Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịzụ Ụmụ n’Ụwa nke Onye Ọ Bụla Na-eme Otú Masịrị Ya

Ịzụ Ụmụ n’Ụwa nke Onye Ọ Bụla Na-eme Otú Masịrị Ya

Ịzụ Ụmụ n’Ụwa nke Onye Ọ Bụla Na-eme Otú Masịrị Ya

Ị̀ HỤTỤLA ebe nwatakịrị nọ na-arịọ mama ya ka ọ zụtara ya ihe ọ ga-eji na-egwuri egwu bụ́ nke mama ya na-achọghị ịzụ, ma ọ bụ nwatakịrị nke chọrọ ịga gbagharịwa na-egwu egwuregwu, mgbe mama ya gwara ya ka ọ nọrọ otu ebe? Ị ga-ahụ na mgbe ụdị ihe a mere, mama nwata ahụ chọrọ ime ihe ga-akacha baara nwa ya uru. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ mgbe, mama ya na-emere ya ihe ọ chọrọ. Nwata ahụ nyegide ya nsogbu, ya e meere ya ihe ọ chọrọ.

O yiri ka ọtụtụ ndị nne na nna kweere na otú ha ga-esi zụọ ụmụ ha nke ọma bụ imere ụmụ ha ihe ha chọrọ ọtụtụ mgbe. Dị ka ihe atụ, na United States, a gbara narị ụmụaka asaa na iri ise ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị nọ n’agbata afọ iri na abụọ na afọ iri na asaa. Mgbe a jụrụ ha ihe ha na-eme mgbe ndị mụrụ ha na-ekwetaghị imere ha ihe ha chọrọ, ihe karịrị ọkara n’ime ha sịrị na ha na-anọgide na-arịọ ha. Ihe karịtụrụ ọkara n’ime ha sịrị na nke a na-eme ka ha nweta ihe ha chọrọ. Ọ ga-abụ na ndị mụrụ ha chere na imere ha ihe ha chọrọ na-egosi na ha hụrụ ha n’anya. Ma, nke a ọ̀ bụ eziokwu?

Tụlee ilu a onye amamihe tụrụ n’oge ochie, nke sịrị: “Ọ bụrụ na mmadụ na-azụtọ onye na-ejere ya ozi malite n’oge ọ bụ nwata, mgbe o mere okenye, ọ ga-aghọ onye na-enweghị ekele.” (Ilu 29:21) Ọ bụ ezie na nwata abụghị onye na-eje ozi. Ma, ọ́ bụghị eziokwu na otu ihe ahụ nwere ike ime nwatakịrị a na-azụ azụ? Ịzụtọ ụmụaka, ya bụ, imere ha ihe niile ha chọrọ, nwere ike ime ka ha ghọọ ndị “na-enweghị ekele” mgbe ha toro, ndị a zụtọrọ azụtọ.

Ma, Baịbụl dụrụ ndị nne na nna ọdụ, sị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ kwesịrị ya si dị.” (Ilu 22:6) Ndị nne na nna maara ihe na-agbaso ntụziaka a. Ha na-enye ụmụ ha iwu doro anya ndị na-esibigaghị ike ókè, hụkwa na ụmụ ha na-edebe ha. Ha maara ọdịiche dị n’ịhụ nwata n’anya na imere ya ihe ọ bụla ọ chọrọ; ha anaghịkwa enye ụmụaka onyinye mgbe ụmụaka were iwe, mee mkpesa, ma ọ bụ mgbe ha dara n’ala bewe ákwá. Kama nke ahụ, ha na-eme ihe Jizọs kwuru nke bụ́: “Naanị ka Ee unu kwuru bụrụ Ee, ka Ee e unu kwuru bụrụ Ee e.” (Matiu 5:37) Ma, olee otú e kwesịrị isi na-azụ ụmụaka? Tụlee ihe atụ a bụ́ ịgba.

“Dị Ka Akụ́ nke Dị n’Aka Dike”

Ihe atụ Baịbụl mere banyere mmekọrịta dị n’etiti ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha na-egosi na nduzi ndị mụrụ ụmụ dị ụmụ ha mkpa. Abụ Ọma 127:4, 5 kwuru, sị: “Dị ka akụ́ nke dị n’aka dike, otú ahụ ka ụmụ a mụrụ n’okorobịa dị. Obi ụtọ na-adịrị dimkpa nke ji ha kpojuo akpa akụ́ ya.” Ya mere, e ji ụmụaka tụnyere akụ́, jirikwa ndị mụrụ ha tụnyere dike. Otú ahụ onye na-agba ụta si mara na akụ́ ya agaghị agbata ihe ọ chọrọ ma ọ bụrụ na ọ tụzighị ya atụzi, ọ bụ otú ahụ ka ndị mụrụ ụmụ si mara na ịzụ ụmụ chọrọ ezi mgbalị. O nwere ụdị mmadụ ha chọrọ ka ụmụ ha ghọọ ná ndụ, ya bụ, ndị toro eto bara uru, nweekwa obi ụtọ ná ndụ. Ha chọrọ ka ụmụ ha họrọ ime ihe dị mma, ka ha mara ihe ma zere nsogbu ndị na-enweghị isi, ka ha nweta ihe ziri ezi ha chọrọ inweta ná ndụ. Ma, ndị mụrụ ụmụ aghaghị ime mgbalị ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka ihe ndị a mee.

Gịnị ka onye na-agba ụta ga-eme ka akụ́ ya gbata n’ihe ọ chọrọ? Ọ ghaghị ịpị ya apị nke ọma, chebe ya nke ọma, gbasiekwa ya ike ka ọ gbata n’ihe ọ chọrọ ịgba ya. N’otu aka ahụ, a ghaghị ịzụ ụmụaka azụ, chebe ha ma chee ha ihu n’ebe kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na ha ga-aghọ ndị ezigbo mmadụ mgbe ha toro. Ka anyị tụlee ụzọ ihe atọ a otu otu bụ́ ndị na-enye aka n’ịzụ ụmụ.

Ịpị Akụ́ ahụ nke Ọma

A na-apị akụ́ ndị e ji agba ụta n’oge ochie nke ọma. A na-eji aka apị akụ́ ahụ, bụ́ nke e ji osisi dị fere fere apị, ma eleghị anya, ka ọ ghara ịgbagọ agbagọ. Ọnụ ya na-adị nkọ. A na-etinye ábụ́bà n’isi akụ́ ahụ, bụ́ nke na-eme ka ọ gaa tụọ n’ihe a chọrọ ka ọ tụọ.

Ọ na-adị ndị mụrụ ụmụ mma ka ụmụ ha dịrị ka akụ́ ndị ahụ na-agbagọghị agbagọ, ndị na-anaghị efega n’ebe ọzọ ma ọ́ bụghị n’ihe a chọrọ ka ha tụọ. Ya mere, ọ bụrụ na ha ma ihe, ha agaghị eleghara ihe na-adịghị mma ụmụ ha na-eme anya, kama ha ga-eji ịhụnanya nyere ha aka ka ha kwụsị ụdị omume ahụ. Ọrụ dị otú a nke a ga-arụ n’ebe nwatakịrị ọ bụla nọ dị ukwuu n’ihi na ọ bụ “nzuzu ka e kekọtara ya na obi nwata.” (Ilu 22:15) Ya mere, Baịbụl gwara ndị mụrụ ụmụ ka ha na-adọ ụmụ ha aka ná ntị. (Ndị Efesọs 6:4) N’ezie, ịdọ nwata aka ná ntị na-arụ ọrụ dị oké mkpa n’ịgbazi echiche ya na ime ka àgwà ya dị mma.

Ka a sịkwa ihe mere Ilu 13:24 ji sị: “Onye na-adịghị apịa nwa ya ụtarị kpọrọ ya asị, ma onye hụrụ ya n’anya na-ahụ na a dọrọ ya aka ná ntị.” N’amaokwu a, ụtarị e ji adọ nwata aka ná ntị pụtara ụzọ e nwere ike isi gbazie ya n’agbanyeghị otú e nwere ike isi mee ya. Mgbe nne ma ọ bụ nna ji ịhụnanya na-adọ nwa ya aka ná ntị, ọ na-edozi ihe ndị ọ ga-abụ ọ bụrụ na ha amara nwata ahụ́, ọ gaghị enwe obi ụtọ mgbe o toro. N’eziokwu, mmadụ ịhapụ ịdọ nwa ya aka ná ntị pụtara na ọ hụghị ya n’anya; ma ịdọ ya aka ná ntị pụtara na ọ hụrụ ya n’anya.

Nne ma ọ bụ nna hụrụ nwa ya n’anya na-emekwa ka nwa ya ghọta ihe mere o ji nye ya iwu ndị o nyere ya. Ya mere, ịdọ aka ná ntị abụghị naanị inye iwu na inye ntaramahụhụ, kama, ihe ka mkpa ọ bụ bụ ime ka nwata ghọta ihe. Baịbụl kwuru, sị: “Nwa nke nwere nghọta na-edebe iwu.”—Ilu 28:7.

Ábụ́bà onye na-agba ụta na-etinye n’isi akụ́ ya na-eme ka akụ́ ahụ fega n’ebe ọ chọrọ ka ọ tụọ mgbe ọ gbapụrụ ya. N’otu aka ahụ, ozizi Baịbụl, nke sitere n’aka Onye mere ka ezinụlọ malite, nwere ike ịdịgide n’obi ụmụaka ọbụna mgbe ha hapụrụ ezinụlọ ha. Ọ ga-abakwara ha uru ná ndụ ha niile. (Ndị Efesọs 3:14, 15) Ma, olee otú ndị mụrụ ụmụ nwere ike isi mata ma ozizi ahụ ọ̀ “dị” n’obi ụmụ ha n’ezie?

Lee ndụmọdụ Chineke nyere ndị nne na nna n’Izrel n’oge Mozis: “Okwu ndị a m na-enye gị n’iwu taa ga-adị n’obi gị; kụnye ha n’ime ụmụ gị.” (Diuterọnọmi 6:6, 7) Ya mere, ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ime ụzọ ihe abụọ. Nke mbụ bụ na ha kwesịrị ịmụ Okwu Chineke ma na-eme ya eme, ya bụ, ịhụ iwu Chineke n’anya. (Abụ Ọma 119:97) Nke ahụ ga-eme ka ha nwezie ike ime ihe nke abụọ amaokwu ahụ kwuru, ya bụ, ‘ịkụnye’ iwu Chineke n’ime ụmụ ha. Nke a pụtara na ha ga-eme ka uru iwu ndị ahụ bara dịrị n’obi ụmụ ha site n’izi ha ihe nke ọma, na-ezighachikwa ha ihe ndị ahụ ugboro ugboro.

O doro anya na iji ihe ndị dị na Baịbụl na-ezi ụmụaka ihe, ma ọ bụ iji ịhụnanya na-adọ ha aka ná ntị ka ha kwụsị ihe na-adịghị mma, abụghị ihe ndị mgbe ochie ma ọ bụ ihe oge ya gaferela. Ha bụ ụzọ ndị dị mkpa e si apị “akụ́” ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa ka ha ruo n’ebe a chọrọ ka ha gaa, ghara ịga n’ebe ọzọ ka ha na-eto.

Ichekwa Akụ́ Ahụ

Ka anyị gaghachi n’ihe atụ ahụ dị n’Abụ Ọma 127:4, 5. Cheta na onye ahụ na-agba ụta ji akụ́ “kpojuo akpa akụ́ ya.” Mgbe a pịchara akụ́, a na-echekwa ya echekwa. Ya mere, ọ na-achịnye ha n’akpa akụ́, ebe ha na-agaghị emebi ngwa ngwa ma ọ bụ gbajie. Ọ dị mma ịmara na Baịbụl buru amụma na Mesaya bụ akụ́ a pịrị apị nke Nna ya ‘zobere n’ime akpa akụ́ ya.’ (Aịzaya 49:2) Jehova bụ́ Chineke, bụ́ Nna nke o nweghị onye hụrụ ụmụ ya n’anya ka ya, chebere Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ka ihe ọ bụla ghara ime ya ruo mgbe e buru n’amụma na a ga-egbu Mesaya ahụ. Ọbụna n’oge ahụ e gburu Ọkpara ya, Chineke chebere ya ka ọnwụ ghara imeri ya. Ọ kpọghachiri ya n’eluigwe ka ọ dịrị ndụ n’ebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi.

N’otu aka ahụ, ezigbo ndị nne na nna na-echebe ụmụ ha ka ihe ize ndụ ndị dị n’ụwa a rụrụ arụ ghara imetụta ha. Ndị mụrụ ụmụ nwere ike inye ụmụ ha iwu ka ha ghara ime ihe ndị ga-eme ka ha banye ná nsogbu na-enweghị isi. Dị ka ihe atụ, ndị nne na nna ma ihe anaghị eji ihe a e dere na Baịbụl egwuri egwu, bụ́ nke sịrị: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.” (1 Ndị Kọrịnt 15:33) Ichebe ụmụaka ka ha na ndị na-anaghị akpa àgwà Baịbụl chọrọ ghara ịkpakọrịta nwere ike ime ka ha ghara ime ihe dị oké njọ ma ọ bụ ihe nwere ike ịkpatara ha ọnwụ.

Ọ bụghị mgbe niile ka obi na-atọ ụmụaka ụtọ na ndị mụrụ ha na-echebe ha. N’ezie, ha nwere ike ịjụ ya mgbe ụfọdụ, n’ihi na ichebe ụmụaka pụtara na mgbe mgbe ị gaghị ekwe ka ha mee ihe ha chọrọ ime. Otu onye a na-akwanyere ùgwù nke na-ede akwụkwọ ndị metụtara ịzụ ụmụaka kwuru, sị: “N’ezie, ụmụaka chọrọ ka ndị mụrụ ha na-eduzi ha ná ndụ, ọ bụ ezie na ọ bụghị mgbe niile ka ha na-egosi na ọ bụ ihe ha chọrọ ma ọ bụkwanụ kelee ndị mụrụ ha n’oge ahụ. Anyị ga-eme nke a site n’iji ọrụ anyị kpọrọ ihe, na-agwa ụmụ anyị ihe ha kwesịrị ime na ihe ha na-ekwesịghị ime.”

N’ezie, ihe ọ bụla ị ga-eme ka ahụ́ ruo ụmụ gị ala, ka ha na Chineke dị ná mma, ma ọ bụ ka ha ghara imebi, bụ ụzọ dị mkpa ị ga-esi gosi na ị hụrụ ha n’anya. Ka oge na-aga, ha nwere ike ịghọta ihe mere i ji na-enye ha iwu. Obi ga-atọ ha ụtọ na i ji ịhụnanya chebe ha.

Iche Akụ́ ahụ Ihu n’Ebe O Kwesịrị Ịga

Cheta na Abụ Ọma 127:4, 5 ji onye mụrụ nwa tụnyere “dike.” Nke a ọ̀ pụtara na ọ bụ naanị nna nwere ike ịzụ nwata nke ọma? Mbanụ. N’ezie, ihe ihe atụ a na-akụzi dịịrị ma ndị nne ma ndị nna, tinyere ndị nne ma ọ bụ ndị nna naanị ha na-azụ ụmụ. (Ilu 1:8) Okwu bụ́ “dike” na-egosi na ịgbapụ akụ́ chọrọ ike dị ukwuu. N’oge ochie, a na-eji ọla kọpa amachi ụta mgbe ụfọdụ, a na-ekwukwa na onye agha “na-ekwe ụta.” Ọ ga-abụ na ọ na-azọgide ụta ụkwụ ka o nwee ike ịrọji ya wee kwee ya. (Jeremaya 50:14, 29) O doro anya na ume na mgbalị dị mkpa iji dọlaa eriri ụta azụ wee gbapụ akụ́ ka ọ gbata n’ihe a chọrọ!

N’otu aka ahụ, ịzụ ụmụ chọrọ mgbalị dị ukwuu. Ụmụaka anaghị azụ onwe ha, otú ahụ akụ́ na-anaghị agbapụ onwe ya wee gbata n’ihe a chọrọ. Ọ dị mwute ikwu na o yiri ka ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ taa anaghị achọ itinye ụdị mgbalị ha kwesịrị itinye n’ịzụ ụmụ. Ha na-ahọrọ ime nke dịịrị ha mfe. Ha na-ahapụ ụmụ ha ka televishọn, ụlọ akwụkwọ, na ndị ọgbọ ha na-akụziri ha ihe ọma na ihe ọjọọ, àgwà ha kwesịrị ịkpa na nke ha na-ekwesịghị ịkpa, nakwa banyere mmekọahụ. Ha na-ahapụ ụmụ ha ka ha na-eme ihe masịrị ha. Ọ bụrụ na o siere ha ike ịgwa ụmụ ha ka ha ghara ime ihe ha chọrọ, ha na-ahapụ ha. Mgbe mgbe, ha na-ekwu na ihe mere ha ji mee otú ahụ bụ na ha achọghị ime ihe ga-ewute ụmụ ha. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na nhapụ ha na-ahapụ ụmụ ha ka na-eme ihe masịrị ha ga-ewetara ụmụ ha ezigbo nsogbu nke ga-adịte aka.

Ịzụ ụmụaka abụghị obere ọrụ. Mmadụ iji obi ya dum na-arụ ọrụ ahụ site n’enyemaka nke Okwu Chineke chọrọ mgbalị dị ukwuu, ma uru dị na ya karịrị akarị. Magazin bụ́ Parents kwuru, sị: “Nchọpụta ndị e merela . . . na-egosi na ndị nne na nna, ndị hụrụ ụmụ ha n’anya ma jiri ọrụ ha kpọrọ ihe, ya bụ, ndị na-akwado ụmụ ha ma na-agwa ha ihe ndị ha ga na-eme na ihe ndị ha na-agaghị eme, na-azụpụta ụmụaka ndị na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, ndị na-akpa ezigbo àgwà, nweekwa afọ ojuju. Obi na-atọkwa ụmụ ha ụtọ karịa ụmụaka ndị ndị mụrụ ha na-agbachi nkịtị ka ha na-eme otú masịrị ha ma ọ bụ ndị ndị mụrụ ha ji aka ike na-azụ.”

Ọ dị uru ọzọ ka nke a mma. Anyị atụleela ihe mbụ e kwuru n’Ilu 22:6 nke sịrị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ kwesịrị ya si dị.” Amaokwu ahụ kwukwara ihe a na-enye obi ụtọ, sị: “Ọbụna mgbe o mere okenye, ọ gaghị ahapụ ya.” Ilu a nke si n’ike mmụọ nsọ ọ̀ na-ekwu na ndị mụrụ ụmụ ga-enwerịrị ihe ịga nke ọma? Ọ bụchaghị otú ahụ. Nwa gị nweere onwe ya ime ihe dị ya mma mgbe o toro. Ma, amaokwu a na-emesi ndị mụrụ ụmụ obi ike. Gịnị ka ọ na-ekwu?

Ọ bụrụ na i jiri ndụmọdụ dị na Baịbụl na-azụ ụmụ gị, ị na-eme ihe ga-abara gị uru nke ukwuu, ya bụ, ịhụ ụmụ gị ka ha toro ghọọ ndị bara uru, ndị nwere obi ụtọ na afọ ojuju. (Ilu 23:24) Ya mere, pịa “akụ́” ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa, chebe ha, gbalịakwa chee ha ihu n’ebe kwesịrị ekwesị. Ọ dịghị mgbe ị ga-akwara ya mmakwaara.

[Foto dị na peeji nke 13]

Ndị mụrụ ụmụ hà na-egosi na ha hụrụ ụmụ ha n’anya site n’imere ha ihe ọ bụla ha chọrọ?

[Foto dị na peeji nke 15]

Nne ma ọ bụ nna nke hụrụ nwa ya n’anya na-akọwara nwa ya ihe mere e ji nwee iwu ndị e nwere n’ezinụlọ ha

[Foto dị na peeji nke 15]

Ezigbo ndị nne na nna na-echebe ụmụ ha ka ihe ize ndụ ndị dị n’ụwa a rụrụ arụ ghara imetụta ha

[Foto dị na peeji nke 16]

Ịzụ ụmụaka abụghị obere ọrụ, ma uru dị na ya karịrị akarị