Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Alaeze Oge Ochie Bụ́ Lydia Si Emetụta Anyị Taa

Otú Alaeze Oge Ochie Bụ́ Lydia Si Emetụta Anyị Taa

Otú Alaeze Oge Ochie Bụ́ Lydia Si Emetụta Anyị Taa

ENWERE ike ị nụtụbeghị banyere alaeze oge ochie bụ́ Lydia. Ya mere, o nwere ike iju gị anya ịnụ na ọ bụ nchọpụta e mere n’ebe ahụ gbanwere otú ụwa si azụ ahịa. O nwekwara ike iju ndị na-agụ Baịbụl anya ịnụ na ihe ndị Lydia chọpụtara mere ka a ghọtakwuo amụma dị mgbagwoju anya nke dị na Baịbụl. Gịnị ka ndị Lydia chọpụtara? Tupu a zaa ajụjụ a, ọ ga-adị mma ịmata ihe ụfọdụ banyere alaeze ahụ ọ fọrọ obere ka e chefuo.

Ndị eze ndị chịrị Lydia nọrọ n’isi obodo ya bụ́ Sadis chịa, nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ nke ebe a na-akpọbu Eshia Maịnọ, bụ́ Turkey ugbu a. Eze ikpeazụ nke chịrị Lydia, bụ́ Croesus, kpatara akụ̀ buru ibu. Ma n’ihe dị ka afọ 546 T.O.A., Saịrọs Onye Ukwu bụ́ eze Peshia meriri ya, bụ́ Saịrọs ahụ meriri Alaeze Babịlọn n’afọ ole na ole mgbe e mechara.

A sịrị na ọ bụ ndị Lydia ndị ịchụ nta ego doro anya bụ ndị mbụ malitere iji ego kịrịkịrị azụ ahịa. Ọ dịla anya e jiwere ọlaedo na ọlaọcha na-azụ ahịa. Ma, ebe ọ bụ na ha anaghị aha nhata, ndị mmadụ na-atụ ha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ mgbe ọ bụla ha zụrụ ahịa. Dị ka ihe atụ, n’Izrel, onye amụma Chineke bụ́ Jeremaya zụrụ ala ma dee, sị: “M wee tụọ ego ma were ya kwụọ ya, ọ dị shekel asaa na mkpụrụ ọlaọcha iri.”—Jeremaya 32:9.

Na Lydia, ndị ha na Jeremaya dịkọrọ ndụ chọpụtara ihe ga-eme ka ịzụ ahịa dịrị ha mfe, ya bụ, iji ego kịrịkịrị ndị bu akara ndị ọchịchị na-azụ ahịa. Ọ bụ ọlaedo na ọlaọcha ka e ji kpụọ ego kịrịkịrị mbụ ndị Lydia jiri zụọ ahịa. Mgbe Croesus ghọrọ eze, o ji ego kịrịkịrị ndị e ji naanị ọlaọcha kpụọ na ndị nke e ji naanị ọlaedo kpụọ dochie anya ha. Ndị Lydia wepụtara ego kịrịkịrị ndị e ji ụdị ọla abụọ kpụọ. Ego kịrịkịrị iri na abụọ ndị e ji ọla na-adịchaghị oké ọnụ kpụọ na otu ego kịrịkịrị e ji ọla dị oké ọnụ kpụọ hà nhata. Ma, nsogbu e nwere bụ na ndị mmadụ malitere ịkpụpụta ego kịrịkịrị ọlaedo ndị a gwara ọla ndị na-adịghị oké ọnụ. Ndị na-azụ ahịa chọrọ ihe ga-enyere ha aka ịmata ego bụ́ ezigbo ọlaedo.

Ndị Lydia chọpụtara na otu nkume ojii ha nwere n’obodo ha nke a na-akpọ nkume Lydia ga-akwụsị nsogbu ahụ. Ọ bụrụ na e were ego kịrịkịrị chie na nkume ahụ dị mụrụmụrụ, nke nwekwara ike ịkpụcha ọla, ọ na-aka nkume ahụ akara. Ọ bụrụ na e were otú akara ahụ na-acha tụnyere otú akara ezigbo ego kịrịkịrị ọlaedo na-acha, a na-achọpụta ọdịiche dị na ha abụọ, ma ọ bụrụ na e nwere. Ọ bụ nchọpụta a, ya bụ, ihe a e ji nkume amata, mere ka a na-amata ego kịrịkịrị nke bụ́ ezigbo ya. Olee otú ịmata banyere nkume a e ji amata ezigbo ego kịrịkịrị si enyere anyị aka ịghọta Baịbụl?

Ihe Nkume ahụ Na-anọchi Anya Ya na Baịbụl

Mgbe ndị niile na-azụ ahịa malitere iji nkume na-amata ezigbo ọlaedo, okwu a sụgharịrị “nkume e ji amata ezigbo ọlaedo” gbanwere ghọọ otú e si anwale ihe. N’asụsụ Grik, bụ́ asụsụ e ji sụgharịa akwụkwọ ụfọdụ na Baịbụl, a na-ekwukwa okwu ahụ mgbe a na-ekwu banyere ahụhụ a na-ata ndị mere ihe ọjọọ.

Ebe ọ bụ ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ na-ata ndị mkpọrọ ahụhụ, ọ bụ n’okwu ahụ a sụgharịrị “nkume e ji amata ezigbo ọlaedo” ka e si sụgharịa okwu bụ́ ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ. Ya mere, Baịbụl kọrọ otu ihe atụ Jizọs mere banyere otu ohu nke na-enweghị ekele, onye e nyefere n’aka “ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ,” ma ọ bụ “ndị mmekpa ahụ́,” dị ka Bible Nsọ nke Union Version si dee ya. (Matiu 18:34) Akwụkwọ bụ́ The International Standard Bible Encyclopædia kwuru banyere amaokwu a, sị: “Ikekwe, e weere ịtụ mmadụ mkpọrọ dị ka ‘mmekpa ahụ́’ (dị ka o doro anya na ọ bụ), o nweghịkwa ihe ọzọ okwu ahụ bụ́ ‘ndị mmekpa ahụ́’ pụtara ma ọ́ bụghị ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ.” Nke a na-enye aka ịkọwa otu amaokwu na-akpali mmasị nke dị na Baịbụl.

Ihe Dị Mgbagwoju Anya Edoola Anya

Ọ dịla anya ndị ji ezi obi agụ Baịbụl nọ na-eche ihe ga-abụ ụgwọ ọrụ Setan. Baịbụl kwuru, sị: “A tụbakwara Ekwensu . . . n’ime ọdọ ọkụ na sọlfọ ahụ, bụ́ ebe ma anụ ọhịa ahụ ma onye amụma ụgha ahụ nọ anọ; a ga-emekpakwa ha ahụ́ ehihie na abalị ruo mgbe niile ebighị ebi.” (Mkpughe 20:10) N’ezie, Jehova ịta mmadụ ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi ekwekọghị n’ịhụnanya na ikpe ziri ezi ya. (Jeremaya 7:31) Baịbụl kwukwara na ndụ ebighị ebi bụ onyinye, ọ bụghị ntaramahụhụ. (Ndị Rom 6:23) Ya mere, o doro anya na ihe e dere ná Mkpughe 20:10 bụ ihe atụ. Anụ ọhịa ahụ na ọdọ ọkụ ahụ nwere ihe ha na-anọchi anya ha. (Mkpughe 13:2; 20:14) Mmekpa ahụ́ ahụ ò nwere ihe ọ na-anọchi anya ya? Gịnị ka okwu a pụtara?

Dị ka e kwuru ná mbụ, ọ bụ okwu Grik a sụgharịrị “nkume e ji amata ezigbo ọlaedo” ka e si nweta okwu bụ́ “mmekpa ahụ́.” O nwekwara ike ịpụta imekpa mmadụ ahụ́ site n’ịtụ ya mkpọrọ. Ya mere, ahụ́ a ga-emekpa Setan bụ mkpọrọ ebighị ebi a ga-atụ ya n’ebe ọ na-agaghị enwe ike ịpụta apụta, ya bụ, ọnwụ.

Nkume ndị Lydia ji amata ezigbo ọlaedo na-enyere anyị aka ịghọta ihe ọzọ banyere ‘ahụ́ a ga-emekpa’ Setan ruo mgbe ebighị ebi bụ́ nke kwekọrọ n’ịhụnanya Chineke. N’asụsụ ụfọdụ, ihe “nkume e ji amata ezigbo ọlaedo” pụtara bụ otú e si anwale ihe. Dị ka ihe atụ, n’asụsụ Bekee, “nkume e ji amata ezigbo ọlaedo” pụtara “ule ma ọ bụ otú e si amata ma ihe ọ̀ dịkwa mma ma ọ bụ ma ò zikwara ezi.” Ya mere, ‘ahụ́ a ga-emekpa’ Setan ruo mgbe ebighị ebi pụtara na ikpe a ga-ekpe Setan bụ ihe àmà ga-adịru mgbe ebighị ebi nke a ga-echeta ma ọ bụrụ na e nwee mgbe ọ bụla e nupụụrụ Jehova isi n’ọdịnihu. O nwekwaghị mgbe ọ bụla ọzọ a ga-ama ọchịchị Jehova aka, a gbachi nkịtị ka ogologo oge gafee iji gosi na onye ahụ mara ya aka ezighị ezi.

Ịghọta ihe mere ndị na-azụ ahịa n’ebe niile ji nabata otú ahụ ndị Lydia si jiri nkume na-amata ezigbo ọlaedo nakwa ịghọta otú e si jiri ya mee ihe atụ na-eme ka anyị ghọta ihe ga-eme Setan. Ihe ga-eme ya ga-abụ ihe àmà ga-adịru ebighị ebi nke a ga-adabere na ya na-ekpe ikpe. Nke a ga-eme ka ọ ghara inwe mgbe Chineke ga-agbachi ndị nnupụisi nkịtị.—Ndị Rom 8:20.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 23]

Ahụ́ ihe atụ a ga-emekpa Setan na-egosi na ikpe a ga-ekpe ya ga-abụ ihe àmà nke ga-adịru mgbe ebighị ebi

[Map dị na peeji nke 21]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Oké Osimiri Ojii

LYDIA

SADIS

Oké Osimiri Mediterenian

[Foto dị na peeji nke 21]

Sadis oge ochie—mgbe e bibichara ya

[Foto dị na peeji nke 22]

N’oge ochie, a na-eji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ atụ ego

[Ebe E Si Nweta Foto]

E. Strouhal/Werner Forman/Art Resource, NY

[Foto ndị dị na peeji nke 22, 23]

N’oge a, a ka na-eji nkume amata ezigbo ọla

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Ego kịrịkịrị: A natara Classical Numismatic Group, Inc., ikike; nkume e ji amata ezigbo ọlaedo: Science Museum/Science & Society Picture Library

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 21]

Ego kịrịkịrị e ji ọla abụọ kpụọ: A natara Classical Numismatic Group, Inc., ikike