Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

March 22, 2008 Bụ Ụbọchị E Kwesịrị Icheta

March 22, 2008 Bụ Ụbọchị E Kwesịrị Icheta

March 22, 2008 Bụ Ụbọchị E Kwesịrị Icheta

N’anyasị ikpeazụ Jizọs nọrọ n’ụwa tupu ya anwụọ, o nyere ndịozi ya otu ogbe achịcha na-ekoghị eko na otu iko mmanya wee gwa ha ka ha rie ya ma ṅụọ ya. Ọ gwakwara ha, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.”—Luk 22:19.

N’afọ a, ncheta ọnwụ Jizọs bụ́ nke a na-echeta kwa afọ, ga-abụ na Saturday, March 22, mgbe anyanwụ dachara. Ndịàmà Jehova n’ụwa dum ga-ezukọ n’anyasị a pụrụ iche iji cheta ọnwụ Jizọs otú ahụ o kwuru ka e si na-echeta ya. Anyị ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù ka ị bịa jiri anya gị hụ nke a. Biko, jụọ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu ka ha gwa gị ebe na oge a ga-enwe nnọkọ a.