Ọ Nọrọ na Nche ma Chere
Ṅomie Okwukwe Ha
Ọ Nọrọ na Nche ma Chere
ỊLAỊJA chọrọ ịnọrọ naanị ya ka o wee kpekuo Nna ya nke eluigwe ekpere. Ma, ọ dịbeghị anya ìgwè mmadụ ndị nọ ya gburugburu hụrụ ka ezi onye amụma ahụ kpere ekpere, ọkụ wee si n’eluigwe daa. O doro anya na ọtụtụ n’ime ha chọrọ ka ha na ya dịrị ná mma. Tupu Ịlaịja agbagoo n’elu elu Ugwu Kamel, bụ́ ebe ifufe na-efesi ike, ịga kpekuo Jehova bụ́ Chineke ekpere, o nwere ọrụ tara akpụ ọ ga-arụ. Ọ ghaghị ịgwa Eze Ehab okwu.
Ihe anaghị adabara mmadụ abụọ ahụ. Ehab yi uwe eze mara mma. Ọ bụ onye anya ukwu si n’ezi ofufe dapụ, nke na-anaghị ekpebiliri onwe ya ihe ọ na-eme. Ịlaịja yi uwe e ji mara ya, uwe a na-achọghị mma. Ọ ga-abụ na e ji akpụkpọ anụ ma ọ bụ ajị kamel ma ọ bụ nke ewu kwee ya. Ọ bụ nwoke nwere obi ike, nke kwesịrị ntụkwasị obi, nweekwa okwukwe. Ụbọchị ahụ nke na-achọ ịgwụ emewo ka a mara ụdị ndị mmadụ abụọ ahụ bụ. *
Ụbọchị ahụ bụụrụ Ehab na ndị ọzọ na-efe Bel ụbọchị ọjọọ. A gbara ofufe arụsị nke Ehab na nwunye ya, bụ́ Jezibel, na-akwado n’alaeze ebo iri nke Izrel n’anwụ. E gosiri na ofufe Bel bụ ofufe aghụghọ. Chi ahụ na-adịghị ndụ ezitelighị ọkụ nkịtị mgbe ndị amụma ya ji ike ha niile na-arịọ ya arịrịọ, na-agba egwú, jiri mma na-ebekasị onwe ha ahụ́. Bel azọpụtalighị narị mmadụ anọ na iri ise ahụ n’ọnwụ ha kwesịrị ịnwụ. Ma, chi ụgha ahụ kụkwara afọ n’ala n’ihe ọzọ, nke a ga-edo anya n’oge na-adịghị anya. Kemgbe ihe karịrị afọ atọ, ndị amụma Bel nọ na-arịọ chi ha ka o mee ka oké ọkọchị nke na-akpa ala ahụ aka ọjọọ kwụsị, ma Bel emelighị ya. N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-egosi na ya bụ ezi Chineke site n’ime ka oké ọkọchị ahụ kwụsị.—1 Ndị Eze 16:30–17:1; 18:1-40.
Ma, olee mgbe Jehova ga-eme ihe? Olee ihe Ịlaịja ga na-eme tupu mgbe ahụ? Gịnịkwa ka anyị ga-amụta n’aka nwoke a nwere okwukwe? Ka anyị tụlee ihe e dere ná 1 Ndị Eze 18:41-46 iji mara azịza ajụjụ ndị a.
Ọ Na-ekpe Ekpere Mgbe Niile
Ịlaịja gakwuuru Ehab wee sị ya: “Lawa, rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ; n’ihi na ụda nke mkpọtụ oké mmiri ozuzo na-ada.” (Amaokwu nke iri anọ na otu) Eze arụrụala a ọ̀ mụtara ihe n’ihe mere n’ụbọchị ahụ? Baịbụl ekwughị otú ahụ, o nweghịkwa ihe e kwuru n’ebe ahụ nke gosiri na o chegharịrị, ọ rịọghịkwa onye amụma ahụ arịọrọ ka o nyere ya aka kpekuo Jehova ekpere ka ọ gbaghara ya. Naanị ihe Ehab mere bụ ‘ịla gaa rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ.’ (Amaokwu nke iri anọ na abụọ) Gịnị ka Ịlaịja mere?
“Ma Ịlaịja gbagooro n’elu ugwu Kamel wee hulata ala ma kpunye ihu ya n’agbata ikpere ya abụọ.” Mgbe Ehab gara iri nri, Ịlaịja ji ohere ahụ kpekuo Nna ya ekpere. Lee ihe amaokwu a kwuru banyere otú Ịlaịja si weda onwe ya ala. O gburu ikpere n’ala hulata isi ya ala nke na isi ya ruwere n’ikpere ya. Gịnị ka Ịlaịja nọ na-eme? Anyị ekwesịghị ichewe ya eche. Na Jems 5:18, Baịbụl gwara anyị na Ịlaịja kpere ekpere ka oké ọkọchị ahụ kwụsị. O doro anya na ọ bụ n’elu Ugwu Kamel ka ọ nọ na-ekpe ekpere ahụ.
1 Ndị Eze 18:1) Ya mere, Ịlaịja nọ na-ekpe ekpere ka uche Nna ya mezuo, dị ka Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe mgbe ihe dị ka otu puku afọ gachara.—Matiu 6:9, 10.
Jehova eburuwo ụzọ kwuo, sị: “Ekpebisiwo m ike ime ka mmiri zoo n’elu ala.” (Ihe nlereanya Ịlaịja na-akụziri anyị ihe dị ukwuu banyere ekpere. Ihe kacha dịrị Ịlaịja mkpa bụ ka uche Nna ya mezuo. Mgbe anyị na-ekpe ekpere, ọ dị mma ka anyị cheta na “ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ [Chineke] dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.” (1 Jọn 5:14) Ya mere, o doro anya na anyị kwesịrị ịmara ihe bụ́ uche Chineke iji na-ekpe ekpere ọ ga-anara. Ọ bụ nke a mere o ji dị mma ka anyị na-amụ Baịbụl kwa ụbọchị. N’ezie, ihe ọzọ mere Ịlaịja ji chọọ ka oké ọkọchị ahụ kwụsị bụ n’ihi ahụhụ niile ndị obodo ya nọ na-ata. Ọ ga-abụkwa na ekele juru ya obi mgbe ọ hụrụ ọrụ ebube Jehova rụrụ n’ụbọchị ahụ. Anyị kwesịrị ikpe ekpere maka ọdịmma nke ndị ọzọ, jirikwa obi anyị nye Chineke ekele.—2 Ndị Kọrịnt 1:11; Ndị Filipaị 4:6.
Obi Siri Ya Ike, Ọ Nọkwa na Nche
O doro Ịlaịja anya na Jehova ga-eme ka oké ọkọchị ahụ kwụsị, ma ọ maghị mgbe Jehova ga-eme ya. Ma, gịnị ka onye amụma a megodịrị? Lee ihe amaokwu nke iri anọ na atọ kwuru: “O wee sị onye na-ejere ya ozi: ‘Biko, gbagoo. Lee anya ná mpaghara oké osimiri.’ Ya mere, ọ gbagooro lee anya wee sị: ‘Ọ dịghị ihe m hụrụ ma ọlị.’ O wee sị, ‘Gbagoo ọzọ,’ ruo ugboro asaa.” Ihe nlereanya Ịlaịja na-akụziri anyị ụzọ ihe abụọ, ma ọ dịkarịa ala. Nke mbụ bụ na onye amụma ahụ nwere obi ike. Nke abụọ bụ na ọ nọrọ na nche.
Ịlaịja chọsiri ike ịhụ ihe ga-egosi ya na Jehova chọrọ ime ihe, ọ bụ ya mere o ji ziga onye na-ejere ya ozi ka ọ gbagoo n’elu elu legharịa anya iji mara ma mmiri ọ̀ na-eru. Mgbe onye ahụ na-ejere ya ozi lọtara, o ziri ya ozi na-adịchaghị ụtọ, sị: “Ọ dịghị ihe m hụrụ ma ọlị.” Ebe niile gbachapụrụ agbachapụ, o dokwara anya na mmiri anaghị eru. Ò nwere ihe dị iche ị chọpụtara? Cheta na ọ dịbeghị anya Ịlaịja gwara Eze Ehab, sị: “Ụda nke mkpọtụ oké mmiri ozuzo na-ada.” Olee otú onye amụma ahụ ga-esi kwuo ụdị ihe ahụ mgbe ọ na-adịghị mmiri na-eru?
Ịlaịja maara banyere ihe Jehova kwere ná nkwa. Ebe ọ bụ onye amụma Jehova na onye na-anọchi anya ya, o ji n’aka na Chineke ya ga-emezu ihe O kwuru. Obi siri Ịlaịja ike nke na ọ dị ya ka à ga-asị na ọ nụwalarị ụda oké mmiri ozuzo. Nke a na-echetara anyị ihe Baịbụl kwuru banyere Mozis, sị: “O guzosiri ike dị ka à ga-asị na ọ na-ahụ onye ahụ anya bụ́ Onye a na-apụghị ịhụ anya.” Ì weere Chineke dị ka onye dị adị otú ahụ Ịlaịja si were ya? O gosiri ezi ihe mere anyị ga-eji nwee okwukwe n’ebe ọ nọ nakwa ná nkwa ya.—Ndị Hibru 11:1, 27.
Leekwa otú Ịlaịja si nọrọ na nche. Ọ gwara onye na-ejere ya ozi ka ọ gaghachi, ọ bụghị otu ugboro, ọ bụghị ugboro abụọ, kama ugboro asaa! Anyị nwere ike iji anya nke uche Amaokwu nke iri anọ na anọ) Ì nwere ike iji anya nke uche gị hụ onye ahụ na-ejere ya ozi ka o setịpụrụ aka na-egosi ya otú ígwé ojii ahụ hà nke si n’ebe Osimiri Ukwu * na-apụta? Onye ahụ na-ejere ya ozi nwere ike iche na ígwé ojii ahụ adịghị mkpa. Ma, n’anya Ịlaịja, ọ dị mkpa. O wee zie onye ahụ na-ejere ya ozi dị ngwa, sị: “Gaa sị Ehab, ‘Kwadebe ụgbọ ịnyịnya gị! Gbadawakwa ka oké mmiri ozuzo ghara igbochi gị ịla!’”
anyị hụ ka ike na-agwụ onye na-ejere ya ozi ịgaghachi ugboro ugboro. Ma, Ịlaịja nọgidere na-achọ ịhụ ihe àmà, ike agwụghịkwa ya. N’ikpeazụ, mgbe onye ahụ na-ejere ya ozi gara nke ugboro asaa, o wetara ozi, sị: “Lee! E nwere obere ígwé ojii dị ka ọbụ aka mmadụ nke si n’oké osimiri na-apụta.” (Ịlaịja setịpụkwaara anyị ihe nlereanya ọzọ magburu onwe ya anyị ga-agbaso. Anyị onwe anyị bikwa mgbe ọ na-agaghị adị anya Chineke emezuo nzube ya. Ịlaịja cheere ruo mgbe oké ọkọchị ahụ kwụsịrị; taa, ndị ohu Chineke na-echere ọgwụgwụ nke ụwa a rụrụ arụ. (1 Jọn 2:17) Dị ka Ịlaịja mere, anyị kwesịrị ịnọgide na nche ruo mgbe Jehova bụ́ Chineke ga-eme ihe. Jizọs, bụ́ Ọkpara Chineke, nyere ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ, sị: “Na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.” (Matiu 24:42) Okwu Jizọs ọ̀ pụtara na ndị na-eso ụzọ ya agaghị amatatụ mgbe ọgwụgwụ ahụ ga-abịa? Mba. N’ihi na o kwuru okwu nke ukwuu banyere otú ụwa ga-adị mgbe ọ ga-afọ ntakịrị ka ọgwụgwụ ahụ bịa. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịmụta nke ọma banyere ihe ịrịba ama nke “ọgwụgwụ usoro ihe a.”—Matiu 24:3-7. *
Nke ọ bụla n’ihe ịrịba ama ahụ nwere ihe àmà doro anya nke na-emesi obi ike. Ihe àmà ahụ ò zuola ime ka anyị mee ihe ngwa ngwa? Obere ígwé ojii mere ka obi sie Ịlaịja ike na Jehova achọwala ime ihe. Jehova ò mechuru onye amụma ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ihu?
Jehova Gọziri Ya, Meekwa Ka Ahụ́ Ruo Ya Ala
Baịbụl kọkwara, sị: “O wee ruo na mgbe nke a na-eme, ígwé ojii na ifufe mere ka eluigwe gbachie, nnukwu mmiri wee malite izo. Ehab nọkwa na-agba ụgbọ ịnyịnya wee ruo Jezril.” (Amaokwu nke iri anọ na ise) Ihe niile malitere ime ọsọ ọsọ. Ka onye na-ejere Ịlaịja ozi nọ na-ezi Ehab ozi onye amụma ahụ ziri ya, obere ígwé ojii ahụ buru ibu, kpuchie eluigwe, gbachiekwa ya. Oké ifufe malitere ife. Mmiri mechara zoo n’ala Izrel mgbe afọ atọ na ọkara gachara. * Ala ahụ kpọrọ nkụ wee mịkọrọ mmiri ahụ. Mgbe mmiri ahụ zosiwere ike, osimiri Kaịshọn toro. O doro anya na ọ sachapụrụ ọbara ndị amụma Bel ahụ e gburu egbu. Nke a bụkwaara ụmụ Izrel bụ́ ndị nnupụisi ohere ha ga-eji sachapụ unyi ọjọọ ofufe Bel tere ala ahụ.
O doro anya na Ịlaịja nwere olileanya na ha ga-eme otú ahụ! Ehab ọ̀ ga-echegharị ma hapụ iji ofufe Bel na-emerụ onwe ya? Ihe ndị mere n’ụbọchị ahụ gosiri ya ezigbo ihe mere ọ ga-eji gbanwee. N’ezie, anyị amaghị ihe Ehab na-eche n’oge ahụ. Naanị ihe Baịbụl gwara anyị bụ na eze ahụ ‘nọ na-agba ụgbọ ịnyịnya wee ruo Jezril.’ Ò nwere ihe ọ mụtara? Ò kpebiela ịgbanwe omume ya? Ihe ndị mechara mee gosiri na azịza ya bụ ee e. Ma, ọ ka nwere ihe chere ma Ehab ma Ịlaịja ihu n’ụbọchị ahụ.
Onye amụma Jehova wee malite njem. Ọ bụ ụzọ ahụ Ehab si ka ya onwe ya sikwa. Njem a bụ njem dị anya nke ọ ga-eji ụkwụ gaa n’ọchịchịrị n’okporo ụzọ dị mmiri mmiri. Ma, ihe dị ịtụnanya mere.
“Aka Jehova dịkwasịrị Ịlaịja, o wee kee ájị̀ n’úkwù, buru Ehab ụzọ gbaruo Jezril.” (Amaokwu nke iri anọ na isii) O doro anya na “aka Jehova” na-arụ ọrụ ebube n’ahụ́ Ịlaịja. Jezril dị ihe dị ka kilomita iri atọ site n’ugwu ahụ, Ịlaịja abụghịzikwa nwa okorobịa. * Jiri anya nke uche gị hụrụ ka onye amụma ahụ na-eyiri uwe mwụda ya, kegide ya n’úkwù ka ọ ghara inye ya nsogbu ná njem ya, wee gbapụ ọsọ n’okporo ụzọ ahụ dị mmiri mmiri. Ọ gbasiri ọsọ ike wee gbakwute ụgbọ ịnyịnya eze ma gbafere ya!
N’ezie, nke a bụụrụ Ịlaịja ngọzi dị ukwuu. Ọ ga-atọ ya ụtọ nke ukwuu inwe ụdị ike na ume karịrị nke o nwere mgbe ọ bụ okorobịa, ma eleghị anya. Nke a na-echetara anyị amụma dị iche iche kwuru na ndị kwesịrị ntụkwasị obi ga-enwe ahụ́ ike na ume zuru okè na Paradaịs a ga-enwe n’ụwa. (Aịzaya 35:6; Luk 23:43) Ka Ịlaịja nọ na-agba ọsọ n’okporo ụzọ ahụ dị mmiri mmiri, ọ maara na ihe ya masịrị Nna ya, bụ́ Jehova, onye naanị ya bụ ezi Chineke!
Ọ na-agụsi Jehova agụụ ike ịgọzi ndị ya. Ime ihe ọ bụla anyị nwere ike ime iji nweta ngọzi ya kwesịrị ekwesị. Dị ka Ịlaịja mere, anyị kwesịrị ịnọ na nche ma jiri nlezianya na-atụle ihe àmà doro anya nke na-egosi na Jehova achọwala ime ihe n’oge ọjọọ a nke e kwesịrị ime ihe ngwa ngwa na ya. Dị ka Ịlaịja mere, e nwere ezi ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike ná nkwa Jehova, bụ́ “Chineke nke eziokwu,” kwere.—Abụ Ọma 31:5.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Ị chọọ ịmatakwu ihe mere n’ụbọchị ahụ, gụọ isiokwu bụ́ “Ọ Kwadoro Ofufe Dị Ọcha,” nke dị n’Ụlọ Nche nke January 1, 2008.
^ par. 16 N’oge a, aha Osimiri Ukwu ahụ bụ Mediterenian.
^ par. 17 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe na-egosi na okwu Jizọs na-emezu n’oge anyị a, gụọ isi nke itoolu nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
^ par. 20 Ụfọdụ ndị chere na ọ ga-abụ na Baịbụl na-emegide onwe ya n’ihe metụtara afọ ole oké ọkọchị ahụ dịruru. Gụọ igbe dị na peeji nke iri na itoolu.
^ par. 23 Ozugbo nke a mechara, Jehova gwara Ịlaịja ka ọ zụọ Ịlaịsha, bụ́ onye a ga-amara dị ka “onye wụsara mmiri n’aka Ịlaịja.” (2 Ndị Eze 3:11) Ịlaịsha jeere Ịlaịja ozi. O doro anya na o mere ihe niile o nwere ike ime iji nyere nwoke a mere agadi aka.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 19]
Oké Ọkọchị E Nwere n’Oge Ịlaịja Ọ̀ Dịruru Afọ Ole?
Ịlaịja onye amụma Jehova gwara Eze Ehab na oké ọkọchị ahụ dị kemgbe ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya. Ọ ga-abụ na Ịlaịja gwara ya nke a “n’afọ nke atọ” ọ gwachara ya na a ga-enwe oké ọkọchị. (1 Ndị Eze 18:1) Jehova mere ka mmiri zoo n’oge na-adịghị anya Ịlaịja kwuchara na Ọ ga-eme otú ahụ. N’ihi nke a, ụfọdụ nwere ike ikwu na oké ọkọchị ahụ kwụsịrị n’ime afọ nke atọ, n’ihi ya, o rughị afọ atọ. Otú ọ dị, ma Jizọs ma Jems gwara anyị na oké ọkọchị ahụ dịruru “afọ atọ na ọnwa isii.” (Luk 4:25; Jems 5:17) Nke a ọ̀ pụtara na Baịbụl na-emegide onwe ya?
Mbanụ. N’Izrel n’oge ochie, oge ọkọchị na-adịte aka, ọ na-adịru ọnwa isii. O doro anya na ọ bụ n’oge ọkọchị, mgbe ọkọchị dịtewere aka karịa otú ọ na-adị ma sie ike, ka Ịlaịja bịara gwa Ehab na a ga-enwe oké ọkọchị. Nke a pụtara na oké ọkọchị ahụ malitere n’ihe fọrọ nke nta ka o ruo ọkara afọ tupu mgbe ahụ. Ya mere, mgbe Ịlaịja kwuru na oké ọkọchị ahụ ga-akwụsị “n’afọ nke atọ” malite mgbe o kwuru na a ga-enwe oké ọkọchị ahụ, oké ọkọchị ahụ adịruola ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ atọ na ọkara. “Afọ atọ na ọnwa isii” zuru ezu agafeela n’oge ahụ ndị Izrel niile zukọrọ n’Ugwu Kamel ka ha jiri anya ha hụ nnukwu ule ahụ.
Chee echiche banyere otú oge mbụ ahụ Ịlaịja gara hụ Ehab si bụrụ oge kwesịrị ekwesị. Ndị Izrel kweere na Bel bụ “chi na-achị igwe ojii,” ya bụ, chi nke ga-eme ka mmiri zoo wee kwụsị ọkọchị ahụ. Ọ bụrụ na ọkọchị ahụ adịteela aka karịa otú ọkọchị kwesịrị ịdịru, ikekwe, ha ga na-eche, sị: ‘Olee ebe Bel nọ? Olee mgbe ọ ga-eme ka mmiri zoo?’ O wutere ndị ahụ na-efe Bel mgbe Ịlaịja kwuru na mmiri agaghị ezo, igirigi agaghịkwa ada ruo mgbe o kwuru ka mmiri zoo.—1 Ndị Eze 17:1.
[Ebe E Si Nweta Foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est
[Foto dị na peeji nke 18]
Ekpere Ịlaịja kpere gosiri na ọ chọsiri ike ka uche Chineke mee