Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Onye Ruru Eru Ịchị Ụmụ Mmadụ?

Olee Onye Ruru Eru Ịchị Ụmụ Mmadụ?

Okwu Pụrụ Iche A Ga-agwa Ọhaneze

Olee Onye Ruru Eru Ịchị Ụmụ Mmadụ?

Olee onye ọchịchị nke nwere ike

• igboro mmadụ niile mkpa ego na-akpa ha, wee mee ka ha nwee nri n’ụba nakwa ezigbo ụlọ?

• igbochi ọdachi ndị na-emere onwe ha, wee mee ka ala ọma jijiji ndị na-eme n’oké osimiri, oké ifufe, ma ọ bụ ala ọma jijiji nkịtị kwụsị aka ọjọọ ha na-akpa ụmụ mmadụ?

• ịkwụsị ọrịa niile, ọbụna mee ka ndị agadi nweghachi ike otú ha nwere n’oge ha bụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa?

• ịkwụsị agha niile, wee mee ka ndị ọ na-achị biri n’udo, ahụ́ eruokwa ha ala?

• ime ka ụwa zuo okè, gbanwee ya ka ọ ghọọ paradaịs?

E nwere naanị otu onye ọchịchị nke nwere ike ime ihe a niile. Onye ọchịchị ahụ ọ̀ bụ onye? A ga-aza ajụjụ a n’okwu a ga-agwa ọhaneze, nke isiokwu ya bụ: “Ònye Ruru Eru Ịchị Ụmụ Mmadụ?” A ga-ekwu okwu a sitere na Baịbụl n’ụwa dum n’ihe karịrị narị mba abụọ na iri atọ. N’ọtụtụ ebe, ọ bụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova ka a ga-anọ kwuo ya na Sunday, April 6, 2008. Obi ga-atọ Ndịàmà bi n’ebe unu bi ụtọ ịgwa gị oge ọ ga-abụ na ebe ọ ga-abụ. A na-akpọ gị òkù ka ị bịa.