Gịnị Ga-eme n’Ọdịnihu?
Gịnị Ga-eme n’Ọdịnihu?
GỊNỊ MERE AZỊZA YA JI DỊ ANYỊ MKPA? Ihe mmadụ na-atụ anya na ọ ga-eme echi na-emetụta otú o si eme ihe taa. Dị ka ihe atụ, echiche ndị na-enweghị olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu na-enwe bụ: “Ka anyị rie ma ṅụọ, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.” (1 Ndị Kọrịnt 15:32) Ụdị echiche a na-eme ka ndị mmadụ na-eribiga ihe ókè, na-aṅụ oké mmanya ma na-echegbu onwe ha. Ihe ndị a anaghị eme ka obi ruo mmadụ ala.
N’ezie, a sị na ọdịnihu anyị dị ụmụ mmadụ n’aka, anyị agaraghị enwe olileanya ọ bụla. A na-emebi ikuku, mmiri, na ala gabiga ókè. Egwu ji ndị mmadụ na agha nuklia nwere ike ịda nakwa na ndị na-eji ngwá agha eyi ọha mmadụ egwu nwere ike ịsụ ndị mmadụ akwụ mgbe ọ bụla. Ọrịa na ịda ogbenye na-akpa ọtụtụ nde mmadụ aka ọjọọ n’ụwa dum. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ezi ihe mere anyị ga-eji nwee olileanya.
Ọ bụ ezie na ọtụtụ ihe ụmụ mmadụ na-ekwu ga-eme n’ọdịnihu adịghị emezu, Jehova bụ́ Chineke kwuru na ya bụ “Onye na-anọ ná mmalite kwuo ihe ga-eme n’ikpeazụ, onye na-anọkwa n’oge dị anya gara aga kwuo ihe a na-emebeghị eme.” (Aịzaya 46:10) Olee ihe Jehova kwuru ga-eme n’ọdịnihu?
Ihe Baịbụl Kwuru
Jehova agaghị ekwe ka ụwa mebie nke na ọ gaghị ekwe mmekwata. N’ezie, Baịbụl kwere nkwa na Chineke ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Jehova ga-eji Alaeze ya, ma ọ bụ ọchịchị eluigwe ya, wepụ ihe ọjọọ n’ụwa wee mee ka ụwa dịrị otú o zubere na mbụ. (Jenesis 1:26-31; 2:8, 9; Matiu 6:9, 10) Amaokwu Baịbụl ndị a na-agwa anyị ihe ga-eme n’ọdịnihu, bụ́ ndị ga-emetụta mmadụ niile nọ n’ụwa n’oge na-adịghị anya.
Abụ Ọma 46:8, 9. “Bịanụ, hụ ọrụ dị iche iche nke Jehova, otú o si mee ihe ndị na-eju anya n’ụwa. Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa. Ọ na-agbaji ụta, na-egbujisịkwa ube; ọ na-agbakwa ụgbọ agha ọkụ.”
Aịzaya 35:5, 6. “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, a ga-emeghekwa ntị nke ndị ntị chiri. Mgbe ahụ ka onye ngwọrọ ga-awụli elu dị ka oké ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ. N’ihi na mmiri ga na-agbapụta n’ala ịkpa, mmiri iyi ga na-agbapụtakwa na mbara ọzara.”
Aịzaya 65:21, 22. “Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie ya; ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ya.”
Daniel 2:44. “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”
Jọn 5:28, 29. “Oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu [Jizọs] wee pụta.”
Mkpughe 21:3, 4. “Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”
Otú Ihe Baịbụl Zara Si Eme Ka Obi Ruo Mmadụ Ala
O nwere ike isiri mmadụ ike ikweta ihe ndị a Baịbụl kwuru na nke mbụ onye ahụ nụrụ ha. Ma, ọ bụ Chineke kwere nkwa ndị a, ọ bụghị ụmụ mmadụ. Jehova bụ́ Chineke bụ “onye na-apụghị ịgha ụgha.”—Taịtọs 1:2.
Ọ bụrụ na ị tụkwasị obi ná nkwa ndị Chineke kwere ma na-edebe iwu ya, obi ga-eru gị ala n’agbanyeghị ihe isi ike ndị na-abịara gị. Ọ bụrụgodị na a na-alụ agha, na ị dara ogbenye, na ị na-arịa ọrịa, ọbụna na-enwe nsogbu ndị agadi na-enwe, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọnwụ na-akụrụ gị aka n’ụzọ—ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a nke nwere ike ime ka obi ghara iru gị ala ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na obi ga-esi gị ike na Alaeze Chineke ga-agbanwe ihe niile nsogbu ndị a na-akpata.
Olee otú ị ga-esi nwee olileanya na ihe ndị a ga-eme n’ọdịnihu? Ị ghaghị ‘ime ka uche gị dị ọhụrụ’ ma ‘chọpụta n’onwe gị ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.’ (Ndị Rom 12:2) Ikekwe, ị ka chọkwuru ihe ndị ga-egosi gị na i kwesịrị ịtụkwasị nkwa ndị dị na Baịbụl obi. Mgbalị ọ bụla i mere iji chọpụta nke a kwesịrị ekwesị. O siri ike ịhụ ihe ndị ga-eme ka obi ruo gị ala ná ndụ karịa nke a.
[Foto ndị dị na peeji nke 8 na 9]
Olee ihe Okwu Chineke kwuru ga-eme n’ọdịnihu?