Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

I Nwere Ike Inwe Obi Ụtọ n’Agbanyeghị na Ihe Agaghị Otú Ị Chọrọ

I Nwere Ike Inwe Obi Ụtọ n’Agbanyeghị na Ihe Agaghị Otú Ị Chọrọ

I Nwere Ike Inwe Obi Ụtọ n’Agbanyeghị na Ihe Agaghị Otú Ị Chọrọ

OLEE onye ga-asị na ihe ọ na-achọghị abịatụbereghị ya? Ọbụna Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke, nwere mgbe ihe na-agaghị otú ọ chọrọ, ya ewute ya. Dị ka ihe atụ, ọ napụtara ndị Izrel ka ha ghara ịbụkwa ndị ohu n’Ijipt, ọ gọzikwara ha nke ukwuu. Ma, Baịbụl sịrị: “Ha nwara Chineke ọnwụnwa ugboro ugboro, ha mekwara ihe wutere Onye Nsọ Izrel.” (Abụ Ọma 78:41) N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova bụ “onye obi ụtọ” mgbe niile.—1 Timoti 1:11.

N’ezie, e nwere ọtụtụ ihe na-eme ka ihe ghara ịga otú anyị chọrọ. Olee ihe anyị nwere ike ime ka ha ghara ịnapụ anyị obi ụtọ? Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe Jehova bụ́ Chineke mere mgbe ihe na-agaghị otú ọ chọrọ?

Ihe Ndị Na-anaghị Aga Otú Anyị Chọrọ

Okwu Chineke sịrị na “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị” anyị niile. (Ekliziastis 9:11) Ná mberede, mpụ, ihe mberede, ma ọ bụ ọrịa, nwere ike ịkpatara anyị oké nchekasị, bụ́ ihe ndị anyị na-achọghị ka ha bịara anyị. Baịbụl kwukwara, sị: “Ihe a na-atụ anya ya nke e yigharịrị oge ya na-eme ka obi daa ọrịa.” (Ilu 13:12) Obi na-atọ anyị ụtọ mgbe anyị nwere ihe ọma anyị na-atụsi anya ya ike. Ma, ọ bụrụ na o rughị anyị aka ngwa ngwa, ọ na-ewute anyị nke ukwuu. Dị ka ihe atụ, Duncan, * bụ́ onye obi ya dị n’ịnọ n’ala ọzọ na-ekwusa ozi ọma, chọpụtara na ya na nwunye ya aghaghị ịlaghachi n’obodo ha mgbe ha kwusarala ozi ọma ọtụtụ afọ n’ala ọzọ. Ọ sịrị: “Ná nke mbụ ya ná ndụ m, amakwaghị m ihe m ga-eme eme. O nwekwaghị ihe na-agụ m agụụ ime. O nwekwaghị ihe dị m mma ná ndụ.” Dị ka o mere Claire, mmadụ nwere ike inwe mwute ruo ogologo oge mgbe ihe ọ na-achọghị bịaara ya. Ọ sịrị: “Adị m ime ọnwa asaa mgbe ime pụrụ m. Ọtụtụ afọ agafeela, ma, ọbụna ugbu a, m hụ nwata nwoke ka ọ pụtara na-ekwu okwu n’ihu ọgbakọ, m na-asị onwe m, ‘Ihe a bụ otú nwa m nwoke gaara aha ugbu a.’”

Ọ na-ewutekwa ewute mgbe mmadụ mere gị ihe ị na-atụghị anya ya, dị ka mgbe onye ị chọrọ ịlụ sịrị na ya achọkwaghị ka ị lụọ ya, mgbe alụmdi na nwunye kụrụ afọ n’ala, mgbe nwatakịrị nupụrụ isi, mgbe enyi gị gbara gị mgba okpuru ma ọ bụ mee gị ihe na-adịghị mma. Ebe ọ bụ na anyị na ndị na-ezughị okè bi n’oge a siri ike, ihe anyị na-achọghị ga na-abịara anyị.

Ihe ndị anyị na-emehie n’onwe anyị nwere ike ịkpatara anyị mwute. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị adaa ule, ọ bụrụ na anyị enwetaghị ọrụ, ọ bụrụ na onye anyị hụrụ n’anya ahụghị anyị n’anya, anyị nwere ike iche na o nweghị uru anyị bara. Anyị nwekwara ike inwe mwute mgbe onye anyị hụrụ n’anya na-achọkwaghị ife Chineke. Mary sịrị: “O yiri ka nwa m nwaanyị ò ji obi ya dum na-efe Chineke. Ọ dị m ka m setịpụụrụ ya ezi ihe nlereanya. Ma, mgbe ọ gbakụtara Jehova bụ́ Chineke na iwu ezinụlọ anyị azụ, m chere na mụ akụọla afọ n’ala. O nweghị nke ọ bụla n’ihe niile ọzọ m mere nke ọma ná ndụ m na-eme ka obi tọọ mụ ụtọ. Obi dara m mbà.”

Olee otú anyị nwere ike isi die ụdị ihe mwute a? Iji mata azịza ya, tụlee ihe nlereanya Jehova setịpụrụ mgbe ihe ọ na-achọghị mere.

Lekwasị Anya n’Imezi Ihe Mebiri Emebi

Jehova bụ́ Chineke ji ịhụnanya nye di na nwunye mbụ ihe niile dị ha mkpa, ma, ha nupụrụ isi wee gosi na ha enweghị obi ekele. (Jenesis isi nke abụọ na nke atọ) Nwa ha nwoke bụ́ Ken wee malite ịkpa àgwà ọjọọ. Ken leghaara ịdọ aka ná ntị Jehova anya wee gbuo nwanne ya. (Jenesis 4:1-8) Chegodị echiche ụdị mwute Jehova nwere mgbe ahụ!

Gịnị mere na Chineke ekweghị ka ihe ahụ ha mere napụ ya obi ụtọ? Ọ bụ n’ihi na ọ bụ nzube ya ka ụmụ mmadụ zuru okè jupụta n’ụwa, ọ nọgidekwara na-arụ ọrụ ka nzube ahụ mezuo. (Jọn 5:17) Ọ bụ ya mere o ji mee ka e nwee ihe mgbapụta ahụ na Alaeze ya. (Matiu 6:9, 10; Ndị Rom 5:18, 19) Jehova bụ́ Chineke lekwasịrị anya n’imezi ihe ahụ mebiri emebi, ọ bụghị ná nsogbu ahụ.

Okwu Chineke gbara anyị ume ka anyị lekwasị anya n’ihe anyị nwere ike ime, ọ bụghị n’ihe anyị gaara eme ma ọ bụ n’ihe anyị na-emetaghị. Ọ sịrị: “Ihe ọ bụla nke bụ́ eziokwu, ihe ọ bụla nke dị mkpa, ihe ọ bụla nke ziri ezi, ihe ọ bụla nke dị ọcha, ihe ọ bụla nke na-akpali ịhụnanya, ihe ọ bụla nke a na-ekwu okwu ọma banyere ya, omume ọma ọ bụla dịnụ na ihe ọ bụla dịnụ nke kwesịrị otuto, na-echebaranụ ihe ndị a echiche.”—Ndị Filipaị 4:8.

Otú Anyị Kwesịrị Isi Lee Ihe Anyị Na-achọghị nke Bịaara Anyị Anya

E nwere ihe ndị nwere ike ime, ndụ anyị agbanwee nke ukwuu. Dị ka ihe atụ, ihe nwere ike ime, anyị agakwaghị enwe ọrụ, di ma ọ bụ nwunye, ma ọ bụ kwụsị ọrụ ndị anyị na-arụ n’ọgbakọ. Anyị nwere ike ịmalite ịrịa ọrịa, anyị nwekwara ike ịghọ ndị na-enwekwaghị ụlọ, ma ọ bụ ndị enyi anyị ahapụ anyị. Olee otú anyị nwere ike isi die ihe ndị a?

Ụfọdụ ndị achọpụtala na ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ na-enye aka. Duncan, bụ́ onye e kwuru okwu ya ná mbụ, sịrị: “Mgbe mụ na nwunye m chọpụtara na anyị enweghị ike ịlaghachi n’ozi anyị, o wutere anyị nke ukwuu. Anyị mechara kpebie ihe abụọ anyị ga-ebute ụzọ ná ndụ: ilekọta nne anyị na ịnọgide na-eje ozi ọma oge niile, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume. Ọ bụrụ na e nwee mkpebi ndị ọzọ anyị ga-eme, anyị na-atụle otú ha ga-esi metụta ihe ndị a anyị butere ụzọ ná ndụ. Nke a mere ka ihe dịrị anyị mfe.”

Mgbe ihe anyị na-achọghị bịaara anyị, ọ na-ebu ọtụtụ n’ime anyị ibu n’anya gabiga ókè. Dị ka ihe atụ, o nwere ike mgbalị niile anyị tinyere n’ịzụlite nwata, n’ịchọ ọrụ, ma ọ bụ n’ikwusa ozi ọma ná mba ọzọ, agaghị arụpụta ihe anyị tụrụ anya ya. Mmadụ nwere ike iche, sị, ‘Akụọla m afọ n’ala.’ Ma, otú ahụ o si bụrụ na Chineke akụghị afọ n’ala maka na ụmụ mmadụ emeghị ihe ọ chọrọ ná mmalite, ọ bụ otú ahụ ka anyị onwe anyị na-akụghị afọ n’ala naanị maka na mgbalị anyị mere agaghị otú anyị chọrọ ya.—Diuterọnọmi 32:4, 5.

Mgbe ndị mmadụ mere anyị ihe anyị na-achọghị, ọ na-adịrị anyị mfe iwe iwe dị ọkụ. Jehova anaghị eme otú ahụ. Eze Devid mere ihe wutere Jehova nke ukwuu mgbe ọ kwara iko ma gbuo di nwaanyị nke ya na ya kwara iko. Ma, Jehova hụrụ na Devid ji obi ya chegharịa, Devid wee nọgide bụrụ ohu ya. N’otu aka ahụ, Eze Jehọshafat bụ́ onye kwesịrị ntụkwasị obi mere mmehie mgbe ọ gara sonyere ndị iro Chineke. Onye amụma Jehova kwuru, sị: “N’ihi nke a, Jehova na-eweso gị iwe. Ka o sina dị, e nwere ihe ndị dị mma a hụrụ n’ime gị.” (2 Ihe E Mere 19:2, 3) Jehova maara na otu ihe Jehọshafat mehiere apụtaghị na ọ jụla ya. N’otu ụzọ ahụ, anyị na ndị enyi anyị ga-anọgide na-adị ná mma ma ọ bụrụ na anyị anaghị ewebiga iwe ókè mgbe ha mehiere. Ndị enyi anyị ndị mere ihe anyị na-achọghị ka nwere ike inwe àgwà ndị dị mma.—Ndị Kọlọsi 3:13.

Ihe ndị na-adịghị mma bịaara anyị nwere ike imecha nyere anyị aka inwe ihe ịga nke ọma ná ndụ. Onwe anyị nwere ike ịgbụ anyị ma anyị mee mmehie. Ma, anyị na Chineke nwere ike ịdịghachi ná mma ma ọ bụrụ na anyị ekpebie ilefuru ihe gara aga anya ma mee ihe anyị kwesịrị ime. Mgbe Eze Devid mere ihe wutere ya onwe ya nke ukwuu, o dere, sị: “Ike gwụrụ ọkpụkpụ m n’ihi ude m na-asụ ogologo ụbọchị dum. . . . N’ikpeazụ, ekwupụtaara m gị [Jehova] mmehie m . . . , gị onwe gị gbaghaara m njehie m na mmehie m.” (Abụ Ọma 32:3-5) Ọ bụrụ na anyị amata na anyị emeghị ihe Chineke chọrọ ka anyị mee, anyị kwesịrị ịrịọ ya ka ọ gbaghara anyị, anyị kwesịkwara ịgbanwe ụzọ anyị ma kpebisie ike isochi ndụmọdụ ya anya n’ọdịnihu.—1 Jọn 2:1, 2.

Kwadebe Ugbu a Maka Ihe Ị Na-achọghị nke Nwere Ike Ịbịara Gị

O doro anya na ihe anyị na-achọghị nwere ike ịbịara anyị n’ọdịnihu. Olee ihe anyị nwere ike ime iji kwadebe onwe anyị? Ọ dị mma ịnụ ihe Bruno kwuru, bụ́ Onye Kraịst katarala ahụ́, onye ndụ ya gbanwere n’ihi ihe dị mwute mere ya. Ọ sịrị: “Otu ihe kacha enyere m aka idi ihe mwute bịaara m bụ na ahapụghị m ihe m dị mbụ na-eme iji mee ka mụ na Chineke na-adị ná mma. M dị mbụ mara ihe mere Chineke ji kwe ka ụwa ọjọọ a ka dịrị. Anọwo m na-agbalị kemgbe ọtụtụ afọ ka mụ na Jehova na-akpachi anya. Enwere m obi ekele na m mere otú a. Ihe kasiri m obi bụ na m maara na ọ kwụ m n’azụ. Ọ bụ nke a nyeere m aka idi ihe na-echegbu m.”

Mgbe anyị na-eche banyere ọdịnihu, o nwere otu ihe anyị pụrụ ijide n’aka, ya bụ, na ọ bụ ezie na anyị nwere ike ime onwe anyị ihe ga-ewute anyị, ndị ọzọ nwekwara ike ime ihe ga-ewute anyị, ma ọ dịghị mgbe Chineke ga-eme anyị ihe ga-ewute anyị. N’eziokwu, Chineke kwuru na aha ya, bụ́ Jehova, pụtara “M ga-abụ ihe m chọrọ ịbụ.” (Ọpụpụ 3:14) Nke a na-eme ka obi sie anyị ike na ọ ga-aghọ ihe ọ bụla dị mkpa iji mezuo nkwa ya. O kwere nkwa na Alaeze ya ga-eme ka uche ya ‘mee n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.’ Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji dee, sị: “Ekwetara m na ọnwụ ma ọ bụ ndụ ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ọchịchị . . . ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke agaghị enwe ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke nke o gosiri site n’aka Kraịst Jizọs.”—Matiu 6:10; Ndị Rom 8:38, 39.

Anyị ga-eji obi ike na-atụ anya mgbe Chineke ga-emezu nkwa o kwere site n’ọnụ Aịzaya onye amụma, nke sịrị: “Lee, m na-eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. A gaghị echeta ihe mbụ niile, ha agaghị abatakwa n’obi.” (Aịzaya 65:17) Anyị nwere olileanya magburu onwe ya, nke bụ́ na oge na-abịa mgbe ihe niile anyị na-achọghị na-abịara anyị ugbu a na-agakwaghị adị!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 A gbanwere aha ụfọdụ n’isiokwu a.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]

Anyị akụghị afọ n’ala naanị maka na mgbalị anyị mere agaghị otú anyị chọrọ

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 14]

Okwu Chineke gbara anyị ume ka anyị lekwasị anya n’ihe anyị nwere ike ime, ọ bụghị n’ihe anyị gaara eme

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Obi dị Chineke ụtọ n’agbanyeghị na ụmụ mmadụ mehiere, n’ihi na nzube ya ga-emezurịrị

[Foto dị na peeji nke 16]

Ibute ihe ndị metụtara ofufe Chineke ụzọ na-enyere anyị aka idi ihe anyị na-achọghị bịaara anyị