Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye Na-eme Ka Mmadụ Dị Ndụ Ọzọ

Onye Na-eme Ka Mmadụ Dị Ndụ Ọzọ

Bịaruo Chineke Nso

Onye Na-eme Ka Mmadụ Dị Ndụ Ọzọ

Luk 7:11-15

Ò NWERE onye ị hụrụ n’anya nwụnahụrụ gị? Ọ bụrụ otú ahụ, mara na ihe kacha mwute ná ndụ emeela gị. Onye kere anyị ghọtara ụdị mwute ị na-enwe. Ọ bụghị naanị nke ahụ, o nwekwara ike ịgbanwe ihe ọnwụ wetaara gị. N’ime Baịbụl, ọ kọọrọ anyị banyere ndị e mere ka ha si n’ọnwụ bilie iji gosi na ọ bụghị naanị na ọ bụ Onye na-enye ndụ, kamakwa, ọ bụ Onye na-eme ka mmadụ dị ndụ ọzọ. Ka anyị leba anya n’akụkọ nke otu n’ime ndị o nyere Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ike ka o mee ka ha si n’ọnwụ bilie. A kọrọ banyere ọrụ ebube a na Luk 7:11-15.

O mere n’afọ 31 O.A. Jizọs gara Nen bụ́ obodo nta dị na Galili. (Amaokwu nke iri na otu) Ọ ga-abụ n’oge mgbede ka ọ garuru ná mpụga obodo ahụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ka o rutere nso n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, lee! e nwere onye nwụrụ anwụ a na-ebupụ, bụ́ nwa nwoke nne ya mụrụ naanị ya. E wezụga nke ahụ, ọ bụ nwaanyị di ya nwụrụ. Ìgwè mmadụ dị ukwuu ndị si n’obodo ahụ sokwa ya.” (Amaokwu nke iri na abụọ) Chegodị echiche ụdị uju nwaanyị ahụ di ya nwụrụ nọ na-eru. Mgbe otu mkpụrụ nwa ọ mụrụ nwụrụ, o nwekwaghị onye ọzọ ga na-egbo mkpa ya ma chebe ya.

Jizọs legidere nwaanyị ahụ na-eru uju anya, bụ́ onye nọ na-aga n’akụkụ ihe e ji buru ozu nwa ya. E dere n’ebe ahụ, sị: “Mgbe Onyenwe anyị hụrụ ya, o nwere ọmịiko n’ebe ọ nọ, o wee sị ya: ‘Kwụsị ịkwa ákwá.’” (Amaokwu nke iri na atọ) Ọnọdụ ọjọọ nke nwaanyị ahụ metụrụ ya n’obi nke ukwuu. Ikekwe, Jizọs chetara nne ya, bụ́ onye ọ ga-abụ na di ya anwụọla n’oge ahụ. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eruwekwa uju n’ihi ọnwụ Jizọs.

Jizọs gara nso, ma, ọ bụghị ka o sonyere ìgwè mmadụ ahụ. O weliri aka dị ka onye nwere ikike ime ihe ma “bitụ ihe ahụ e ji ebu ozu aka” wee mee ka ìgwè mmadụ ahụ kwụsị. O wee jiri olu onye e nyere ikike imeri ọnwụ kwuo, sị: “‘Nwa okorobịa, ana m asị gị, Bilie!’ Onye ahụ nwụrụ anwụ wee bilie nọrọ ọdụ ma malite ikwu okwu, o wee kpọnye ya nne ya.” (Amaokwu nke iri na anọ na iri na ise) Ọnwụ gburu nwa okorobịa ahụ wee kewaa ya na nne ya. Ya mere, mgbe Jizọs kpọọrọ ya ‘kpọnye nne ya,’ ha ghọrọ otu ezinụlọ ọzọ. O doro anya na mwute nke dị nwaanyị ahụ n’obi ghọziri obi ụtọ.

Ọ̀ na-agụsị gị agụụ ike ka i nwee ụdị obi ụtọ ahụ, ya bụ, ka onye ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ dịghachi ndụ? Ka obi sie gị ike na Chineke na-eche banyere gị. Ọmịiko ahụ Jizọs nwere n’ebe nwaanyị ahụ na-eru uju nọ bụ ụdị ọmịiko Chineke nwere, n’ihi na Jizọs nwere àgwà Nna ya, nweruo ya ala. (Jọn 14:9) Baịbụl na-agwa anyị na ọ na-agụsi Chineke agụụ ike ime ka ndị nwụrụ anwụ ọ na-echeta si n’ọnwụ bilie. (Job 14:14, 15) Okwu ya, bụ́ Baịbụl, na-eme ka anyị nwee olileanya magburu onwe ya, ya bụ, olileanya ịdị ndụ na paradaịs n’ụwa nakwa ịhụ mgbe a ga-eme ka ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie. (Luk 23:43; Jọn 5:28, 29) Ọ ga-adị mma ka ị mụkwuo banyere Onye ahụ nke na-eme ka mmadụ dị ndụ ọzọ nakwa otú ị ga-esi nwee olileanya ahụ.

[Foto dị na peeji nke 23]

“Onye ahụ nwụrụ anwụ wee bilie nọrọ ọdụ ma malite ikwu okwu, o wee kpọnye ya nne ya”