Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Amagedọn Bụ Agha Chineke nke Ga-akwụsị Agha Niile

Amagedọn Bụ Agha Chineke nke Ga-akwụsị Agha Niile

Amagedọn Bụ Agha Chineke nke Ga-akwụsị Agha Niile

“Mmadụ igbu mmadụ ibe ya bụụrụ ha arụ; ya mere, ha amaghị ihe agha bụ, ọ bụkwa ihe jọgburu onwe ya n’anya ha. Ha enweghị ihe a na-akpọ agha n’asụsụ ha.”—Ọ BỤ OTÚ A KA FRIDTJOF NANSEN, BỤ́ ONYE NORWAY NA-EME NCHỌPỤTA, SI KỌWAA NDỊ INUIT NA GREENLAND N’AFỌ 1888.

Ò NWERE onye ọ na-agaghị amasị ibi n’ebe ‘a na-amaghị ihe agha bụ’ na ebe agha bụ “ihe jọgburu onwe ya”? Ò nwere onye ọ na-anaghị agụ agụụ ibi n’ụwa nke a na-enweghị ihe a na-akpọ agha n’ihi na ndị mmadụ amaghị ihe ọ bụ? Ụdị ụwa a yiri ihe na-agaghị eru ụmụ mmadụ aka, nke ka nke, ma ọ bụrụ na anyị nwere olileanya na ọ bụ ụmụ mmadụ ga-eweta ya.

Ma, n’amụma Aịzaya, Chineke kwere nkwa na ya ga-eme ka ụwa dị otú ahụ. Amụma ahụ sịrị: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi. Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha.”—Aịzaya 2:4.

N’ụwa taa, e nwere nde ndị agha iri abụọ, a na-alụkwa ihe dị ka agha iri abụọ n’ebe dị iche iche ugbu a. Ya mere, o doro anya na ọ bụrụ na amụma ahụ ga-emezu, a ga-enwerịrị mgbanwe dị ukwuu n’ụwa. Ka a sịkwa ihe mere Chineke bụ́ onye pụrụ ime ihe niile, bụ́ Jehova, na-agaghị eji gbachi ụmụ mmadụ nkịtị. Nkịtị a Jehova na-agaghị agbachi ụmụ mmadụ ga-eme ka e nwee ihe Baịbụl kpọrọ Amagedọn.—Mkpughe 16:14, 16.

Ọ bụ ezie na kemgbe afọ ole na ole na-adịbeghị anya, a na-ekwu na okwu bụ́ “Amagedọn” bụ agha ụwa nke a ga-eji ngwá agha ọgwụrụ mba lụọ, otu akwụkwọ ọkọwa okwu kọwara isi ihe ọ pụtara, sị: “Ebe ihe ọma na ihe ọjọọ ga-anọ lụọ nnukwu agha ikpeazụ.” Ò nwere mgbe ihe ọma ga-emeri ihe ọjọọ, ka agha ahụ ọ̀ bụ akụkọ ifo?

Obi ga-esi anyị ike ma ọ bụrụ na anyị eburu n’obi na Baịbụl kwuru ọtụtụ ugboro na ihe ọjọọ ga-akwụsị. Otu ọbụ abụ buru amụma, sị: “A ga-ekpochapụ ndị mmehie n’ụwa; ndị ajọ omume agaghị adịkwa.” (Abụ Ọma 104:35) Akwụkwọ Ilu kwuru, sị: “Ọ bụ ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta ka a ga-ahapụ n’ime ya. Ma a ga-ebipụ ndị ajọ omume n’ụwa; a ga-efopụkwa ndị na-aghọ aghụghọ na ya.”—Ilu 2:21, 22.

Baịbụl mekwara ka o doo anya na ndị ajọ omume agaghị eji anya ọma hapụ ọchịchị; ọ bụ ya mere Chineke ga-eji hụ na ya kpochapụrụ ihe ọjọọ niile, tinyere agha. (Abụ Ọma 2:2) E nwere ezi ihe mere Baịbụl ji kpọọ agha a aha pụrụ iche nke bụ́ Amagedọn.

Agha Ndị A Lụrụ n’Oge Gara Aga n’Ebe Dị Nso na Megido

Okwu bụ́ “Amagedọn” pụtara “Ugwu Megido.” Obodo oge ochie bụ́ Megido na Mbara Ala Jezril nke gbara ya gburugburu bụ ebe a nọrọ lụọ ọtụtụ agha e ji mara mbe abụọ nke bụ́ oké. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Eric H. Cline dere n’akwụkwọ bụ́ The Battles of Armageddon, sị: “Kemgbe ụwa, Megido na Ndagwurugwu Jezril bụ ebe a na-anọ alụ agha ndị na-ekpebi ebe ụwa ga-eche ihu.

Dị ka Cline kwuru, agha ndị a lụrụ n’ebe dị nso na Megido bụ agha a na-ejikarị ama mbe abụọ nke bụ́ oké. Ndagwurugwu a bụ ebe mbụ a nọ merie ndị agha Mongol, bụ́ ndị meriri ọtụtụ mba n’Esia n’ihe dị ka narị afọ asatọ gara aga. Ọchịagha bụ́ Edmund Allenby du ndị agha Britain merie ndị Turkey n’ebe na-adịghị anya na Megido n’agha ụwa nke mbụ. Otu onye na-akọ akụkọ agha kwuru na mmeri ahụ Allenby meriri bụ “otu n’ime agha a kacha lụọ ngwa ngwa n’agha niile a lụtụrụla, nke e ji mata mbe abụọ nke bụ́ oké.”

Ọ bụ n’ebe dị nso na Megido ka a lụkwara agha dị iche iche a kọrọ na Baịbụl bụ́ ndị e ji mata mbe abụọ nke bụ́ oké. Ọ bụ n’ebe ahụ ka onyeikpe bụ́ Berak nọ merie ndị agha Kenan ndị Sisera du. (Ndị Ikpe 4:14-16; 5:19-21) Ọ bụ n’ebe dị nso n’ebe ahụ ka Gidiọn na naanị narị ndị ikom atọ nọ merie ọtụtụ ndị agha Midia. (Ndị Ikpe 7:19-22) Eze Sọl na nwa ya bụ́ Jọnatan nwụrụ n’Ugwu Gilboa, nke dị nso n’ebe ahụ, mgbe ndị agha Filistia meriri ndị agha Izrel.—1 Samuel 31:1-7.

N’ihi otú Megido na ndagwurugwu dị ya nso si enyere ndị agha aka n’agha, a lụọla ọtụtụ agha n’ebe ahụ kemgbe puku afọ anọ gara aga. Otu onye na-akọ akụkọ ihe mere eme kwuru na ha dị iri atọ na anọ, ma ọ dịkarịa ala!

O doro anya na otú Megido dị na ihe ndị merela na ya na-egosi ihe okwu bụ́ “Amagedọn” na-anọchi anya ya. Ọ bụ ezie na ọ bụ naanị otu ebe ka okwu ahụ dị na Baịbụl, ihe ndị e kwuru n’amaokwu ndị ọzọ dị n’akwụkwọ Mkpughe gosiri nke ọma na Amagedọn ga-emetụta ndụ ndị niile nọ n’ụwa.

Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Amagedọn

Ọ bụ ezie na ọtụtụ agha a lụrụ n’ebe dị nso na Megido n’oge gara aga mere ka a mata mbe abụọ nke bụ́ oké, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha kwụsịrị ajọ omume. N’ezie, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha bụ agha ihe ọma na ihe ọjọọ lụrụ. O doro anya na ụdị agha ahụ ga-esi n’aka Chineke. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo otu mgbe na “ọ dịghị onye bụ́ ezi onye, ma e wezụga otu onye, ya bụ, Chineke.” (Luk 18:19) Baịbụl kwukwara kpọmkwem na Amagedọn bụ agha Chineke.

Na Baịbụl, akwụkwọ Mkpughe kwuru na a ga-akpọkọta “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi . . . maka ibu agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” (Mkpughe 16:14) Amụma ahụ kwukwara, sị: “Ha wee kpọkọta ha n’ebe a na-akpọ Ha-Magedọn n’asụsụ Hibru” ma ọ bụ Amagedọn. * (Mkpughe 16:16) Mkpughe mechara kwuo na ‘ndị eze nke ụwa na ụsụụ ndị agha ha ga-ezukọta ibuso onye ahụ nke nọ n’elu ịnyịnya ahụ na ụsụụ ndị agha ya agha.’ (Mkpughe 19:19) O nweghị onye ọzọ onye ahụ nọ n’elu ịnyịnya bụ ma ọ́ bụghị Jizọs Kraịst.—1 Timoti 6:14, 15; Mkpughe 19:11, 12, 16.

Gịnị ka anyị mụtara n’amaokwu ndị a? Anyị mụtara na Amagedọn bụ agha Chineke na ụmụ mmadụ ndị na-enupụ isi ga-alụ. Gịnị mere Jehova na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-eji lụọ ụdị agha a? Nke mbụ bụ na Amagedọn ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Nke abụọ bụ na ọ ga-eme ka e nwee ụwa nke udo ga-adị na ya, ya bụ, “ụwa ọhụrụ anyị na-echere dị ka nkwa [Chineke] si dị,” bụ́ ebe ‘ezi omume ga-ebi.’—2 Pita 3:13.

Gịnị Mere Amagedọn Ji Dị Mkpa?

Ọ̀ na-esiri gị ike ikweta na Jehova, bụ́ “Chineke nke ịhụnanya,” ga-edunye Ọkpara ya, bụ́ “Onyeisi Udo,” ka ọ lụọ agha? (2 Ndị Kọrịnt 13:11; Aịzaya 9:6) O doro anya na ịghọta ihe mere ha ga-eji mee nke a ga-eme ka ihe doo gị anya. Akwụkwọ Abụ Ọma kwuru na Jizọs bụ onye agha nke nọ n’elu ịnyịnya. Gịnị mere ọ ga-eji lụọ agha? Ọbụ abụ ahụ kwuru na Kraịst na-agba ịnyịnya “n’ihi eziokwu na ịdị umeala n’obi na ezi omume.” Ọ ga-alụ agha n’ihi na ọ hụrụ ezi omume n’anya, kpọọ ajọ omume asị.—Abụ Ọma 45:4, 7.

Baịbụl kwukwara otú Jehova si ele ikpe na-ezighị ezi ọ na-ahụ n’ụwa taa anya. Aịzaya onye amụma dere, sị: “Jehova wee hụ ya, o wee bụrụ ihe ọjọọ n’anya ya na ikpe ziri ezi adịghị. O wee yiri ezi omume dị ka uwe agha, kpurukwa okpu agha nke nzọpụta n’isi ya. O yiiri uwe ịbọ ọbọ, werekwa ịnụ ọkụ n’obi kpuchie onwe ya dị ka uwe elu na-enweghị aka.”—Aịzaya 59:15, 17.

Ebe ọ bụ na ndị ajọ omume na-achị, udo agaghị adịrị ndị ezi omume, ahụ́ agaghịkwa eru ha ala. (Ilu 29:2; Ekliziastis 8:9) Nke bụ́ eziokwu bụ na nrụrụ aka na ajọ omume agaghị akwụsị, ọ gwụla ma ndị na-eme ha anọkwaghị. Ya mere, a ga-enwe udo na ikpe ziri ezi nke na-adịgide mgbe e bibichara ndị ajọ omume. Sọlọmọn dere, sị: “Onye ajọ omume bụụrụ onye ezi omume ihe mgbapụta.”—Ilu 21:18.

Ebe ọ bụ na Chineke bụ Onyeikpe, obi ga-esi anyị ike na ikpe niile ọ ga-ekpe ndị ajọ omume ga-abụ ikpe ziri ezi. Ebreham jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ na Onyeikpe nke ụwa dum agaghị eme ihe ziri ezi?” Ebreham matara azịza ya, nke bụ́ na Jehova na-eme ihe ziri ezi mgbe niile! (Jenesis 18:25) Baịbụl gwakwara anyị na ọ naghị atọ Jehova ụtọ ibibi ndị ajọ omume; ọ na-ebibi ha naanị ma ọ bụrụ na ha ekweghị echegharị.—Ezikiel 18:32; 2 Pita 3:9.

Amagedọn Abụghị Ihe Egwuregwu

Ònye ka anyị ga-akwado n’agha a a ga-eji mara mbe abụọ nke bụ́ oké? Ọtụtụ n’ime anyị na-eche na anyị na-akwado Chineke. Olee otú anyị ga-esi jide n’aka na anyị na-akwado ya? Zefanaya onye amụma gbara anyị ume, sị: “Chọọnụ ezi omume, chọọnụ ịdị umeala n’obi.” (Zefanaya 2:3) Pọl onyeozi kwuru na ọ bụ uche Chineke ka “a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.”—1 Timoti 2:4.

Ihe mbụ anyị ga-eme iji nweta nzọpụta bụ ịmụta eziokwu banyere Jehova na nzube ya nke bụ́ ikpochapụ ajọ omume n’ụwa. Nke abụọ bụ ime ezi omume, bụ́ nke ga-eme ka anyị na Chineke dị ná mma, meekwa ka o chebe anyị.

Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị a dị mkpa, anyị na-egosi na anyị na-atụ anya Amagedọn, bụ́ agha ga-akwụsị agha ụmụ mmadụ na-alụ. A lụchaa agha a, ọ dịghị onye ga-amakwa ihe agha bụ, ọ ga-abụkwara ndị mmadụ ihe jọgburu onwe ya. “Ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha.”—Aịzaya 2:4.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Ị chọọ ịhụ ebe a tụlere ma ò nwere otu ebe a na-akpọ Amagedọn, gụọ isiokwu bụ́ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Jụrụ,” nke dị na peeji nke iri atọ na otu.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Nkịtị a Chineke na-agaghị agbachi ụmụ mmadụ ka a kpọrọ Amagedọn

[Foto dị na peeji nke 6]

Gidiọn na ndị ikom ya meriri n’agha ha lụrụ n’ebe dị nso na Megido nke bụ́ agha e ji mara mbe abụọ nke bụ́ oké

[Foto dị na peeji nke 6]

MEGIDO

[Foto dị na peeji nke 6, 7]

A lụchaa agha Amagedọn, ọ dịghị onye ga-amakwa ihe agha bụ, ọ ga-abụkwara ndị mmadụ ihe jọgburu onwe ya

[Foto dị na peeji nke 8]

Ihe mbụ anyị ga-eme iji nweta nzọpụta bụ ịmụta eziokwu banyere Jehova na nzube ya