Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Nwere Mgbe A Ga-ebibi Ụwa Anyị?

Ò Nwere Mgbe A Ga-ebibi Ụwa Anyị?

Ò Nwere Mgbe A Ga-ebibi Ụwa Anyị?

Ò NWETỤLA mgbe ị jụrụ onwe gị, sị: ‘Gịnị ga-eme ụwa anyị a n’ọdịnihu?’ Ọtụtụ ndị kweere na ụwa anyị a mara mma nwere ike ịla n’iyi n’ihi ihe ndị ha na-ahụ a na-eme ya.

N’eziokwu, a na-emebi ụwa taa, n’ihi otú e si akpa ihe ndị dị n’ime ya aka ọjọọ, ihe ndị dị ka mmiri, oké ọhịa, na ikuku na-akwado ndụ. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na ihe ndị dị ka nnukwu nkume igwe, ya bụ, kpakpando ndị na-agbawa agbawa, ma ọ bụ anyanwụ ịkwụsị ịcha otú o si acha, nwere ike ime ka ụwa na ihe niile dị ndụ na ya laa n’iyi.

Ndị ọkà mmụta sayensị kweere na ike ga-eji nke nta nke nta gwụ ụwa, ma eleghị anya, mmadụ agaghị enwekwa ike ibi n’ime ya mgbe ọ na-erula ọtụtụ ijeri afọ. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica kpọrọ nke a “nghasa a na-enweghị ike ịgbanwe agbanwe nke ihe e kere eke ga-aghasa.”

Ọ bụ ihe na-eme obi ụtọ ịmara na Baịbụl na-emesi anyị obi ike na Jehova bụ́ Chineke agaghị ekwe ka e bibie ụwa anyị a ma ọ bụ mee ka ọ ghara ikwe obibi. Ebe Onye kere ihe niile nwere ‘ike dị ukwuu,’ o nwere ike ime ka ụwa dịruo mgbe ebighị ebi. (Aịzaya 40:26) Ya mere, i nwere ike ịtụkwasị okwu a obi, nke sịrị: “[Chineke] tọrọ ntọala ụwa mee ka o sie ike; ọ gaghị ama jijiji ruo mgbe ebighị ebi, ma ọ bụ ruo mgbe niile ebighị ebi.” “Toonụ ya, unu anyanwụ na ọnwa. Toonụ ya, unu kpakpando niile na-enye ìhè. . . . N’ihi na ọ bụ ya nyere iwu, e wee kee ha. Ọ na-emekwa ka ha dịruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 104:5; 148:3-6.

Nzube Chineke Maka Ụwa

O nweghị mgbe ọ bụ nzube Chineke ka a na-emetọ ụwa ma na-emebisị ya dị ka a na-eme taa. Kama nke ahụ, Chineke kere nwoke mbụ na nwaanyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, wee mee ka ha nọrọ n’ogige mara mma. O doro anya na ebe ahụ ha bi bụ́ Paradaịs agaghị anọgide na-ama mma n’onwe ya. Chineke nyere ha ọrụ ka ha “na-akọ ihe na ya ma na-elekọta ya.” (Jenesis 2:8, 9, 15) Ọ bụ ọrụ mara mma nke na-enye obi ụtọ ka Chineke nyere nne na nna anyị ahụ zuburu okè.

Ma, nzube Chineke maka ụwa abụghị naanị ka a na-elekọta ogige mbụ ahụ. Ọ chọrọ ka e mee ka ụwa dum ghọọ paradaịs. Ọ bụ ya mere Chineke ji nye Adam na Iv iwu, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu, ka azụ̀ ndị dị n’oké osimiri na anụ ufe nke eluigwe na ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ nke na-agagharị n’elu ala nọrọkwa n’okpuru unu.”—Jenesis 1:28.

Ọ dị mwute ikwu na otu mmụọ ozi nke dị mpako, onye mechara bụrụ Setan, mara nzube Chineke aka. Ọ chọsiri ike ka Adam na Iv fewe ya. Setan ji agwọ mee ka ha nupụrụ ọchịchị Chineke isi. (Jenesis 3:1-6; Mkpughe 12:9) Ọ ghaghị ịbụ na o wutere Onye kere anyị nke ukwuu na ha enweghị obi ekele. Ma, isi ha nupụrụ emeghị ka Jehova bụ́ Chineke gbanwee nzube ya maka ụwa. O kwuru, sị: “Otú ahụ ka okwu m nke si n’ọnụ m pụta ga-adị. Ọ gaghị agba aka lọghachikwute m, kama ọ ga-eme ihe na-atọ m ụtọ, ọ ga-emezukwa ihe m zigara ya ka o mee.”—Aịzaya 55:11.

O nwere ezi ihe mere Jehova ji hapụ Setan ka ọ nọgide na-enupụ isi ruo n’oge anyị a. N’oge a, ụmụ mmadụ anwaleela ụdị ọchịchị dị iche iche. Ihe ndị si na ya pụta na-egosi na ụmụ mmadụ kụrụ afọ n’ala n’ihi ịhapụ ịnọ n’okpuru ọchịchị Chineke wee na-achị onwe ha, bụ́ ihe Setan chọrọ ka ha na-eme. *Jeremaya 10:23.

Ọ dị mma ịmara na n’ime ọtụtụ puku afọ gara aga, Chineke gọziri ụfọdụ ndị ezi omume. O mekwara ka e dee n’ime Baịbụl ihe mere ma ndị rubeere ya isi ma ndị jụrụ ọchịchị ya. Jehova arụwokwa ọrụ dị ebube maka abamuru anyị n’ọdịnihu. O ji ịhụnanya nye ụmụ mmadụ Onye nzọpụta site n’izite Ọkpara ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jizọs Kraịst, ka o nye ndụ ya maka anyị, kụziekwara anyị ụzọ kacha mma anyị ga-esi na-ebi ndụ. (Jọn 3:16) Ebe ọ bụ na Jizọs ekwesịghị ịnwụ, Chineke ji ọnwụ ya zụtaghachi ihe Adam na Iv tụfuru, ya bụ, olileanya ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs nke ga-ezu ụwa. * N’ihi ya, Jehova bụ́ Chineke ehiwela ọchịchị eluigwe nke ga-achị mmadụ niile, ọ họpụtawokwa Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, onye ọ kpọlitere n’ọnwụ, ka ọ bụrụ Eze Alaeze ahụ. Ndokwa a nke magburu onwe ya ga-eme ka nzube Chineke maka ụwa mezuo.—Matiu 6:9, 10.

N’ihi ya, i nwere ike inwe obi ike ná nkwa ndị a magburu onwe ha e dere na Baịbụl, sị: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ma ọ bụ ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enweta ụwa. Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” “‘Lee! Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.’ Onye ahụ nke nọ ọdụ n’ocheeze ahụ wee sị: ‘Lee! Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.’”—Abụ Ọma 37:9, 29; Mkpughe 21:3-5.

Baịbụl Anaghị Emegide Onwe Ya

Ma ndị ụfọdụ na-eche, sị, ‘Olee otú anyị nwere ike isi gosi na amaokwu ndị a dị na Baịbụl kwekọrọ n’amaokwu ndị ọzọ yiri ka hà kwuru na a ga-ebibi ụwa?’ Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha. Ọ ga-eme ka anyị hụ na Baịbụl anaghị emegide onwe ya.

Ọtụtụ afọ tupu ndị ọkà mmụta sayensị amata banyere ‘nghasa ha sị na ihe niile e kere eke ga-aghasa,’ otu ọbụ abụ nke so dee Baịbụl dere, sị: “Ị [ya bụ, Chineke] tọrọ ntọala ụwa ogologo oge gara aga, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị. Ha onwe ha ga-ala n’iyi, ma gị onwe gị ga na-adị ndụ; ha niile ga-akakwa nká dị ka uwe. Ị ga-agbanwe ha dị ka ákwà, oge ha ga-agwụkwa. Ma ị ka bụ onye ị bụ, afọ ndụ gị agaghịkwa agwụ agwụ.”—Abụ Ọma 102:25-27.

Ihe ndị a ọbụ abụ ahụ dere emegideghị nzube ebighị ebi Chineke maka ụwa. Kama nke ahụ, ọ na-egosi otú Chineke si dị iche n’ihe niile o kere eke, bụ́ ndị nwere ike ịla n’iyi, ma, ya onwe ya na-anọru mgbe ebighị ebi. Ọ bụrụ na ike ebighị ebi Chineke nke na-eme ka eluigwe na ụwa dịghachi ọhụrụ adịghị, ma eluigwe ma ụwa, tinyere anyanwụ na ọnwa na kpakpando dị iche iche ndị na-eme ka ihe na-aga n’usoro, ndị na-enyekwa anyị ìhè na ike, gaara aghasasị ma bibie. Ya mere, ọ bụrụ na a gbachi ụwa anyị a nkịtị, ọ ‘ga-aka nká,’ ma ọ bụ ghara ịdịkwa ọzọ.

O nwere amaokwu ndị ọzọ dị n’Akwụkwọ Nsọ ndị nwekwara ike iyi ka hà na-emegide nzube Chineke maka ụwa ma ọ bụrụ na anyị elerughị ha anya. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na eluigwe na ụwa ‘ga-agabiga.’ (Mkpughe 21:1) N’eziokwu, nke a adịghị emegide nkwa Jizọs kwere, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5) Oleezi ihe Baịbụl na-ekwu mgbe ọ sịrị na eluigwe na ụwa ‘ga-agabiga’?

Ọtụtụ mgbe, mgbe Baịbụl kwuru “ụwa,” ọ bụ ụwa ihe atụ ka ọ na-ekwu, ya bụ, ụmụ mmadụ. Dị ka ihe atụ, tụlee amaokwu a nke sịrị: “Ụwa niile wee na-asụ otu asụsụ, nweekwa otu usoro okwu.” (Jenesis 11:1) O doro anya na “ụwa” a na-ekwu okwu ya n’ebe a bụ ụmụ mmadụ ndị bi n’ụwa. Ihe atụ ọzọ bụ Abụ Ọma 96:1. Bible Nsọ nke Union Version kwuru, sị: “Bụkuonụ Jehova abụ, unu ụwa niile.” O doro anya na n’amaokwu a nakwa n’amaokwu ndị ọzọ, okwu bụ́ “ụwa” bụ ihe atụ, nke na-anọchi anya ụmụ mmadụ.—Abụ Ọma 96:13.

Mgbe ụfọdụ, mgbe Baịbụl kwuru eluigwe ma ọ bụ ihe ndị nọ n’eluigwe, ọ bụ ndị na-achị achị n’ụwa ka ọ na-ekwu. Dị ka ihe atụ, a kọwara na ndị ọchịchị aka ike ndị chịrị Babịlọn dị ka kpakpando n’ihi otú ha si bulie onwe ha elu karịa ndị ọzọ n’oge ahụ. (Aịzaya 14:12-14) Dị ka e buru n’amụma, n’afọ 539 T.O.A., e bibiri “eluigwe” ihe atụ ahụ, ma ọ bụ ndị ọchịchị Babịlọn, na “ụwa” ya, ya bụ, ndị na-akwado ọchịchị ahụ. (Aịzaya 51:6) Nke a mere ka ndị Juu chegharịrị echegharị laghachi na Jeruselem, bụ́ ebe “eluigwe ọhụrụ,” ya bụ, ndị ọchịchị ọhụrụ, chịrị “ụwa ọhụrụ,” ya bụ, ụmụ mmadụ ndị ezi omume.—Aịzaya 65:17.

O doro anya na mgbe Baịbụl kwuru na eluigwe na ụwa ‘ga-agabiga,’ ihe ọ na-ekwu bụ na a ga-ebibi ọchịchị ọjọọ nke ụmụ mmadụ na ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke bụ́ ndị na-akwado ha. (2 Pita 3:7) Nke ahụ ga-eme ka ọchịchị eluigwe ọhụrụ nke Chineke gọzie ụmụ mmadụ ọhụrụ bụ́ ndị ezi omume, n’ihi na “e nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ anyị na-echere dị ka nkwa [Chineke] si dị, ezi omume ga-ebikwa n’ime ha.”—2 Pita 3:13.

N’ihi ya, i nwere ike inwe okwukwe ná nkwa Chineke kwere na ebe obibi anyị a bụ́ ụwa ga-adịru mgbe ebighị ebi. Baịbụl kwukwara ihe ị ga-emerịrị iji dịrị ndụ n’oge ahụ nke ga-amagbu onwe ya, mgbe a ga-eme ka ụwa dum ghọọ paradaịs. Jizọs sịrị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ọ́ gaghị adị mma ka ị mụọ ihe Baịbụl na-akụzi banyere ọdịnihu ụwa na ọdịnihu ụmụ mmadụ? Ọ ga-amasị Ndịàmà Jehova bi n’ebe unu bi inyere gị aka ime nke a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ebe a tụlere ihe mere Chineke ji kwe ka nhụjuanya dịrị, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị nEzie Ka Bible Na-akụzi?, peeji nke 106 ruo nke 114, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 11 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ọnwụ Jizọs nwụrụ iji chụọ àjà, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị nEzie Ka Bible Na-akụzi?, peeji nke 47 ruo nke 56.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]

Baịbụl kwere nkwa na ebe obibi anyị a bụ́ ụwa ga-adịru mgbe ebighị ebi

[Ebe E Sigasị Nweta Foto ndị dị na peeji nke 10]

Foto ụwa: NASA/The Visible Earth (http://visibleearth.nasa.gov/); anụ ọhịa bea: © Foto Bryan and Cherry Alexander Photography sere