Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Na-anaghị Eji Obe Efe Ofufe?

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Na-anaghị Eji Obe Efe Ofufe?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Jụrụ

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Na-anaghị Eji Obe Efe Ofufe?

Ndịàmà Jehova kwenyesiri ike na ọnwụ Jizọs Kraịst mere ka e nwee ihe mgbapụta nke megheere ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ ohere inwe ndụ ebighị ebi. (Matiu 20:28; Jọn 3:16) Ma, ha ekweghị na Jizọs nwụrụ n’elu obe, dị ka a na-esekarị n’ihe osise. Ha kweere na Jizọs nwụrụ n’elu ogwe osisi nke na-enweghị osisi ọzọ a tụhiere ya.

Ebe obe malitere bụ na Mesopotemia, n’ihe dị ka puku afọ abụọ tupu Kraịst abịa n’ụwa. N’oge ochie, ọtụtụ narị afọ tupu a mụọ Jizọs, a tụrụ obe ná nnukwu nkume ndị dị ná mba ndị dị n’ebe ùgwù Yurop. Sven Tito Achen, onye Denmark bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme, bụrụkwa ọkà mmụta n’ihe metụtara ihe nnọchianya, dere n’akwụkwọ ya bụ́ Symbols Around Us na ndị ahụ na-abụghị Ndị Kraịst weere obe “dị ka ihe e ji eme anwansi . . . nke na-enye nchebe, nke na-eweta chi ọma.” Ka a sịkwa ihe mere akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia ji kwuo na “obe dị tupu oge Ndị Kraịst, dịrịkwa n’etiti ndị na-abụghị Ndị Kraịst, bụ́ ndị weere ya dị ka ihe àmà nke ihe ndị dị n’igwe.” Gịnịzi mere chọọchị dị iche iche ji were obe dị ka ihe nnọchianya kacha dị nsọ?

W. E. Vine, onye Britain bụ́ ọkà mmụta a na-akwanyere ùgwù kwuru eziokwu a gbara ọkpụrụkpụ mgbe ọ sịrị: “N’ihe dị ka otu puku afọ na narị asaa na iri ise gara aga . . . a nabatara ndị na-ekpere arụsị na chọọchị dị iche iche . . . a hapụkwara ha ka ha jiri ihe àmà na ihe nnọchianya ndị ha na-eji ekpere arụsị bata. Ya mere, a nabatara Tau ma ọ bụ T, . . . nke e wedatụrụ ihe e ji tụhie ya eweda.”—Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words.

Vine kwukwara na okwu Grik a sụgharịrị “obe” na nke a sụgharịrị “ịkpọgide n’obe” bụ “ogwe osisi ma ọ bụ osisi kwụ ọtọ . . . ọ bụghị obe ahụ ndị ụka na-ebu nke a tụhiere atụhie.” Akwụkwọ bụ́ Companion Bible nke Mahadum Oxford kwuru ihe kwekọrọ ná nke a, sị: “Ihe àmà na-egosi na . . . e gburu Onyenwe anyị n’elu osisi kwụ ọtọ, ọ bụghị n’elu osisi abụọ a tụhiere otu n’elu nke ọzọ.” O doro anya na chọọchị webatara omenala ahụ ewebata bụ́ nke na-esighị na Baịbụl.

Achen, bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme, nke e kwuru okwu ya na mbụ, sịrị: “O yighị ka ò nwere mgbe Ndị Kraịst na-eji ihe nnọchianya bụ́ obe efe ofufe, malite na mgbe Jizọs nwụrụ ruo narị afọ abụọ ọ nwụchara.” O kwukwara na ‘otú ahụ ndị mmadụ n’oge a na-anaghị ele ígwè e ji egbupụ ndị mmadụ isi ma ọ bụ oche e ji akwụgbu mmadụ anya ọma, ọ bụ otú ahụ ka Ndị Kraịst oge mbụ lere obe anya dị ka ọnwụ na ihe ọjọọ.’

Ihe kacha mkpa bụ na n’agbanyeghị ihe ọ bụla e ji taa Jizọs ahụhụ ma kpọgbuo ya, Ndị Kraịst ekwesịghị iji ihe oyiyi ya ma ọ bụ ihe nnọchianya ya na-efe ofufe. Baịbụl nyere iwu, sị: “Gbaaranụ ikpere arụsị ọsọ.” (1 Ndị Kọrịnt 10:14) Jizọs n’onwe ya kwuru ihe a ga-eji mara ndị bụ ezigbo ndị na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:35.

Dị ka Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ mere, Ndịàmà Jehova na-agbalị ịgbaso Baịbụl kama ịgbaso ọdịnala. (Ndị Rom 3:4; Ndị Kọlọsi 2:8) Ọ bụ ya mere ha anaghị eji obe efe ofufe.

[Foto dị na peeji nke 22]

Ihe a tụrụ atụ nke na-egosi eze Asiria bụ́ onye na-ekpere arụsị ka o yi obe, n’ihe dị ka 800 T.O.A.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto a natara Ebe A Na-edebe Ihe Ochie na Britain ike see