Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịghọ Otu n’Ime Ụmụ Chineke

Ịghọ Otu n’Ime Ụmụ Chineke

Ịghọ Otu n’Ime Ụmụ Chineke

MGBE ihe dị ka afọ iri atọ Agha Korea biri, Ụlọ Ọrụ Mgbasa Ozi Ndị Korea malitere ịgbasa ozi iji nyere ndị mmadụ aka ịchọta ndị ezinụlọ ha bụ́ ndị ha na-amaghị ebe ha nọ kemgbe agha ahụ malitere. Olee ihe si na ya pụta? Ihe karịrị puku mmadụ iri na otu chọtara ndị ha hụrụ n’anya, wee jiri ọṅụ na anya mmiri makụọ ha. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Korea Times kọrọ, sị: “O nwetụbeghị mgbe ọtụtụ ndị Korea nọ otu mgbe bepụta anya mmiri hà otú a n’ihi ọṅụ.”

Na Brazil, ndị mụrụ Cézar kpọọrọ ya mgbe ọ bụ nwata kpọnye onye ọzọ iji kwụọ ụgwọ ha ji. Mgbe ihe dị ka afọ iri gachara, obi tọrọ Cézar ụtọ nke ukwuu mgbe ọ chọtara nne mụrụ ya nke na ọ hapụrụ di na nwunye ya na ha bi, bụ́ ndị ji ego, lakwuru nne ya.

Ọ na-atọ mmadụ ụtọ nke ukwuu mgbe ọ hụrụ onye ezinụlọ ya nke ya na ya na-ahụbeghị kemgbe. Baịbụl kọrọ ụzọ dị mwute ụmụ mmadụ si hapụ ịbụkwa ndị ezinụlọ Chineke. Ọ kọkwara otú ha si jiri ọṅụ ugbu a na-alọghachi iji bụrụ ndị ezinụlọ Chineke. Olee otú nke a si mee? Oleekwa otú i nwere ike isi bụrụ otu n’ime ha?

Otú Ụmụ Mmadụ Si Hapụ Ezinụlọ Chineke

Otu ọbụ abụ kwuru banyere Jehova Chineke, bụ́ Onye okike, sị: “Ọ bụ gị bụ isi iyi nke ndụ.” (Abụ Ọma 36:9) Jehova bụ Nna nke nnukwu ezinụlọ ya dị n’eluigwe nakwa n’ụwa, ya bụ, ndị niile nwere ọgụgụ isi e kere eke bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Ndị so n’ezinụlọ ya a bụ ndị mmụọ ozi, ya bụ, ụmụ ya ndị bụ́ mmụọ bi n’eluigwe, nakwa ụmụ mmadụ, ya bụ, ụmụ ya ndị bi n’ụwa.

Dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, mgbe Adam, bụ́ mmadụ mbụ Chineke kere, nupụụrụ Chineke isi, ihe dị mwute mere. Ụmụ mmadụ hapụrụ Nna ha nke hụrụ ha n’anya bụ́ Onye kere ha. (Luk 3:38) Ọ bụ n’ihi na mgbe Adam nupụrụ isi, ọ tụfuru ihe ọma bịaara ya na nke gaara abịara ụmụ ọ ka ga-amụ amụ, ya bụ, ịbụ ụmụ Chineke. Chineke si n’ọnụ ohu ya bụ́ Mozis kwuo ihe ihe ahụ merenụ rụpụtara. Ọ sịrị: “Ha onwe ha emewo omume na-eweta mbibi; Ha abụghị ụmụ [Chineke], ọ bụ ha nwere ntụpọ.” “Ntụpọ,” ma ọ bụ mmehie ụmụ mmadụ ketara, mere ka ha na Chineke, bụ́ onye dị nsọ ma zuo okè n’ụzọ niile, ghara ịdịkwa ná mma. (Diuterọnọmi 32:4, 5; Aịzaya 6:3) Ya mere, e kwuo ya n’ụzọ ọzọ, ụmụ mmadụ ghọrọ ụmụaka furu efu, ndị na-enwekwaghị nna.—Ndị Efesọs 2:12.

Iji gosi otú nhapụ ụmụ mmadụ hapụrụ Chineke dịruru ná njọ, Baịbụl kpọrọ ndị na-esokwaghị n’ezinụlọ Chineke “ndị iro.” (Ndị Rom 5:8, 10) Ebe ụmụ mmadụ na-anọkwaghị n’okpuru Chineke, ha na-ahụsi anya n’aka Setan bụ́ onye ji aka ike na-achị ha, mmehie na ezughị okè ha ketara eketa na-akpakwa ha aka ọjọọ. (Ndị Rom 5:12; 1 Jọn 5:19) Ụmụ mmadụ ndị na-eme mmehie hà nwere ike ịghọ ndị ezinụlọ Chineke? Ụmụ mmadụ na-ezughị okè hà nwere ike ịghọ ụmụ Chineke n’ụzọ zuru ezu, otú ahụ Adam na Iv bụbu tupu ha emehie?

Ịchịkọta Ụmụ Ya Ndị Hapụrụ Ya

Jehova ji ịhụnanya mee ndokwa ga-abara ụmụ mmadụ na-ezughị okè ndị hụrụ ya n’anya uru. (1 Ndị Kọrịnt 2:9) Pọl onyeozi kwuru, sị: “Chineke si n’aka Kraịst na-eme ka ya na ụwa dị ná mma, n’agụrụghị ha njehie ha.” (2 Ndị Kọrịnt 5:19) Dị ka a kọwara n’isiokwu bu nke a ụzọ, Jehova bụ́ Chineke nyere Jizọs Kraịst ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka mmehie anyị. (Matiu 20:28; Jọn 3:16) Jọn onyeozi ji obi ekele dee, sị: “Leenụ ụdị ịhụnanya Nna ahụ gosiri anyị, ka e wee kpọọ anyị ụmụ Chineke.” (1 Jọn 3:1) Ya mere, e nyere ụmụ mmadụ ndị na-erube isi ohere ka ha soroghachi ná ndị ezinụlọ Jehova.

Ọ bụ ezie na mmadụ niile a chịkọtara ka ha soro ná ndị ezinụlọ Chineke ga-abụ otu ndị, bụ́ ndị Nna ha nke eluigwe na-elekọta, lee otú Baịbụl si kwuo na ha ga-adị ìgwè abụọ. Ọ sịrị: “Ihe nzuzo a bụ dị ka ihe dị ya ụtọ si dị bụ́ nke o zubere n’ime onwe ya maka ilekọta ihe mgbe oge ahụ a kara aka zuru, ya bụ, ịchịkọtaghachi ihe niile n’ime Kraịst, ihe ndị dị n’eluigwe na ihe ndị dị n’ụwa.” (Ndị Efesọs 1:9, 10) Gịnị mere Chineke ji eme nke a otú ahụ?

Nhazi Jehova haziri ụmụ ya ka ha dịrị ìgwè abụọ na-eme ka ezinụlọ ya dịrị n’otu. Ọ dị mfe ịghọta ihe mere Chineke ji mee ya otú a. Ezinụlọ Chineke buru ibu nke ukwuu nke na e nwere ike iji ya tụnyere otu mba. Ná mba ọ bụla, a na-ahọrọ ụfọdụ ndị ka ha soro ná ndị ọchịchị, ka udo wee dịrị ndị ha na-achị, ihe a na-agakwa n’usoro. O nwebeghị ọchịchị ụmụ mmadụ nke wetarala ezi udo. Ma, Chineke hiweere ezinụlọ ya ọchịchị zuru okè. Ndị so n’ìgwè nke mbụ, ya bụ, “ihe ndị dị n’eluigwe,” bụ ụmụ Chineke ndị Jehova họọrọ ka ha bụrụ ndị ọchịchị, ma ọ bụ, ndị ga-achị n’Alaeze, n’eluigwe. “Ha ga-achịkwa ụwa dị ka ndị eze” site n’ebe ahụ.—Mkpughe 5:10.

Ụmụ Chineke Ndị Nọ n’Ụwa

Jehova na-achịkọtakwa “ihe ndị dị n’ụwa,” ya bụ, ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa dum, ka ha wee ghọọ ụmụ ya ndị bi n’ụwa mgbe e mechara. Ebe ọ bụ Nna obiọma, ọ na-akụziri ha ụzọ ịhụnanya ya, ọ bụkwa ezie na ha si n’ọtụtụ mba, ha dị n’otu. A na-akpọ ọbụna ndị na-eme ihe ike òkù, ndị na-achọ naanị ọdịmma onwe ha, ndị na-eme omume rụrụ arụ na ndị na-enupụrụ Chineke isi, ka ha ‘mee ka ha na Chineke dị ná mma.’—2 Ndị Kọrịnt 5:20.

Olee maka ndị jụrụ ịza òkù Chineke na-akpọ ha ka ha bịa ka ha na ya dị ná mma wee bụrụ ụmụ ya? Jehova ga-eme ha ihe, ka udo na ịdị n’otu wee dịrị n’ezinụlọ ya. A ga-enwe “ụbọchị mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 3:7) Chineke ga-ekpochapụ ndị nnupụisi n’ụwa. Nke a ga-eme ka ahụ́ ruo ndị na-erube isi ala.—Abụ Ọma 37:10, 11.

Mgbe e bibichara ndị ọjọọ ahụ, a ga-enwe otu puku afọ mgbe udo ga-adị, mgbe a ga-eji nke nta nke nta mee ka ndị niile nabatara ịhụnanya Chineke zuo okè, bụ́ ụdị ndụ Adam tụfuru. A ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29; Mkpughe 20:6; 21:3, 4) Ya mere, Chineke ga-emezu nkwa o kwere, nke bụ́ na ‘a ga-eme ka ụmụ mmadụ e kere eke nwere onwe ha pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.’—Ndị Rom 8:21.

Otú Ị Ga-esi Lọghachikwute Nna Gị

Cézar na ọtụtụ puku ndị Korea a kọrọ akụkọ ha ná mbido isiokwu a nwere ihe ha mere nke mere ka ha laghachikwuru ndị ezinụlọ ha. Ndị Korea ahụ ṅara ntị n’ozi ahụ a gbasara, Cézar hapụkwara di na nwunye ahụ ya na ha bi. Gị onwe gị aghaghịkwa ime ihe ka gị na Nna gị nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke, wee dị ná mma, ka i wee soro ná ndị ezinụlọ ya. Gịnị ka i kwesịrị ime?

Iji bịaruo Chineke bụ́ Nna gị nso, ị ghaghị ịmụ Okwu ya, bụ́ Baịbụl, ka i wee nwee okwukwe siri ike n’ebe ọ nọ nakwa ná nkwa ndị o kwere. Ị ga-amụta inwe ntụkwasị obi na ihe niile Chineke gwara gị ka i mee ga-abara gị uru. I kwesịkwara ịnabata ntụziaka Chineke na ịdọ aka ná ntị ya, n’ihi na Baịbụl gwara Ndị Kraịst, sị: “Chineke na-emeso unu dị ka ụmụ. N’ihi na olee nwa nke nna ya na-adịghị adọ aka ná ntị?”—Ndị Hibru 12:7.

Ime ihe ndị a ga-agbanwecha otú i si ebi ndụ. Baịbụl sịrị: “Unu kwesịrị ime ka ike nke na-eduzi uche unu dị ọhụrụ, unu kwesịkwara iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị, n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.” (Ndị Efesọs 4:23, 24) I kwesịkwara ịṅa ntị ná ndụmọdụ Pita nyere. Ọ sịrị: “Dị ka ụmụ na-erube isi, kwụsịnụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka ọchịchọ unu nwere n’oge gara aga si dị, mgbe unu na-amaghị ihe.”—1 Pita 1:14.

Ịchọta Ndị Bụ́ Ezigbo Ndị Ezinụlọ Gị

Mgbe Cézar chọtara nne ya, ọ tọrọ ya ụtọ nke ukwuu ịmata na ya nwekwara otu nwanne nwoke na otu nwanne nwaanyị. Ọ bụrụ na ị bịaruo Nna gị nke eluigwe nso, ị ga-achọpụtakwa na i nwere ọtụtụ ụmụnne ndị nwoke na ndị nwaanyị n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ka gị na ha na-akpakọrịta, i nwere ike ịhụ na gị na ha dị ná mma karịa ndị ezinụlọ gị ndị gị na ha si n’otu afọ.—Ọrụ 28:14, 15; Ndị Hibru 10:24, 25.

A na-akpọ gị òkù ka ị lọghachikwute ezigbo Nna gị na ezigbo ụmụnne gị ndị nwoke na ndị nwaanyị. Ị ga-enwe ọṅụ dị ukwuu otú ahụ Cézar na ọtụtụ puku ndị bi na Korea nwere mgbe ha chọtara ndị ezinụlọ ha.

[Foto dị na peeji nke 8]

Cézar na nne ya, mgbe Cézar dị afọ iri na itoolu

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Mee ihe ndị i kwesịrị ime ka ị bịaruo Chineke nso