Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikpe Laara Ndị E Mesoro Ihe Ike

Ikpe Laara Ndị E Mesoro Ihe Ike

Ikpe Laara Ndị E Mesoro Ihe Ike

NA May 3, 2007, ndị ọkàikpe niile nke Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop, nke dị na Strasbourg, France, ji otu olu kpelaara Ndịàmà Jehova nọ na Republic of Georgia ikpe. Ụlọikpe ahụ chọpụtara na a na-arụsa Ndịàmà arụrụala, nakwa na a naghị ekwe ha fee Chineke otú ha chọrọ bụ́ nke iwu kwadoro ka ha na-eme. Ụlọikpe ahụ bakwaara ọchịchị na-achịbu Georgia mba otú ha si gbachi nkịtị ghara ịkpọpụ ndị ahụ rụsara Ndịàmà arụrụala ụlọikpe. Gịnị mere ha ji mee mkpebi a?

N’October 17, 1999, otu narị mmadụ na iri abụọ nọ n’Ọgbakọ Gldani nke Ndịàmà Jehova na Tbilisi, bụ́ isi obodo Georgia, zukọrọ na-efe Chineke n’enweghị nsogbu. Ná mberede, Vasili Mkalavishvili, onye ndị okpukpe Ọtọdọks chụrụ n’ọrụ ụkọchukwu, kpọ ìgwè mmadụ buru ibu wabata n’ebe Ndịàmà ahụ nọ na-amụ ihe. Ìgwè mmadụ ahụ bu okpiri na obe e ji ígwè rụọ wabata malite ịkụ ndị ahụ na-amụ ihe ihe. Ha merụkwara ọtụtụ n’ime ha ahụ́ nke ukwuu, kụkpọọ otu nwaanyị anya. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, a kpọgara mmadụ iri na isii ụlọ ọgwụ. Mgbe ụfọdụ Ndịàmà gara n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ka ha nyere ha aka, ha hụrụ onyeisi ndị uwe ojii, bụ́ onye gwara ha na ya gaara eme ha nke ka njọ ma à sị na ọ bụ ya! Otu n’ime ndị kpara arụ ahụ ji ígwè vidio sere ihe niile merenụ, e mechaa, ụlọ ọrụ televishọn obodo ahụ gosiri ya na TV, gosikwa ndị kpara arụ ahụ. *

Ndịàmà ahụ e mesoro ihe ike mere mkpesa, dee ya edee, ma e nweghị ihe e mere ndị ahụ kpara arụ ahụ. Onye uwe ojii na-eme nchọpụta bụ́ onye e nyefere okwu ahụ n’aka kwuru na ya bụ onye okpukpe Ọtọdọks, na ya agaghị enwe ike ịkwụwa aka ọtọ n’okwu ahụ. Nkịtị ahụ ndị ọchịchị gbara mere ka ndị ahụ okpukpe ha na-agba ara kpaa ụdị arụ ahụ ọzọ ihe karịrị otu narị ugboro.

Na June 29, 2001, Ndịàmà Jehova gbara ha akwụkwọ n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop. * Ụlọikpe ahụ kpebiri ikpe ahụ na May 3, 2007. Ná mkpebi ikpe ahụ, ha kọwara arụrụala ahụ ndị ahụ rụrụ ma taa ndị ọchịchị obodo ahụ ụta maka otú ha si gbachi nkịtị n’emeghị ihe ọ bụla. Ụlọikpe ahụ sịrị: “Ọ bụ ọrụ dịịrị ndị ọchịchị . . . ịchọpụta ozugbo ma ọ̀ bụ eziokwu na” e tiri Ndịàmà ahụ ihe. Ha kwuru ná mkpebi ikpe ha na “naanị ihe nkịtị ahụ ndị ọchịchị gbara ga-eme bụ ime ka ọhaneze ghara inwe ntụkwasị obi n’iwu na-achị obodo, gharakwa inwe ntụkwasị obi na ndị ọchịchị ga-ahụ na e debere iwu obodo.”

Ụlọikpe ahụ kwubiri, sị: “Ebe ọ bụ na ndị ọchịchị leghaara ihe ahụ e tiri ndị a n’October 17, 1999, anya, ya bụ, ndị a gbara akwụkwọ, bụ́ nke mbụ ìgwè mmadụ hà otú ahụ lụsoro Ndịàmà Jehova ọgụ, nkịtị ahụ ha gbara mere ka otu ìgwè ahụ nke na-eme ihe ike mesowe ha ihe ike n’ebe niile na Georgia.”

Ya mere, ikpe laara ndị ahụ e mesoro ihe ike, a gwakwara ọchịchị Georgia ka ọ kwụọ ndị nọ n’Ọgbakọ Gldani ego iti aka n’obi nakwa ego niile ha mefuru n’ikpe ahụ. Ọ bụ ezie na Ndịàmà Jehova nọ na Georgia nwere obi ụtọ na ihe ike a na-emeso ha na arụrụala a na-arụsa ha akwụsịtụla, obi na-atọ ha ụtọ karịchaa na Ụlọikpe ahụ kpebiri na ha nweere onwe ha izukọta na-efe Chineke n’enweghị nsogbu. Ha ji obi ha dum na-ekele Nna ha nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke, n’ihi otú o si duzie ha ma chebe ha n’oge ọnwụnwa ahụ.—Abụ Ọma 23:4.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ị chọọ ịmatakwu otú ihe ahụ si mee, gụọ Teta! (Bekee) nke January 22, 2002, peeji nke 18-24, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 5 Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop bụ ngalaba nke Òtù Na-ahụ Maka Udo na Yurop. Ọ bụrụ na e mebie Ihe Òtù Na-ahụ Maka Udo na Yurop Kwekọrịtara na Ha Ruuru Mmadụ Nakwa na Mmadụ Nweere Onwe Ya Ime Ha, ọ bụ Ụlọikpe a na-ekpe ya. Georgia sonyeere òtù a na May 20, 1999, wee si otú a kweta ime ihe òtù a kpebiri.