Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikwusa Ozi Ọma na Ịkụzi Baịbụl n’Africa

Ikwusa Ozi Ọma na Ịkụzi Baịbụl n’Africa

Ikwusa Ozi Ọma na Ịkụzi Baịbụl n’Africa

Mba ole dị na ya: 57

Ndị bi na ya: 827,387,930

Ndịàmà Jehova: 1,086,653

Ndị a na-akụziri Baịbụl: 2,027,124

AKỤKỌ a e dere banyere otú Ndịàmà Jehova si kwusaa ozi ọma n’afọ gara aga abụghị iji mezuo iwu. Kama, ọ na-egosi otú ndị ikom, ndị inyom na ụmụntakịrị si hụ Chineke n’anya, na-asọpụkwara ya. N’ezie, akụkọ a na-eme ka anyị mata ọtụtụ ihe ọ na-efu Ndịàmà Jehova, nakwa mbọ ha na-agba, iji kwusaa ozi ọma. Ụdị mbọ a ha na-agba, ma ò buru ibu ma ọ̀ dị ntakịrị, dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova bụ́ Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst. (Abụ Ọma 50:14; Luk 21:1-4) Akụkọ a na-echetakwara anyị na ọ bụ naanị ‘ike nke Chineke na-enye’ ka e ji na-arụ ọrụ a na-azọpụta ndụ. (1 Pita 4:11) Ya mere, mgbe ị na-atụgharị uche n’akụkọ a, ‘nọgide na-enweta ike n’ime Onyenwe anyị nakwa n’ịdị ike nke ume ya.’—Ndị Efesọs 6:10.

Côte d’Ivoire Agụụ eziokwu dị na Baịbụl na-agụ ndị bi n’obodo nta bụ́ Bianouan, nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke mba ahụ. Ụfọdụ n’ime ha na-akpọte Ndịàmà n’elekere isii nke ụtụtụ ka ha mụọ Baịbụl tupu ha agawa ubi. Ụfọdụ na-arịọ ka a bịa kụziere ha Baịbụl ná mgbede mgbe Ndịàmà lọtara ọmụmụ ihe ha. Otu ụbọchị, otu nwaanyị nke na-agụghị akwụkwọ rịọrọ otu Onyeàmà ka o nye ya akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, nke Ndịàmà Jehova bipụtara. Ọ sịrị na di ya ga na-agụrụ ya akwụkwọ ahụ. Onyeàmà ahụ nyere ya akwụkwọ ahụ ma gaa n’ụlọ ha n’echi ya. Nwaanyị ahụ na di ya nọ na-eche ya eche. Di ya agaghị ubi maka na ha ji abalị ahụ dum gụọ akwụkwọ ahụ. N’ihi ya, ọ chọrọ ka ya na Onyeàmà ahụ kwurịta ihe ọ gụtara n’akwụkwọ ahụ. A malitere ịkụziri di na nwunye ahụ Baịbụl.

Benin N’otu ime obodo, otu nnukwu ezinụlọ malitere ịmụ Baịbụl. Nna ha bụ pastọ na chọọchị ndị obodo ahụ na-aga. Naanị izu abụọ ezinụlọ ahụ malitere ịmụ Baịbụl, ha dum zara òkù a kpọrọ ha ka ha bịa mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova. Ná mgbede Saturday ya, ada ha dara ọrịa ná mberede wee nwụọ. Nna ha bịara mgbakọ ahụ na Sunday, n’agbanyeghị ọnwụ nwa ya. Na Monday ya, o kwuru banyere ọnwụ nwa ya, sị: “Ọ bụ Setan mere ihe a iji kụda anyị aka, ma, ezinụlọ m agaghị ekwe ka nke a mee.” O wepụtara ngwongwo niile o ji ekpe chọọchị, ya bụ, uwe mwụda ya, okpu ya, ájị̀ ya, mmanụ nsọ, na mkpara ya. Nwunye ya, bụ́ onye nwere ọkwá na chọọchị ahụ, mekwara otu ihe ahụ. Pastọ ahụ kwuru, sị: “O nwekwaghị ihe jikọrọ anyị na chọọchị a.” Ọ kpọrọ ihe niile ahụ ọkụ n’ihu ọha, bụ́ ụdị ihe a kọrọ n’Ọrụ 19:19. Ezinụlọ ahụ na-eme nnọọ nke ọma.

Madagascar N’afọ gara aga, n’otu obodo nta ihe dị ka narị mmadụ ise bi, otu onye ụka natara otu Onyeàmà bi n’obodo nta ọzọ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Mgbe onye ụka a gụchara ya nke ọma, obi siri ya ike na ya amatala nke bụ́ eziokwu, o wee malite ịgwa ndị chọọchị ya ihe ọ gụtara. Ọ dịghị anya, ma ya, ma ezinụlọ ya, ma mmadụ iri abụọ ọzọ, malitere izukọta na-amụ ihe otú Ndịàmà Jehova na-eme. Ndịàmà Jehova ndị na-ekwusa ozi ọma oge niile bịara nyere ha aka. Ha kụziiri ọtụtụ ndị nwere mmasị Baịbụl, mee ndokwa ka ha na-ezukọ mgbe niile maka ọmụmụ ihe ụfọdụ Ndịàmà Jehova na-enwe. N’October, mmadụ ise ghọrọ Ndịàmà Jehova a na-emebeghị baptizim, ugbu a kwa, ndị ahụ na-ekwusa ozi ọma oge niile emeela ndokwa ka ha na-enwe Nzukọ Ihu Ọha na Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ha na-adịkarị mmadụ iri anọ n’ọmụmụ ihe ndị a, a na-akụzikwara ihe karịrị mmadụ iri abụọ Baịbụl n’ụlọ ha.

South Africa Hennie na nwunye ya nọ na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ka ha na-aga n’akụkụ otu ụlọ a gbara ogige, otu nkịta ọjọọ wepụtara isi taa Hennie arụ n’aka, ya agbawa ọbara nke ukwuu. Ha wee gbara lawa n’ụlọ ha, nwunye ya wee sachaa ebe ahụ nkịta tara ya arụ, keekwa ya ákwà. Hennie mere ndokwa ịga hụ dọkịta ma e mechaa. Ọ gwara nwunye ya na ya achọghị ka ọ bụrụ nkịta ga-eme ka ya ghara ịga ozi ọma. Mgbe ihe dị ka otu awa gachara, ha gaghachiri ebe ahụ ha nọ na-ekwusa ozi ọma. Ha malitere ozi ọma n’ụlọ dị n’akụkụ ụlọ ahụ nkịta tara ya. Mgbe ha gara n’ụlọ ole na ole, otu nwoke nabatara ha n’ụlọ ya. O gere ha ntị nke ọma, ọ chọsikwara ike ka ha bịa na nke ya ọzọ. Ha malitere ịkụziri ya Baịbụl, ọ dịghị anya, ya ebido ịgachi ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova anya. Mgbe nwoke ahụ kwụsịrị ikpe ụka Dutch Reformed Church, otu onye ukwu na chọọchị ahụ bịara leta ya wee gwa ya na a ga-echi ya dikọn. Ma, ọ laghị azụ ná mkpebi ya ịhapụ chọọchị ahụ. Ọ na-eme nke ọma, o debawokwa aha ya n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.

Tanzania N’October 2005, mgbe a gbasiri mbọ ike ka e kwusaa ozi ọma n’ebe a na-anaghị ekwusakarị ozi ọma, Ndịàmà itoolu, ndị si n’Ọgbakọ Iringa nke Ndịàmà Jehova, gawara Pawaga, bụ́ ebe dị kilomita iri asaa na ise site n’ebe ọgbakọ ha dị. Ha nụrụ na e nwere naanị otu Onyeàmà nke bi ebe ahụ, ha gakwara chọọ ya. Ha jụrụ ọtụtụ ndị ajụjụ, mechaa hụ Onyeàmà ahụ. Ọ gwara ha na ya ebiela ebe ahụ ihe karịrị afọ iri abụọ, na ya chere na a ka machibidoro ọrụ ikwusa ozi ọma iwu na Tanzania. Ọ na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma kemgbe ọtụtụ afọ, ọ sịkwara na ụfọdụ ndị nwere ezigbo mmasị na Baịbụl. Ndịàmà ndị si Ọgbakọ Iringa wepụtara onwe ha ịnọ izu abụọ na Pawaga iji kụziere ndị nwere mmasị na Baịbụl ihe. Na 2006, Ndịàmà Jehova abụọ ndị na-ekwusa ozi ọma oge niile kwagara ebe ahụ ọtụtụ ndị nwere mmasị iji kụziere ha Baịbụl. E nyeere Onyeàmà ahụ aka ka ya na Chineke dịkwuo ná mma. Ugbu a, ha dị Ndịàmà itoolu n’ebe ahụ. Ka ọ dị ugbu a, ha na-amụ ihe n’okpuru osisi. Ma, ha na-eme ndokwa ka ha jiri ihe ndị e ji arụ ụlọ n’obodo ahụ rụọ obere ụlọ ha ga-anọ na-amụ ihe.

Rwanda Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Gentille ghọrọ onye a ma ama n’ihi otú o si enwe ike ịsụnye ọkpụ ma ọ gbawa bọl. Ndị mmadụ kpọwara ya Manayibitego n’asụsụ Kinyarwanda, nke pụtara “Chi Na-asụnye Ọkpụ.” Ụfọdụ ndị Italy hụrụ otú o si agba bọl, ha wee nyekwuo ya ọzụzụ. Ha wee kpọọ ya ka ọ bịa soro na-agba bọl n’Italy. Ohere ịga Yurop na ịghọ onye a ma ama nke na-agba bọl ná mba dị iche iche magburu onwe ya. Ma, Gentille maara na ọ bụrụ na ya ekweta, na ya ga-ahapụ ezinụlọ ya. Mama ya bụ Onyeàmà. Ọ bụ ezie na Gentille amụtụla Baịbụl, ma, o nwebeghị mgbe o ji ya kpọrọ ihe. Ihe o ji mere ihe mbụ ná ndụ ya bụ ịgba bọl. Gentille na mama ya kwurịtara nke ahụ, ya ewee ghọta na nke ahụ nwere ike ime ka ya na Chineke ghara ịdị ná mma. O kpebiri na ya agaghị aga nakwa na ya ga-ebute mmekọrịta ya na Chineke ụzọ ná ndụ ya. E mere ya baptizim ná mgbakọ Ndịàmà Jehova nwere n’oge na-adịbeghị anya.