Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“iwu Ahụ Aghọwo Onye Nduzi Anyị”

“iwu Ahụ Aghọwo Onye Nduzi Anyị”

“iwu Ahụ Aghọwo Onye Nduzi Anyị”

ỤMỤAKA ole na-aghọta na iwu na ịdọ aka ná ntị baara ha uru? Ha adịghị ọtụtụ. Ịgwa ha ka ha ghara ime ihe ụfọdụ anaghị adị ha mma. Ma, ndị na-azụ ụmụaka maara na ilekọta ụmụaka nke ọma dị oké mkpa. Mgbe ụmụaka na-etolite, ikekwe, ọtụtụ n’ime ha na-aghọta na nduzi a na-enye ha baara ha uru nke ukwuu. Pọl onyeozi ji ihe atụ nke onye ọrụ ya bụ ilekọta ụmụaka gosi otu n’ime ụzọ Jehova bụ́ Chineke si elekọta ndị ya.

Ụfọdụ Ndị Kraịst ndị dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga na Galeshia bụ́ ógbè ndị Rom na-achị kwenyesiri ike na ọ bụ naanị ndị na-erube isi n’Iwu ahụ Chineke nyere ụmụ Izrel site n’aka Mozis ka Chineke hụrụ n’anya. Pọl onyeozi maara na nke a bụ ụgha n’ihi na Chineke nyere ụfọdụ ndị ọ na-enwetụbeghị mgbe ha rubeere iwu ndị Juu isi mmụọ nsọ ya. (Ọrụ 15:12) Ya mere, Pọl ji otu ihe atụ gbazie echiche ahụ na-ezighị ezi. N’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst nọ na Galeshia, o dere, sị: “Iwu ahụ aghọwo onye nduzi anyị nke na-eduru anyị gakwuru Kraịst.” (Ndị Galeshia 3:24) Otu ọkà mmụta sịrị na onye nduzi na-arụ ọrụ “dị oké mkpa n’oge ochie.” Ịghọta ụdị ọrụ onye nduzi na-arụ ga-eme ka ihe Pọl onyeozi na-ekwu doo anyị anya.

Onye Nduzi na Ọrụ Ndị Ọ Na-arụ

E nwere ndị nduzi n’ezinụlọ ndị nwere ego n’ọtụtụ ebe na Gris na Rom. Ma eleghị anya, e nwekwara ha ọbụna n’ezinụlọ ndị Juu. Ha na-elekọta ụmụaka malite mgbe a mụrụ ha ọhụrụ ruo mgbe ha ruru afọ iri na ụma. Ndị na-abụkarị ndị nduzi bụ ndị ohu katarala ahụ́ a tụkwasịrị obi, ndị na-anọ ụmụaka nso iji hụ na o nweghị ihe mere ha, hụkwa na e meere ha ihe nna ha chọrọ. Site n’ụtụtụ ruo ná mgbede, onye nduzi na-eso nwata ebe ọ bụla ọ na-eje, na-edebe ya ọcha, na-akpọga ya ụlọ akwụkwọ, ọtụtụ mgbe ọ na-ebute akwụkwọ nwata ahụ na ihe ndị ọzọ o ji aga akwụkwọ, ọ na-anọkwa hụ otú ọmụmụ ihe ya si aga.

Mgbe mgbe, ndị nduzi anaghị abụ ndị nkụzi. Onye nduzi anaghị akụziri nwata akwụkwọ, naanị ihe ọ na-eme bụ ịhụ na nwata debere iwu nna ya. Ma, ọ na-ezi nwata ihe site n’ilekọta ya na ịdọ ya aka ná ntị. Nke a gụnyere ịgwa ya otú o kwesịrị isi na-akpa àgwà, ịbara ya mba, na ọbụna ịta ya ahụhụ ma ọ̀ kpaa àgwà ọjọọ. O doro anya na ọ bụ nne na nna nwe ọrụ izi nwa ha ihe. Ma, mgbe nwata ahụ na-etolite, onye nduzi ya na-akụziri ya na o kwesịrị ịgazi ije agazi mgbe ọ na-aga n’okporo ụzọ, na o kwesịrị iyizi uwe ya eyizi, ịnọrọ ọdụ nke ọma, na iri nri otú kwesịrị ekwesị, nakwa na o kwesịrị ibiliri ndị okenye n’oche, ịhụ ndị mụrụ ya n’anya, na ihe ndị ọzọ.

Plato (428-348 T.O.A.), onye Gris bụ́ ọkà ihe ọmụma, kwenyesiri ike na e kwesịghị ịhapụ ụmụaka ka ha mewe otú masịrị ha. O dere, sị: “Otú ahụ atụrụ ma ọ bụ anụ ọzọ nke na-ata nri kwesịrị inwe onye na-azụ ya, ọ bụ otú ahụ ka ụmụaka na-aghaghị inwe onye nduzi, ọ bụkwa otú ahụ ka ndị ohu na-aghaghị inwe nna ukwu.” Ọ bụ ezie na o yiri ka Plato o kwubigara okwu ókè, ma, ihe o kwuru bụ echiche ya.

Ọnụnọ ndị nduzi na ụmụaka na-anọ mgbe niile mere ka e were ha na ha dị aka ike, na ha na-atabiga ụmụaka ahụhụ ókè nakwa na ha na-emekarị mkpesa na-enweghị isi, ndị na-agwụ ike. N’agbanyeghị nke ahụ, onye nduzi na-echebe ụmụaka ka ihe ghara ime ha, ka ha gharakwa imebi. Appian, onye Gris bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme, onye dịrị ndụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu gara aga, kọrọ banyere otu onye nduzi nke kpọ nwata na-aga ụlọ akwụkwọ. Onye nduzi ahụ gbakụrụ nwata ahụ aka ka ndị chọrọ igbu nwata ahụ ghara igbu ya. Mgbe ọ jụrụ ịhapụ nwata ahụ, e gburu ha abụọ.

Omume rụrụ arụ juru ebe niile n’oge ahụ ndị Gris na-achị ụwa. Ọ dị mkpa ka e chebe ụmụaka, karịchaa, ndị nke nwoke, ka a ghara imetọ ha. N’ihi ya, ndị nduzi na-anọ mgbe a na-akụziri ụmụaka ihe, n’ihi na a tụkwasịghị ọtụtụ ndị nkụzi obi. Libanius, onye Gris bụ́ ọkà n’ikwu okwu, onye dịrị ndụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ asaa gara aga, kwuru na ndị nduzi rụrụ ọrụ dị ka “ndị na-echebe ụmụaka na-eto eto” iji “chụọ ndị inyom na-ekwesịghị ekwesị ndị chọrọ ime ha enyi ụkwụ eru ala ka ha na ụmụaka ndị nwoke ahụ ghara ịkpakọrịta.” Ọtụtụ ndị ndị nduzi lekọtara ejighị ha gwurie egwu. Ọtụtụ nkume e gwunyere n’ebe ili ozu gosiri na ọtụtụ ndị toro eto nwere obi ekele maka ndị nduzi ha nwụrụ anwụ bụ́ ndị ha hụrụ n’anya.

Iwu ahụ Rụrụ Ọrụ Dị Ka Onye Nduzi

Gịnị mere Pọl onyeozi ji were Iwu Mozis tụnyere onye nduzi? Olee ihe mere ihe atụ ahụ ji kwesị ekwesị?

Nke mbụ bụ na Iwu ahụ bụ ihe nchebe. Pọl kwuru na ndị Juu bụ “ndị a na-eche nche n’okpuru iwu.” O yiri ka à ga-asị na Iwu ahụ bụ onye nduzi nke chebere ha. (Ndị Galeshia 3:23) Iwu ahụ metụtara ndụ ha niile. Ọ chịkwara agụụ ihe ọjọọ na-agụ ha na ọchịchọ anụ ahụ́ ha. Ọ chịkwara omume ha, baakwara ha mba mgbe niile ha mehiere, wee mee ka onye nke ọ bụla n’Izrel mara na ya ezughị okè.

Iwu ahụ chebekwara ha ka ihe rụrụ arụ ghara imetụta ha, dị ka omume rụrụ arụ na okpukpe nke mba ndị gbara Izrel gburugburu. Dị ka ihe atụ, iwu Chineke nyere ha ka ha na ndị na-ekpere arụsị ghara ịgọ ọgọ dị mkpa nke ukwuu ka mba ahụ dum na Chineke wee dị ná mma. (Diuterọnọmi 7:3, 4) Iwu ndị ahụ mere ka ndị Chineke nọgide na-adị ọcha, kwadebekwa ha ka ha nwee ike ịmata Mesaya ahụ. N’ezie, Iwu ahụ Chineke nyere ha gosiri na ọ hụrụ ha n’anya. Mozis chetaara ndị Izrel ibe ya, sị: “Dị nnọọ ka mmadụ si agbazi nwa ya nwoke, otú ahụ ka Jehova bụ́ Chineke gị nọ na-agbazi gị.”—Diuterọnọmi 8:5.

Ma, ihe ọzọ dị mkpa n’ihe atụ ahụ Pọl nyere bụ na ọrụ onye nduzi na-arụ anaghị adịte aka. Nwata anaghị anọkwa n’okpuru onye nduzi ya mgbe ọ ghọrọ dimkpa. Xenophon (431-352 T.O.A.), onye Gris bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme, dere, sị: “Mgbe nwata toro ghọọ okorobịa, a na-akpọpụta ya n’aka [onye nduzi] ya nakwa n’aka [onye nkụzi] ya; ọ nakwaghị anọ n’okpuru ha, kama, a na-ahapụ ya ka ọ nọrọ onwe ya.”

Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị Iwu Mozis. Ọ rụrụ ọrụ nwa oge—“iji mee ka mmebi iwu pụta ìhè, ruo mgbe mkpụrụ ahụ [ya bụ, Jizọs Kraịst] ga-abịarute.” Pọl onyeozi kwuru na Iwu ahụ bụụrụ ndị Juu ‘onye nduzi nke duuru ha gakwuru Kraịst.’ Ọ bụrụ na ndị Juu ndị ha na Pọl dịkọrọ ndụ chọrọ ka Chineke hụ ha n’anya, ha aghaghị ịnabata ọrụ Jizọs na-arụ iji mezuo nzube Chineke. Ozugbo ha mere nke a, ọrụ onye nduzi ahụ gwụrụ.—Ndị Galeshia 3:19, 24, 25.

Iwu ahụ Chineke nyere ụmụ Izrel zuru okè. Ọ rụzuru ọrụ niile Chineke zubere ka ọ rụọ, ya bụ, ichebe ndị ya na ime ka ha mara ụdị ndụ ka mma ọ chọrọ ka ha bie. (Ndị Rom 7:7-14) Iwu ahụ bụ ezi onye nduzi. Ma, ụfọdụ ndị nọrọ n’okpuru ya chere na ihe ndị ọ chọrọ ka ha mee sibigara ike ókè. Ọ bụ ya mere Pọl ji dee na mgbe oge Chineke kara aka ruru, “Kraịst tọhapụrụ anyị n’ọbụbụ ọnụ nke Iwu ahụ site n’ịzụrụ anyị.” Naanị otú Iwu ahụ si bụrụ ‘ọbụbụ ọnụ’ bụ na ndị Juu na-ezughị okè enweghị ike idebezu ya. Iwu ahụ chọrọ ka ha jiri nlezianya na-eme ihe niile o kwuru. Ozugbo onye Juu nabatara ndokwa ahụ ka mma nke e ji àjà mgbapụta Jizọs mee, ime ihe onye nduzi ahụ kwuru adịkwaghị mkpa.—Ndị Galeshia 3:13; 4:9, 10.

Ya mere, ihe mere Pọl ji were Iwu Mozis tụnyere onye nduzi bụ iji gosi nke ọma na Iwu ahụ chebere ndị Juu nakwa na ọ dịteghị aka. Mmadụ na Jehova ga-adị ná mma, ọ bụghị ma onye ahụ na-erube isi n’Iwu ahụ, kama, ma onye ahụ nabata Jizọs ma nwee okwukwe na ya.—Ndị Galeshia 2:16; 3:11.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 21]

“NDỊ NA-ELEKỌTA ỌRỤ” NA “NDỊ NA-ELEKỌTA ỤLỌ”

Ọ bụghị naanị banyere onye nduzi ka Pọl dere, o jikwa “ndị na-elekọta ọrụ” na “ndị na-elekọta ụlọ” mee ihe atụ. Ndị Galeshia 4:1, 2, kwuru, sị: “Ọ bụrụhaala na onye nketa ahụ bụ nwa ọhụrụ, ọ dịghị iche ma ọlị n’ebe ohu nọ, ọ bụ ezie na ọ bụ onyenwe ihe niile, ma ọ nọ n’okpuru ndị na-elekọta ọrụ nakwa n’okpuru ndị na-elekọta ụlọ ruo ụbọchị ahụ nna ya kara aka tupu oge eruo.” Ọrụ “ndị na-elekọta ọrụ” na “ndị na-elekọta ụlọ” na-arụ dị iche n’ọrụ ndị nduzi na-arụ, ma, ihe Pọl chọrọ iji ha kwuo bụ otu.

Iwu Rom nyere ikike ka a họpụta ‘onye na-elekọta ọrụ’ ka ọ na-elekọta nwata na-enweghị nne na nna, ka ọ na-ahụkwa maka ihe a na-emefu n’isi nwata ahụ ruo mgbe o toro. Ọ bụ ya mere Pọl ji kwuo na ọ bụ ezie na a na-akpọ nwata “onyenwe” ihe nketa, ya na ohu bụ otu ihe mgbe ọ ka bụ nwata.

Ma, ‘onye na-elekọta ụlọ’ bụ onye a họpụtara ka ọ na-ahụ maka ihe niile a na-akpata ma na-emefu n’ala na ụlọ nwata ahụ. Flavius Josephus, onye Juu bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme, kwuru na otu nwa okorobịa aha ya bụ Hyrcanus rịọrọ nna ya ka o deta akwụkwọ ozi gwa onye na-elekọta ụlọ ya ka o nye ya, ya bụ, Hyrcanus, ego ọ ga-eji zụrụ ihe ọ bụla ọ chọrọ.

Ya mere, nwata ịnọ n’okpuru onye nduzi na ịnọ n’okpuru ‘onye na-elekọta ọrụ’ ma ọ bụ n’okpuru ‘onye na-elekọta ụlọ’ na-egosi na nwata ahụ enwereghị onwe ya mgbe ọ dị obere. Ndị ọzọ na-eduzi ndụ ya ruo oge nna ya kara aka.

[Foto dị na peeji nke 19]

Onye nduzi ji mkpara nke e sere n’ite ụrọ ndị Gris oge ochie

[Ebe E Si Nweta Foto]

National Archaeological Museum, Athens

[Foto dị na peeji nke 19]

Ihe mere n’otu puku afọ na narị afọ isii gara aga nke e sere n’iko nke na-egosi ebe onye nduzi (onye ji mkpara) nọ na-ekiri ka a na-akụziri nwa ọ na-elekọta uri na egwú

[Ebe E Si Nweta Foto]

Bildarchiv Preussischer Kulturbesitz/Art Resource, NY