Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze Iji Too Jehova

Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze Iji Too Jehova

Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze Iji Too Jehova

“Ọ dị m ka ọ̀ bụ ná nrọ. O nweghị mgbe m tụrụ anya na anyị ga-enwe ebe mara mma otú a anyị ga na-ezukọ na-eto Jehova. O nweghị ego ole nwere ike inye m ụdị ọṅụ a m nwere!”—MARIA, MEXICO.

NDỊÀMÀ JEHOVA na-enwe mmasị izukọta iji mụọ Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl. (Abụ Ọma 27:4; Ndị Hibru 10:23-25) Ọ na-atọ ha ụtọ ime otú a karịsịa ma ọ bụrụ na ha nwere ebe dị mma ha na-anọ efe Chineke. N’afọ ole na ole gara aga, ha ewuola ọtụtụ puku ebe ọhụrụ ha na-anọ efe Chineke n’ọtụtụ mba n’ụwa dum. A na-akpọ ha Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Gịnị mere ha ji na-ewu ụlọ ndị ahụ? Olee ndị na-arụrụ ha ọrụ? Olee otú obi na-adị ndị na-ewu ụlọ ndị ahụ? Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata azịza nke ajụjụ ndị a, tụlee ihe na-eme na Mexico na Belize.

E Nwere Mkpa Ọtụtụ Puku Ụlọ Nzukọ Alaeze Ọhụrụ!

N’oge gara aga, Ndịàmà Jehova nọ na Mexico na-ezukọ ebe ọ bụla ha nwetara iji fee Chineke, ma n’azụ ụlọ, ma n’ụlọ Ndịàmà, ma n’ụlọ a na-akwasa ngwongwo, ma n’ebe a na-adọba ụgbọala, ma ọ bụ n’ụlọ ezumezu ha na-akwụ ndị nwe ha ụgwọ. N’oge ahụ, Ndịàmà a kwesịrị ntụkwasị obi na-eche na ọ ga-amagbukwanụ onwe ya ma ọ bụrụ na ha nwere ike iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị nke ha.

N’afọ 1994, Ndịàmà nọ na Mexico dị narị puku atọ na puku iri asatọ na puku asatọ. Nchọpụta e mere n’afọ ahụ gosiri na ọ bụrụ na ha ga-enwe ebe nke aka ha ha ga-anọ na-efe ofufe, a ga-ewu puku Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ atọ na narị atọ. Nke a abụghị ọrụ dị mfe!

N’oge ahụ, ọgbakọ ndị nọ n’ebe ahụ bụ́ ndị nwere ike amalitelarị iji aka ha na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ma, mgbe ihe karịrị afọ ise gachara, o doro anya na anyị ga-ewukwu Ụlọ Nzukọ, wuokwa ha ngwa ngwa, iji gboo mkpa Ụlọ Nzukọ Alaeze e nwere. Olee otú e si na-egbo mkpa a?

Ìgwè Ndị Ọrụ Nwere Nkà Ndị Na-esi Otu Ebe Aga Ebe Ọzọ

N’afọ 1999, a malitere ụzọ ọhụrụ a ga-esi na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze. E hiwere Ìgwè Ndị Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ebe niile na Mexico. Ndịàmà Jehova ndị si n’ebe niile ná mba ahụ, ndị ọtụtụ n’ime ha maara ka e si ewu ụlọ, wepụtara onwe ha iji soro n’ọrụ a na-enye obi ụtọ. Ka ọ dị ugbu a, e nwere ìgwè iri atọ na ise na Mexico, e hiwekwala otu ìgwè na Belize.

Ìgwè Ndị Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na-adịkarị mmadụ asatọ mmadụ asatọ, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị. Ha na-arụ ọrụ a oge niile, a naghịkwa akwụ ha ụgwọ. Ndị a ji obi ụtọ wepụta onwe ha ịrụ ọrụ a na-esi n’otu ebe akwaga ebe ọzọ ná mba ahụ iji na-eduzi ọrụ a. Onye ọrụ nke ọ bụla na-arụ ọrụ awa asatọ kwa ụbọchị, malite na Monday ruo Friday nakwa Saturday ụfọdụ. N’elekere asaa n’ụbọchị ọ bụla, ha na-amalite ihe omume ha site n’ịtụle Baịbụl, ha mechaa ha erie nri ụtụtụ. Ha niile na-adị njikere ime ihe ọ bụla a gwara ha mee. Dị ka ihe atụ, ndị nwaanyị na-arụ ụdị ọrụ ndị nwoke na-arụ, ndị dị ka ite ụlọ plasta, ido taịl, na ite ụlọ ágbá.

Ọgbakọ ndị a na-ewuru Ụlọ Nzukọ Alaeze na-enyekwa aka site n’inye ndị ọrụ ahụ ụlọ ha ga-ebi, ịsara ha uwe, na isiri ha nri. Ndị ọrụ ahụ na Ndịàmà ha na-ewuru Ụlọ Nzukọ na-arụkọ ọrụ ọnụ, na-agakọkwa ọmụmụ ihe nakwa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ.

Uru Ndị Wepụtara Onwe Ha Ịrụ Ọrụ Na-erite

Olee otú obi na-adị ndị ahụ wepụtara onwe ha ịrụ ọrụ a? Daniel, bụ́ onye rụrụla ọrụ a ihe karịrị afọ atọ, kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na anyị na-arụ ọrụ a ma n’oge okpomọkụ ma n’oge oyi, na-eri ụdị nri na-amaghị anyị ahụ́, na-akwagharị mgbe niile, biri n’ebe dị anya n’ebe ndị ezinụlọ anyị nọ, ọ bụkwa eziokwu na anyị enweghị ihe ọ gbara ọhụrụ ndị na-enyere ndụ aka, ma, ihe ndị a enweghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere ngọzi ndị anyị na-enweta.

Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ngọzi ndị ahụ? Ọtụtụ n’ime ndị ọrụ ahụ amụtawo nkà ndị ha na-amabughị. Ma, otu onye ọrụ aha ya bụ Carlos, bụ́ onye na-elekọta otu n’ime ìgwè ndị ka buo ibu kwuru ihe o chere bụ́ uru ka mkpa ha na-erite. Ọ sịrị: “Anyị dị ka otu ezinụlọ ndị dị mmadụ iri abụọ. Anyị na-erikọ nri ọnụ, na-arụkọ ọrụ ọnụ, na-amụkọ ihe ọnụ, na-ekpekọ ekpere ọnụ. Anyị niile aghọwo ezigbo ndị enyi.”

Ndị a na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na ndị nọ n’ọgbakọ ha na-ewuru Ụlọ Nzukọ Alaeze na-adị nnọọ ná mma. José, bụ́ onye sorola wuo ihe karịrị otu narị Ụlọ Nzukọ Alaeze, kwuru, sị: “Ọṅụ na obi ụtọ Ndịàmà e wuuru Ụlọ Nzukọ Alaeze na-enwe maka Ụlọ Nzukọ Alaeze ha tụwara anya ya kemgbe na-emetụ anyị n’ahụ́.” Ọ sịkwara: “Anyị na-enwe ọṅụ na obere ọrụ anyị rụrụ iji wuchaa ụlọ a na-anọ efe ofufe dị ọcha na-eme ka okwukwe ndị ọzọ sikwuo ike.”

Ihe Dị Ịtụnanya A Na-arụpụta n’Ọrụ A!

A naghị achọ ebe ndị a a na-anọ efe ofufe oké mma. Kama nke ahụ, a na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ahụ ka ha ghara ibu oké ibu, nke a na-eme ka e wuo ha ngwa ngwa, ka ha gharakwa ifu nnukwu ego. Mgbe ọ bụla o kwere omume, a na-eji ihe ndị na-esighị n’obodo ọzọ ewu ụlọ ndị ahụ, a na-ewukwa ha otú e si ewu ụlọ ndị a na-ewu n’ebe ahụ. Nke a na-eme ka e nwee ike iwucha Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ n’ime izu isii!

N’afọ 2007, ọgbakọ niile dị na Belize nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ—ha dị iri na asaa. Na Mexico, e wuola ihe karịrị otu puku Ụlọ Nzukọ Alaeze na narị anọ kemgbe afọ 1999!

Ọ bụ ezie na e wuola ọtụtụ Ụlọ Nzukọ, a ka nwere ọtụtụ a ga-ewu. (Matiu 9:37) Ndịàmà nọ na Mexico amụbaala ruo ihe karịrị narị puku isii. Ha niile na-ezukọ ugboro atọ n’izu ka e jiri Okwu Chineke kụziere ha ihe. Ya mere, ọ ka dị mkpa ka e wuo ihe dị ka puku Ụlọ Nzukọ Alaeze abụọ. A sị na ọ bụ ike mmadụ ka ndị ahụ wepụtara onwe ha ji ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a, a garaghị enwe ike ịrụ ihe ndị a a rụrụla. Ma, ihe ndị a rụrụla na-egosi na site ná nkwado Jehova bụ́ Chineke, “ihe niile kwere omume.”—Matiu 19:26.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 22]

“Ha Na-eme Ihe Ha Kwuru”

Ndịàmà Jehova nọ n’ọgbakọ e wuuru Ụlọ Nzukọ Alaeze abụghị naanị ndị ụlọ e wuru na-emetụta ndụ ha. Dị ka ihe atụ, mgbe a na-ewu otu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Belize, otu nwoke nwunye ya na-ekpe chọọchị Pentikọstal gwara nwunye ya na ọ bụrụ na Ndịàmà Jehova ewuchaa “ụlọ ụka” ha, na ya ga-achọ iso ha na-aga ọmụmụ ihe ha. Gịnị mere o ji chọọ ime otú a? Ọ sịrị: “Achọpụtara m na Chineke nọnyeere ha. Ha anaghị alụ ọgụ mgbe ha na-arụkọ ọrụ ọnụ. Ha na-emekwa ihe ha kwuru.”

[Foto]

Ụlọ Nzukọ Alaeze nke dị n’Orange Walk, Belize

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 23]

Mgbalị A Na-eme n’Ụwa Dum

E nweela Ìgwè Ndị Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’otu narị mba na iri abụọ. Ha ji obi ụtọ wepụta onwe ha na-arụ ọrụ n’ọtụtụ mba. Mba ole na ole e depụtara n’ebe a so n’ime ha:

Angola, Bolivia, Croatia, Dominican Republic, Ethiopia, Fiji, Ghana, Hong Kong, India, Jamaica, Kazakhstan, Liberia, Moldova, Nigeria, Papua New Guinea, Rwanda, Tuvalu, Ukraine, Venezuela, Zambia.

[Foto]

Ụlọ Nzukọ Alaeze nke dị n’Acapulco, Mexico

Ndị so ná Ndị Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Mexico

[Foto dị na peeji nke 23]

Ụlọ Nzukọ Alaeze nke dị na Tlaxcala, Mexico