụl na-akụzi na ụmụ mmadụ ndị nọ ugbu a adịrukwaghị mma otú onye mụrụ ha, bụ́ nwoke zuru okè, dịbu

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 16]

“Ikwu na ihe ndị dị nta dị ka mkpụrụ ndụ na-agbanwe ghọọ ihe ọzọ ekwekọghị na nkà mmụta sayensị”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 17]

Otú ihe ndị dị ndụ si dị ịtụnanya na-eme ka anyị ghọta na Onye kere anyị nwere amamihe