Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ahụhụ Dịrị?
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Jụrụ
Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ahụhụ Dịrị?
Ọ bụghị Chineke kpatara ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata. Baịbụl sịrị: “Ya bụrụ Chineke ihe arụ ime ihe ọjọọ!” (Job 34:10) Ònyezi kpatara ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata?
Jizọs kpọrọ Setan “onye na-achị ụwa.” (Jọn 14:30) N’eziokwu, Jehova bụ Ọkaakaa n’Eluigwe na Ala. Ọ dịghị mgbe ọ ga-akwụsị ịbụ Ọkaakaa n’Eluigwe na Ala. Ma, Chineke hapụtụrụ Setan ka ọ chịwa ọtụtụ ụmụ mmadụ.—1 Jọn 5:19.
Olee ụdị onye ọchịchị Setan bụ? Kemgbe Setan na ụmụ mmadụ malitere imekọ ihe, ọ na-egbu ọchụ, ọ bụkwa onye nduhie. Setan na-akpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ n’ụzọ dị iche iche. Lee otú Jizọs si kọwaa ya. Ọ sịrị: “Onye ahụ bụ ogbu mmadụ mgbe ọ malitere, o guzosighịkwa ike n’eziokwu, n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya. Mgbe ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọchịchọ ya si dị, n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ụgha.” (Jọn 8:44) Jizọs kwukwara na ndị chọrọ igbu ya bụ ụmụ nke onye mbụ ahụ gburu ọchụ. Ha mere onwe ha ụmụ ya n’ihi na ha kpara àgwà ka ya. Ha na-eme ka nna ha.
Setan ka na-eme ka ndị mmadụ nwee mmụọ igbu ọchụ. Dị ka ihe atụ, R. J. Rummel, bụ́ prọfesọ kụziburu ihe na Mahadum dị na Hawaii, U.S.A., onye larala ezumike nká, kwuru na malite n’afọ 1900 ruo 1987, na ọchịchị dị iche iche gburu otu narị nde mmadụ, nde iri isii na itoolu na otu narị puku na puku iri itoolu na puku asatọ n’oge ha na-akwatu ọchịchị, n’oge ha na-egbukpọ agbụrụ, nakwa ndị ha gburu n’enweghị ezi ihe kpatara ya. Ndị a e gburu esoghị n’ọtụtụ nde mmadụ iri e gburu n’ọgbọ agha n’otu oge ahụ.
Ọ bụrụ na ọ bụghị Chineke na-akpata ahụhụ, gịnị mere o ji kwe ka ahụhụ dịrị? Ọ bụ n’ihi na e kwesịrị idozi okwu ndị dị mkpa malitere ogologo oge gara aga bụ́ ndị gbasara ihe niile e kere eke. Ka anyị leba anya naanị n’otu n’ime ha.
Mgbe ụmụ mmadụ malitere ịdị ndụ, Adam na Iv dụnyeere Setan úkwù. Ha jụrụ ọchịchị Chineke ma họrọ ịchị onwe ha, nke bụ́ n’ezie ịhọrọ ọchịchị Ekwensu.—Jenesis 3:1-6; Mkpughe 12:9.
Ebe ọ bụ na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi, ọ hapụrụ ka oge gafee ka e wee chọpụta nke bụ́ eziokwu. Olee ihe a chọpụtarala? A chọpụtala na naanị ihe ọchịchị ụmụ mmadụ nke Setan na-eduzi na-akpata bụ ahụhụ. N’eziokwu, oge Chineke kwere ka ọ gafee bụ maka ọdịmma ụmụ mmadụ. Olee otú nke a si bụrụ eziokwu? Ndị na-amụ ihe ndị na-egosi na nke a bụ eziokwu ma kweta ha nwere ohere igosi na ha chọrọ ka Chineke chịwa ha. Ndị na-amụ iwu Chineke ma na-eme ihe o kwuru nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3; 1 Jọn 2:17.
N’eziokwu, Setan ka ji ụwa aka ọjọọ. Ma, ọ gaghị adịgide otú a ruo ogologo oge. N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-esi n’aka Ọkpara ya “bibie ọrụ Ekwensu.” (1 Jọn 3:8) Chineke ga-enye Jizọs ntụziaka, ya agwọọ ndị e tiwara obi, meekwa ka ndụ nke ndị ndụ gbụrụla ka mma. Ọ ga-akpọlite ọtụtụ nde ndị mmadụ n’ọnwụ, bụ́ ndị hụjuru anya ma nwụọ kemgbe ọtụtụ narị afọ.—Jọn 11:25.
Mkpọlite a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ gosiri mmeri Chineke meriri ọrụ Ekwensu, nke bụ́ obere ihe àmà na-egosi ihe a ga-emere ndị họọrọ ọchịchị Chineke. (Ọrụ 17:31) Baịbụl na-eme ka anyị ghọta ihe ndị gaje ime n’ọdịnihu. Ọ kasiri anyị obi, sị: “Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara [ụmụ mmadụ]. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.